Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwee Ụdị Echiche Kraịst Nwere

Nwee Ụdị Echiche Kraịst Nwere

Nwee Ụdị Echiche Kraịst Nwere

“Unu nwee n’etiti onwe unu ụdị echiche ahụ Kraịst Jizọs nwere.”—ROM 15:5.

1. Olee ihe mere anyị ji kwesị inwe ụdị echiche Kraịst nwere?

JIZỌS KRAỊST kwuru, sị: “Bịakwutenụ m . . . mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.” (Mat. 11:28, 29) Ihe a Jizọs gwara anyị ka anyị mee gosiri nnọọ na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. E nweghị mmadụ nwere ike isetịpụrụ anyị ihe nlereanya nke ka nke Jizọs mma. N’agbanyeghị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, nweekwa ike dị ukwuu, o nwere ọmịiko na obiọma. Ọ bụkwa ndị ihe na-atụ n’ọnụ ka ọ kacha emetere ebere.

2. Olee àgwà Jizọs ndị anyị ga-atụle?

2 N’isiokwu a na abụọ ọzọ na-eso ya, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi nwee ụdị echiche Jizọs nwere, nakwa otú anyị ga-esi na-eṅomi “uche nke Kraịst.” (1 Kọr. 2:16) Anyị ga-atụle ise n’ime àgwà Jizọs: otú o si dịrị nwayọọ dịkwa umeala n’obi, otú o si nwee obiọma, otú o si erubere Chineke isi, otú o si nwee obi ike, na ịhụnanya na-anaghị ada ada o nwere.

Mụta Ịdị Nwayọọ Ka Kraịst

3. (a) Olee otu n’ime ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya banyere ịdị umeala n’obi? (b) Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndị na-eso ụzọ ya mere ihe gosiri na ha ezughị okè?

3 Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, onye zuru okè, kwere bịa n’ụwa jee ozi n’etiti ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ndị na-emekwa mmehie. Ụfọdụ n’ime ha mechara gbuo ya. N’agbanyeghị nke a, Jizọs nọgidere na-enwe ọṅụ ma na-ejide onwe ya. (1 Pita 2:21-23) ‘Ilegide anya’ n’ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ ga-enyere anyị aka ime ka ya mgbe ndị ọzọ mejọrọ anyị. (Hib. 12:2) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘nyara yok ya’ ma mụta ihe n’aka ya. (Mat. 11:29) Gịnị ka ha nwere ike ịmụta? Otu n’ime ihe ndị ha nwere ike ịmụta bụ na Jizọs dị nwayọọ n’obi, o nwekwaara ndị na-eso ụzọ ya ndidi n’agbanyeghị na ha ezughị okè. N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ sara ụkwụ ha, si otú ahụ kụziere ha ihe ha na-agaghị echefu echefu, nke bụ́ na ha kwesịrị ‘ịdị umeala n’obi.’ (Gụọ Jọn 13:14-17.) Mgbe Pita, Jems, na Jọn ‘na-echeghị nche,’ Jizọs ji obiọma gosi na ya ghọtara na ha ezughị okè. Ọ sịrị: “Saịmọn, ị̀ na-ehi ụra? Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa. N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Mak 14:32-38.

4, 5. Olee otú ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ nwere ike isi nyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme mgbe ndị ọzọ mere ihe na-ekwesịghị ekwesị?

4 Olee ihe anyị na-eme ma ọ bụrụ na nwanna anyị na-esekarị okwu, na-ewe iwe ọkụ, ma ọ bụ ya ana-esiri ya ike ime ihe ndị okenye ma ọ bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” kwuru? (Mat. 24:45-47) O nwere ike ịdịrị anyị mfe ịgbaghara onye na-abụghị onye Jehova ma o mejọọ anyị n’ihi na e ji àgwà ọjọọ mara ụwa Setan, ma o nwere ike isiri anyị ike ịgbaghara nwanna anyị. Ọ bụrụ na anyị na-ekwe ka àgwà ọjọọ ndị ọzọ na-akpa na-akpasu anyị iwe ngwa ngwa, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya sị, ‘Olee otú m ga-esi na-enwekwu “uche nke Kraịst”?’ Cheta na Jizọs ewesaghị ndị na-eso ụzọ ya iwe, ọbụna mgbe ha mere ihe ha na-ekwesịghị ime.

5 Tụlee ihe banyere Pita onyeozi. Mgbe Jizọs gwara Pita ka o si n’ụgbọ mmiri pụta ma jiri ụkwụ bịakwutewe ya n’elu mmiri, Pita mewere otú ahụ. Ma, Pita lere oké ifufe na-efe anya wee malite imikpu n’ime mmiri. Jizọs ò were iwe ma gwa ya, sị: “Ntọọ gị, ka nke ahụ kụziere gị ihe”? Mba! “Jizọs matịrị aka ozugbo, jide ya wee sị ya: ‘Gị onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?’” (Mat. 14:28-31) Ànyị nwere ike ịmatị aka anyị nyere nwanna anyị okwukwe ya na-esichaghị ike aka ka o nwekwuo okwukwe? Nke a bụ ihe anyị na-amụta n’otú Jizọs si jiri obiọma nyere Pita aka.

6. Gịnị ka Jizọs kụziiri ndịozi ya banyere mmadụ ịchọ ka ọ bụrụ onye a ma ama?

6 Pita sokwa ndịozi ndị ọzọ rụọ ụka ọtụtụ ugboro banyere onye ka ibe ya ukwuu. Jems na Jọn chọrọ ka ha nọrọ Jizọs otu n’aka nri ya, onye nke ọzọ n’aka ekpe ya, n’Alaeze ya. Mgbe Pita na ndịozi ndị ọzọ nụrụ ya, ha were iwe. Jizọs maara na ma eleghị anya, ha mụtara àgwà a n’aka ndị Juu ibe ha. Ọ gwara ha ka ha bịakwute ya wee gwa ha, sị: “Unu maara na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị ukwu ha na-achịkwa ha n’aka ike. O kwesịghị ịdị otú ahụ n’etiti unu; kama onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi.” Jizọs gwaziri ha banyere onwe ya, sị: “Dị nnọọ ka Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—Mat. 20:20-28.

7. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi nye aka mee ka ọgbakọ dịrị n’otu?

7 Ichebara otú Jizọs si dịrị umeala n’obi echiche nwere ike inyere anyị aka ‘ime onwe anyị dị ka ndị ka nta’ n’etiti ụmụnna anyị. (Luk 9:46-48) Ọgbakọ ga-adị n’otu ma ọ bụrụ na anyị emee nke a. Jehova, bụ́ onye dị ka nna nwere nnukwu ezinụlọ, chọrọ ka ụmụ ya ‘bikọta ọnụ n’ịdị n’otu,’ ya bụ, ka ha na ibe ha dịrị ná mma. (Ọma 133:1) Jizọs kpekuru Nna ya ekpere ka ezi Ndị Kraịst niile dịrị n’otu, ka “ụwa wee mara na ọ bụ gị zitere m, marakwa na ị hụrụ ha n’anya dị nnọọ ka ị hụrụ m n’anya.” (Jọn 17:23) Ya mere, ndị mmadụ ga-ama na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst ma ọ bụrụ na anyị adịrị n’otu. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị n’otu, anyị kwesịrị ịna-ele ebe ndị ọzọ na-anaghị eme nke ọma anya dị ka Kraịst si lee ndịozi ya. Jizọs gbaghaara ndị mmadụ mmehie, ọ kụzikwaara ha na ọ bụ naanị mgbe ha gbaghaara ndị ọzọ ka a ga-agbaghara ha.—Gụọ Matiu 6:14, 15.

8. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị jeerela Chineke ozi ọtụtụ afọ?

8 Anyị nwekwara ike ịmụta ọtụtụ ihe site n’iṅomi okwukwe nke ndị ṅomirila Kraịst ọtụtụ afọ. Dị ka Jizọs mere, ha na-eme ihe gosiri na ha ghọtara na ndị ọzọ ezughị okè. Ha mụtara na inwe ọmịiko ka Kraịst na-eme ka ha ‘na-eburu adịghị ike nke ndị na-esighị ike,’ na-emekwa ka ọgbakọ dịrị n’otu. Ihe ọzọkwa bụ na ọ na-eme ka ndị nọ n’ọgbakọ nwee ụdị echiche Kraịst nwere. Ha chọkwara ka ụmụnna ha nwee àgwà ndị Pọl onyeozi chọrọ ka Ndị Kraịst nọ na Rom nwee. Ọ sịrị: “Ka Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi mee ka unu nwee n’etiti onwe unu ụdị echiche ahụ Kraịst Jizọs nwere, ka unu wee site n’otu obi jiri otu olu na-enye Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst otuto.” (Rom 15:1, 5, 6) N’ezie, ofufe anyị na-efekọ Jehova ọnụ na-ewetara ya otuto.

9. Iji nwee ike iṅomi Jizọs, olee ihe mere mmụọ nsọ ji dị anyị mkpa?

9 Jizọs kwuru na ‘ịdị umeala n’obi’ na ịdị nwayọọ, nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, na-agakọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe mmụọ nsọ Jehova ka anyị na-amụ banyere Jizọs, ka anyị wee nwee ike iṅomi Jizọs nke ọma. Anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya, anyị ga-agbalịkwa inwe ihe ndị so ná mkpụrụ ya, ya bụ, “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” (Gal. 5:22, 23) Ọ bụrụ na anyị adị umeala n’obi, dịrịkwa nwayọọ ka Jizọs, ihe anyị ga-amasị Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova.

Jizọs Ji Obiọma Meso Ndị Ọzọ Ihe

10. Olee otú Jizọs si gosi na ya nwere obiọma?

10 Obiọma sokwa ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Jizọs ji obiọma meso ndị ọzọ ihe mgbe niile. Jizọs ‘ji obiọma nabata’ ndị niile ji ezi obi bịakwute ya. (Gụọ Luk 9:11.) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’obiọma Jizọs? Onye nwere obiọma na-emesapụ ihu, dị nwayọọ, nwee ọmịiko, ma na-eme amara. Otú a ka Jizọs dị. O nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị mmadụ “n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.”—Mat. 9:35, 36.

11, 12. (a) Kwuo otu n’ime ihe Jizọs ji ọmịiko mee. (b) Olee ihe i nwere ike ịmụta n’akụkọ a?

11 Jizọs mekwara ihe iji gosi na ya nwere ọmịiko. Tụlee otu n’ime ihe o mere. E nwere otu nwaanyị rịara ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ zuru ezu. Ọ ma na Iwu Mozis kwuru na onye na-arịa ọrịa ahụ ọ na-arịa na onye ọ bụla metụrụ ya aka erughị eru ife Jehova. (Lev. 15:25-27) N’agbanyeghị nke a, ọ ghaghị ịbụ na ihe ndị Jizọs merela na otú o si emeso ndị ọzọ ihe mere ka obi sie ya ike na ọ ga-agwọ ya. Ọ nọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.” Ọ katara obi mee nke a, ọ chọpụtakwara ozugbo na ọ gwọrọ ya.

12 Jizọs ma na e nwere onye metụrụ ya aka, o legharịkwara anya ịmara onye ọ bụ. Ma, nwaanyị ahụ dara n’ala n’ụkwụ Jizọs na-ama jijiji ma gwa ya eziokwu niile, ikekwe n’ihi ụjọ na-atụ ya na a ga-abara ya mba maka na ya adaala Iwu Mozis. Jizọs ọ̀ baara nwaanyị ahụ tagburula onwe ya n’ahụhụ mba? Mbanụ! Ọ gwara ya okwu na-akasi obi, sị: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo.” (Mak 5:25-34) Okwu ọma a na-emetụ n’ahụ́ kasiri nwaanyị ahụ obi nke ukwuu.

13. (a) Olee otú Jizọs si dịrị iche ná ndị Farisii? (b) Olee otú Jizọs si meso ụmụaka ihe?

13 Jizọs adịghị ka ndị Farisii obi tara mmiri, ọ naghị eji ikike o nwere emegbu ndị ọzọ. (Mat. 23:4) Kama nke ahụ, o ji obiọma na ndidi kụziere ndị ọzọ banyere Jehova. Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị na-eso ụzọ ya, ọ hụrụ ha n’anya ma nwee obiọma. Ọ bụ ezigbo enyi ha. (Ilu 17:17; Jọn 15:11-15) Ahụ́ na-erudị ụmụaka ala ma ha na Jizọs nọrọ, ahụ́ na-erukwa yanwa ala. Ọ na-akwụsị ihe ọ na-eme ka ya na ụmụaka wee nwee ike ịnọrị. E nwere mgbe ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ka na-ele onwe ha anya ka o nwere ndị ha bụ, dị ka ndị ndú okpukpe ndị Juu na-eme, chọrọ igbochi ndị na-akpọtara Jizọs ụmụaka ka o metụ ha aka. Ihe a ndị na-eso ụzọ ya mere adịghị ya mma n’obi. Ọ gwara ha, sị: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m; unu anwala igbochi ha, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ.” O mechara jiri ụmụaka kụziere ha ihe, sị: “N’ezie, ana m asị unu, Onye ọ bụla nke na-anabataghị alaeze Chineke dị ka nwatakịrị agaghị aba n’ime ya ma ọlị.”—Mak 10:13-15.

14. Olee uru ụmụaka na-erite ma e nwee mmasị n’ebe ha nọ?

14 Cheedị otú ọ ga-adị ụmụaka ndị ahụ mgbe ha mere okenye ma cheta na e nwere mgbe Jizọs Kraịst ‘kuuru ha wee gọzie ha.’ (Mak 10:16) Taakwa, ụmụaka na-ahụ ndị okenye na ndị ọzọ nwere mmasị n’ebe ha nọ n’anya. Nke ka mkpa bụ na ụmụaka e si na nwata na-egosi ụdị mmasị a n’ọgbakọ na-amata na mmụọ Jehova dị n’ahụ́ ndị ya.

Igosi Ndị Ọzọ Obiọma n’Ụwa A Ndị Mmadụ Na-anaghị Egosi Ibe Ha Obiọma

15. Olee ihe mere na o kwesịghị iju anyị anya na ọtụtụ ndị enweghị obiọma taa?

15 Ọ na-adị ọtụtụ ndị taa ka ha enweghị ohere inwe obiọma n’ebe ndị ọzọ nọ. Kwa ụbọchị, ndị Jehova na-ahụ ndị na-enweghị obiọma n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ha na-arụ ọrụ, mgbe ha na-eme njem na mgbe ha na-eje ozi ọma. O nwere ike iwute anyị ma anyị hụ ndị na-enweghị obiọma, ma nke a ekwesịghị iju anyị anya. Jehova mere ka Pọl dọọ anyị aka ná ntị na “n’oge ikpeazụ” a, ezigbo Ndị Kraịst ga-ahụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-enweghị obi mmadụ.”—2 Tim. 3:1-3.

16. Olee otú anyị nwere ike isi nwee obiọma ka Kraịst n’ọgbakọ?

16 Ma, ọgbakọ ezigbo Ndị Kraịst dị nnọọ iche n’ụwa, bụ́ ebe ndị na-enweghị obiọma juru. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị ana-eṅomi Jizọs, ịhụnanya ga-adị n’ọgbakọ. Olee otú anyị nwere ike isi mee nke a? Anyị kwesịrị ịma na ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ chọrọ enyemaka na agbamume anyị n’ihi ọrịa na-arịa ha ma ọ bụkwanụ n’ihi nsogbu ndị ọzọ ha na-enwe. Nsogbu ndị a ka njọ “n’oge ikpeazụ” a, ma, ha abụghị ihe ọhụrụ. Ndị Kraịst nwere ụdị nsogbu ndị a n’oge ochie. Enyemaka dị ụmụnna anyị mkpa ugbu a dị ka ọ dị Ndị Kraịst oge ahụ. Dị ka ihe atụ, Pọl gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘na-agụgụ mkpụrụ obi dara mbà, na-akwado ndị na-adịghị ike, na-enwekwa ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ niile nọ.’ (1 Tesa. 5:14) Anyị kwesịrị ịdị obiọma ka Kraịst iji nwee ike ime ihe a Pọl kwuru.

17, 18. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi dịrị obiọma ka Jizọs?

17 Ndị Kraịst kwesịrị ‘ịnabata ụmụnna ha nke ọma,’ ya bụ na ha kwesịrị imeso ha ihe otú Jizọs gaara esi emeso ha. Anyị kwesịrị inwe mmasị n’ebe ndị anyị ma kemgbe nakwa n’ebe ndị anyị na-amaghị nọ. (3 Jọn 5-8) Dị nnọọ ka Jizọs na-echeghị ka a gwa ya agwa tupu ya enwee ọmịiko n’ahụ́ ndị ọzọ, anyị kwesịrị ime otú ahụ, ya bụ, anyị kwesịrị ịna-eme ka ndị ọzọ nweta ume.—Aịza. 32:2; Mat. 11:28-30.

18 Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike igosi na ya nwere obiọma site n’imere ndị ọzọ ihe iji gosi na ya hụrụ ha n’anya. Chọọ ụzọ na ohere ị ga-eji mee nke a. Ekwela ka e chetara gị ya echetara! Pọl gbara anyị ume, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Rom 12:10) Nke a pụtara na anyị ga na-eṅomi Kraịst, jiri ịhụnanya na obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe. Ọ pụtakwara na anyị ga-amụta inwe ‘ịhụnanya nke na-abụghị nke ihu abụọ.’ (2 Kọr. 6:6) Lee otú Pọl si kọwaa ịhụnanya ahụ yiri nke Kraịst. Ọ sịrị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu.” (1 Kọr. 13:4) Kama iburu ụmụnna anyị iwe n’obi, anyị kwesịrị ime ihe Pọl dụrụ anyị ọdụ ka anyị mee. Ọ sịrị: “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị nnọọ ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.”—Efe. 4:32.

19. Olee ezigbo ihe ga-eme ma ọ bụrụ na anyị adịrị obiọma ka Kraịst?

19 Ọ bụrụ na anyị agbalịa na-adị obiọma mgbe niile ka Kraịst, anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ n’ụba. Mmụọ Jehova ga na-arụ ọrụ n’ọgbakọ n’enweghị ihe mgbochi, nke a ga-enyekwara mmadụ niile aka inwe mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na anyị eṅomie Jizọs ma nyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ, ofufe anyị niile na-efekọ Chineke ọnụ ga-eme ka o nwee ọṅụ. N’ihi ya, ka anyị gbaa mbọ jiri obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe ka Jizọs, ka anyị dịrịkwa nwayọọ ka ya.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Olee otú Jizọs si gosi na ya “dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi”?

• Olee otú Jizọs si gosi na ya nwere obiọma?

• Olee ụfọdụ ụzọ anyị si egosi na anyị dị nwayọọ ma nwee obiọma ka Kraịst n’ime ụwa a mmadụ niile bụ ndị na-ezughị okè?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 8]

Ọ bụrụ na nwanna anyị adaa mba n’okwukwe dị ka Pita, ànyị ga-amatị aka nyere ya aka?

[Foto dị na peeji nke 10]

Olee otú anyị nwere ike isi nye aka mee ka ọgbakọ bụrụ ebe mmadụ niile nwere obiọma?