Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Olee ihe mere nwaanyị na-enwekwaghị mmasị n’okpukpe jizi ewepụta oge buru ibu na-akụziri ndị ọzọ banyere Chineke? Gịnị mere nwoke nwere mmasị n’egwuregwu ike jizi enwe mmasị n’ime udo? Olee otú nwoke na-aṅụ ọgwụ ike na oké mmanya ma na-alụkarị ọgụ si jisie ike gbanwee ndụ ya? Gụọ ihe ha kọrọ.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: PENELOPE TOPLICESCU

ADỊ M AFỌ: 40

ABỤ M ONYE: AUSTRALIA

NDỤ M BIRI: OKPUKPE GWỤRỤ M IKE

AKỤKỌ NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo Sydney, dị n’Australia, ma mgbe m dị naanị afọ abụọ, ezinụlọ anyị kwagara New Guinea. Anyị biri ihe na-eruchaghị afọ abụọ na Rabaul, bizie afọ asatọ na Bougainville. N’oge ahụ, tiivi adịghị na New Guinea, n’ihi ya, mụ na nwanne m nwoke na-akpapụkarị akpapụ, na-aga igwu mmiri, na-agakwa ebi n’ọhịa.

Mgbe m ruwere afọ iri, amalitere m inwe mmasị n’okpukpe. Mama m bụ onye Katọlik, ọ gwakwara m ka m na-eso otu nwaanyị Katọlik na-aga ọmụmụ Baịbụl. Amalitere m ikpe Katọlik, e meekwa m baptizim mgbe m ruru afọ iri.

Ma, mgbe anyị kwaghachiri Australia, bụ́ mgbe m dịzi afọ iri na ụma, amalitere m inyo ihe ndị a kụziiri m banyere okpukpe enyo. N’oge niile m nọ na kọleji, amụrụ m ihe ndị mere n’oge ochie, mụ na papa m na-ejikwa ọtụtụ awa ekwurịta otú okpukpe si malite na ihe ndị dị na Baịbụl anyị chere na ha bụ akụkọ ifo. Emechaziri m kwụsị ikpe Katọlik.

Mgbe m dị afọ iri na isii, papa m na mama m gbasara. Ihe siiri mama m ike, n’ihi ya, m bikwuuru papa m na onye ọ chọrọ ịlụ. Nwanne m nwoke na mama m bi, ha kwagakwara steeti ọzọ. N’oge a, ezigbo owu malitere ịma m. O were afọ abụọ tupu mụ na mama m akparịtawa ọzọ. Aṅụwara m oké mmanya na ọgwụ ike, gawakwa oriri na nkwari. Akwụsịrị m ịga akwụkwọ, chọta ọrụ, biekwa ndụ rụrụ arụ n’oge ahụ m dị afọ iri abụọ na ụma.

Mgbe m ruru afọ iri abụọ na ise, amaliteghachiri m iche echiche banyere Baịbụl. Amalitere m ọrụ ọhụrụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m hụrụ ezigbo nwa agbọghọ aha ya bụ Liene, bụ́ onye na-akwanyere nna ya ukwu ùgwù mgbe niile n’agbanyeghị na nna ya ukwu na-akparị ya. Mgbe m jụrụ ya ihe mere na ọ naghị agwagwara ya, ọ gwara m na ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, nakwa na ya chọrọ ịna-eme ihe ọ na-amụta na Baịbụl. Liene gwara m ka ya mụwara m Baịbụl. M ghọtahiere ya, chee na ihe ọ na-ekwu bụ na ọ ga-akụziliri m ihe niile ọ ma na Baịbụl naanị n’otu awa. N’abalị ahụ, Liene ji awa atọ zaa m ajụjụ ndị m jụrụ ya banyere Baịbụl. Obi tọrọ m ụtọ na ihe niile ọ zara m si na Baịbụl.

Echetara m na ka m nya ụgbọala m na-ala n’abalị ahụ mụ na Liene kwurịtachara okwu, m nọ na-ewesara Chineke iwe na o meghị ka m mata eziokwu banyere ya n’oge. Ama m na Ndịàmà na-ebi ndụ dị ọcha ma echere m na m gaghịzi agbanweli àgwà ọjọọ m. Echekwara m na m gaghị agali n’ụlọ n’ụlọ na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma otú Ndịàmà na-eme. M ka kwere ka Ndịàmà na-amụrụ m Baịbụl, ma, ihe m bu n’obi bụ ịchọta ihe na-adịghị mma n’ozizi ha ka akọ na uche m ghara ịta m ụta ma m kwụsị ige ha ntị. Otu ụbọchị, achọpụtara m na m gaghị enyochatali ihe na-adịghị mma n’ozizi ha.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Ka m na-amụtakwu ụdị àgwà Baịbụl chọrọ ka m na-akpa, otú ahụ ka akọ na uche m na-enyekwu m nsogbu. Akwụsịrị m ịṅụ ọgwụ ike ka akọ na uche m kwụsị inye m nsogbu. Ma, akwagaziri m mba ọzọ, bie ebe ahụ ruo oge ụfọdụ ma maliteghachi ịga oriri na nkwari na ịṅụ oké mmanya. O yiri ka ọ̀ na-abụ mgbe ọ bụla m malitere ime ihe Baịbụl kwuru, mụ adabaghachi n’omume ọjọọ. M na-eji ihere ekpegara Jehova ekpere, ma obi ka na-ajọ m njọ.

Mgbe m gụrụ ihe Eze Devid na Bat-shiba mere na otú Jehova si meere ha ebere, o nyeere m aka. Devid ji obi ike kweta mmejọ ya mgbe a na-adụ ya ọdụ, n’azọwaghị isi ya. Mgbe a dọrọ ya aka ná ntị, o ji obi umeala nabata ya. (2 Samuel 12:1-13) Mgbe ọ bụla m mere ihe ọjọọ, m na-echeta akụkọ ahụ, ọ na-emekwa ka ọ dịkwuoro m mfe ịrịọ Jehova mgbaghara. Ekpebiziri m ibu ụzọ na-ekpe ekpere mgbe ọnwụnwa bịaara m kama imecha ihe ọjọọ rịọwa mgbaghara, nke ahụ nyekwaara m ezigbo aka.

URU NDỊ M RITERELA: Kemgbe ụwa m, abụ m onye iwe ọkụ. Ma, ihe e dere ná Ndị Efesọs 4:29-31 nyeere m aka ịghọta na m kwesịrị izere ‘obi ilu na iwe na ọnụma.’ Ka m na-amụta ịchịkwa iwe m, amụtara m ịkwa ire m nga. Ndụmọdụ Jizọs nyere “ka Ee unu kwuru bụrụ Ee” nyekwaara m aka ịna-eme ihe m kpebiri ime.—Matiu 5:37.

Mama m achọbughị ka mụ na Ndịàmà na-akpa, ma o mechara gwa m na ya ji m eme ọnụ. O kwudịrị, sị, “Ama m na ihe mere i ji ghọọ ezigbo nwaanyị abụghị otú e si zụọ gị, kama, ọ bụ ihe ị mụtara banyere Jehova.” Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe o kwuru ihe ahụ.

Ugbu a, echere m na ndụ m enweela isi. Kemgbe afọ itoolu, mụ na di m ji Baịbụl na-ezisara ndị mmadụ ozi ọma oge niile. Ana m agazi n’ụlọ n’ụlọ ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, echekwara m na ọ bụ ọrụ kacha baa uru m rụtụrụla.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: DENIS BUSIGIN

ADỊ M AFỌ: 30

ABỤ M ONYE: RUSSIA

NDỤ M BIRI: ỊGBA KARAT NA-ATỌ M EZIGBO ỤTỌ

AKỤKỌ NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo Perm’, ma, m toro n’obodo Furmanov, bụ́ obodo dị ná mpaghara Ivanovo, Russia, nke ihe dị ka iri puku mmadụ anọ bi. Furmanov bụ obodo mara mma nke nwere ọtụtụ ọmarịcha osisi ndị na-acha odo odo na ọbara ọbara n’oge mgbụsị akwụkwọ. N’agbata afọ 1980 na afọ 1999, ime mpụ rịrị elu n’obodo ahụ. Ezinụlọ anyị dara ogbenye. Mụ na papa m na mama m na nwanne m nwoke m tọrọ bi n’otu ọnụ ụlọ, n’ihi ya, efe adịtụdịghị n’ụlọ anyị.

Amalitere m ịmụ ịgba karat mgbe m dị afọ asaa. Egwuregwu ahụ na-atọ m ụtọ; ọ ghọrọ ihe kacha m mkpa ná ndụ. M na-eji ohere ọ bụla m nwere aga ebe a na-amụ ya, n’ihi ya, ndị enyi m niile bụ ndị na-eme egwuregwu. Mgbe m dị afọ iri na ise, enwetala m red belt na karat, nwetakwa brown belt n’afọ sochiri ya. Eso m ná ndị sọrọ mpi e ji mata ọkaibe n’ịgba karat na Russia, Yurop, nakwa n’Eshia. O yiri ka ihe ọ̀ gaziwerela m, ma mgbe m dị afọ iri na asaa, ndụ m gbanwere kpamkpam.

Mụ na ụfọdụ ndị enyi m rụrụ ala, a nwụchie anyị. A tụrụ m mkpọrọ afọ abụọ. M tara ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ. Ma, ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ ka m nọ hụ Baịbụl nke mbụ. Agụrụ m Jenesis, Abụ Ọma, na Agba Ọhụrụ. Ebutedịrị m ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe n’isi, na-agụkwa ya kwa abalị tupu mụ ehie ụra, chee na ọ ga-enyetụrụ m aka.

Apụtara m n’ụlọ mkpọrọ n’afọ 2000, ma, amaghị m ihe m ga-eme eme ná ndụ. Amalitere m ịṅụ ọgwụ ike. Ọ bụ n’oge ahụ ka mama m nwụrụ. Ọ bụ ya ka m kacha hụ n’anya, o sikwaara m ike idi ọnwụ ya. Ma, ejisiri m ike kwụsị ịṅụ ọgwụ ike, maliteghachikwa ịga ebe a na-amụ ịgba karat. Akwagakwara m n’obodo Ivanovo. N’ebe ahụ, achọtara m ọrụ n’ụlọ ahịa a na-ere nri. Onyeisi ndị na-ere ihe n’ụlọ ahịa ahụ bụ Onyeàmà Jehova. Ọ kọwaara m ihe ụfọdụ dị mkpa na Baịbụl, mezie ndokwa ka Onyeàmà ọzọ na-amụchiri m Baịbụl anya.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’oge ahụ m na-amụ Baịbụl, o metụrụ m nnọọ n’ahụ́ mgbe m mụtara na Chineke chọrọ ime ka ụwa ghọọ paradaịs, achọkwara m ime ihe ga-eme ka m baa na ya. N’oge na-adịghị anya, aghọtara m na Jehova Chineke nwere ụdị ndụ ọ chọrọ ka ndị mmadụ na-ebi. Kemgbe ụwa m, ihe m na-eche bụ naanị ọdịmma onwe m. Ma, amụtara m na Jehova chọrọ ka m na-eche banyere ndị ọzọ ma nwee àgwà ndị m na-enweghị n’oge ahụ, ndị dị ka obiọma na ime udo.

Ka m malitere ichebara ihe niile Jehova meerela m echiche, dị ka iji Ọkpara ya chụọ àjà maka mmehie m, obi ụtọ m nwere maka ịhụnanya Chineke mere ka m gbanwee ndụ m. Dị ka ihe atụ, amụtara m n’Abụ Ọma 11:5 na Jehova kpọrọ ime ihe ike asị. N’ihi ya, akwụsịrị m ikiri ihe ndị na-egosi ime ihe ike na ịkpọasị na tiivi. Akwụsịkwara m igwu egwuregwu ike, n’agbanyeghị na o siiri m ezigbo ike. Ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:33 nyeere m aka ịhụ na ndị mụ na ha na-akpa ga-emetụta nnọọ àgwà m. Ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ mkpọrọ ahụ m gara. N’ihi ya, akwụsịrị m iso ndị igwu egwuregwu ike na-atọ ụtọ na-akpa.

URU NDỊ M RITERELA: Iso Ndịàmà Jehova na-akpa na ịmụ Baịbụl enyerela m aka ịghọ onye na-akwụwa aka ya ọtọ. Dị ka ihe atụ, ná Ndị Hibru 13:5, amụtara m na ọ dị mkpa ka afọ ju anyị n’ihe anyị nwere nakwa na anyị ekwesịghị ịhụ ego n’anya. Iso ndụmọdụ a enyerela m aka izere ịgha ụgha na izu ohi.

Ana m enwekarị mmasị inwe ndị enyi. Ahụla m ebe anyaukwu ma ọ bụ ụjọ tọsara enyi na enyi. Ndịàmà Jehova ezughị okè, ma, ahụla m na ha na-agbalị irubere iwu Chineke isi, na-agbalịsikwa ike imeso ndị ọzọ ihe otú iwu ya kwuru. Ụfọdụ n’ime ha aghọọla ezigbo ndị enyi m.

Ònye ma otú ndụ m gaara adị ma a sị na mụ amụtaghị ime ihe Baịbụl kwuru? Ikekwe, a gaarala atụ m mkpọrọ ọzọ ma ọ bụ mụ ana-akpatara ndị ọzọ ahụhụ na obi ọjọọ. Ma, ugbu a, alụọla m ezigbo nwaanyị, mụta ụmụ nwoke abụọ, ọ na-atọkwa nnọọ ezinụlọ anyị ụtọ ịkụziri ndị ọzọ eziokwu banyere Chineke.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: JOSÉ CARLOS PEREIRA DA SILVA

ADỊ M AFỌ: 31

ABỤ M ONYE: BRAZIL

NDỤ M BIRI: E JI ỊLỤ ỌGỤ N’OKPORO ÁMÁ MARA M

AKỤKỌ NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etolitere m n’ebe e nwere mkpọmkpọ ụlọ n’obodo Americana dị na São Paulo, Brazil. Anyị enweghị mmiri dị ọcha na ebe dị mma ikpofu unyi. Ihe e ji mara obodo a bụ ime ihe ike na mpụ.

Mgbe m na-eto, ana m eme ihe ike, na-alụkwa ọgụ. Mgbe ọ bụla a na-alụ ọgụ n’okporo ámá, m na-eso, n’ihi ya, ndị agbata obi anyị na-atụ m ụjọ. Ejiji m, ụdị isi m na-akpụ, na ọdịdị m na-eme ka ndị mmadụ na-eze m eze. Ọtụtụ mgbe, m na-aṅụgide mmanya ruo mgbe m na-amaghịzi onwe m. Ana m aṅụ ọgwụ ike otú ụmụnne m ndị nwoke na-aṅụ. N’eziokwu, otu nwanne m nwoke nwụrụ n’ihi ịṅụfe ọgwụ ike ókè.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe Ndịàmà Jehova ziri m ozi ọma, ha ji Baịbụl gosi m na Chineke ga-eme ka ụwa niile ghọọ paradaịs. (Luk 23:42, 43; Mkpughe 21:3, 4) Amụtakwara m na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, nke pụtara na Chineke anaghị ata ndị ọjọọ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. (Ekliziastis 9:5, 6) Nke a mere nnọọ ka obi ruo m ala. Ihe m mụtara banyere Chineke mere ka m chọsie ike ịgbanwe ndụ m. Ma, ọ dịghịrị m mfe ịgbanwe àgwà m, ya bụ, ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ike, ịṅụ oké mmanya, ịlụ ọgụ, na ikwu okwu ọjọọ m na-ekwukarị.

Ma, ihe Pọl onyeozi kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11 gbara m nnọọ ume. Ebe ahụ gosiri na e nwere mgbe Ndị Kraịst narị afọ mbụ kpara ụfọdụ àgwà ọjọọ ndị ahụ m na-akpa. Ma ebe ahụ kwukwara, sị: “Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu. Ma a sachawo unu, ma e dowo unu nsọ, ma a kpọwo unu ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.” Okwu ndị ahụ mere ka m nwee olileanya na m ga-akwụsịli àgwà ọjọọ m iji mee ka obi tọọ Chineke ụtọ.

Mgbe m sowere Ndịàmà Jehova, ọ bịara doo m anya na ọ bụ okpukpe ha bụ ezi okpukpe. Ha maara na m na-emebu ihe ike, n’agbanyeghị ya, ha ji obi ụtọ na ịhụnanya nabata m.

URU NDỊ M RITERELA: A sị na mụ amụghị Baịbụl ma gbanwee ndụ m, m nwerela ike ịnwụ. Kama nke ahụ, enyerela m otu nwanne m nwoke aka ịmụ Baịbụl na ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ike riri ya ahụ́, nke ahụ na-enyekwa m ọṅụ. Agbaakwala m ndị ikwu m ndị ọzọ ume ka ha mụwa Baịbụl. Obi dị m nnọọ ụtọ na enyefeela m Chineke, bụ́ onye na-eche nnọọ banyere m, ndụ m ijere ya ozi!

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

“Ekpebiri m ibu ụzọ na-ekpe ekpere mgbe ọnwụnwa bịaara m kama imecha ihe ọjọọ rịọwa mgbaghara, nke ahụ nyekwaara m ezigbo aka”