Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọta Akụ̀ Ndị Zoro Ezo

Ịchọta Akụ̀ Ndị Zoro Ezo

Ịchọta Akụ̀ Ndị Zoro Ezo

Ị̀ CHỌTATỤLA akụ̀ dị oké ọnụ ahịa n’ebe ị na-atụghị anya ya? Nke ahụ bụ ihe Ivo Laud, bụ́ Onyeàmà Jehova nke bi n’Estonia, mere na March 27 2005. Ọ nọ na-enyere Alma Vardja, bụ́ Onyeàmà merela agadi, aka ịkwatu otu ụlọ nkwakọba ihe nke merela ochie. Ka ha na-akwatu mgbidi nke chere ihu n’èzí, ha hụrụ otu bọọdụ nke e ji mechie ihe n’ahụ́ otu ogidi. Mgbe ha wepụrụ bọọdụ ahụ, ha hụrụ otu nnukwu oghere nke e ji bọọdụ ahụ mechie. Ihe dị n’ime oghere ahụ bụ (1) akụ̀ dị oké ọnụ ahịa! Olee ihe ndị bụ́ akụ̀ a dị oké ọnụ ahịa? Ònye zoro ha ebe ahụ?

E nwere ọtụtụ ngwugwu ndị e ji akwụkwọ kechie nke ọma ndị dị n’oghere ahụ. (2) Akwụkwọ Ndịàmà Jehova dị n’otu n’ime ngwugwu ndị ahụ, karịchaa isiokwu Ụlọ Nche ndị a na-amụ amụ, ụfọdụ n’ime ndị e biri malite n’afọ 1947 gawa dịkwa na ya. (3) E ji aka dee ha nke ọma n’asụsụ Estonian. Ụfọdụ n’ime ha nwere ihe e nwere ike iji mara onye zoro ha. A hụrụ ebe e dere ajụjụ ndị a gbara di Alma, bụ́ Villem Vardja. A hụkwara ebe e dere afọ ole ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ. Olee ihe mere e ji tụọ ya mkpọrọ?

Villem Vardja rụrụ ọrụ ndị dị mkpa n’Ọgbakọ Tartu, nakwa n’Ọgbakọ Otepää dị n’Estonia. Ọ dị ka ọ dịghị anya ọ natara eziokwu Agha Ụwa nke Abụọ amalite. Mgbe afọ ole na ole gachara, na December 24, 1948, ọchịchị ndị Kọmunist nwụchiri Nwanna Vardja n’ihi na ọ na-ekwusa ozi ọma. Ndị uwe ojii nzuzo gbara ya ajụjụ ma rụsa ya arụrụala ka ha nọ na-amanye ya ka ọ gwa ha aha ụmụnna. A tụrụ ya mkpọrọ afọ iri n’ogige ịta ahụhụ dị na Russia n’ekweghị ka ọ zara ọnụ ya n’ụlọikpe.

Villem Vardja kwesịrị ntụkwasị obi ruo mgbe ọ nwụrụ na March 6, 1990. Nwunye ya amaghị na akwụkwọ ndị ahụ dị n’ebe ahụ. Ikekwe ihe mere ọ gwaghị nwunye ya bụ na ọ chọghị ihe ga-etinye nwunye ya na nsogbu ma ọ bụrụ na a bịa ịgba ya ajụjụ. Gịnị mere o ji zoo akwụkwọ ndị ahụ? Ọ bụ n’ihi na ndị uwe ojii nzuzo nke mba Soviet na-aga n’ụlọ Ndịàmà Jehova n’agwaghị ha agwa, na-achọ akwụkwọ ha ji amụ Baịbụl. Eleghị anya ihe mere Nwanna Vardja ji zoo akwụkwọ ndị ahụ bụ ka ụmụnna wee nọgide na-enweta nri ime mmụọ ma ọ bụrụ na ndị uwe ojii e wekọrọ ihe niile. N’afọ 1990, a hụrụ ngwugwu akwụkwọ ndị ọzọ e zoro ezo. A hụrụ otu na Tartu, nke dị n’ebe ndịda Estonia. Ọ bụkwa Villem Vardja zoro ya.

Olee ihe mere anyị ji sị na akwụkwọ ndị a bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa? Ọ bụ n’ihi na akwụkwọ ndị a e ji aka nkịtị dee, bụ́ ndị e zoro nke ọma, na-egosi na Ndịàmà Jehova ji nri ime mmụọ e nwere n’oge ahụ kpọrọ ihe. (Mat. 24:45) Ì ji nri ime mmụọ ị na-enweta ugbu a n’ebe i bi kpọrọ ihe? Ihe so na nri ime mmụọ ndị a bụ Ụlọ Nche nke asụsụ Estonian na ndị nke e nwere n’ihe karịrị otu narị asụsụ na asụsụ iri asaa ndị ọzọ.