Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa Bụ Olileanya Chineke Mere Ka Anyị Nwee

Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa Bụ Olileanya Chineke Mere Ka Anyị Nwee

Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa Bụ Olileanya Chineke Mere Ka Anyị Nwee

“E doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu . . . ka o nwee olileanya.”—ROM 8:20.

1, 2. (a) Olee ihe mere inwe olileanya na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa a ji dị anyị mkpa? (b) Gịnị mere na obi esichaghị ọtụtụ mmadụ ike na a ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa?

IKEKWE i chetara ụdị ọṅụ i nwere mgbe mbụ ị nụrụ na n’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ agakwaghị na-aka nká ma ọ bụ na-anwụ anwụ, kama, na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Jọn 17:3; Mkpu. 21:3, 4) Ọ ga-abụ na ọ na-amasị gị ịkọrọ ndị ọzọ banyere olileanya a dị n’Akwụkwọ Nsọ. A si kwuwe, olileanya ndụ ebighị ebi bụ otu n’ime ihe ndị dị mkpa anyị na-ezi ndị mmadụ n’ozi ọma. Ọ na-agbanwe otú anyị si ele ndụ anya.

2 Ọtụtụ okpukpe ndị Krisendọm anaghị akụziri ndị mmadụ na a ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa a. N’agbanyeghị na Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, ọtụtụ chọọchị na-akụziri ndị mmadụ na ha nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ, bụ́ nke na-apụ gaa eluigwe ma ọ bụ ebe ọzọ ma mmadụ nwụọ. (Ezik. 18:20) Ọ bụ ya mere na obi anaghị esicha ọtụtụ ndị ike na a ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ya mere, anyị nwere ike ịjụ, sị: Baịbụl ò kwuru n’ezie na ndị mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa? Ọ bụrụ otú ahụ, olee mgbe mbụ Chineke mere ka ụmụ mmadụ mara nke a?

“E Doro Ihe E Kere Eke Ịbụ Ihe Efu . . . Ka O Nwee Olileanya”

3. Olee otú e si mara ihe Chineke zubeere ụmụ mmadụ malite n’oge o kere ha?

3 Jehova mere ka a mara ihe bụ́ nzube ya banyere mmadụ malite n’oge o kere ya. O mere ka o doo anya na Adam ga-adị ndụ ebighị ebi ma o rubere ya isi. (Jen. 2:9, 17; 3:22) O doro anya na ụmụ Adam na ụmụ ụmụ ha matara na mmadụ ezukwaghị okè, bụ́ nke ihe ha na-ahụ anya gosiri na ọ bụ eziokwu. E mechiri ụzọ e si abanye n’ogige Iden, ha malitekwara na-aka nká na-anwụkwa anwụ. (Jen. 3:23, 24) Ka oge na-aga, afọ ole ndị mmadụ na-anọ ndụ malitere na-agbada. Adam dịrị ndụ narị afọ itoolu na iri atọ. Otu n’ime ndị na-anwụghị n’Iju Mmiri ahụ, bụ́ Shem, dịrị ndụ naanị narị afọ isii, ebe Apakshad nwa ya dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ na asatọ. Nna Ebreham, bụ́ Tira, dịrị ndụ narị afọ abụọ na ise. Ebreham dịrị ndụ otu narị afọ na iri asaa na ise, ebe nwa ya Aịzik dịrị otu narị afọ na iri asatọ. Jekọb dịrị ndụ otu narị afọ na iri anọ na asaa. (Jen. 5:5; 11:10-13, 32; 25:7; 35:28; 47:28) Ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị n’oge ahụ ghọtara ihe mgbada a afọ ndụ ndị mmadụ na-agbada pụtara. Ọ pụtara na ndị mmadụ enwekwaghị olileanya ịdị ndụ ebighị ebi! Ò nwere ihe mere ha ga-eji nwee olileanya na ndị mmadụ nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi ọzọ?

4. Olee ihe mere ndị fere Chineke n’oge ochie ji nwee okwukwe na Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ nweta ngọzi ndị ahụ Adam mere ka ha kwụsị ịdị?

4 Baịbụl sịrị: ‘E doro mmadụ ịbụ ihe efu ka o nwee olileanya.’ (Rom 8:20) Olee olileanya a na-ekwu okwu ya? Amụma mbụ e buru na Baịbụl kwuru okwu banyere “mkpụrụ” nke ‘ga-egwepịa isi agwọ ahụ.’ (Gụọ Jenesis 3:1-5, 15.) Nkwa ahụ Chineke kwere banyere Mkpụrụ ahụ na-emesi ndị nwere okwukwe obi ike na Chineke ga-emezuru ndị mmadụ ihe o zubeere ha. O mere ka ndị dị ka Ebel na Noa nwee olileanya na Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ nweta ngọzi ndị ahụ Adam mere ka ha kwụsị ịdị. Ọ ga-abụ na ndị ikom ndị a ma na ‘ahụ́ a ga-emerụ mkpụrụ ahụ n’ikiri ụkwụ’ ga-agụnye ịwụfu ọbara.—Jen. 4:4; 8:20; Hib. 11:4.

5. Gịnị na-egosi na Ebreham kwere na mbilite n’ọnwụ ga-adị?

5 Tụlee ihe banyere Ebreham. Mgbe e lere Ebreham ule, ọ ‘chọrọ ịchụ Aịzik n’àjà, bụ́ ọkpara ọ mụrụ naanị ya.’ (Hib. 11:17) Gịnị mere o ji chọọ ime nke a? (Gụọ Ndị Hibru 11:19.) Ọ bụ n’ihi na o kwere na mbilite n’ọnwụ ga-adị! E nwere ihe mere Ebreham ji kwere na mbilite n’ọnwụ ga-adị. Nke a bụ n’ihi na Jehova mere ka o nweghachi ike ịmụ nwa nke mere ka ya na nwunye ya, bụ́ Sera, mụọ nwa mgbe ha merela agadi. (Jen. 18:10-14; 21:1-3; Rom 4:19-21) Ebreham chetakwara ihe Jehova kwuru. Chineke gwara ya, sị: “Ihe a ga-akpọ mkpụrụ gị ga-esi n’Aịzik.” (Jen. 21:12) N’ihi ya, Ebreham nwere ezigbo ihe mere ọ ga-eji nwee olileanya na Chineke ga-akpọlite Aịzik n’ọnwụ.

6, 7. (a) Gịnị ka Jehova kwere Ebreham ná nkwa? (b) Olee otú nkwa ahụ Jehova kwere Ebreham si mee ka ụmụ mmadụ nwee olileanya?

6 Jehova kwere Ebreham nkwa banyere nwa ya, ma ọ bụ “mkpụrụ” ya, n’ihi okwukwe na-enweghị atụ Ebreham nwere. (Gụọ Jenesis 22:18.) E mechara mata na onye bụ́ isi ná “mkpụrụ” ahụ bụ Jizọs Kraịst. (Gal. 3:16) Jehova gwara Ebreham na “mkpụrụ” ya ga-amụba “dị ka kpakpando nke eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.” Nke a pụtara na Ebreham amaghị ole ha ga-adị. (Jen. 22:17) Ma, Jehova mechara mee ka a mara ole ha ga-adị. Jizọs Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị ya na ha ga-achị n’Alaeze ya, bụ “mkpụrụ” ahụ. (Gal. 3:29; Mkpu. 7:4; 14:1) Ọ bụ site n’Alaeze ahụ nke dị n’aka Mesaya ka “mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.”

7 Ebreham aghọtachaghị ihe nkwa ahụ Jehova kwere ya pụtara. N’agbanyeghị nke ahụ, Baịbụl sịrị na “ọ nọ na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala.” (Hib. 11:10) Obodo ahụ bụ Alaeze Chineke. Ebreham aghaghị ịdị ndụ ọzọ ka o wee nweta ngọzi n’Alaeze ahụ. A ga-akpọlite ya n’ọnwụ ka o wee dị ndụ ebighị ebi n’ụwa a. Ndị Amagedọn na-egbughị nakwa ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi.—Mkpu. 7:9, 14; 20:12-14.

“Mmụọ nke Dị n’Ime Afọ M Arụgidewo M”

8, 9. Gịnị mere na ihe e dere n’akwụkwọ Job abụghị naanị akụkọ banyere ọnwụnwa bịaara otu nwoke?

8 O nwere otu nwoke aha ya bụ Job, bụ́ onye nọ n’ụwa n’agbata oge nwa nwa Ebreham, bụ́ Josef, na Mozis onye amụma dịrị ndụ n’ụwa. Akwụkwọ Job, bụ́ nke ọ dị ka ọ bụ Mozis dere, kwuru ihe mere Jehova ji kwere ka Job taa ahụhụ, kwuokwa otú ihe si mechaa gaara ya. Ma, akwụkwọ Job ekwughị naanị otú ọnwụnwa si bịara otu nwoke; o kwukwara ihe ndị ọzọ metụtara ma ndị mmadụ ma ndị mmụọ ozi. Akwụkwọ ahụ mere ka a mara na Jehova ji ezi omume na-achị nakwa na esemokwu ahụ nke malitere n’Iden gbasara ma ndị ohu Chineke nọ n’ụwa hà ga-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụ na ha agaghị eme otú ahụ. O metụtakwara ihe ga-emecha bịara ha n’ọdịnihu. N’agbanyeghị na Job amaghị banyere esemokwu a, o kweghị ka ndị enyi ya atọ mee ka o chewe na ya anaghị eguzosi ike n’ezi ihe. (Job 27:5) Nke a kwesịrị ime ka okwukwe anyị sie ike ma nyere anyị aka ịghọta na anyị nwere ike iguzosi ike n’ezi ihe ma na-akwado ọchịchị Jehova.

9 Mgbe mmadụ atọ ndị sị na ha bịara ịkasi Job obi kwuchara ihe ha na-ekwu, “Elaịhu nwa Barakel onye si n’agbụrụ Bọz wee zaa” ha okwu. Gịnị mere o ji gwa ha okwu? Ọ sịrị: “Okwu juru m ọnụ; mmụọ nke dị n’ime afọ m arụgidewo m.” (Job 32:5, 6, 18) N’agbanyeghị na ihe ahụ Elaịhu ji ike mmụọ nsọ kwuo mezuru mgbe ọnwụnwa Job kwụsịrị, ọ na-emezukwa n’ahụ́ ndị ọzọ. Ọ na-eme ka ndị niile na-eguzosi ike n’ezi ihe nwee olileanya.

10. Gịnị na-egosi na mgbe ụfọdụ Jehova na-egosi otu onye ihe ga-eme, bụ́ nke ga-emetụta mmadụ niile?

10 Mgbe ụfọdụ, Jehova na-egosi otu onye ihe ga-eme, bụ́ nke ga-emetụta mmadụ niile. Amụma Daniel buru nke kọwara nrọ Eze Nebukadneza nke na-achị Babịlọn rọrọ banyere mgbutu e gbuturu otu nnukwu osisi na-egosi na nke a bụ eziokwu. (Dan. 4:10-27) Ọ bụ eziokwu na nrọ ahụ mezuru n’ahụ́ Nebukadneza, ma, ọ pụtara ihe karịrị nke ahụ. O gosiri na ọchịchị nke Chineke ji ndị si n’agbụrụ Eze Devid na-achị ụwa ga-amaliteghachi ma puku afọ abụọ na narị afọ ise na iri abụọ gafee, malite n’afọ 607 T.O.A. * Chineke malitere ịchị ụwa anyị a n’ụzọ pụrụ iche mgbe o mere Jizọs Kraịst Eze n’eluigwe n’afọ 1914. Chegodị nnọọ otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka olileanya ndị na-erubere Chineke isi nwere mezuo n’oge na-adịghị anya!

“Napụta Ya Ka Ọ Ghara Ịgbada n’Olulu!”

11. Gịnị ka ihe Elaịhu kwuru na-egosi banyere Chineke?

11 Mgbe Elaịhu na-aza Job okwu, o kwuru banyere “onye ozi, ọnụ na-ekwuchitere [Chineke], otu n’ime otu puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi ọ ga-eme.” Gịnị ga-eme ma onye ozi a rịọsie “Chineke arịrịọ ike ka o nwee mmasị n’ebe ọ nọ”? Elaịhu sịrị: “[Chineke] wee meere ya amara, sị, ‘Napụta ya ka ọ ghara ịgbada n’olulu! Enwetawo m ihe mgbapụta! Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata; ka ọ laghachi otú ọ dị n’oge o nwere ike okorobịa.’” (Job 33:23-26) Ihe a Elaịhu kwuru na-egosi na Chineke nwere mmasị ịnara “ihe mgbapụta” maka ụmụ mmadụ chegharịrị echegharị.—Job 33:24.

12. Olee olileanya ihe Elaịhu kwuru mere ka ụmụ mmadụ nwee?

12 O nwere ike ịbụ na Elaịhu aghọtachaghị ihe ihe mgbapụta ahụ pụtara, otú ahụ Daniel, onye dịrị ndụ mgbe ọtụtụ afọ gaferela Elaịhu dịrị ndụ, na-aghọtachaghị ihe ọtụtụ amụma o buru pụtara. (Dan. 12:8; 1 Pita 1:10-12) Ma, ihe Elaịhu kwuru gosiri na otu ụbọchị Chineke ga-anara ihe mgbapụta wee mee ka ụmụ mmadụ ghara ịna-aka nká, na-anwụkwa anwụ. Ihe Elaịhu kwuru mere ka anyị nwee olileanya magburu onwe ya na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. Akwụkwọ Job kwukwara na mbilite n’ọnwụ ga-adị.—Job 14:14, 15.

13. Olee uru ihe ahụ Elaịhu kwuru baara Ndị Kraịst?

13 Taa, ihe ahụ Elaịhu kwuru baara nde kwuru nde Ndị Kraịst uru, bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ mgbe a ga-ebibi ụwa ochie a. A banye n’ụwa ọhụrụ, ndị merela agadi ga-alaghachi otú ha dị n’oge ha nwere ike okorobịa. (Mkpu. 7:9, 10, 14-17) Ihe ọzọ bụ na olileanya nke ịhụ ka e mere ka ndị si n’ọnwụ bilie laghachiri n’okorobịa na agbọghọbịa na-atọ ndị niile nwere okwukwe ezigbo ụtọ. Anyị manụ na ihe ga-eme ka Ndị Kraịst e tere mmanụ gaa eluigwe wee bụrụ ndị na-agaghị anwụ anwụ bụ ma ọ bụrụ na ha enwee okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs chụrụ. “Atụrụ ọzọ” Jizọs ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi n’ụwa ma ha nwee okwukwe n’àjà ahụ.—Jọn 10:16; Rom 6:23.

Jehova Ga-eloda Ọnwụ n’Ụwa

14. Gịnị na-egosi na ihe karịrị Iwu Mozis dị ụmụ Izrel mkpa ka ha wee nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi?

14 Ụmụ Ebreham ghọrọ mba nweere onwe ya mgbe ha na Chineke gbara ndụ. Mgbe Jehova nyere ha Iwu ahụ, ọ sịrị: “Unu ga-edebe ụkpụrụ m na mkpebi ikpe m. Ọ bụrụ na mmadụ edebe ha, ha ga-eme ka ọ dị ndụ.” (Lev. 18:5) Ma, Iwu ahụ mara ụmụ Izrel ikpe n’ihi na ha enweghị ike idebe ya. Nke a mere ka ọ dị mkpa ka a napụta ha.—Gal. 3:13.

15. Olee ngọzi a ga-enwe n’ọdịnihu nke Devid ji ike mmụọ nsọ dee banyere ya?

15 Mgbe Mozis nwụrụ, Jehova nyere ndị ọzọ so dee Baịbụl mmụọ nsọ ya ka ha dee banyere olileanya ndụ ebighị ebi. (Ọma 21:4; 37:29) Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ bụ́ Devid ji okwu banyere ndụ ebighị ebi mechie abụ ọ bụrụ banyere otú ndị na-efe Jehova na Zayọn si dị n’otu. Ọ sịrị: “N’ebe ahụ ka Jehova nyere iwu ka ngọzi dịrị, bụ́ ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 133:3.

16. Gịnị ka Jehova si n’ọnu Aịzaya kwe nkwa na ya ga-eme “n’ụwa dum” n’ọdịnihu?

16 Jehova mere ka Aịzaya buo amụma banyere ndụ ebighị ebi a ga-adị n’ụwa. (Gụọ Aịzaya 25:7, 8.) Mmehie na ọnwụ yiri “ihe mkpuchi” nke kpuchiri ụmụ mmadụ, nke na-anaghị ekwe ha kuru ume. Jehova na-emesi ndị ya obi ike na ya ga-eloda ọnwụ, ma ọ bụ wepụ ya, “n’ụwa dum.”

17. Olee ihe e buru n’amụma na Mesaya ga-eme, nke ga-eme ka ndị mmadụ nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi?

17 Chegodị ihe Iwu Mozis kwuru banyere ewu Azezel. Otu ugbo n’afọ, n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, onyeisi nchụàjà ‘na-ebikwasị aka ya abụọ n’isi mkpi dị ndụ wee kwupụta njehie niile nke ụmụ Izrel, ọ na-emekwa ka ha dịrị n’isi mkpi ahụ. Mkpi ahụ na-eburu njehie niile ha banye n’ọzara.’ (Lev. 16:7-10, 21, 22) Aịzaya buru amụma na Mesaya ga-abịa, bụ́ onye ga-eme ihe yiri ihe ahụ mkpi ahụ na-eme site n’iburu “ọrịa,” “ihe mgbu” na “mmehie ọtụtụ ndị.” Nke a ga-eme ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Gụọ Aịzaya 53:4-6, 12.

18, 19. Olee olileanya e kwuru okwu ya n’Aịzaya 26:19 na Daniel 12:13?

18 Jehova si n’ọnụ Aịzaya gwa ndị ya, bụ́ Izrel, sị: “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ. Ozu m niile ga-ebili. Tetanụ tie mkpu ọṅụ, unu ndị bi n’ájá! N’ihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ahịhịa malo, ala ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.” (Aịza. 26:19) Akwụkwọ Nsọ Hibru gosiri nke ọma na anyị nwere olileanya na ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ n’ụwa. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka Daniel ruo otu narị afọ, Jehova mesiri ya obi ike, sị: “Ị ga-ezukwa ike, ma ị ga-ebili ka i nweta òkè gị mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.”—Dan. 12:13.

19 N’ihi olileanya Mata nwere na ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ, ọ gwara Jizọs banyere nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:24) Ihe Jizọs kụziiri ndị mmadụ na ihe ndị na-eso ụzọ ya ji ike mmụọ nsọ dee hà kagburu olileanya a? Jehova ọ̀ ka kwere ụmụ mmadụ nkwa na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa? Anyị ga-atụle azịza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Gụọ akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! isi nke isii.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Olee olileanya e ji maka ya ‘doo ụmụ mmadụ ịbụ ihe efu’?

• Gịnị na-egosi na Ebreham kwere na mbilite n’ọnwụ ga-adị?

• Olee olileanya ihe Elaịhu gwara Job na-eme ka ụmụ mmadụ nwee?

• Olee otú Akwụkwọ Nsọ Hibru si mee ka anyị nwee olileanya na mbilite n’ọnwụ ga-adị nakwa na ndị mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 5]

Ihe Elaịhu gwara Job na-eme ka anyị nwee olileanya na a ga-eme ka ụmụ mmadụ kwụsị ịka nká na ịnwụ anwụ

[Foto dị na peeji nke 6]

E mesiri Daniel obi ike na ọ ‘ga-ebili ka o nweta òkè ya mgbe ụbọchị ndị a gwụchara’