Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Jehova Emeela Ka Ha Nweta Ihu Ọma Ya’

‘Jehova Emeela Ka Ha Nweta Ihu Ọma Ya’

‘Jehova Emeela Ka Ha Nweta Ihu Ọma Ya’

E NWERE ihe karịrị uru ahụ́ iri atọ n’ihu mmadụ ọ bụla. Uru ahụ́ iri na anọ na-emegharị ahụ́ tupu mmadụ amụmụọ naanị ọnụ ọchị! Chegodị otú mkparịta ụka gaara na-adị ma ọ bụrụ na anyị enweghị uru ahụ́ ndị a. Ọ̀ ga na-aga werewere? Mbanụ. Ọ bụghị naanị ime ka mkparịta ụka na-aga werewere ka uru ahụ́ ndị dị n’ihu na-emere ndị ogbi. Uru ahụ́ ndị a na mmegharị ahụ́ na-enyere ndị ogbi aka ime ka ndị ọzọ ghọta ihe ha bu n’obi. Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya otú e si eji asụsụ ndị ogbi eme ka ihe siri ike nghọta kwe nghọta.

N’oge na-adịbeghị anya, ndị ogbi nọ n’ụwa dum malitere ịhụ ihu ka ihu mmadụ ọ bụla eme ka a ghọta ihe nke ọma. E nwere ike ikwu na ha na-ahụ ‘ihu Jehova.’ (Ákwá 2:19) Nke a anaghị eme na mberede. Ọ dịlarị anya Jehova hụwara ndị ogbi n’anya nke ukwuu. Ọ hụrụ ndị ogbi nọ n’Izrel oge ochie n’anya. (Lev. 19:14) N’oge a, ọ hụkwara ndị ogbi n’anya. “Ọ bụ uche [Chineke] ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) E nwere ike ikwu na ọtụtụ ndị ogbi na-ahụ ihu Chineke mgbe ha maara eziokwu banyere ya nke ọma. Olee otú ha si mara nke a ebe ọ bụ na ha anaghị anụ ihe? Tupu anyị azaa ajụjụ a, ka anyị tụlee ihe mere asụsụ ndị ogbi ji dị ndị ogbi mkpa.

Anya Ndị Ogbi Na-arụrụ Ha Ọrụ Ntị Na-arụ

E nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-aghọtahie banyere ndị ogbi na asụsụ ha. Ka anyị mee ka ị ghọta nke bụ́ eziokwu banyere ụfọdụ n’ime ha. Ndị ogbi na-anyali ụgbọala. Ile mmadụ anya n’ọnụ ma ọ na-ekwu okwu anatụghị eme ka ọ dịrị onye ogbi mfe ịghọta ihe onye ahụ na-ekwu. Asụsụ Ndị Ogbi adịghị ka Mkpụrụ Akwụkwọ Ndị Ìsì. Asụsụ Ndị Ogbi abụghịkwa naanị mmegharị ahụ́. E nweghị otu asụsụ ndị ogbi nke a na-asụ naanị ya n’ụwa dum. Ihe ọzọ bụ na otú ndị ogbi nọ n’otu mba si asụ asụsụ na-adịtụ iche n’otú ndị nke nọ ná mpaghara ọzọ na mba ahụ si asụ.

Ndị ogbi hà nwere ike ịgụ ihe? N’agbanyeghị na ụfọdụ n’ime ha na-agụ ihe nke ọma, nke bụ́ eziokwu bụ na ịgụ ihe na-esiri ọtụtụ n’ime ha ike. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ ihe a na-ekwu ekwu ka a na-ede n’akwụkwọ. Chegodị banyere otú nwatakịrị na-abụghị onye ogbi si amụta asụsụ. Ndị na-asụ asụsụ ebe a mụrụ ya na-agba ya gburugburu malite n’ụbọchị a mụrụ ya. N’oge na-adịghị anya, ọ na-enwe ike ikwu okwu. Ihe na-enyere ya aka ime nke a n’enweghị nsogbu bụ ọnụnụ ọ na-anụ ka ndị ọzọ na-asụ asụsụ ahụ. Ya mere, ụmụntakịrị ndị na-abụghị ndị ogbi na-amalite ịgụ ihe mgbe ọ bụla ha mụtara na ihe e dere n’akwụkwọ bụkwanụ okwu ndị ahụ ha na-anụ, na-ekwukwa kemgbe.

Were ya na ị gara mba ọzọ, nọrọ n’otu ọnụ ụlọ e ji enyo rụọ, nke ị gaghị anụ ihe onye nọ n’èzí na-ekwu. Ị nụtụbeghị ebe mmadụ sụrụ asụsụ ndị ebe ahụ. Kwa ụbọchị, ndị ebe ahụ na-abịakwute gị nọrọ n’èzí na-agwa gị okwu. Ị naghị anụ ihe ha na-ekwu, naanị ihe ị na-ahụ bụ na ha na-emegharị ọnụ. Mgbe ha chọpụtara na ị naghị anụ ihe ha na-ekwu, ha edee ihe ahụ ha na-agwa gị ná mpempe akwụkwọ nọrọ n’èzí na-egosi gị ya. Ha echee na o nweghị ihe ga-eme ka ị ghara ịghọta ya. Olee otú i chere na gị na ihe ga-esi gaa? O nweghị ihe ị ma ị ga-ekwu ma ihe dịrị otú a. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e ji asụsụ ị na-anụtụbeghị dee ihe dị n’akwụkwọ ahụ. Ihe a yiri kpọmkwem ihe ọtụtụ ndị ogbi na-ahụ.

Asụsụ ndị ogbi ka ndị ogbi ji agwa ndị mmadụ okwu. Ha na-emegharị akụkụ ahụ́ ha dị iche iche iji mee ka mmadụ mara ihe ha na-ekwu. Ahụ́ ha na-emegharị na ihe ha ji ihu ha na-ekwu na-ekwekọ n’otú e si asụ asụsụ ndị ogbi. Otú a ka e si asụ asụsụ e ji anya ahụ, nke na-eme ka anya na-ahụ ihe ntị kwesịrị ịna-anụ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na aka, ahụ́, na ihu onye ogbi megharịrị mgbe ọ na-agwa mmadụ okwu nwechara ihe ha pụtara. Onye ogbi anaghị emegharị ihu ya ka o wee kpaa ndị mmadụ ọchị. Nke a bụ otu n’ime ụzọ dị mkpa e si asụ asụsụ ndị ogbi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye na-asụ asụsụ ndị ogbi egbulie iku anya ya elu, ọ na-egosi na ọ jụrụ mmadụ ajụjụ ga-eme ka onye ahụ chee echiche, ma ọ bụkwanụ na ọ chọrọ ka ọ zaa ya ee ma ọ bụ ee e. Ọ bụrụ na o gbutuo iku anya ya ala, nke ahụ nwere ike ịpụta na ọ jụrụ ònye, gịnị, ebee, olee mgbe, n’ihi gịnị, ma ọ bụ olee otú. Otú e si megharịa ọnụ mgbe ụfọdụ nwere ike igosi otú ihe hà ma ọ bụkwanụ otú ihe merenụ hà. Otú onye ogbi si megharịa isi ya, ubu ya, ntì ya, na anya ya mgbe ọ na-agwa mmadụ okwu nwechara ihe ha pụtara.

Ahụ́ a niile ọ na-emegharị na-enyere onye na-ahụ ya aka ịghọta ihe ọ na-agwa ya nke ọma. Ndị ogbi ndị ma asụsụ ha nke ọma na-eji ụzọ a dị iche mara mma agwa ndị mmadụ okwu, ha aghọtakwa ya nke ọma, ya sọkwa ihe ahụ ya bụrụ uri, ihe siri ike nghọta, okwu ịhụnanya, okwu na-atọ ọchị, ihe e nwere ike ịhụ anya ma ọ bụkwanụ nke a na-enweghị ike ịhụ anya.

Akwụkwọ Ndị E Dere n’Asụsụ Ndị Ogbi Na-enye Aka

Ọ bụrụ na e jiri asụsụ ndị ogbi gwa onye ogbi okwu Chineke, e nwere ike ịsị na ọ nụrụ okwu Chineke ma “nwee okwukwe” n’Onye nwe okwu ahụ. N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova na-agba mbọ dị ukwuu na-ezi ndị ogbi nọ n’ụwa dum ozi ọma. Ha na-emepụtakwa ihe ndị ọzọ na-enyere ndị ogbi aka. (Rom 10:14) Ka ọ dị ugbu a, e nwere ìgwè iri ise na asatọ n’ụwa dum, bụ́ ndị na-asụgharị asụsụ ndị ogbi. Akwụkwọ ndị e biri n’asụsụ ndị ogbi ndị dị na DVD dịkwa n’asụsụ iri anọ ugbu a. Ò nwere ihe ọma si n’ihe a niile pụta?

Jeremy, bụ́ onye nne ya na nna ya bụ ndị ogbi, sịrị: “M chetara mgbe papa m na-eji ọtụtụ awa agụ paragraf ole na ole n’Ụlọ Nche iji ghọta ihe ọ na-ekwu. Ya nọkata ya ejiri ọṅụ si n’ọnụ ụlọ ya mapụta jiri asụsụ ndị ogbi sị: ‘Aghọtala m ya! Aghọtala m ya!’ Ya agwazie m ihe ọ ghọtara. M dị naanị afọ iri na abụọ mgbe ahụ. M na-agụ paragraf ndị ahụ ngwa ngwa wee jiri asụsụ ndị ogbi gwa ya, sị: ‘Papa, echeghị m na ọ bụ ihe ọ pụtara. Ọ pụtara . . . ’ Ya asị m kwụsị. Ya alaghachi n’ọnụ ụlọ ya ka o jiri aka ya chọpụta ihe ọ pụtara. M gaghị echefu otú ihu ya na-adị iji gosi na nke ahụ wutere ya. Obi na-atọkwa m ụtọ ma ya laghachiwe n’ime ụlọ. Ma, ọ na-akara ya mfe ugbu a ịghọta ihe e dere n’akwụkwọ n’ihi na ọtụtụ akwụkwọ ndị e nwere n’asụsụ ndị ogbi dịzi na DVD. M na-enwe ọṅụ dị ukwuu mgbe ọ bụla m hụrụ na obi dị ya ụtọ ma ya na-ekwu banyere Jehova.”

Chegodị ihe otu di na nwunye, bụ́ Ndịàmà, chọpụtara banyere Jessenia, bụ́ nwa agbọghọ onye Chile dara ogbi ha ziri ozi ọma. Ha natara mama Jessenia ike ka ha gosi ya ihe dị n’Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible—Nke Dị na DVD n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Chile. Ha sịrị: “Mgbe Jessenia malitere ikiri akụkọ ahụ, o bidoro ịchị ọchị, chịkata bewe ákwá. Mgbe mama ya jụrụ ya ihe ọ na-ebere ákwá, ọ gwara ya na ọ bụ n’ihi na ihe ya na-ekiri masịrị ya. Nke a mere ka mama ya mara na ọ na-aghọta ihe niile ọ na-ekiri.”

Otu nwaanyị dara ogbi, onye bi n’otu ime ime obodo dị na Venezuela, mụrụ otu nwa ma dịrị ime nke abụọ. Ya na di ya kpebiri na ha agaghị amụ nwa nke abụọ ahụ n’ihi na ihe na-esiri ha ike. Nke a mere ka ha na-atụle ma hà ga-ete ime ahụ. Ndịàmà Jehova ndị bịara na nke ha gosiri ha ihe ọmụmụ nke iri na abụọ na vidio bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, nke e mepụtara n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Venezuela, n’agbanyeghị na ha amaghị ihe ha na-achọ ime. Ihe ọmụmụ ahụ kwuru banyere otú Chineke si ele ite ime na igbu ọchụ anya. Ka oge na-aga, nwaanyị ahụ kelere Ndịàmà maka ihe ọmụmụ nke iri na abụọ ahụ o kiriri. O kwuru na ha ekpebiela na ha agaghịzi ete ime ahụ. A zọpụtara ndụ nwatakịrị ahụ n’ihi ihe dị n’asụsụ ndị ogbi nke dị na DVD!

Lorraine, bụ́ Onyeàmà dara ogbi, sịrị: “Ịmụ Baịbụl yiri m ijikọta nnukwute ihe gbara iberibe iberibe ka ọ dị otú o kwesịrị ịdị. E nwere iberibe ndị m na-enweghị ike itinye ebe ha kwesịrị ịdị, ya bụ, e nwere ihe ndị na-anaghị ekwe m nghọta. Ma, mgbe a malitere bipụtahiwe eziokwu Baịbụl nne n’asụsụ ndị ogbi, m malitere ịghọta ihe ndị m na-anaghị aghọtabu.” George, bụ́ onye ogbi, nke bụ́ Onyeàmà kemgbe iri afọ atọ na asatọ, sịrị: “Obi abụọ adịghị ya na mmadụ iji aka ya ghọta ihe, na-eme ka onye ahụ nwee ùgwù na obi ike. Obi m na-agwa m na ọ bụ DVD ndị e nwere n’asụsụ ndị ogbi mere ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma.”

‘Ịmụ Ihe n’Asụsụ M’

E wezụga akwụkwọ ndị Ndịàmà Jehova na-ebipụta n’asụsụ ndị ogbi, ha nwere ọgbakọ ndị na-enwe ọmụmụ ihe ha niile n’asụsụ ndị ogbi. E nwere ihe karịrị otu puku na otu narị ọgbakọ n’ụwa dum ugbu a, bụ́ ndị na-amụ ihe n’asụsụ ndị ogbi. N’ọgbakọ ndị ahụ, a na-agwa ndị ogbi okwu n’asụsụ ha. A na-ejikwa asụsụ ndị ogbi akụziri ndị ogbi eziokwu dị na Baịbụl n’ụzọ kwekọrọ n’otú ha si eche echiche. A na-akụziri ha ihe ndị a n’ụzọ na-egosi na a na-akwanyere otú ha si ebi ndụ ùgwù nakwa na a naghị eleda ha anya n’ihi ihe merela ha ná ndụ.

Ò nwere uru e riterela maka na e nwere ọgbakọ ndị na-amụ ihe n’asụsụ ndị ogbi? Chegodị echiche banyere Cyril, bụ́ onye ghọrọ Onyeàmà Jehova e mere baptizim n’afọ 1955. Ọ na-amụ akwụkwọ anyị otú ike kwere ya, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya kemgbe ọtụtụ afọ. Mgbe ụfọdụ, ndị na-eji asụsụ ndị ogbi agwa ya ihe a na-ekwu na-abịa ọmụmụ ihe, mgbe ụfọdụ ha anaghị abịa. Mgbe ha na-abịaghị, Ndịàmà ndị ọzọ na-eji obiọma enye aka site n’idere ya ihe onye nọ n’ikpo okwu kwuru n’akwụkwọ. Ọ bụ n’afọ 1989, mgbe ọ bụrụla Onyeàmà ihe dị ka afọ iri atọ na anọ, ka e hiwere ọgbakọ mbụ na United States nke malitere ịmụ ihe n’asụsụ ndị ogbi na New York City. Olee otú obi dị Cyril mgbe e hiwere ọgbakọ ahụ? Ọ sịrị: “Mgbe anyị malitere ịmụ ihe n’asụsụ m, ọ dị m ka m si n’oké ọhịa gbara itiri pụta n’ebe ìhè dị.”

Ọgbakọ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị e ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na ha, bụ ebe ndị ogbi na-ezukọ mgbe niile ka ha wee mụọ okwu Chineke, feekwa ya ofufe. Ha bụ ebe ndị Chineke na-aga agbarịta ibe ha ume. N’ụwa a nke ndị ogbi na-anaghị ahụ ndị na-ekwunyere ha okwu, ha na ndị ọzọ anaghịkwa akpakọrịta, ma, ọgbakọ ndị a bụ ebe ọ na-abụ ha gaa, ha ahụ ndị ha na ha na-akparịta nnọọ ụka. N’ọgbakọ ndị a, ndị ogbi na-amụta ihe, nwee ọganihu, ruokwa eru ijere Jehova ozi. Ọtụtụ Ndịàmà dara ogbi na-eje ozi oge niile. Ụfọdụ na-akwaga mba ọzọ dị iche iche ịga nyere ndị ogbi ibe ha aka ka ha mara Jehova. Ndị ikom dara ogbi, bụ́ Ndị Kraịst, na-agba mbọ ka ha bụrụ ndị na-ezi ihe nke ọma, ndị ma ahazi ihe, na ndị ọzụzụ atụrụ. Ọtụtụ n’ime ha na-emecha ruo eru ịrụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ.

Na United States, e nwere ihe karịrị otu narị ọgbakọ e ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na ha, nweekwa ihe dị ka ìgwè iri asatọ ji ya amụ ihe. Na Brazil, e nwere ihe dị ka narị ọgbakọ atọ nakwa ihe karịrị narị ìgwè anọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe. E nwere ihe dị ka narị ọgbakọ atọ ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na Mexico. Na Russia, e nwere ihe karịrị iri ọgbakọ atọ na otu narị ìgwè na iri na atọ ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe. Ndị a bụ ihe atụ ole na ole na-egosi ọganihu anyị na-enwe n’ụwa dum.

Ndịàmà Jehova na-enwekwa ọtụtụ mgbakọ ukwu na mgbakọ nta n’asụsụ ndị ogbi. N’afọ gara aga, e nwere ihe karịrị otu narị mgbakọ na iri abụọ n’asụsụ ndị ogbi dị iche iche n’ụwa dum. Mgbakọ ndị a na-enyere Ndịàmà Jehova dara ogbi aka ịhụ na ha so n’ụmụnna nọ n’ụwa, bụ́ ndị na-eri nri ime mmụọ ahụ Chineke na-enye anyị n’oge ya.

Leonard bụ onye ogbi. Ọ bụ Onyeàmà Jehova kemgbe ihe karịrị iri afọ abụọ na ise. Ọ sịrị: “M ma kemgbe na Jehova bụ ezi Chineke. Ma, aghọtachaghị m ihe mere o ji hapụ anyị anyị ana-ata ahụhụ. Mgbe ụfọdụ, nke a na-eme ka m na-ewere ya iwe. Ma, ọ bụ mgbe e ji asụsụ ndị ogbi na-ekwu okwu n’otu mgbakọ distrikti ka m ghọtara ihe mere o ji hapụ anyị anyị ana-ata ahụhụ. Mgbe e kwuchara okwu ahụ, nwunye m dụtụrụ m aka wee jụọ m, sị, ‘O jukwara gị afọ?’ Esi m n’ala ala obi m sị ya ee! Obi dị m ụtọ na ahapụghị Jehova kemgbe ihe karịrị afọ iri abụọ na ise. M hụrụ ya n’anya n’agbanyeghị na aghọtachaghị m banyere ya. Taa, m ghọtala banyere ya nke ọma!”

Obi Dị Ha Ụtọ

Olee “ihe” ndị ogbi na-ahụ n’ihu Jehova mgbe ha matara eziokwu banyere ya? Ha na-ahụ ịhụnanya, ọmịiko, ikpe ziri ezi, iguzosi ike n’ihe, obiọma, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Ndị ogbi, bụ́ Ndịàmà Jehova, n’ụwa dum na-ahụ ihu Jehova, ha ga na-ahụkwa ya nke ọma karị. Ọ bụ ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị ogbi nọ mere o ji ‘mee ka ha nweta ihu ọma ya.’ (Ọnụ Ọgụ. 6:25) Ha na-ekelekwa Jehova nke ukwuu na ha amatala ya.

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

E nwere ihe karịrị otu puku na otu narị ọgbakọ e ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na ha n’ụwa dum

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Jehova emeela ka ndị ogbi nweta ihu ọma ya