Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì So ‘Ụzọ Ịhụnanya Kasị Mma’?

Ì So ‘Ụzọ Ịhụnanya Kasị Mma’?

Ì So ‘Ụzọ Ịhụnanya Kasị Mma’?

“CHINEKE bụ ịhụnanya.” Jọn onyeozi ji okwu ahụ kọwaa àgwà kachanụ Chineke nwere. (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ịhụnanya Chineke hụrụ ụmụ mmadụ mere anyị ji abịaru ya nso, anyị na ya adịrịkwa ná mma. Oleekwa uru ọzọ ịhụnanya Chineke baara anyị? Ndị mmadụ kwuru, sị: “Ihe anyị hụrụ n’anya na-emetụta ụdị onye anyị ga-abụ.” Okwu ahụ bụ eziokwu. Ma, ọ bụkwa eziokwu na onye anyị hụrụ n’anya na onye hụrụ anyị n’anya na-emetụta otú anyị si akpa àgwà. Ebe e kere anyị n’onyinyo Chineke, anyị ga-ahụli mmadụ n’anya dị ka Chineke. (Jen. 1:27) Ọ bụ ya mere Jọn onyeozi ji dee na anyị hụrụ Chineke n’anya “n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.”—1 Jọn 4:19.

Okwu Anọ E Ji Akọwa Ịhụnanya

Pọl onyeozi kpọrọ ịhụnanya “ụzọ kasị mma.” (1 Kọr. 12:31) Olee ihe mere o ji kpọọ ya ụzọ kasị mma? Olee ụdị ịhụnanya Pọl na-ekwu? Iji chọpụta, ka anyị lebatụkwuo anya n’ihe “ịhụnanya” pụtara.

E nwere ụzọ dị iche iche Ndị Grik oge ochie si akọwa ịhụnanya. Ha na-eji okwu anọ bụ́ isi bụ́ stor·geʹ, eʹros, phi·liʹa, na a·gaʹpe akọwa ya. N’ime okwu anọ ndị ahụ, a na-eji a·gaʹpe ekwu okwu mgbe a na-ekwu banyere Chineke, onye ‘bụ́ ịhụnanya.’ * Mgbe Prọfesọ William Barclay na-ekwu banyere ụdị ịhụnanya a n’akwụkwọ ya a kpọrọ New Testament Words, ọ sịrị: “Agapē bụ ịhụnanya si n’obi: ọ bụghị otú obi dị mmadụ, nke onye ahụ na-echeghị eche; ọ bụ ụkpụrụ anyị kpachaara anya kpebie ka ọ na-edu anyị. Agapē na-esi kpọmkwem n’uche.” N’isiokwu a, a·gaʹpe bụ ịhụnanya ụkpụrụ na-eduzi, ma, ihe na-emetụkarị onye nwere ya n’ahụ́. Ebe ọ bụ na e nwere ma ụkpụrụ ọma ma ụkpụrụ ọjọọ, o doro anya na ụkpụrụ ọma Jehova Chineke ji aka ya dee, bụ́ ndị dị na Baịbụl, kwesịrị iduzi Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị ejiri otú Baịbụl si kọwaa a·gaʹpe tụnyere okwu ndị ọzọ e ji kọwaa ịhụnanya na Baịbụl, ọ ga-enyere anyị aka ịmatakwu ụdị ịhụnanya anyị kwesịrị ịhụ mmadụ.

Ịhụnanya A Na-enwe n’Ezinụlọ

E nweghị onye obi na-anaghị atọ ụtọ ịnọ n’ezinụlọ mmadụ niile hụrụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu! Stor·geʹ bụ okwu Grik a naara ejikarị akọwa ịhụnanya e bu pụta ụwa ndị mmadụ na-ahụ ndị ezinụlọ ha. Ndị Kraịst na-ahụ ndị ezinụlọ ha n’anya. Pọl buru amụma na n’oge ikpeazụ, ndị mmadụ ‘agaghị enwe obi mmadụ.’ *2 Tim. 3:1, 3.

N’ụwa taa, ọ dị mwute na ezigbo ịhụnanya nke kwesịrị ịdị n’ezinụlọ adịghịzi. Olee ihe mere ọtụtụ ndị gaara abụ nne ji ete ime? Gịnị mere ọtụtụ ezinụlọ ji eleghara ndị nne na nna ha merela agadi anya? Olee ihe mere ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm ji ebukwu ibu? Azịza ha bụ́, Enweghị obi mmadụ.

Ọzọkwa, Baịbụl kụziri na “obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ.” (Jer. 17:9) Ịhụnanya anyị na-ahụ ndị ezinụlọ anyị na-esi anyị n’obi na n’uche. Ma, ọ dị mma ịmara na Pọl ji a·gaʹpe kọwaa ịhụnanya di kwesịrị ịhụ nwunye ya. O ji ya tụnyere ịhụnanya Kraịst hụrụ ọgbakọ ya. (Efe. 5:28, 29) Ọ bụ ụkpụrụ Jehova nyere, bụ́ Onye malitere ezinụlọ, na-eduzi ịhụnanya a.

Ọ bụ ezigbo ịhụnanya anyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị na-eme ka anyị na-elekọta nne na nna anyị ndị merela agadi ma ọ bụ na-elebara ụmụ anyị anya. Ọ na-emekwa ka ndị nne na nna jiri ịhụnanya dọọ ụmụ ha aka ná ntị mgbe ọ dị mkpa, meekwa ka ha ghara ịna-emetara ụmụaka ebere n’enweghị isi, bụ́kwanụ ihe na-eme ka a na-eleghakarị àgwà ọjọọ ụmụaka na-akpa anya.—Efe. 6:1-4.

Ịhụnanya Nwoke na Nwaanyị na Ụkpụrụ Baịbụl

N’eziokwu, ịhụnanya nwoke na nwaanyị na-ahụ onwe ha ma ha lụọ bụ onyinye Chineke. (Ilu 5:15-17) Otú ọ dị, ndị ji ike mmụọ nsọ dee Baịbụl e deghị okwu bụ́ eʹros, nke pụtara ịhụnanya nwoke na nwaanyị. Maka gịnị? N’afọ ole na ole gara aga, Ụlọ Nche kwuru, sị: “Taa, o yiri ka ụwa niile hà na-ehie otu ụzọ ahụ ndị Grik oge ochie hiere. Ha fere Eros ka chi, kpọọrọ ya isiala n’ebe ịchụàjà ya ma chụọrọ ya àjà. . . . Ma, akụkọ ihe mere eme gosiri na ụdị ofufe ahụ wetara mweda n’ala, ndụ ịla n’iyi na ọnwụ. O nwere ike ịbụ ihe mere ndị dere Baịbụl edeghị ya.” Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ọ bụrụ naanị otú mmadụ dị mere anyị ji nwee mmasị n’ebe ọ nọ, ụkpụrụ Baịbụl kwesịrị ịna-achịkwa ịhụnanya anyị hụrụ onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe anyị. Ya mere, jụọ onwe gị, sị: ‘Ezigbo ịhụnanya ò so n’ịhụnanya m hụrụ onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m?’

N’oge “ntoju ntorobịa,” bụ́ mgbe agụụ mmekọahụ na-akpa ike ọjọọ, ndị ntorobịa ji ụkpụrụ Baịbụl kpọrọ ihe ga na-eme omume dị ọcha. (1 Kọr. 7:36; Kọl. 3:5) Anyị maara na alụmdi na nwunye bụ onyinye dị nsọ Jehova nyere ụmụ mmadụ. Jizọs kwuru banyere ndị di na nwunye, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:6) Kama anyị ịhụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị n’anya naanị mgbe agụụ mmekọahụ gụwara anyị, anyị anaghị e ji nkwa alụmdi na nwunye egwuri egwu. Ọ bụrụ na anyị na di ma ọ bụ nwunye anyị enwee nsogbu, anyị ekwesịghị ichewe otú anyị ga-esi hapụ di ma ọ bụ nwunye anyị, kama, anyị ga-agbalịsi ike na-akpa àgwà Chineke kwuru ka anyị na-akpa iji mee ka e nwee obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. Ụdị mgbalị ahụ na-eme ka ọṅụ na-adị n’ezinụlọ.—Efe. 5:33; Hib. 13:4.

Ịhụnanya Enyi na Enyi

Ndụ ga-agbụ anyị ma ọ bụrụ na anyị enweghị ndị enyi! Otu ilu Baịbụl sịrị: “E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” (Ilu 18:24) Jehova chọrọ ka anyị nwee ezigbo ndị enyi. A ma na Devid na Jọnatan bụ ezigbo enyi. (1 Sam. 18:1) Baịbụl kwukwara na Jizọs ‘hụrụ Jọn onyeozi n’anya nke ukwuu.’ (Jọn 20:2) Okwu Grik e ji akọwa ụdị ịhụnanya ahụ bụ phi·liʹa. N’ọgbakọ, ọ dịghị njọ inwe enyi gị na ya bụ nnu na mmanụ. Ma, na 2 Pita 1:7, a gwara anyị ka anyị tụkwasị ịhụnanya (a·gaʹpe) “n’ịhụnanya ụmụnna” anyị (nke pụtara phi·la·del·phiʹa, ya bụ, okwu Grik abụọ e jikọtara ọnụ. Phiʹlos bụ okwu Grik pụtara “enyi,” ebe a·del·phosʹ bụ okwu Grik pụtara “nwanna”). Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na ndị enyi anyị na-adị ná mma, anyị kwesịrị ime ihe a Baịbụl kwuru. Anyị kwesịziri ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ụkpụrụ Baịbụl ọ̀ na-eduzi ịhụnanya m hụrụ ndị enyi m?’

Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịghara imelara otu onye ihe mgbe anyị na ndị enyi anyị na-emekọ ihe. Anyị anaghị eme ihu abụọ, ya bụ, ịna-emetara ndị enyi anyị ebere mgbe anyị na-emeso ha ihe ma na-akpọchi obi mgbe anyị na-emeso ndị na-abụghị ndị enyi anyị ihe. Ihe ọzọkwa bụ na anyị anaghị eji ire ụtọ emeta ndị enyi. Nke kacha mkpa bụ na ọ bụrụ na anyị aghọta ụkpụrụ Baịbụl, ọ ga-eme ka anyị nwee amamihe ga-enyere anyị aka ịma ụdị ndị anyị ga-emete enyi, meekwa ka anyị ghara inwe ‘mkpakọrịta ọjọọ bụ́ nke ga-emebi àgwà ọma anyị.’—1 Kọr. 15:33.

Ịhụnanya Pụrụ Iche!

Ịhụnanya jikọrọ Ndị Kraịst pụrụ nnọọ iche! Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ịhụnanya unu ghara ịbụ nke ihu abụọ. . . . N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ.” (Rom 12:9, 10) N’eziokwu, Ndị Kraịst nwere ‘ịhụnanya (a·gaʹpe) nke na-enweghị ihu abụọ.’ Ịhụnanya a abụghị naanị ihe mmadụ na-anọkata nwewe. Kama nke ahụ, ọ dabesiiri ike n’ụkpụrụ Baịbụl. Ma, Pọl kwukwara banyere “ịhụnanya ụmụnna” (phi·la·del·phiʹa) na “obi ọmịiko” (ya bụ, phi·loʹstor·gos, okwu si n’okwu abụọ bụ́ phiʹlos na stor·geʹ). Otu ọkà mmụta kwuru na “ịhụnanya ụmụnna” pụtara “ịhụnanya dị nro, igosi obiọma, ọmịiko, inyere ndị mmadụ aka.” Ọ bụrụ na ndị na-efe Jehova enwee ụdị ịhụnanya a, nweekwa a·gaʹpe, ọ ga-eme ka ha na-emekọrịta ihe nke ọma. (1 Tesa. 4:9, 10) E dere okwu nke ọzọ a sụgharịrị “obi ọmịiko” otu ugbo n’ime Baịbụl. Ọ pụtakwara mmadụ na ibe ya ịdị n’ezigbo mma otú ahụ ọ na-adị n’ezinụlọ. *

Ihe jikọrọ ezi Ndị Kraịst bụ ma ịhụnanya a na-enwe n’ezinụlọ ma ịhụnanya ezigbo ndị enyi na-enwe. Ma, ihe na-achịkwa ha bụ ịhụnanya ụkpụrụ Baịbụl na-eduzi. Ọgbakọ Ndị Kraịst abụghị òtù ọhaneze, kama, ọ bụ ezinụlọ dị n’otu n’ofufe Jehova Chineke. Anyị na-akpọ ndị kwere ekwe ibe anyị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị, ọ bụkwa otú ahụ ka anyị si were ha. Ha so n’ezinụlọ ime mmụọ anyị, anyị hụrụ ha n’anya ka ndị enyi, anyị na-emesokwa ha ihe otú ụkpụrụ Baịbụl si kwuo. Ka anyị niile nye aka mee ka ịhụnanya jikọrọ ezi ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́kwa nke e ji mara ya, sie ike.—Jọn 13:35.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A na-ejikwa a·gaʹpe ekwu okwu ma e kwuwe ihe na-adịghị mma.— Jọn 3:19; 12:43; 2 Tim. 4:10; 1 Jọn 2:15-17.

^ par. 7 “Enweghị obi mmadụ” bụ ụdị ọzọ e si sụgharịa stor·geʹ. Ọ bụrụ na e tinye a, nke pụtara “enweghị,” n’azụ stor·geʹ, ọ pụtara “enweghị obi mmadụ.”—Gụọkwa Ndị Rom 1:31.

^ par. 18Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, e nwekwara okwu Grik ndị ọzọ a sụgharịrị “obi ọmịiko.” N’ihi ya, ná nsụgharị Baịbụl ahụ, “obi ọmịiko” pụtara ma ná Ndị Rom 12:10 ma ná Ndị Filipaị 1:8.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

Olee otú i si enye aka eme ka ịhụnanya jikọrọ anyị sie ike?