Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Okpukpe Na-akụziri Ndị Òtù Ya Ịkwanyere Okwu Chineke Ùgwù

Ezi Okpukpe Na-akụziri Ndị Òtù Ya Ịkwanyere Okwu Chineke Ùgwù

Ezi Okpukpe Na-akụziri Ndị Òtù Ya Ịkwanyere Okwu Chineke Ùgwù

JIZỌS kụziiri ndị mmadụ ka ha na-akwanyere Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ùgwù. Otú o si zaghachi Ekwensu mgbe ọ nwara ya ọnwụnwa gosiri na nke a bụ eziokwu. (Matiu 4:4-11) Dị ka ihe atụ, olee ihe Jizọs zara mgbe Setan gwara ya ka o mee ka nkume ghọọ ógbè achịcha ma ọ bụrụ na ọ bụ Ọkpara Chineke? Jizọs jụrụ ime ihe ahụ ọ gwara ya, kwuo ihe Mozis si n’ike mmụọ nsọ dee, bụ́ nke i nwere ike ịgụ na Diuterọnọmi 8:3. Oleekwa ihe Jizọs kwuru mgbe Ekwensu gwara ya na ya ga-enye ya alaeze niile nke ụwa ka ọ chịwa ma ọ bụrụ na ọ kpọọrọ ya isiala? Ọ jụrụ ma kwughachi ihe dị na Diuterọnọmi 6:13.

Chegodị echiche! N’agbanyeghị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, o ji Baịbụl kụzie ihe niile ọ kụziri. Ọ dịtụghịkwa mgbe o ji omenala ụmụ mmadụ kpọrọ ihe karịa Okwu Chineke. (Jọn 7:16-18) Ma, ọtụtụ ndị ndú okpukpe e nwere n’oge Jizọs akwanyeghịrị Okwu Chineke ùgwù otú ahụ. N’ihi gịnị? Ha ji omenala ụmụ mmadụ kpọrọ ihe karịa Akwụkwọ Nsọ. Jizọs gwara ndị okpukpe ahụ hoo haa, sị: “Unu na-emekwa okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu n’ihi ozizi e nyere unu n’aka idebe. Ndị ihu abụọ, Aịzaya buru amụma nke ọma banyere unu, sị, Ndị nke a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha; ma obi ha dị anya n’ebe M nọ. Ma ha na-ebiri m isiala n’efu, na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.”—Matiu 15:6-9, Bible Nsọ nke Union Version.

Ọtụtụ okpukpe ndị dị n’ụwa, ma nke Ndị Kraịst ma nke ndị na-abụghị Ndị Kraịst, na-ekwu na ha na-akwanyere Baịbụl ùgwù. N’agbanyeghị nke ahụ, okpukpe ole ka ị maara na-ajụ omenala ụmụ mmadụ mgbe omenala ndị ahụ megidere ihe doro anya Okwu Chineke na-akụzi? Ka anyị tụlee naanị ihe atụ abụọ.

ISIOKWU: Utu aha okpukpe.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Jizọs katọrọ ndị ndú okpukpe e nwere n’oge ya n’ihi otú ha si nwee mmasị n’utu aha na otú ha si achọ ịbụ ndị a ma ama. O kwuru na ọ na-amasị ha “ịnọ n’oche dị elu n’oriri, ịnọ n’ihu oche n’ụlọ nzukọ, ị nara ekele n’ọma ahịa nakwa ka ndị mmadụ na-akpọ ha ndị nkuzi.” Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ụnụ ekwela ka a na-akpọ ụnụ ndị nkuzi, n’ihina ụnụ nwere naanị otu onye nkuzi. Ụnụ niile bụkwa ụmụnne. Ụnụ akpọla onye ọbụla nna ụnụ n’elu ụwa a, n’ihina ụnụ nwere otu nna nke bi n’eluigwe.”—Matiu 23:1-10, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

AJỤJỤ: Ọ̀ na-amasị ndị ndú nke okpukpe a ka a na-etu ha aha iji kwanyere ha ùgwù, hà na-achọkwa ịbụ ndị a ma ama n’obodo, ka hà na-erubere iwu Jizọs isi ma zere ime otú ahụ?

ISIOKWU: Iji ihe oyiyi efe ofufe.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: “Apịrịla onwe gị arụsị ọ bụla, ma ọ bụ ihe nwere oyiyi nke a ga-achọta ụdị ya n’eluigwe, na n’okpuru eluigwe, ma ọ bụ nke a ga-achọta na mmiri n’okpuru ụwa. Akpọla isi ala nye ha ma ọ bụ fee ha ofufe.”—Ọpụpụ 20:4, 5, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Jọn onyeozi degaara Ndị Kraịst akwụkwọ ozi, sị: “Cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị.”—1 Jọn 5:21, Bible Nsọ nke Union Version.

AJỤJỤ: Okpukpe a ọ̀ na-erubere iwu doro anya Baịbụl nyere isi, nke bụ́ ka anyị zere iji ihe oyiyi na arụsị efe Chineke?

Ị Ga-achọtali Ezi Ụzọ Ahụ

N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ okpukpe taa, bụ́ nke mere ka ndị mmadụ ghara ịma nke ha ga-eso eso, ị ga-achọtali nke ahụ ga-eduba ná ndụ. E nwere ọtụtụ ihe e ji amata “okpukpe Chineke, nke dị ọcha, nke na-emerụghị emerụ n’anya Chineke.” (Jems 1:27, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’isiokwu ndị a nwere ike inyere gị aka ịmata okpukpe ahụ.

Ọ́ gaghị adị mma ka ị jụọ Ndịàmà Jehova ajụjụ ndị a jụrụ n’isiokwu a ma hụ otú ha ga-esi zaa ha? Ka ị na-atụle ihe ndị ha kwuru, soro ezi ihe nlereanya nke ndị biri n’obodo Beria na narị afọ mbụ. Mgbe ha nụchara ozi ọma Pọl onyeozi ziri ha, “ha jiri ọṅụ nyochaa akwụkwọ nsọ ịchọpụta ma ozizi Pọl na Saịlas na-ezi ọ̀ bụ eziokwu.” (Ọrụ 17:11, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ọ bụrụ na ị na-akwanyere Okwu Chineke ùgwù ma na-amụsi ya ike otú ahụ ndị Beria mere, ị ga-achọta ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ. Ọ bụzi gị ga-ekpebi ma ị̀ ga-eso ụzọ ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 9]

Olee okpukpe na-agba ndị mmadụ ume ịmụ Akwụkwọ Nsọ iji mara ma ihe ha na-amụ ọ̀ bụ eziokwu?