Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ebube nke Mere na Pentikọst!

Ihe Ebube nke Mere na Pentikọst!

Maka Ndị Na-eto Eto

Ihe Ebube nke Mere na Pentikọst!

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a!

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ ỌRỤ 2:1-21, 38-41.

Ka ị na-agụ banyere ‘oké ifufe ahụ nke na-efesi ike’ na ‘ihe ndị ahụ dị ka ire ọkụ,’ gịnị na-abata gị n’obi?

․․․․․

Olee ihe i chere ndị nọ n’ebe ahụ nọ na-ekwu n’ihi otú o si ju ha anya ịnụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-asụ asụsụ ndị mba ọzọ?

․․․․․

Olee otú i chere ihu dị ndị nkatọ ahụ e kwuru okwu ha n’amaokwu 13?

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Olee ụdị ememme Pentikọst bụ, oleekwa otú i chere ememme a mere ka obi dị ìgwè mmadụ ahụ gbakọtara na Jeruselem? (Diuterọnọmi 16:10-12)

․․․․․

Olee otú Pita si kwanyere ndị na-ege ya ntị ùgwù mgbe ọ na-agwa ha okwu, oleekwa otú o si kwuo ihe na-agaghị esere ya na ha okwu? (Ọrụ 2:29)

․․․․․

Olee otú nkwuwa okwu Pita na Pentikọst si dị nnọọ iche n’ihe o meburu na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà? (Matiu 26:69-75)

․․․․․

MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Mkpa ọ dị ikwu ihe na-agaghị esere anyị na ndị na-ege anyị ntị okwu na ịkwanyere ha ùgwù mgbe anyị na-akọrọ ha ihe ndị dị na Baịbụl anyị kweere.

․․․․․

Otú o si bụrụ na i nwere ike ịbụrụ Jehova Onyeàmà nwere nkwuwa okwu, ya bụrụgodị na ị na-emetụ ihere ma ọ bụ na-atụtụ ụjọ ugbu a.

․․․․․

OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ bụrụ na ị chọrọ imekwu nnyocha, gụọ Ụlọ Nche, September 15, 1996, peeji nke 8-9.