Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwetụla Ihe Ùgwù Ije Ozi? Ì Nwere Ike Inwe Ya Ọzọ?

Ì Nwetụla Ihe Ùgwù Ije Ozi? Ì Nwere Ike Inwe Ya Ọzọ?

Ì Nwetụla Ihe Ùgwù Ije Ozi? Ì Nwere Ike Inwe Ya Ọzọ?

Ì NWETỤLA ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ? Eleghị anya e nwere mgbe ị bụ okenye, ohu na-eje ozi, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ dị mgbe i jere ozi oge niile. O doro anya na ọrụ ị rụrụ mgbe ahụ nyere gị ọṅụ dị ukwuu. Ma, ọ ga-abụ na e nwere ihe mere i ji kwụsị.

O nwere ike ịbụ na ị kwụsịrị ọrụ ị na-arụ n’ọgbakọ ka i wee nwee ike ilekọta ndị ezinụlọ gị, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ nká na ọrịa mere i ji kwụsị. Nkwụsị ị kwụsịrị ya apụtaghị na o nweghị ihe ị dị mma ya. (1 Tim. 5:8) Na narị afọ mbụ, o nwere mgbe Filip bụ onye ozi ala ọzọ, ma o mechara kwụsị, gaa biri na Sesaria ka o wee nwee ike ịna-elekọta ezinụlọ ya. (Ọrụ 21:8, 9) Mgbe Eze Devid mere agadi, o mere ndokwa ka nwa ya bụ́ Sọlọmọn nọchie ya. (1 Eze 1:1, 32-35) N’agbanyeghị nke a, Jehova hụrụ ma Filip ma Devid n’anya, a ka na-akwanyekwara ha ùgwù ruo taa.

Ma, o nwere ike ịbụ na a napụrụ gị ihe ùgwù i nweburu anapụ. Ọ̀ bụ n’ihi ihe na-adịghị mma i mere? Ka ọ̀ bụ nsogbu ezinụlọ mere e ji napụ gị ya? (1 Tim. 3:2, 4, 10, 12) O nwekwara ike ịbụ na i chere na e kwesịghị ịnapụ gị ya, nke a emeekwa ka obi ghara ịdị gị mma kemgbe ahụ.

I Nwere Ike Iru Eru Ije Ozi Ọzọ

Ọ bụrụ na a napụ mmadụ ihe ùgwù n’ọgbakọ, ọ̀ pụtara na ọ gaghị enweta ya ọzọ? Ọ bụchaghị otú ahụ. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ije ozi ọzọ, ọ ga-agba mbọ ka o ruo eruo. (1 Tim. 3:1) Ma, gịnị mere ị ga-eji chọọ ije ozi ọzọ? Ọ bụ n’ihi otu ihe ahụ mere i ji rara onwe gị nye Chineke, ya bụ, n’ihi na ị hụrụ ya n’anya, hụkwa ndị na-efe ya n’anya. Ọ bụrụ na ị ga-achọ igosi ịhụnanya dị otú a site n’ije ozi ọzọ, nke a ga-eme ka Jehova jiri gị rụọ ọrụ n’ihi ihe ndị ị maara tupu a napụ gị ihe ùgwù ahụ nakwa n’ihi ihe ị mụtarala kemgbe a napụrụ gị ya.

Cheta otú Jehova si mesie mba Izrel obi ike mgbe ọ napụrụ ha ihe ùgwù nke ijere ya ozi n’ihi àgwà ọjọọ ha. Baịbụl kwuru, sị: “Abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe. Unu onwe unu bụ ụmụ Jekọb; unu anwụchabeghị.” (Mal. 3:6) Jehova hụrụ ndị Izrel n’anya, chọọkwa ka ha ka na-arụrụ ya ọrụ. O nwekwara ọrụ ọ ka chọrọ ka ị rụọrọ ya n’ọdịnihu. Olee ihe i nwere ike ime ugbu a? Ihe na-eme ka mmadụ ruo eruo ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ bụ otú ya na Jehova dịruru ná mma, ọ bụghị otú ọ maruru ihe. N’ihi ya, ebe ọ na-enweghị nnukwu ọrụ ị na-arụ n’ọgbakọ ugbu a, gbalịa mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ‘ịdị ike’ n’okwukwe, ị ghaghị ‘ịchọ Jehova na ike ya.’ (1 Kọr. 16:13; Ọma 105:4) Otu ụzọ i nwere ike isi mee nke a bụ isi n’ala ala obi gị na-ekpeku ya ekpere. Mgbe ị na-akọrọ Jehova ọnọdụ gị, gwa ya otú obi dị gị, rịọkwa ya ka o nye gị mmụọ ya. Ọ bụrụ na i mee otú a, ị ga-abịarukwu Jehova nso, nke a ga-emekwa ka ị dị ike. (Ọma 62:8; Fil. 4:6, 13) Ụzọ ọzọ ị ga-esi mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma bụ ịmụchi Okwu ya anya. Ebe ị na-enweghị ọtụtụ ọrụ ị na-arụ ugbu a n’ọgbakọ, i nwere ike ịna-enwechikwu ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ anya, ikekwe na-agbalịsi ike ugbu a ịhụ na ị na-amụchi ya anya.—Fil. 3:16.

O doro anya na ị ka na-anọchite anya Jehova dị ka otu n’ime Ndịàmà ya. (Aịza. 43:10-12) Ihe ùgwù kacha mma onye ọ bụla nwere bụ iso ná “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Ụzọ mara mma ị ga-esi mee ka gị na Jehova na ụmụnna gị dịkwuo ná mma bụ ijechikwu ozi ọma anya.

Idi Ihe Mere Gị

Ihere nwere ike ịna-eme gị ma ọ bụrụ na a napụrụ gị ihe ùgwù ije ozi i nwere. I nwere ike ịna-eche na e kwesịghị ịnapụ gị ihe ùgwù ahụ. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ụmụnna ndị ọzọ egechaa gị ntị ma ka chee na e kwesịrị ịnapụ gị ihe ùgwù ahụ? Nke a nwere ike ime ka ị na-ewe iwe ruo ogologo oge nke na ị gaghịzi eru eru ka a họpụta gị, ma ọ bụkwanụ mee ka o siere gị ike isi n’ihe ahụ mere gị mụta ihe. Ka anyị tụlee otú ihe nlereanya Job, Manase, na Josef setịpụrụ nwere ike isi nyere anyị aka idi ihe mere anyị.

Job nọchitere anya ndị ọzọ n’ihu Jehova, ọ bụkwa okenye nke kpere ikpe n’oge ochie. (Job 1:5; 29:7-17, 21-25) Ma, e nwere mgbe ihe siiri ya ike, ihe niile o nwere alaa n’iyi, ụmụ ya anwụọ, ya adaakwa ọrịa. Nke a mekwara ka ndị mmadụ na-eleda ya anya. Job kwuru, sị: “Ugbu a, ha achịwo m ọchị, bụ́ ndị m tọrọ atọ.”—Job 30:1.

Obi Job gwara ya na aka ya dị ọcha, ọ chọkwara igosi Chineke na ọ dịghị ihe ya mere. (Job 13:15) N’agbanyeghị nke a, Job dị njikere ichere Jehova, nke a rụpụtakwara ihe dị mma. Ọ chọpụtara na e kwesịrị ka a gbazie ya, karịchaa n’ihi ihe o mere mgbe ule bịaara ya. (Job 40:6-8; 42:3, 6) Otu n’ime ihe mere ka Job nweghachi ihe karịrị ihe ndị o nwere na mbụ bụ n’ihi na ọ dị umeala n’obi.—Job 42:10-13.

Ọ bụrụ na ihe mere e ji napụ gị ihe ùgwù ije ozi bụ n’ihi ihe i mere, i nwere ike ịna-eche ma Jehova na ụmụnna gị hà ga-agbaghara gị ma chefuo ya. Tụlee ihe banyere Eze Manase nke chịrị Juda. O “mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu iji kpasuo ya iwe.” (2 Eze 21:6) N’agbanyeghị nke a, Manase kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ọ chịgidekwara ruo mgbe ọ nwụrụ. Ole otú nke a si mee?

Manase mechara kpawa ezigbo àgwà mgbe a tachara ya ahụhụ. Mgbe ọ na-anaraghị ịdọ aka ná ntị, Jehova hapụrụ ndị Asiria ka ha buso ya agha. Ha jidere ya kee ya agbụ, kpụrụ ya gaa obodo dị anya bụ́ Babịlọn. Mgbe Manase ruru ebe ahụ, “o mere ka obi Jehova bụ́ Chineke ya jụrụ, o wee na-eweda onwe ya ala nke ukwuu n’ihi Chineke nna nna ya hà. O wee na-ekpeku ya ekpere.” Manase mere ihe gosiri na ya ji obi ya dum chegharịa, a gbaghakwaara ya.—2 Ihe 33:12, 13.

Ọ na-esi ike mmadụ enwetaghachichaa ihe ùgwù niile a napụrụ ya n’otu ntabi anya. Ma, ka oge na-aga, a na-eji nwayọọ nwayọọ nyeghachi onye ahụ ụfọdụ. Ọ bụrụ na ị nara ha ma rụọ ha nke ọma, a ga-enyekwu gị ndị ọzọ. Nke a apụtaghị na ihe niile ga-aga siriri werere. E nwere ike inwe ihe ndị na-agaghị aga otú i chere. Ma, ihe ga-emecha dị mma ma ọ bụrụ na ị dịrị njikere ịrụ ọrụ e nyere gị ma nwee ndidi.

Were ihe banyere nwa Jekọb bụ́ Josef dị ka ihe atụ. Mgbe Josef dị afọ iri na asaa, ụmụnne ya resịrị ya ndị ji ya mere ohu. (Jen. 37:2, 26-28) O doro anya na ọ tụghị anya na ụmụnne ya ga-eme ya ụdị ihe a. Ma, ọ dị njikere ịrụ ọrụ e nyere ya n’ebe ọ gara, Jehova gọzikwara ya, ya ‘aghọọ onye na-elekọta ụlọ nna ya ukwu.’ (Jen. 39:2) Ka oge na-aga, a tụrụ ya mkpọrọ. Ma, ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi, Jehova nọnyekwaara ya. E mechara mee ya onye na-elekọta ndị mkpọrọ ibe ya.—Jen. 39:21-23.

Josef amaghị na e nwere uru ihe a niile ga-aba. Ọ nọgidere na-eme nnọọ ihe o nwere ike ime. Ihe ndị a mere ka Jehova nwee ike iji ya mee ka a ghara ibibi usoro ọmụmụ nke Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esi na ya pụta. (Jen. 3:15; 45:5-8) N’agbanyeghị na ọ dịghị onye n’ime anyị na-atụ anya na ya ga-eme ụdị ihe Josef mere, akụkọ banyere ya na-egosi na aka Jehova dị n’ihe ùgwù a na-enye ndị ohu ya. I nwere ike inweta ihe ùgwù dị iche iche ma ọ bụrụ na i ṅomie Josef.

Isi n’Ihe Ndị Mere Gị Mụta Ihe

Job, Manase, na Josef tachara ahụhụ. Ma, nke Manase bụ n’ihi ihe o metere. Ha atọ diri ihe dị iche iche Jehova kwere ka ha bịara ha, ha mụtakwara ihe na ha. Gịnị ka i nwere ike ịmụta?

Lee ma ị̀ ga-achọpụta ihe Jehova ji ihe mere gị na-akụziri gị. Mgbe ihe na-esiri Job ike, ọ malitere iche banyere onwe ya gabiga ókè, nke na ọ mataghị ebe ihe na-eme ya si. Ma, mgbe Jehova ji ịhụnanya gbazie ya, ọ ghọtara onwe ya. O kwetara sị: “M kwuru okwu, ma aghọtaghị m.” (Job 42:3) Ọ bụrụ na obi adịghị gị mma n’ihi na a napụrụ gị ihe ùgwù ije ozi, ‘echela banyere onwe gị karịa ka i kwesịrị iche, kama na-eche echiche iji nwee uche zuru okè.’ (Rom 12:3) O nwere ike ịbụ na Jehova chọrọ iji ụzọ ị na-amachaghị gbazie gị.

Nabata ịdọ aka ná ntị. O nwere ike ịbụ na Manase chere ná mmalite na ihe ya mere erughị ihe e kwesịrị iji taa ya ụdị ahụhụ a tara ya. Ma, o diri ya, chegharịa, hapụkwa omume ọjọọ ya. N’agbanyeghị ihe i chere banyere ịdọ aka ná ntị ahụ, ‘weda onwe gị ala n’anya Jehova, ọ ga-ebulikwa gị elu.’—Jems 4:10; 1 Pita 5:6.

Nwee ndidi, dịkwa njikere ịrụ ọrụ e nyere gị. Ihe ndị mere Josef gaara eme ka ọ kpọọ ndị tara ya ahụhụ asị ma chọọ imegwara. Kama ime otú ahụ, o gosiri na ya nwere amamihe na obi ebere. (Jen. 50:15-21) Ọ bụrụ na ihe e mere gị wutere gị, nwee ndidi. Nabata ọzụzụ Jehova na-enye gị.

Ò nwere mgbe i nweburu ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ? Kwe ka Jehova jiri gị rụọ ọrụ ọzọ n’ọdịnihu. Mee ka gị na ya dịkwuo ná mma. Iwe gị jụrụ, nwee ndidi, dịkwa umeala n’obi. Dịrị njikere ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere gị. Mara na “Jehova agaghị ajụ inye ndị na-eje ije n’enweghị ntụpọ ihe ọ bụla bụ́ ihe ọma.”—Ọma 84:11.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 30]

Mee ka okwukwe gị sikwuo ike site n’isi n’ala ala obi gị na-ekpe ekpere

[Foto dị na peeji nke 31]

Ị ga na-agachikwu ozi ọma anya ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na Jehova dịkwuo ná mma

[Foto dị na peeji nke 32]

Kwe ka Jehova jiri gị rụọ ọrụ ndị ọzọ n’ọdịnihu