Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ihe mere ndị agha Rom ji chọsie ike inweta uwe ime Jizọs?

Ndị agha anọ e nyefere ọrụ ịkpọgbu Jizọs kere uwe ya n’etiti onwe ha. Jọn 19:23 kwuru, sị: “Ma uwe ime [Jizọs] enweghị ebe a dụkọtara ya, n’ihi na a kpara ya akpa site n’elu gbadaa.” Ndị agha ahụ kpebiri na ha agaghị adọwa ya kama na ha ga-efe nza n’elu ya iji mata onye ga-ewere ya. Olee otú e si akpa ụdị uwe ahụ?

O yiri ka uwe ime ahụ ọ̀ bụ uwe e ji linin ma ọ bụ ajị anụ kpaa nke na-eru n’ikpere ma ọ bụ na nkwonkwo ụkwụ. Otú a na-esikarị akpa ụdị uwe a bụ ijikọta ákwà abụọ ndị ogologo ha karịrị uhiè ha ma ọ bụ ndị ogologo ha na uhiè ha hà ọnụ, kpachie elu ha na akụkụ ha abụọ. A na-ahapụ ebe isi mmadụ na aka mmadụ ga-abanye.

Akwụkwọ bụ́ Jesus and His World kwuru na e nwere ụdị uwe a nke ka oké ọnụ e sikwa otú a akpa, bụ́ nke “a na-eji naanị otu ibé ákwà dị ogologo akpa, a na-apịaji ya abụọ, bepuo elu ya maka ebe isi mmadụ ga-abanye” ma pịa ọnụ ya apịa. Ebe ọ ga-adị mkpa ka a kpachie ụdị uwe a bụ n’akụkụ ya abụọ.

Ọ bụ naanị na Palestaịn ka a na-eyi uwe na-enwetụghị ebe a dụkọtara ya adụkọta, dị ka nke ahụ Jizọs yiri. A na-ekwe ha n’osisi e ji ekwe ákwà nke a na-etinye ụzọ owu ogologo abụọ, otu n’ihu, otu n’azụ. Otu akwụkwọ kwuru na onye na-ekwe ákwà ahụ na-atụfe úkwù owu ya nke na-aga uhiè uhiè n’owu ndị nke dị n’ihu nakwa n’owu ndị nke dị n’azụ, “si otú ahụ kwee ákwà na-enweghị oghere n’akụkụ abụọ ya.” O nwere ike ịbụ na uwe na-enwetụghị ebe a dụkọtara ya adụkọta dị ụkọ n’oge ahụ, onye nke ọ bụla n’ime ndị agha ahụ chọkwara ka ọ bụrụ nke ya.

È nwere ndị na-akpa aṅụ n’Izrel oge ochie?

Akwụkwọ Nsọ Hibru gwara anyị na Chineke kwere ndị Izrel oge ochie nkwa iduba ha “n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ọpụpụ 3:8) N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe niile Akwụkwọ Nsọ kpọrọ mmanụ aṅụ aha, o yiri ka ọ̀ bụ ihe ọrịra aṅụ bi n’ọhịa na-emepụta ka ọ na-ekwu. Ọ dịghị ihe Baịbụl kwuru banyere ịkpa aṅụ n’Izrel oge ochie. Ma, ihe a chọpụtara na Ndagwurugwu Bet She’an dị n’Izrel n’oge na-adịbeghị anya gosiri na n’oge ochie, ndị bi n’ebe ahụ “kpara aṅụ iji kpata ego.”

N’obodo Tel Rehov, ndị nchọpụta si ná Ngalaba Na-amụ Banyere Ihe Ndị Mgbe Ochie na Mahadum Hibru dị na Jeruselem gwupụtara ebe a na-akpa aṅụ nke a sịrị na e wuru n’agbata narị afọ nke iri na mmalite narị afọ nke itoolu Tupu Oge Anyị, bụ́ mmalite nke oge ndị eze chịwara Izrel. Nke a bụ nke mbụ a na-achọta ebe a na-edebe aṅụ n’Izrel oge ochie. E chere na ebe ahụ a na-akpa aṅụ nweburu ihe dị ka otu narị ebe a na-edebe aṅụ ndị dị okpukpu atọ ma ọ dịkarịa ala.

Ihe odide mahadum ahụ ji kọwaa ihe ha chọpụtara kwuru na “nke ọ bụla n’ebe ndị ahụ a na-edebe aṅụ bụ ụrọ a na-aṅaghị n’ọkụ . . . nke dị ihe dị ka sentimita iri asatọ n’ogologo, dịkwa sentimita iri anọ n’uhiè. . . . Ndị aka ochie n’ịkpa aṅụ na ndị ọkà mmụta gara n’ebe ahụ kwuru na a ga na-enweta ihe dị ka ọkara tọn mmanụ aṅụ kwa afọ n’ebe ndị ahụ a na-edebe aṅụ.”

[Foto dị na peeji nke 22]

Ebe Ahụ e Gwupụtara Ihe na Rehov

[Ebe E Si Nweta Foto]

Institute of Archaeology/Hebrew University © Ebe E Gwupụtara Ihe na Tel Rehov