Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Obi Ụtọ Nabata Enyemaka, Si n’Ala Ala Obi Gị Na-enye Ihe

Jiri Obi Ụtọ Nabata Enyemaka, Si n’Ala Ala Obi Gị Na-enye Ihe

Jiri Obi Ụtọ Nabata Enyemaka, Si n’Ala Ala Obi Gị Na-enye Ihe

JEHOVA, Nna anyị bi n’eluigwe nke hụrụ anyị n’anya, na-eche banyere anyị. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na ihe banyere ndị ohu ya na-emetụ ya nnọọ n’obi. (1 Pita 5:7) Otu ụzọ Jehova si egosi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi bụ na ọ na-enyere anyị aka n’ụzọ dị iche iche ka anyị nwee ike ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. (Aịza. 48:17) Jehova chọrọ ka aka ọ na-enyere anyị baara anyị uru, nke ka nke, mgbe anyị nwere nsogbu ndị mere ka obi ghara iru anyị ala. Iwu Mozis gosiri na okwu a bụ eziokwu.

N’Iwu ahụ, Jehova kwuru ka e nyere “ndị nọ n’ahụhụ” aka, dị ka ụmụ mgbei, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na ndị mbịarambịa. (Lev. 19:9, 10; Diut. 14:29) Ọ ma na ụfọdụ ndị ohu ya nwere ike ịchọ ka ụmụnna ha nyere ha aka. (Jems 1:27) N’ihi ya, ndị ohu ya kwesịrị ịnabata enyemaka o si n’aka ndị ọzọ na-enye ha. Ma, ọ bụrụ na e nyere anyị aka, anyị kwesịrị iji obi ụtọ nabata enyemaka ahụ.

Ma, Okwu Chineke kwuru na ndị Chineke kwesịkwara ịna-enye ihe. Cheta akụkọ “nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye,” onye Jizọs hụrụ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. (Luk 21:1-4) O yiri ka ò so ná ndị e nyeere aka otú ahụ Jehova kwuru n’Iwu ahụ ka e nyere ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ aka. Ma, ọ bụ eziokwu na ọ dara ogbenye, ihe e ji echeta ya abụghị n’ihi aka e nyeere ya, kama ọ bụ n’ihi onyinye o nyere. Ọ ga-abụrịrị na onyinye ahụ o nyere mere ya obi ụtọ, n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) N’ihi ya, olee otú ị ga-esi ‘na-enye ihe’ ma nweta obi ụtọ?—Luk 6:38.

“Gịnị Ka M Ga-eji Kwụọ Jehova Ụgwọ?”

Ọbụ abụ jụrụ, sị: “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite?” (Ọma 116:12) Olee uru o ritere? Jehova nyeere ya aka n’oge ọ nọ “na-enwe ahụhụ na iru uju.” Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ‘napụtara mkpụrụ obi ya n’ọnwụ.’ Ugbu a, ọ chọrọ ‘ịkwụghachitụ Jehova ụgwọ.’ Olee otú ọbụ abụ ahụ ga-esi eme ya? O kwuru, sị: “M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova.” (Ọma 116:3, 4, 8, 10-14) O kpebiri imezu nkwa niile o kwere Jehova na ịrụrụ ya ọrụ.

I nwere ike ime otú ahụ. Olee otú ị ga-esi eme ya? Ọ bụ ịna-eme ihe niile iwu Chineke na ụkpụrụ ya kwuru ka e mee. N’ihi ya, hụ na ofufe Jehova bụ ihe kacha gị mkpa ná ndụ, meekwa ka mmụọ ya na-edu gị n’ihe niile ị na-eme. (Ekli. 12:13; Gal. 5:16-18) N’eziokwu, i nweghị ike ịkwụghachicha Jehova ụgwọ ihe niile o meere gị. N’agbanyeghị nke ahụ, ‘Jehova na-aṅụrị ọṅụ’ ma ọ bụrụ na i jiri obi gị niile na-ejere ya ozi. (Ilu 27:11) Ọ bụ ihe ùgwù magburu onwe ya isi otú ahụ mee ka obi Jehova ṅụrịa!

Soro Na-eme Ka Ihe Na-aga nke Ọma n’Ọgbakọ

O doro anya na enweela ọtụtụ ụzọ ọgbakọ Ndị Kraịst sirila nyere gị aka. Jehova esila n’ọgbakọ nye gị ọtụtụ nri ime mmụọ. Ọ bụ ọgbakọ kụziiri gị eziokwu nke mere ka ị hapụ ozizi okpukpe ụgha ma mata Chineke na nzube ya. (Jọn 8:32) “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” esila n’ọmụmụ ihe ọgbakọ, mgbakọ ukwu na mgbakọ nta mee ka ị mụta ihe ị ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs mgbe ihe mgbu na ahụhụ na-agaghị adị. (Mat. 24:45-47) I nweghị ike ịgụtacha uru niile ndị i riterela n’ọgbakọ Chineke na ndị ị ka ga-erite. Olee ihe i nwere ike inye ọgbakọ n’ihi uru ndị ahụ i riterela?

Pọl onyeozi dere, sị: “Ahụ́ dum, site n’ịbụ nke e jikọrọ ọnụ n’otu, nke e mekwara ka o kwenyekọọ site na nkwonkwo ọ bụla nke na-enye ihe dị mkpa, dị ka ịrụ ọrụ nke akụkụ ahụ́ nke ọ bụla n’otu n’otu si dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị, na-eme ka ahụ́ na-eto eto maka iwuli onwe ya elu n’ịhụnanya.” (Efe. 4:15, 16) Ọ bụ eziokwu na amaokwu Akwụkwọ Nsọ ahụ na-ekwu banyere Ndị Kraịst e tere mmanụ, ọ gbasakwara Ndị Kraịst niile taa. N’eziokwu, onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ kwesịrị iso na-eme ka ihe na-aga nke ọma n’ọgbakọ nakwa ka ọ na-eto eto. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịgbalịsi ike na-agba ndị ọzọ ume mgbe niile, na-emekwa ka ha sie ike n’ozi ha na-ejere Chineke. (Rom 14:19) Anyị nwekwara ike iso na-eme ka “ahụ́ na-eto eto” ma ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ndị mmụọ nsọ Chineke na-edu mgbe anyị na-emeso ụmụnna anyị ihe. (Gal. 5:22, 23) Ihe ọzọ bụ na anyị kwesịrị iji ohere ọ bụla anyị nwere “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Gal. 6:10; Hib. 13:16) Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ, ma ụmụnna nwoke ma ụmụnna nwaanyị, ndị agadi na ụmụntakịrị, nwere ike iso ‘na-eme ka ahụ́ na-eto eto maka iwuli ya elu n’ịhụnanya.’

Anyị nwekwara ike iji nkà anyị, ike anyị na ihe anyị nwere soro ọgbakọ na-ekwusa ozi ọma e ji azọpụta ndụ ndị mmadụ. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Unu natara n’efu.” Olee ihe anyị ga-eme? Ọ sịrị: “Na-enyenụ n’efu.” (Mat. 10:8) N’ihi ya, jiri ike gị niile soro na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 24:14; 28:19, 20) È nwere ihe na-adọla gị azụ ịrụ ọrụ a? Cheta nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye Jizọs kwuru banyere ya. Ihe o nyere ebughị ibu. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs kwuru na o nyere karịa ndị ọzọ. O nyere ihe niile o nwere ike inye n’onyinye.—2 Kọr. 8:1-5, 12.

Jiri Obi Ụtọ Nabata Enyemaka

Ma, mgbe ụfọdụ, i nwere ike chọọ ka ọgbakọ nyere gị aka. Nabata enyemaka ọ bụla ọgbakọ nwere ike inye gị mgbe gị na nsogbu ụwa a na-alụ. Jehova nyere anyị ndị ikom ruru eru nwere obiọma ‘ịzụ ọgbakọ.’ Ha ga-enyere gị aka mgbe ọnwụnwa na mkpagbu dakwasịrị gị. (Ọrụ 20:28) Ndị okenye na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-akasi gị obi, nyere gị aka ma kwado gị n’oge nsogbu.—Gal. 6:2; 1 Tesa. 5:14.

Ma, hụ na i ji obi ụtọ nabata aka e nyeere gị. Na-ekele ndị nyeere gị aka. Were aka ahụ ụmụnna gị nyeere gị dị ka obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke. (1 Pita 4:10) Gịnị mere o ji dị mkpa ka i were ya otú ahụ? N’ihi na anyị achọghị ịnabata ya otú ọtụtụ ndị ụwa si anabata ya, ya bụ, ha anaghị e ji obi ụtọ anabata ya.

Achọla Ọdịmma Onwe Gị

N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ọgbakọ Filipaị, o dere banyere Timoti, sị: “Enweghị m onye ọzọ nke nwere ụdị obi o nwere, bụ́ onye ihe banyere unu ga-emetụ n’obi n’ezie.” Pọl dekwara, sị: “Ndị ọzọ niile na-achọ ọdịmma nke onwe ha, ọ bụghị nke Kraịst Jizọs.” (Fil. 2:20, 21) N’ihi okwu a dị mkpa Pọl kwuru, olee otú anyị ga-esi eme ka ‘ọdịmma onwe anyị’ ghara ịna-echu anyị ụra taa?

Ọ bụrụ na anyị na-arịọ ụmụnna nọ n’ọgbakọ anyị ka ha wepụta oge ha nyere anyị aka ná nsogbu anyị, anyị ekwesịghị ịbụ ndị a na-anaghị emeta emeta. N’ihi gịnị? Chegodị echiche: O doro anya na obi ga-atọ anyị ezigbo ụtọ mgbe nwanna nyere anyị onyinye ga-enyere anyị aka n’ihe mberede dakwasịrị anyị. Ma ànyị kwesịrị ịgwa ya na ọ ga-enyerịrị anyị onyinye ahụ? Mbanụ. N’otu aka ahụ, ọ bụ eziokwu na obi na-atọ ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya ụtọ inyere anyị aka mgbe niile, anyị ekwesịghị iche na ha ga-ewepụtarịrị oge ha iji nyere anyị aka. A sị ka e kwuwe, anyị ga-achọ ka ihe ọ bụla ụmụnna anyị ga-eji nyere anyị aka n’oge ihe isi ike bụrụ ihe si ha n’ala ala obi.

O doro anya na ụmụnna gị ga-achọ inyere gị aka mgbe niile. Ma, mgbe ụfọdụ, ha agaghị enyecha gị ihe niile ị chọrọ. Ọ bụrụ na ihe dị otú ahụ emee, obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ná nsogbu ọ bụla i nwere otú ahụ o nyeere ọbụ abụ ahụ.—Ọma 116:1, 2; Fil. 4:10-13.

N’ihi ya, jiri obi ụtọ nabata ihe ọ bụla Jehova nyere gị, nke ka nke, mgbe i nwere nsogbu. (Ọma 55:22) Ọ chọrọ ka i mee otú ahụ. Ma, ọ chọkwara ka ịna-eji “obi ụtọ enye ihe.” N’ihi ya, ‘kpebisie ike n’obi gị’ ime ihe ọ bụla i nwere ike ime iji kwado ezi ofufe. (2 Kọr. 9:6, 7) I mee otú ahụ, ọ ga-eme ka i jiri obi ụtọ nabata aka e nyeere gị, gị esikwa n’ala ala obi gị na-enye ihe.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 31]

“Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite?”—Ọma 116:12

▪ Wepụta oge ị ga-eji “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ”

▪ Na-agba ndị ọzọ ume ma na-ewusi ha ike n’okwukwe

▪ Na-arụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ otú ike gị hà