Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Jehova Chọrọ Anyị n’Aka?

Gịnị Ka Jehova Chọrọ Anyị n’Aka?

Bịaruo Chineke Nso

Gịnị Ka Jehova Chọrọ Anyị n’Aka?

Diuterọnọmi 10:12, 13

Ọ NAGHỊ adịrị mmadụ mfe mgbe niile ikpebi ma ọ̀ ga-erube isi ma ọ bụ na ọ gaghị erube. O nwere ike isiri ndị nọ n’okpuru onyeisi nke dị aka ike, nke ọ na-esikwa ike imeta mma ike isi n’ala ala obi ha rubere ya isi. Ma, ndị na-efe Jehova Chineke na-eji obi ha dum erubere ya isi. N’ihi gịnị? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị leba anya n’ihe Mozis kwuru na Diuterọnọmi 10:12, 13. *

Mgbe Mozis na-achịkọta ihe ndị Chineke chọrọ n’aka ụmụ mmadụ, ọ jụrụ otu ajụjụ dị mkpa, nke bụ́: “Gịnị ka Jehova bụ́ Chineke gị na-achọ n’aka gị?” (Amaokwu 12) O ruuru Chineke ịgwa anyị mee ihe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị mee. A sị kwuwe, ọ bụ ya bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, Onye nyere anyị ndụ na Onye ji anyị ndụ. (Abụ Ọma 36:9; Aịzaya 33:22) N’ihi ya, Jehova ruru nnọọ eru ka anyị rubere ya isi. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọghị nrubeisi na-esighị anyị n’obi. Gịnị ka ọ chọrọ anyị n’aka? Ọ chọrọ ka anyị bụrụ “ndị si n’obi ha na-erube isi.”—Ndị Rom 6:17.

Olee ihe ndị nwere ike ịkpali anyị iji obi anyị dum na-erubere Chineke isi? Mozis kwuru na otu n’ime ha bụ “ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke gị.” * (Amaokwu 12) Nke a abụghị ịtụ egwu na-enweghị isi maka ihe ọjọọ nwere ike ime anyị, kama ọ bụ ịkwanyere nnọọ Chineke na ụzọ ya ùgwù. Ọ bụrụ na anyị na-atụ nnọọ egwu Chineke, anyị ga-achọ izere ime ihe ga-ewute ya.

Ma, olee isi ihe kwesịrị ịkpali anyị irubere Chineke isi? Mozis kwuru, sị: “Hụ ya [Jehova] n’anya ma jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na-ejere Jehova bụ́ Chineke gị ozi.” (Amaokwu 12) Ịhụ Chineke n’anya abụghị naanị iche banyere ya. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru, sị: “Okwu Hibru a sụgharịrị iche echiche na-apụtakwa mgbe ụfọdụ àgwà mmadụ kpara n’ihi echiche o chere.” Otu akwụkwọ a kwukwara na ịhụ Chineke n’anya pụtara “imeso ya ihe n’ịhụnanya.” E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya n’ezie, anyị ga na-eme omume ndị anyị maara ga-eme ya obi ụtọ.—Ilu 27:11.

Olee otú anyị kwesịrị iruberuru Chineke isi? Mozis kwuru, sị: “Jee ije n’ụzọ ya [Chineke] niile.” (Amaokwu 12) Jehova chọrọ ka anyị mee ihe niile ọ chọrọ anyị n’aka. Irubere ya isi n’ihe niile otú a ò nwere ike imebiri anyị ihe? Mbanụ.

Iji obi anyị dum na-erubere ya isi ga-ewetara anyị ngọzi. Mozis dere, sị: “Debe iwu . . . ndị m na-enye gị taa, maka ọdịmma gị.” (Amaokwu 13) N’ezie, iwu niile Jehova nyere, ya bụ, ihe niile ọ chọrọ anyị n’aka, bụ maka ọdịmma anyị. Otú ahụ ka o kwesịrị ịdị. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) N’ihi ya, naanị iwu ndị ọ na-enye anyị bụ iwu ndị ga-eme ka ihe dịrị anyị ná mma ruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 48:17) Ime ihe niile Jehova chọrọ n’aka anyị ga-eme ka anyị zere ọtụtụ nsogbu ugbu a, meekwa ka anyị nweta ngọzi ebighị ebi n’ọdịnihu mgbe Alaeze ya ga-achịwa. *

A bịa n’ikpebi ma ànyị ga-erube isi n’ihe Jehova chọrọ anyị n’aka ma ọ bụ na anyị agaghị erube, naanị otu ihe ga-egosi na anyị maara ihe. Ihe kacha mma ime mgbe niile bụ iji obi anyị dum rubere ya isi. Ikwesị ntụkwasị obi otú ahụ na-eme ka anyị na-abịarukwu Jehova nso, bụ́ Chineke hụrụ anyị n’anya nke na-ebu ọdịmma anyị n’obi mgbe niile.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị Izrel oge ochie ka Mozis gwara okwu ahụ, ihe o kwuru gbasakwara ndị niile chọrọ ime ihe dị Chineke mma n’oge anyị a.—Ndị Rom 15:4.

^ par. 6 N’akwụkwọ Diuterọnọmi dum, Mozis mere ka ọ pụta ìhè na egwu Chineke kwesịrị iduzi ndụ ndị ohu Chineke.—Diuterọnọmi 4:10; 6:13, 24; 8:6; 13:4; 31:12, 13.

^ par. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu nke a, gụọ isi nke 3, bụ́ “Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?” n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.