Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kraịst Ọ̀ Kụziri na Ndị Mmadụ Ga-adị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa?

Kraịst Ọ̀ Kụziri na Ndị Mmadụ Ga-adị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa?

Kraịst Ọ̀ Kụziri na Ndị Mmadụ Ga-adị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa?

“[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ.”—MKPU. 21:4.

1, 2. Olee otú anyị si mara na ọtụtụ ndị Juu nọ ndụ na narị afọ nke mbụ nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa?

OTU nwa okorobịa, bụ́ onye ọchịchị a ma ama nke bara ọgaranya, bịakwutere Jizọs wee gbuo ikpere n’ala n’ihu ya jụọ ya, sị: “Ezi Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?” (Mak 10:17) Nwa okorobịa ahụ jụrụ Jizọs ajụjụ banyere iketa ndụ ebighị ebi. Ma, ebee ka o bu n’obi iketa ndụ ebighị ebi? Dị ka anyị mụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, ọtụtụ narị afọ tupu nwoke ahụ abịakwute Jizọs, Chineke mere ka ndị Juu nwee olileanya na mbilite n’ọnwụ ga-adị nakwa na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ọtụtụ ndị Juu nọ ndụ na narị afọ mbụ nwekwara olileanya a.

2 O doro anya na enyi Jizọs, bụ́ Mata, bu n’uche na ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ nọrọ n’ụwa mgbe ọ gwara Jizọs banyere nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:24) Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị Sadusii oge ahụ ekweghị na mbilite n’ọnwụ ga-adị. (Mak 12:18) Ma, George Foot Moore kwuru n’akwụkwọ ya e dere banyere okpukpe ndị Juu e nwere n’oge Kraịst, sị: “Ihe ndị e dere . . . na narị afọ nke abụọ ma ọ bụ na narị afọ nke mbụ tupu oge Ndị Kraịst gosiri na ndị mmadụ kwere na e nwere mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ n’oge ochie n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa.” Ọgaranya ahụ nke bịakwutere Jizọs chọrọ inweta ndụ ebighị ebi n’ụwa a.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Taa, ọtụtụ okpukpe na ndị ọkà mmụta Baịbụl ekweghị na Kraịst kụziri na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ọtụtụ ndị nwere olileanya na e nwere ebe ha ga-anọ na-adị ndụ mgbe ha nwụrụ. Ọ bụ ya mere na mgbe ọtụtụ ndị gụtara “ndụ ebighị ebi” n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, o nweghị ihe ọzọ ha na-eche na ọ pụtara ma ọ́ bụghị ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe. Ọ̀ bụ eziokwu? Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru okwu banyere ndụ ebighị ebi? Gịnị ka ndị na-eso ụzọ ya kwere na ọ bụ? Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ọ̀ na-akụzi na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa a?

Ndị Mmadụ Ga-adị Ndụ Ebighị Ebi “Mgbe A Ga-eme Ka Ihe Dị Ọhụrụ”

4. Gịnị ga-eme “mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ”?

4 Baịbụl na-akụziri anyị na Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-ebilite n’ọnwụ nọrọ n’eluigwe na-achị ụwa. (Luk 12:32; Mkpu. 5:9, 10; 14:1-3) Ma, ọ bụghị naanị ha ka ihe ọ bụla Jizọs kwuru banyere ndụ ebighị ebi metụtara. Chegodị ihe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya mgbe nwa okorobịa ahụ, bụ́ onye ọchịchị nke bara ọgaranya, ji iwe lawa mgbe o gwara ya ka ọ hapụ ihe onwunwe ya niile bịa bụrụ onye na-eso ụzọ ya. (Gụọ Matiu 19:28, 29.) Jizọs gwara ndịozi ya na ha ga-eso ná ndị ga-abụ ndị eze ga-ekpe “ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe,” ya bụ, mmadụ niile, ma e wezụga ndị ga-anọ n’eluigwe na-achị. (1 Kọr. 6:2) O kwukwara ụgwọ a ga-akwụ “onye ọ bụla” ga-abụ onye na-eso ụzọ ya. Onye ahụ ‘ga-eketa ndụ ebighị ebi.’ Ihe a niile ga-eme “mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ.”

5. Olee otú i ga-esi kọwaa okwu ahụ bụ́ “mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ”?

5 Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru banyere “mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ”? Nsụgharị Nhazi Katọlik kpọrọ ya ‘ụwa ọhụrụ.’ Ebe ọ bụ na Jizọs akọwaghị ihe ahụ o kwuru, o doro anya na ọ bụ ihe ndị Juu nọ na-ele anya ya kemgbe ọtụtụ narị afọ. A ga-eme ka ihe dị ọhụrụ n’ụwa, ka ihe wee dịghachi otú ha dị n’ogige Iden tupu Adam na Iv emee mmehie. Nke a ga-emezu nkwa ahụ Chineke kwere na ya “na-eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.”—Aịza. 65:17.

6. Gịnị ka ihe atụ ahụ Jizọs ji ewu na atụrụ mee na-akụziri anyị banyere olileanya ndụ ebighị ebi?

6 Jizọs kwukwara banyere ndụ ebighị ebi mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ọgwụgwụ usoro ihe a. (Mat. 24:1-3) Ọ sịrị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze ya dị ebube. A ga-emekwa ka mba niile zukọta n’ihu ya, ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ.” Ndị ọ ga-ama ikpe “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi, ma ndị ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi.” “Ndị ezi omume,” bụ́ ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi, bụ ndị na-erubere “ụmụnna” Kraịst, bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, isi ma na-akwado ha. (Mat. 25:31-34, 40, 41, 45, 46) Ebe ọ bụ na Chineke họọrọ ndị e tere mmanụ ka ha bụrụ ndị ọchịchị n’Alaeze eluigwe, “ndị ezi omume” a na-ekwu okwu ha ebe a aghaghị ịbụ ndị Alaeze ahụ ga na-achị n’ụwa. Baịbụl buru amụma, sị: “[Eze Jehova họpụtara] ga-enwe ndị ọ na-achị malite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri, malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo na nsọtụ ụwa.” (Ọma 72:8) Ndị a Alaeze a ga na-achị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa.

Gịnị Ka Oziọma Jọn Gosiri?

7, 8. Olee olileanya abụọ Jizọs gwara Nikọdimọs banyere ha?

7 Oziọma Matiu, Mak, na Luk, gosiri na Jizọs kwuru okwu banyere “ndụ ebighị ebi” n’oge o kwuru ihe ndị ahụ anyị kwuru na mbụ. Oziọma Jọn kwuru na Jizọs kwuru banyere ịdị ndụ ebighị ebi ihe dị ka ugboro iri na asaa. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ebe ndị ahụ ma hụ ihe Jizọs kwuru banyere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa.

8 Oziọma Jọn kwuru na onye mbụ Jizọs gwara banyere ndụ ebighị ebi bụ otu onye Farisii aha ya bụ Nikọdimọs. Ọ gwara Nikọdimọs, sị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịbanye n’alaeze Chineke.” A ghaghị ‘ịmụ ndị ga-abanye n’Alaeze eluigwe ọzọ.’ (Jọn 3:3-5) Ọ bụghị naanị ihe a ka Jizọs gwara ya. O kwukwara olileanya dịịrị ụwa dum. (Gụọ Jọn 3:16.) Ihe Jizọs na-ekwu okwu ya bụ olileanya ịdị ndụ ebighị ebi nke ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ nwere nakwa olileanya nke ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa nwere.

9. Olee olileanya Jizọs gwara nwaanyị Sameria banyere ya?

9 Mgbe Jizọs gwachara Nikọdimọs okwu na Jeruselem, o si ụzọ gara Galili gawa ebe ugwu Izrel. Ka ọ na-aga, ọ hụrụ otu nwaanyị n’akụkụ olulu mmiri Jekọb nke dị na Saịka, na Sameria. Ọ gwara ya, sị: “Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri nke m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị, kama mmiri nke m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke mmiri na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi.” (Jọn 4:5, 6, 14) Mmiri a na-anọchite anya ndokwa Chineke mere ka ndị mmadụ niile, tinyere ndị ga-ebi n’ụwa, maliteghachi ịdị ndụ ebighị ebi. Chineke kwuru n’akwụkwọ Mkpughe sị: “M ga-enye onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si n’isi iyi nke mmiri nke ndụ n’efu.” (Mkpu. 21:5, 6; 22:17) Otú a ka Jizọs si gwa nwaanyị Sameria banyere ndụ ebighị ebi nke ndị e tere mmanụ ga-eso ya chịa n’Alaeze Chineke ga-eketa, nakwa nke ndị kwere na Chineke, bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa a, ga-eketa.

10. Mgbe Jizọs gwọchara otu nwoke n’ọdọ mmiri Betzeta, gịnị ka ọ gwara ndị okpukpe na-akpagbu ya banyere ndụ ebighị ebi?

10 Ka otu afọ gafere, Jizọs gara Jeruselem ọzọ. Ọ nọ n’ọdọ mmiri Betzeta dị n’ebe ahụ gwọọ otu nwoke ahụ́ na-adịghị. Jizọs gwara ndị Juu katọrọ ihe o mere na “Ọkpara ahụ apụghị ime otu mkpụrụ ihe n’uche nke aka ya, kama ọ bụ naanị ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme.” Mgbe Jizọs gwachara ha na Nna ya ‘enyefewo ikpe ikpe niile n’aka Ọkpara ya,’ ọ gwara ha, sị: “Onye na-anụ okwu m ma kwere n’onye ahụ nke zitere m nwere ndụ ebighị ebi.” Jizọs kwukwara, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta, ndị mere ezi ihe ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:1-9, 19, 22, 24-29) Jizọs nọ na-agwa ndị Juu na-akpagbu ya na ọ bụ ya ka Chineke họpụtara ime ka ndị Juu nweta ndụ ebighị ebi ha na-atụ anya na ha ga-enweta n’ụwa nakwa na ya ga-eme nke a site n’ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

11. Olee otú anyị si mara na ihe Jizọs kwuru nke dị na Jọn 6:48-51 gụnyere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa?

11 Na Galili, ọtụtụ puku ndị mmadụ, bụ́ ndị chọrọ ka Jizọs jiri ọrụ ebube nye ha achịcha ka ha rie, malitere iso ya. Jizọs gwara ha banyere ụdị achịcha ọzọ, ya bụ, “achịcha na-enye ndụ.” (Gụọ Jọn 6:40, 48-51.) Ọ sịrị: “achịcha ahụ m ga-enye bụ anụ ahụ́ m.” Jizọs nyere ndụ ya n’ihi ndị ga-eso ya chịa n’Alaeze eluigwe, nyekwa ya “n’ihi ndụ nke ụwa,” ya bụ, ụmụ mmadụ ndị e nwere ike ịgbapụta. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a,” ya bụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla enwee okwukwe na àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ga-agbapụtali ya, onye ahụ ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Anyị nụ ‘ịdị ndụ ebighị ebi,’ ọ gụnyere olileanya ahụ ndị Juu nwere kemgbe ụwa na ndị mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’oge ọchịchị Mesaya.

12. Olee olileanya Jizọs kwuru okwu ya mgbe ọ gwara ndị na-emegide ya na ‘ya ga-enye atụrụ ya ndụ ebighị ebi’?

12 Ka oge na-aga, n’oge Ememme Nraranye e mere na Jeruselem, Jizọs gwara ndị na-akpagbu ya, sị: “Unu ekweghị, n’ihi na unu esoghị n’atụrụ m. Atụrụ m na-ege ntị n’olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m. M na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi.” (Jọn 10:26-28) Ọ̀ bụ naanị ịdị ndụ n’eluigwe ka Jizọs na-ekwu okwu ya, ka ọ̀ na-ekwukwu banyere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke ga-aghọ paradaịs? N’oge ahụ, ọ dịbeghị anya Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu nkasi obi. Ọ sịrị: “Unu atụla egwu, ìgwè atụrụ nta, n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.” (Luk 12:32) Ma, Jizọs kwuru n’oge Ememme Nraranye, sị: “Enwekwara m atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a; m ga-akpọtakwa ha.” (Jọn 10:16) Ya mere, ihe Jizọs gwara ndị ahụ na-emegide ya gụnyere ma olileanya ịga n’eluigwe nke “ìgwè atụrụ nta” nwere ma olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa, bụ́ nke nde kwuru nde “atụrụ ọzọ” nwere.

Olileanya nke Doro Anya

13. Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs”?

13 Mgbe Jizọs nọ n’elu osisi ịta ahụhụ, o mere ka olileanya ụmụ mmadụ nwere doo onye ukwu na onye nta anya. Otu onye ajọ omume a kwụwara n’akụkụ ya gwara ya, sị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Jizọs wee kwe ya nkwa, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:42, 43) O doro anya na nwoke ahụ ma ihe Paradaịs pụtara n’ihi na ọ bụ onye Juu. Ọ ma na ndị mmadụ nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’ọdịnihu.

14. (a) Gịnị na-egosi na o siiri ndịozi Jizọs ike ịghọta ihe o kwuru mgbe ọ gwara ha banyere olileanya ịga eluigwe? (b) Olee mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtara ihe olileanya ịga eluigwe pụtara?

14 Ma, ihe ndị mmadụ na-aghọtaghị mgbe Jizọs kwuru okwu ya bụ olileanya ịga eluigwe. Mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya na-aga ịkwadebere ha ebe n’eluigwe, ha aghọtaghị ihe o bu n’obi. (Gụọ Jọn 14:2-5.) O mechara gwa ha, sị: “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu apụghị ịghọta ha ugbu a. Otú ọ dị, mgbe ihe inyeaka ahụ bịarutere, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ, ọ ga-eduzi unu wee nyere unu aka ịghọta eziokwu niile.” (Jọn 16:12, 13) Ọ bụ naanị mgbe Pentikọst afọ 33 O.A. gafere, bụ́ mgbe e ji mmụọ nsọ Chineke tee ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ ịbụ eze n’ọdịnihu, ka ha ghọtara na ọ bụ n’eluigwe ka ha ga-anọ na-achị. (1 Kọr. 15:49; Kọl. 1:5; 1 Pita 1:3, 4) Olileanya ịga eluigwe bụụrụ ha ihe ọhụrụ, akwụkwọ ozi ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kwukwara ọtụtụ ihe banyere ya. Ma, akwụkwọ ozi ndị a hà na-akwado olileanya ndị mmadụ nwere na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa?

Gịnị Ka Akwụkwọ Ozi Ndị E Ji Ike Mmụọ Nsọ Dee Kwuru?

15, 16. Olee otú akwụkwọ ozi Pọl ji ike mmụọ nsọ degara ndị Hibru, nakwa ihe Pita kwuru si mee ka a mara banyere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa a?

15 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, ọ kpọrọ ụmụnna ya “ndị dị nsọ, ndị so ná ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe.” Ma, o kwukwara na Chineke doro “elu ụwa mmadụ bi nke gaje ịbịa” n’okpuru Jizọs. (Hib. 2:3, 5; 3:1) N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu Grik e si sụgharịta “elu ụwa mmadụ bi,” pụtara ụwa ndị mmadụ bi. Ya mere, “elu ụwa mmadụ bi nke gaje ịbịa” bụ usoro ihe ga-adị n’ụwa n’ọdịnihu mgbe Jizọs Kraịst ga na-achị ụwa. Ọ bụ n’oge ahụ ka Jizọs ga-emezu nkwa Chineke kwere, mgbe ọ sịrị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 37:29.

16 Pita onyeozi jikwa ike mmụọ nsọ dee banyere olileanya ụmụ mmadụ nwere banyere ọdịnihu. O dere, sị: “Eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:7) Gịnị ka a ga-eji dochie eluigwe ahụ, ya bụ, ọchịchị ụmụ mmadụ, nakwa ndị ajọ omume nọ ugbu a? (Gụọ 2 Pita 3:13.) A ga-eji “eluigwe ọhụrụ,” ya bụ, Alaeze Chineke, nke dị n’aka Mesaya, nakwa “ụwa ọhụrụ,” ya bụ, ụmụ mmadụ ndị na-eme ezi omume, bụ́ ndị na-efe Jehova, dochie ha.

17. Olee ihe Mkpughe 21:1-4 kwuru banyere olileanya ụmụ mmadụ nwere?

17 Ọhụụ Jọn hụrụ nke dị n’akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl, bụ́ nke na-egosi otú a ga-esi mee ka ụmụ mmadụ zuo okè, na-eme anyị obi ụtọ. (Gụọ Mkpughe 21:1-4.) Nke a bụ olileanya ụmụ mmadụ ndị na-efe Chineke nwere kemgbe mmehie Adam mere ka ụmụ mmadụ ghọọ ndị na-ezukwaghị okè. Ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi n’akaghị nkà mgbe a ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs. Ma Akwụkwọ Nsọ Hibru ma Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kwuchara banyere olileanya a. Olileanya a anọgidewokwa na-eme ka okwukwe ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi sie ike ruo taa.—Mkpu. 22:1, 2.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru banyere “mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ”?

• Gịnị ka Jizọs gwara Nikọdimọs okwu ya?

• Olee nkwa Jizọs kwere onye ajọ omume ahụ a kpọgidere n’osisi ịta ahụhụ n’akụkụ ya?

• Olee otú akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru na ihe Pita kwuru si akwado na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndị yiri atụrụ ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ụwa

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Jizọs gwara ndị ọzọ okwu banyere ndụ ebighị ebi