Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okpukpe Niile Hà Dị Mma?

Okpukpe Niile Hà Dị Mma?

Okpukpe Niile Hà Dị Mma?

ANYỊ bi n’ụwa okpukpe dị iche iche juru. Otu nchọpụta e mere n’ụwa niile na nso nso a gosiri na e nwere okpukpe iri na itoolu a ma ama, nweekwa ihe dị ka iri puku ụmụ obere okpukpe ndị ọzọ. Nke a emeela ka ndị mmadụ nwee ọtụtụ okpukpe ha nwere ike isi na ha họrọ nke ha ga-ekpe karịa mgbe ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, ò nwere nke ị họọrọ na-adịghị mma?

Ụfọdụ ndị na-ekwu na okpukpe dị iche iche dị ka ọtụtụ ụzọ e si arị otu ugwu. Obi ha bụ na ebe ọ bụ na ụzọ niile ahụ na-eduga n’otu ebe, ọ dịghị nke mmadụ si dị njọ. Ha na-eche na ebe ọ bụ na e nwere naanị otu Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ pụtara na okpukpe niile ga na-amasị ya.

Ụzọ Niile Hà Na-eduga n’Ebe Chineke Nọ?

Olee ihe Jizọs Kraịst, bụ́ otu n’ime ndị nkụzi okpukpe a kacha akwanyere ùgwù n’ụwa, kwuru n’okwu a? Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa.” N’ihi gịnị? “N’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”—Matiu 7:13, 14, Bible Nsọ nke Union Version. *

Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ n’ezie na e nwere okpukpe ndị na-eduba “n’ịla n’iyi”? Ka ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ na ọ bụ naanị ndị na-ekweghị ekwe nọ n’ụzọ ahụ dị obosara, ndị kweere na Chineke anọrọ n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ, n’agbanyeghị okpukpe ha na-ekpe?

Ozugbo Jizọs kwuchara na e nwere ụzọ abụọ, o kwuru, sị: “Kpachapụnụ anya! N’ihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu n’ụdị atụrụ, ma ha bụ agụ.” (Matiu 7:15, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) O mechara kwuo, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-akpọ m ‘Dinwenụ, Dinwenụ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche nke Nna m bi n’igwe.” (Matiu 7:21, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Ọ bụrụ na a kpọrọ mmadụ onye amụma ma ọ bụ na onye ahụ na-akpọ Jizọs “Dinwenụ,” ọ pụtara na ọ bụ onye ji okpukpe kpọrọ ihe, ọ bụghị onye na-ekweghị ekwe. N’ihi ya, o doro anya na ihe Jizọs na-ekwu bụ na ọ bụghị okpukpe niile dị mma nakwa na ọ bụghị onye ọ bụla na-akụzi banyere Chineke ka e kwesịrị ikwere ihe ọ na-akụzi.

Mmadụ Ò Nwere Ike Ịmata Ụzọ ahụ Dị Warara?

Ebe ọ bụ na ọ bụghị ụzọ niile na-eduga n’ebe Chineke nọ, olee otú ị ga-esi amata nke bụ́ ụzọ ahụ dị warara na-eduba ná ndụ n’ime ọtụtụ puku ụzọ e nwere taa? Chebagodịrị ihe atụ a echiche: Ka e were ya na ị gara otu nnukwu obodo, fuo ụzọ. Gị achọọ ịjụta ụzọ. Onye mbụ ị jụrụ nke chere na ya maara ụzọ gwara gị si aka nri. Onye nke abụọ agwa gị si aka ekpe. Onye nke atọ agwa gị si ụzọ ọ bụla masịrị gị. N’ikpeazụ, onye bịara abịa otú ị bịara ewepụta otu ezigbo map, gosi gị ụzọ i kwesịrị isi. Ya enyezie gị map ahụ ka i nwee ike na-elere anya na-aga. Obi ọ́ gaghị esi gị ike na ị ga-eru ebe ị na-aga?

Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ma a bịa n’ịhọrọ ezi okpukpe. Anyị kwesịrị iji ezigbo map ihe atụ. È nwere ụdị map ahụ? Ee, e nwere. Map ahụ bụ Baịbụl, bụ́ akwụkwọ kwuru, sị: “Ihe nile ọ bụla e dere n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’uche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma.”—2 Timoti 3:16, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

N’asụsụ Igbo, e nwere nsụgharị Baịbụl dị iche iche i nwere ike iji mere map ihe atụ. Ndị bipụtara magazin a, bụ́ Ndịàmà Jehova, na-ebipụta ezigbo nsụgharị Baịbụl a na-akpọ Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ. Ma, ọ bụrụ na ị bụghị Onyeàmà Jehova, i nwere ike iji nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ mgbe ị na-achọ ịmata ezi okpukpe na okpukpe na-adịghị mma. N’ihi ya, e si ná nsụgharị Baịbụl dị iche iche okpukpe ndị ọzọ na-akwanyere ùgwù depụta amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu ndị a.

Ka ị na-agụ isiokwu ndị na-eso nke a, jiri ihe ndị ị mabụ tụnyere ihe Baịbụl kwuru. Buru n’obi ihe Jizọs kwuru banyere otú anyị ga-esi amata ezi okpukpe na okpukpe na-adịghị mma. O kwuru, sị: “Otú a ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ. Ezi osisi apụghị ịmị ajọ mkpụrụ, osisi na-abaghị n’ihe apụghịkwa ịmị mkpụrụ ọma.” (Matiu 7:17, 18, Bible Nsọ nke Union Version) Ka anyị tụlee naanị ụzọ mkpụrụ ọma atọ n’ime mkpụrụ ọma ndị Baịbụl kwuru a ga-eji amata “ezi osisi.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A sụpere okwu niile si ná nsụgharị Baịbụl a otú e si asụpe okwu n’oge a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 3]

Baịbụl dị ka ezi map nwere ike inyere mmadụ aka ịchọta ezi okpukpe