Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka I Kwesịrị Ime Mgbe E Mejọrọ Gị?

Gịnị Ka I Kwesịrị Ime Mgbe E Mejọrọ Gị?

Gịnị Ka I Kwesịrị Ime Mgbe E Mejọrọ Gị?

NDỊ mmadụ na-asịkarị, ‘I mee m mụ emegwara, Chineke agaghị ewe iwe.’ Ihe kpatara ya bụ na iwe iwe mgbe a kpasuru anyị iwe ma ọ bụ mejọọ anyị dị anyị n’ọbara. Ebe ọ bụ na e kere anyị ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ka e mezie ihe ọ bụla e mejọrọ emejọ. Ma, ajụjụ bụ, olee otú e kwesịrị isi mee nke a?

Ma, mmejọ dị n’ụdị n’ụdị. O nwere ike ịbụ ịma ụra, ịkwa aka, mkparị, ịkọ ọnụ, mmetọ, izu ohi, ma ọ bụ mmejọ ndị ọzọ. Olee otú obi na-adị gị mgbe a kparịrị gị ma ọ bụ leda gị anya? O yiri ka ihe ọtụtụ ndị taa na-ekwu mgbe ụdị ihe a mere ha bụ, ‘M ga-emesirịrị ya ike maka ihe a o mere m!’

Na United States, ọtụtụ ụmụaka nọ na klas nke mbụ ruo nke atọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị ebola ndị nkụzi ha ebubo ụgha iji megwara ha maka ahụhụ ha tara ha. Brenda Mitchell, bụ́ onyeisi nke Òtù Ndị Nkụzi na New Orleans, kwuru, sị: “Ihe na-emenụ bụ na ozugbo e boro onye nkụzi ebubo, e mebiela aha ya.” Ya bụrụgodị na e mechara chọpụta na ebubo ahụ bụ ụgha, a ka ga na-eletụ onye nkụzi ahụ anya ọjọọ.

N’ebe ọrụ, ọtụtụ ndị ọrụ obi na-adịghị mma na-achọ imegwara ihe ndị were ha n’ọrụ mere ha site n’imebi ihe ndị dị mkpa dị na kọmputa ụlọ ọrụ ha ma ọ bụ ihichapụ ha. Ndị ọzọ na-ezuru ihe nzuzo nke ụlọ ọrụ ha ma resị ha ma ọ bụ nyetụ ha ndị ọzọ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru na e wezụga iwere ihe ndị dị na kọmputa, “izu ngwongwo ụlọ ọrụ ka bụ ụzọ ndị ọrụ na-ejikarị emegwara ihe ụlọ ọrụ ha mere ha.” Iji gbochie ndị a chụrụ n’ọrụ imegwara ihe e mere ha, ọtụtụ ụlọ ọrụ na-akpọzi onye nche ka o duru onye ha chụrụ n’ọrụ gaa n’ọfịs ya, legide ya anya ka o were ihe ndị bụ́ nke ya ma kpọpụ ya n’ụlọ ọrụ ahụ.

Ndị kacha emegwara ibe ha ihe bụ ndị enyi, ndị ikwu na ibe, na ndị si n’otu ezinụlọ. Mmadụ iwe iwe n’ihi okwu ọjọọ a gwara ya ma ọ bụ ihe ọjọọ e mere ya nwere nnọọ ike ime ka o megwara. Ọ bụrụ na enyi gị ejiri olu ike gwa gị okwu, ị̀ na-agwagwara ya ozugbo? Ọ bụrụ na onye ezinụlọ gị akpasuo gị iwe, ị̀ na-achọ ụzọ ị ga-esi megwara ya? Ọ na-adị nnọọ mfe ịkpa àgwà otú ahụ mgbe onye anyị na ya dị ná mma mejọrọ anyị!

Ihe Mere Imegwara Ihe Ji Bụrụ Nzuzu

Ọtụtụ mgbe, ndị na-achọ imegwara ihe e mere ha na-eme otú ahụ iji mee ka obi jụtụrụ ha n’ihe e mere ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị na mgbe ụmụ ndị ikom otu n’ime ndị nna ochie ndị Hibru bụ́ Jekọb nụrụ na onye Kenan, bụ́ Shikem, dinara nwanne ha nwaanyị bụ́ Daịna n’ike, ha ‘nwere mwute na mmụọ ha, wee wee oké iwe.’ (Jenesis 34:1-7) Iji megwara ihe ọjọọ e mere nwanne ha nwaanyị, ụmụ ndị ikom abụọ Jekọb gbaara Shikem na ezinụlọ ya izu ọjọọ. Simiọn na Livaị ji aghụghọ banye n’obodo ndị Kenan ahụ ma gbuo ụmụ nwoke niile nọ na ya, tinyere Shikem.—Jenesis 34:13-27.

Ọbara ahụ ha kwafuru ò doziri nsogbu ahụ? Mgbe Jekọb nụrụ ihe ụmụ ya mere, ọ baara ha mba, sị: “Unu ebuteworo m nsogbu site n’ime ka m bụrụ ihe na-esi ísì n’ebe ndị bi n’ala a nọ, . . . ha ga-ezukọtakwa megide m wee wakpo m, a ga-alakwa m n’iyi, mụ na ụlọ m.” (Jenesis 34:30) N’ezie, ihe ahụ ha megwaara edozighị nsogbu ahụ, kama o mere ka ihe ka njọ; ụjọ jizi ezinụlọ Jekọb na ndị agbata obi ha iwe ji nwere ike imegwara ha. Ikekwe, iji gbochie nke ahụ ime, Chineke gwara Jekọb ka ya na ezinụlọ ya kwafee n’ógbè Betel.—Jenesis 35:1, 5.

Ihe ndị mere mgbe e dinachara Daịna n’ike na-akụziri anyị otu ihe dị mkpa. Imegwara ndị mmadụ ihe ha mere na-emekarị ka ha megwakwara, mmegwara ana-arịzi ibe ya elu.

Imegwara Ihe Na-akpatakwu Ihe Mgbu

Mmadụ ịnọ na-eche otú ọ ga-esi megwara ihe ọjọọ e mere ya na-emebi ihe. Akwụkwọ bụ́ Forgiveness—How to Make Peace With Your Past and Get On With Your Life kwuru, sị: “Ọnụma na-amịkpọ mmadụ. Ọ na-ewekọrọ oge na ume mgbe ị nọ na-echegbu onwe gị banyere ihe ọjọọ ndị merela gị, na-akpọ ndị mejọrọ gị iyi n’obi gị ma na-achọ ụzọ ị ga-esi emegwara ha.” Baịbụl kwuru ya hoo haa na “ekworo bụ ure ọkpụkpụ.”—Ilu 14:30.

Obi ọ̀ ga-adịnụ mmadụ ụtọ mgbe ịkpọasị na echiche ọjọọ juru ya obi? Otu onye na-enye nkọwa kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i chere na ‘e mee gị, gị emegwara na Chineke agaghị ewe iwe,’ legodị otú imi na anya dị ndị merela otú ahụ ọtụtụ afọ.”

Chegodị echiche banyere ihe ndị na-eme n’ọtụtụ ebe n’ụwa bụ́ ebe ndị a na-enwekarị esemokwu agbụrụ na nke okpukpe. Igbu otu onye na-akpatakarị igbu onye ọzọ, na-eme ka ịkpọasị na ọnwụ na-arị nnọọ ibe ha elu. Dị ka ihe atụ, mgbe otu bọmbụ nke ndị na-eyi ọha egwu gburu ndị na-eto eto iri na asatọ, otu nwaanyị na-eru uju tiri mkpu, sị, “Anyị kwesịrị nnọọ imegwara ha otu puku ugboro!” Naanị ihe nke a na-eme bụ ime ka ihe ike na-amụba, ọtụtụ ndị ana-esonyekwa n’esemokwu ahụ.

‘Anya Laara Anya’

Ụfọdụ ndị na-ekwu na Baịbụl na-akwado mmadụ imegwara ihe ọjọọ e mere ya. Ha na-ekwu, sị, “Baịbụl ó kwughị na ‘anya ga-alara anya, ezé alaara ezé’?” (Levitikọs 24:20) E lee ya anya elu elu, o nwere ike iyi ka iwu ‘anya laara anya’ ọ̀ na-akwado mmadụ imegwara ihe ọjọọ e mere ya. Ma, n’ezie, ihe iwu a mere bụ ịkwụsịlata mmegwara na-enweghị isi. Olee otú o si mee ya?

Ọ bụrụ na onye Izrel akụọ onye Izrel ibe ya ihe ma kụkpọọ ya anya, Iwu ahụ kwuru ka a taa ya ahụhụ kwesịrị ekwesị. Ma, ọ bụghị onye ahụ a kụkpọrọ anya ga-emegwara onye ahụ kụkpọrọ ya anya ma ọ bụ onye ezinụlọ onye ahụ. Iwu ahụ kwuru na ọ ga-ewepụ okwu ahụ n’aka ndị ikike dị n’aka, bụ́ ndị ikpe a họpụtara ahọpụta, ka ha dozie ya. Ịmara na a ga-eme onye kpachaara anya mee mmadụ ibe ya ihe ọjọọ ma ọ bụ ihe ike ihe ahụ o mere onye ahụ mere nnọọ ka ọtụtụ ndị zere ime ihe ọjọọ. Ma, ọ bụghị naanị nke ahụ.

Tupu Jehova Chineke enye mba Izrel iwu anya laara anya, o si n’ọnụ Mozis gwa ha, sị: “Akpọla nwanna gị asị n’ime obi gị. . . . Abọla ọbọ, eburula ụmụ ndị gị iwe n’obi.” (Levitikọs 19:17, 18) N’ezie, e kwesịrị iji ihe ndị ọzọ e kwuru n’Iwu ọgbụgba ndụ ahụ ghọta iwu ‘anya laara anya, ezé alaara ezé,’ bụ́ nke Jizọs chịkọtara n’iwu abụọ bụ́: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya” na “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:37-40) Oleezi ihe ezi Ndị Kraịst kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e kpee ha ikpe na-ezighị ezi?

Na-eme Udo

Baịbụl kpọrọ Jehova “Chineke nke udo” ma gbaa ndị na-efe ya ume ka ha “chọọ udo, chụsookwa ya.” (Ndị Hibru 13:20; 1 Pita 3:11) Ma, ime nke a ọ̀ na-aba uru?

Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, a gbụrụ ya ọnụ mmiri, pịa ya ihe, ndị iro ya akpagbuo ya, onye ya na ya dị ná mma arara ya nye, ọbụna ndị na-eso ụzọ ya ahapụ ya. (Matiu 26:48-50; 27:27-31) Olee ihe o mere? Pita onyeozi dere, sị: “Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, o yighị onye ọ bụla egwu, kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.”—1 Pita 2:23.

Pita kwuru, sị: “Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) N’ezie, a gbara Ndị Kraịst ume ka ha ṅomie Jizọs, nke gụnyere iṅomi otú o si die ikpe na-ezighị ezi. Jizọs kwuru banyere nke a n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe.”—Matiu 5:44, 45.

Olee ihe ndị nwere ịhụnanya yiri nke Kraịst na-eme mgbe e mejọrọ ha ma ọ bụ mgbe ha chere na e mejọrọ ha? Ilu 19:11 kwuru, sị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.” Ha na-agbasokwa ndụmọdụ a: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:21) Nke a dị nnọọ iche n’àgwà i mee m mụ emegwara juru ebe niile n’ụwa taa! Ezi ịhụnanya Ndị Kraịst nwere ike inyere anyị aka imeri ọchịchọ imegwara ihe e mere anyị, si otú ahụ ‘leghara mmejọ anya’ n’ihi na ịhụnanya ‘adịghị agụkọ ihe ọjọọ.’—1 Ndị Kọrịnt 13:5.

Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụrụ na e meso anyị ihe ike ma ọ bụ e nwee ụzọ ọzọ e si yie anyị egwu na anyị kwesịrị nnọọ iji ịdị nwayọọ n’obi gba nkịtị? Mbanụ! Mgbe Pọl kwuru, sị, “Jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ,” okwu ya apụtaghị na o kwesịrị ịna-agụ Onye Kraịst agụụ ịnwụ maka okwukwe ya. Kama nke ahụ, mgbe e mesoro anyị ihe ike, anyị nwere ike ịgbachitere onwe anyị. Ọ bụrụ na mmadụ merụrụ gị ahụ́ ma ọ bụ mebie ihe gị, i nwere ike kpebie ịkpọ ndị uwe ojii. Ọ bụrụ na ọ bụ n’ebe ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, e nwere ndị isi anyị nwere ike ịkọsara.—Ndị Rom 13:3, 4.

Ma, ọ dị mma ka anyị buru n’uche na inweta ikpe ziri ezi n’ụwa n’oge a nwere ike isi ike. N’ezie, e nweela ọtụtụ ndị ji ndụ ha niile chọọ inweta ya, iwe na ọnụma emechaa ju ha obi n’ihi na ha enwetalighị ya.

Ọ dịghị ihe ga-atọ Setan ụtọ karịa ịhụ ka ndị mmadụ na-ekewasị n’ihi ịkpọasị na mmadụ imegwara ihe e mere ya. (1 Jọn 3:7, 8) Ọ kacha nnọọ mma iburu ihe a Baịbụl kwuru n’uche: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’” (Ndị Rom 12:19) Ọ bụrụ na anyị ahapụrụ Jehova ihe ọjọọ e mere anyị, anyị ga-ezere ọtụtụ ihe mgbu, ọnụma, na ime ihe ike.—Ilu 3:3-6.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 22]

“Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya” na “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị”

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ịhụnanya ‘adịghị agụkọ ihe ọjọọ.’—1 Ndị Kọrịnt 13:5