Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Ekele Maka Ihe Jehova Mere Iji Napụta Gị?

Ì Nwere Ekele Maka Ihe Jehova Mere Iji Napụta Gị?

Ì Nwere Ekele Maka Ihe Jehova Mere Iji Napụta Gị?

“Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na o lebaworo ndị ya anya wee napụta ha.”—LUK 1:68.

1, 2. Olee ihe e nwere ike iji mee ihe atụ otú ọnọdụ anyị dịruru njọ, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

WEREGODỊ ya na i dina n’ụlọ ọgwụ ebe ndị niile gị na ha nọ n’otu ọnụ ụlọ na-arịa otu ụdị ọrịa nke na-egbu mmadụ, nke na-enweghị ngwọta. Obi dị gị ụtọ mgbe ị nụrụ na e nwere dọkịta na-agba mbọ ịchọta ọgwụ a ga-eji agwọ ọrịa ahụ ị na-arịa. Ị na-achọ mgbe ọ bụla ịma ihe dọkịta ahụ chọpụtara. Otu ụbọchị, gị anụ na e nwetala ọgwụ e ji agwọ ọrịa ahụ! Dọkịta chọpụtara nke a gbara mbọ dị ukwuu iji hụ na o nwetara ọgwụ na-agwọ ọrịa ahụ. Gịnị ka ị ga-eme? O doro anya na ị ga-ekele nwoke ahụ nke ukwuu ma na-akwanyere ya ùgwù n’ihi na ọ napụtala gị na ọtụtụ ndị ọzọ n’ọnwụ.

2 Nke a nwere ike iyi akụkọ ifo, ma, e nwere ihe yiri ya mere anyị. Anyị niile nọ n’ọnọdụ ka nke a e kwuru okwu ya njọ. Onye nnapụta dị anyị ezigbo mkpa. (Gụọ Ndị Rom 7:24.) Jehova emeela ihe dị ukwuu iji napụta anyị. Ọkpara ya mekwara ihe dị ukwuu. Ka anyị tụlee ajụjụ anọ dị mkpa. Gịnị mere nnapụta ji dị anyị mkpa? Gịnị ka ịnapụta anyị furu Jizọs? Gịnị ka o furu Jehova? Oleekwa otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-ekele Chineke maka ịnapụta anyị?

Ihe Mere Nnapụta Ji Dị Anyị Mkpa

3. Olee otú mmehie si kara ọrịa na-efe efe njọ?

3 Dị ka ihe a chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya gosiri, otu n’ime ọrịa na-efe efe kacha njọ e nwetụrụla bụ influenza nke e nwere n’afọ 1918, nke gburu ọtụtụ nde mmadụ. O nwere ọrịa ndị ọzọ ka ya njọ. N’agbanyeghị na ọ bụ mmadụ ole na ole nwere ike ibute ha, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha na-anwụ. * Ma, olee otú mmehie si kara ha njọ? Cheta ihe e dere ná Ndị Rom 5:12. Ọ sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” Mmadụ niile bu ọrịa ahụ bụ́ mmehie n’ihi na o nweghị onye zuru okè. (Gụọ Ndị Rom 3:23.) Mmadụ olekwanụ ka mmehie na-egbu? Pọl dere na mmehie na-ewetara “mmadụ niile” ọnwụ.

4. Olee ihe Jehova zubere banyere afọ ndụ anyị, olee otú nke a si dị iche n’otú ọtụtụ ndị si ele ya anya taa?

4 Taa, ọtụtụ ndị anaghị ele mmehie na ọnwụ anya ka oké ihe. Ihe na-akacha eche ha uche bụ ihe ha na-akpọ nnwụchu ọnwụ, ma, ha na-ewere ọnwụ gburu onye merela agadi dị ka “ihe mere mgbe o kwesịrị.” Ọtụtụ mmadụ anaghị elekarị ihe anya otú Onye Okike si ele ihe anya. Afọ ndụ anyị anaghị erutụdị otú Chineke zubere ka o ruo. N’ezie, ọ dịbeghị onye nọruru “otu ụbọchị” n’anya Jehova. (2 Pita 3:8) N’ihi ya, Okwu Chineke sịrị na ndụ anyị na-agafe ngwa ngwa ka oge ma ọ bụkwanụ ka ume e kupụrụ ekupụ. (Ọma 39:5; 1 Pita 1:24) Anyị kwesịrị iburu nke a n’uche. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na anyị amara na “ọrịa” nke na-arịa anyị jọgburu onwe ya, ọ ga-eme ka anyị mara na “ọgwụgwọ,” ya bụ, nnapụta, dị anyị ezigbo mkpa.

5. Gịnị ka mmehie furu onye ọ bụla n’ime anyị?

5 Anyị ga-amata otú mmehie jọruru njọ ma ọ bụrụ na anyị aghọta ihe o merela anyị. Nke a nwere ike isitụrụ anyị ike nghọta n’ihi na mmehie furu anyị ihe anyị na-enwetụbeghị. Adam na Iv zuburu okè. Uche ha zuru okè, ahụ́ ha zukwara okè, ọ dị ha n’aka ikpebi ihe ha ga na-eche n’echiche, na ihe ha ga na-eme. Ha nwere ike ịnọgide na-abụ ndị ohu Jehova Chineke ma mezuo ihe e kere ha ka ha na-eme. Kama ime otú ahụ, ha tụfuru onyinye ahụ na-enweghị atụ Chineke nyere ha. Mgbe ha kpebiri imebi iwu Jehova, ha mere ka ha na ụmụ ha ghara ịdị ụdị ndụ Jehova bu n’uche ka ha dịrị. (Jen. 3:16-19) Ha sikwa otú a butere onwe ha na anyịnwa “ọrịa” ọjọọ anyị nọ na-ekwu okwu ya kemgbe. Ọ bụ nke a mere Jehova ji maa ha ikpe. Ma, o mere ka anyịnwa nwee olileanya na a ga-anapụta anyị.—Ọma 103:10.

Ihe Ịnapụta Anyị Furu Jizọs

6, 7. (a) Olee otú Jehova si gosi ná mmalite na ịnapụta anyị ga-efu nnukwu ihe? (b) Gịnị ka àjà Ebel na ndị nna ochie dịrị ndụ tupu e nye Iwu Mozis chụrụ na-akụziri anyị?

6 Jehova maara na ịnapụta ụmụ Adam na Iv ga-efu nnukwu ihe. Amụma ahụ dị na Jenesis 3:15 mere ka anyị mata ihe ịnapụta anyị ga-efu. Jehova ga-eme ka e nwee “mkpụrụ,” ya bụ, onye nnapụta, bụ́ onye ga-ebibi Setan otu ụbọchị ma mee ka ọ ghara ịdịkwa. Ma, onye nnapụta ahụ ga-ata ahụhụ tupu ya ebibie Setan, ya bụ na a ga-emerụ ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ. Nke ahụ yiri ka ọ̀ ga-afụ ya ụfụ, ma, gịnị ka ọ pụtara? Olee ihe Onye Jehova Họọrọ ga-edi ụfụ ya?

7 Iji zọpụta ụmụ mmadụ ná mmehie, onye nnapụta ga-eweta ihe mkpuchi mmehie, bụ́ ihe ga-eme ka ụmụ mmadụ na Chineke dịghachi ná mma site n’imezi ihe niile mmehie mebiri. Gịnị ka nke a gụnyere? E nwere ihe ndị mere ná mmalite bụ́ ndị gosiri na a chọrọ ka a chụọ àjà. Mgbe onye mbụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Ebel, ji anụmanụ chụọrọ Jehova àjà, Jehova nabatara ya. Ka oge na-aga, ndị nna ochie, bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, ndị dị ka Noa, Ebreham, Jekọb, na Job jikwa ụmụ anụmanụ chụọ àjà, ihe ha mere masịkwara Chineke. (Jen. 4:4; 8:20, 21; 22:13; 31:54; Job 1:5) Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Iwu Mozis mere ka ndị mmadụ marakwuo banyere àjà.

8. Gịnị ka nnukwu onye nchụàjà na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie?

8 Otu n’ime àjà ndị dị mkpa e kwuru n’Iwu Mozis ka a na-achụ bụ ndị nke ahụ a na-achụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. N’ụbọchị ahụ, nnukwu onye nchụàjà na-arụ ọtụtụ ọrụ, bụ́ ndị nwere ihe ha na-anọchi anya ya. Ọ na-achụrụ Jehova àjà iji kpuchie mmehie. Ndị mbụ ọ na-ekpuchi mmehie ha bụ ndị nchụàjà, e mechaa, ya achụọ nke ga-ekpuchi mmehie nke ebo ndị na-abụghị ndị nchụàjà. Ọ bụ naanị n’ụbọchị a n’afọ ọ bụla ka nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọikwuu ma ọ bụ n’ụlọ nsọ, ọ bụkwa naanị ya na-abanye ebe ahụ. Ya ruo ebe ahụ, ọ na-efesa ọbara nke anụ ahụ e ji chụọ àjà n’igbe ọgbụgba ndụ ahụ. A na-enwekwa urukpuru na-enwu gbaa n’elu igbe ahụ mgbe ụfọdụ, bụ́ nke na-egosi na Jehova Chineke nọ ya.—Ọpụ. 25:22; Lev. 16:1-30.

9. (a) N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, ònye ka nnukwu onye nchụàjà na-anọchi anya ya, oleekwa ihe àjà ndị ọ chụrụ na-eso onyinyo ha? (b) Olee ihe mbanye nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’Ebe Kasị Nsọ nọchiri anya ya?

9 Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ kọwaa ihe ihe ndị ahụ nnukwu onye nchụàjà na-eme na-anọchi anya ha. O kwuru na nnukwu onye nchụàjà ahụ na-anọchi anya Mesaya, bụ́ Jizọs Kraịst, ebe àjà ndị ahụ ọ na-achụ na-anọchi anya àjà Kraịst ji ndụ ya chụọ. (Hib. 9:11-14) Àjà ahụ zuru okè ga-ekpuchiri ụzọ ndị abụọ mmehie ha, ya bụ, ụmụnna Kraịst e tere mmanụ, ndị dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, na “atụrụ ọzọ.” (Jọn 10:16) Mbanye nnukwu onye nchụàjà na-abanye Ebe Kasị Nsọ na-anọchi anya mbanye Jizọs banyere n’ihu Jehova Chineke iche uru nke àjà mgbapụta ahụ n’ihu ya.—Hib. 9:24, 25.

10. Olee ihe amụma ndị e buru na Baịbụl kwuru ga-eme Mesaya?

10 N’ezie, ọ ga-efu nnukwu ihe iji napụta ụmụ Adam na Iv. Mesaya ga-eji ndụ ya chụọ àjà! Ndị buru amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mere ka nke a doo anya. Dị ka ihe atụ, Daniel onye amụma kwuru hoo haa na “a ga-ebipụ” ma ọ bụ gbuo “Mesaya bụ́ Onye Ndú,” ka e wee “kpuchie mmehie.” (Dan. 9:24-26) Aịzaya buru amụma na a ga-ajụ Mesaya ahụ, kpagbuo ya, gbuo ya, ma ọ bụ maa ya ube, ka o wee buru mmehie nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè.—Aịza. 53:4, 5, 7.

11. Olee otú Ọkpara Jehova si gosi na ya dị njikere iji ndụ ya chụọ àjà ka e wee napụta anyị?

11 Tupu Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya abịa n’ụwa, ọ maara ihe ịnapụta anyị ga-efu ya. Ọ ga-ata ezigbo ahụhụ, e gbuokwa ya. Mgbe Nna ya gwara ya ihe ndị ga-eme ya, ọ̀ lara azụ ma ọ bụ jụ ịbịa? Kama ime otú ahụ, o ji obi ya dum mee ihe Nna ya kwuru. (Aịza. 50:4-6) Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o rubekwara isi mee ihe niile bụ́ uche Nna ya. N’ihi gịnị? O kwuru otu n’ime ihe ndị mere o ji mee nke a. Ọ sịrị: “M hụrụ Nna m n’anya.” O kwukwara ihe ọzọ mere o ji rube isi, sị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 14:31; 15:13) N’ihi ya, otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mere a ga-eji napụta anyị bụ n’ihi na Ọkpara Jehova hụrụ anyị na Nna ya n’anya. N’agbanyeghị na nke a pụtara na ọ ga-eji ndụ ya zuru okè chụọ àjà, obi dị ya ụtọ n’ihi na nke a ga-eme ka a napụta anyị.

Ihe Ịnapụta Anyị Furu Jehova

12. Olee onye ọ bụ uche ya ka a gbapụta anyị, oleekwa ihe mere o ji mee ndokwa ka a gbapụta anyị?

12 Ọ bụghị Jizọs mere ndokwa ka a chụọ àjà mgbapụta ahụ, ọ bụghịkwa ya zubere ka e mee nke a. Kama, ọ bụ uche Jehova ka a napụta anyị. Pọl onyeozi kwuru na ebe ịchụàjà nke dị n’ụlọ nsọ ahụ, bụ́ ebe a na-anọ achụ àjà, sere onyinyo uche Jehova. (Hib. 10:10) N’ihi ya, ihe bụ́ isi mere Kraịst ji chụọ àjà ka e wee napụta anyị bụ na ọ bụ uche Jehova. (Luk 1:68) Ọ bụ uche Jehova ka a napụta ụmụ mmadụ, ọ bụkwa n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu mere o ji mee ndokwa ka e mee nke a.—Gụọ Jọn 3:16.

13, 14. Olee otú ihe mere Ebreham nwere ike isi nyere anyị aka ịghọta ihe Jehova meere anyị?

13 Olee ihe o furu Jehova iji si otú a gosi na ya hụrụ anyị n’anya? Ọ ga-esiri anyị ike ịghọta ihe o furu ya. Ma, e nwere akụkọ e dere na Baịbụl, bụ́ nke ga-enyere anyị aka ịghọta ya nke ọma. Jehova gwara nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebreham ka o mee ihe siri ezigbo ike, ya bụ, ka o jiri Aịzik nwa ya chụọ àjà. Ebreham bụkwanụ nna nke hụrụ nwa ya n’anya. Jehova gwara Ebreham na ya ma na Aịzik bụ “nwa [ọ] mụrụ naanị ya, onye [ọ] hụrụ n’anya.” (Jen. 22:2) N’agbanyeghị nke ahụ, Ebreham ma na ime uche Jehova dị mkpa karịa ịhụnanya o nwere n’ebe Aịzik nọ. Ebreham rubeere Jehova isi. Ma, Jehova ekweghị ka Ebreham mee ihe yanwa ga-eme otu ụbọchị. Chineke zitere mmụọ ozi ka ọ kwụsị Ebreham tupu Ebreham egbuo nwa ya. Ebreham dị nnọọ njikere ime ihe a siri ike Jehova gwara ya mee nke na naanị olileanya o nwere ịhụ nwa ya ọzọ bụ mgbe a ga-akpọlite nwa ya n’ọnwụ. O kwesikwara ike na Chineke ga-akpọlite nwa ya n’ọnwụ. N’ezie, Pọl kwuru na Ebreham natara Aịzik site ná ndị nwụrụ anwụ “n’ụzọ ihe atụ.”—Hib. 11:19.

14 Cheedị ụdị mwute Ebreham ga na-enwe ka ọ na-akwadebe iji nwa ya chụọ àjà? N’ezie, otú obi dị Ebreham ga-enyere anyị aka ịghọta otú obi dị Jehova mgbe o ji onye ọ kpọrọ “Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya,” chụọ àjà. (Mat. 3:17) Ma, cheta na o wutere Jehova karịa otú o wutere Ebreham. Ya na Ọkpara ya anọọla ọtụtụ nde afọ, ma ọ bụdị ọtụtụ ijeri afọ, nke a na-enweghị ike ịgụta ọnụ. Ọkpara ahụ ji ọṅụ soro Nna ya rụọ ọrụ dị ka “onye ọkà ọrụ” nke Nna ya hụrụ n’anya nakwa dị ka Ọnụ Na-ekwuru Nna ya, ya bụ, “Okwu ahụ.” (Ilu 8:22, 30, 31; Jọn 1:1) N’ezie, anyị enweghị ike ịghọta otú obi dị Jehova mgbe a tara Ọkpara ya ahụhụ, kparịa ya, ma mechaa gbuo ya dị ka omempụ. N’ezie, ịnapụta anyị furu Jehova ihe dị ukwuu. Oleezi otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ji nnapụta a napụtara anyị kpọrọ ihe?

Olee Otú I Nwere Ike Isi Gosi na I Ji Nnapụta A Napụtara Gị Kpọrọ Ihe?

15. Olee otú Jizọs si rụchaa ọrụ mkpuchi mmehie, oleekwa ihe nke a mere ka e nwee ike ime?

15 Jizọs rụchara ọrụ mkpuchi mmehie ahụ mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ ya agaa eluigwe. Mgbe ọ gakwuuru Nna ya ọ hụrụ n’anya n’eluigwe, o chere uru nke àjà ahụ ọ chụrụ n’ihu ya. Nke a wetara ọtụtụ ngọzi. O mere ka e nwee ike ịgbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha kpamkpam. E bu ụzọ gbaghara ụmụnna Kraịst e tere mmanụ mmehie ha, mechazie gbaghara “ụwa dum.” Ndị niile ji ezi obi chegharịa ná mmehie ha ma ghọọ ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst na Jehova Chineke na-adị ná mma n’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ. (1 Jọn 2:2) Olee otú nke a si gbasa gị?

16. Olee ihe atụ anyị nwere ike iji kọwaa ihe mere anyị kwesịrị iji na-ekele Jehova n’ihi na o mere ka e nwee ike ịnapụta anyị?

16 Ka anyị laghachi n’ihe atụ ahụ anyị nyere ná mmalite. Ka e were ya na dọkịta ahụ nke chọpụtara ọgwụ a ga-eji agwọ ọrịa ahụ bịakwutere ndị ọrịa gị na ha nọ n’otu ọnụ ụlọ ọgwụ ma gwa ha sị: A ga-agwọ onye ọ bụla kwere ka a gwọọ ya, kwerekwa ime ihe a gwara ya mee. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọrịa ibe gị ajụ ime ihe dọkịta ahụ gwara ha mee, na-ekwu na ọ ga-ara ha ahụ́ ịṅụ ọgwụ ahụ na ime ihe dọkịta sịrị ha mee? Ị̀ ga-eso ha n’agbanyeghị na o doro gị anya na ọgwụ ahụ ga-agwọ gị? Anyị ma na ị gaghị eme otú ahụ! O doro anya na ị ga-enwe ekele na a hụla ọgwụ ga-agwọ gị, o dokwara anya na ị ga-eme ihe dọkịta ahụ gwara gị mee nakwa na ị ga-agwa ndị ọzọ ka ha mee ya. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị igosi Jehova na ya nwere ekele dị ukwuu na o mere ka e nwee ike ịnapụta anyị n’ihi àjà Ọkpara ya chụrụ.—Gụọ Ndị Rom 6:17, 18.

17. Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere ekele maka ihe Jehova merela iji napụta anyị?

17 Ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka ihe Jehova na Ọkpara ya mere iji napụta anyị ná mmehie na ọnwụ, anyị ga-egosipụta nke a. (1 Jọn 5:3) Anyị ga-alụso ọchịchọ anyị nwere ime mmehie ọgụ. Anyị agaghị ama ụma na-eme mmehie, anyị agaghịkwa abụ ndị ihu abụọ, bụ́ ihe e ji mara ndị na-eme mmehie. Ọ bụrụ na anyị ana-ebi ụdị ndụ a, ihe anyị na-ekwu bụ na anyị enweghị ekele maka àjà ahụ a chụrụ iji gbapụta anyị. Kama ime otú a, anyị ga-egosi na anyị nwere ekele site n’ịgba mbọ na-adị ọcha n’ihu Chineke. (2 Pita 3:14) Otú anyị ga-esi eme nke a bụ site n’ịkọrọ ndị ọzọ olileanya magburu onwe ya anyị nwere na a ga-anapụta anyị, ka hanwa na Jehova nweekwa ike ịdị ná mma, ha ewee nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (1 Tim. 4:16) N’ezie, Jehova na Ọkpara ya kwesịrị ka anyị jiri oge na ike anyị niile na-eto ha! (Mak 12:28-30) Chebara nke a echiche! Anyị na-atụ anya mgbe Chineke ga-eme ka mmehie hapụ anyị aka kpamkpam. Anyị nweziri ike ịdị ụdị ndụ Chineke zubere ka anyị dị, ya bụ, anyị ga-ezu okè, dịrịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ihe mere ihe a niile ga-eji kwe omume bụ n’ihi ihe Jehova merela iji napụta anyị!—Rom 8:21.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 E kwuru na ihe dị ka ụzọ abụọ n’ime ụzọ ise, ma ọ bụkwanụ ọkara nke ndị bi n’ụwa, butere ọrịa influenza n’oge ahụ. O nwere ike ịbụ na ọrịa ahụ gburu ihe dị ka otu ụzọ n’ime ụzọ iri nke ndị butere ya. Ma, ọrịa Ebola anaghị arịakarị ndị mmadụ, ma, n’ebe ụfọdụ ọ rịara ndị mmadụ, ọ na-afọ obere ka o gbuchaa ndị niile butere ya.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ihe mere nnapụta ji dị gị ezigbo mkpa?

• Olee uru àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ baara gị?

• Olee otú àjà mgbapụta Jehova mere ndokwa ka a chụọ dị gị?

• Olee ihe i kpebiri ime n’ihi ndokwa Jehova mere ka a napụta anyị?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 27]

N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, nnukwu onye nchụàjà Izrel na-ese onyinyo Mesaya

[Foto dị na peeji nke 28]

Otú Ebreham si dịrị njikere ịchụ nwa ya n’àjà na-akụziri anyị nnọọ banyere àjà karịrị nke ahụ, bụ́ nke Jehova chụrụ