Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Codex Vatikan Ji Bụrụ Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa?

Gịnị Mere Codex Vatikan Ji Bụrụ Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa?

Gịnị Mere Codex Vatikan Ji Bụrụ Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa?

E NWERE ọtụtụ ihe ndị dị oké ọnụ ahịa na Vatikan. A na-ele ihe osise, ihe a tụrụ atụ, na ihe owuwu ndị dị na ya anya dị ka ihe ndị dị oké ọnụ ahịa n’ihi otú ha si maa mma. Ma, ruo ọtụtụ narị afọ, e kwechaghị ka ndị mmadụ hụ otu n’ime ihe ndị kacha oké ọnụ ahịa dị na ya. Otu ihe odide oge ochie dị oké ọnụ ahịa nke na-eme ka a ghọtakwuo akụkụ dị iche iche nke Okwu Chineke, bụ́ nke e dere ọtụtụ puku afọ gara aga, dị n’Ọ́bá Akwụkwọ Vatikan. A na-akpọ ihe odide ahụ Codex Vatikan. *

A kọchara akụkọ ndị na-atọ ụtọ banyere otú e si chọta ma chebe Codex Alexandrine na nke Sinaitic, bụ́ ihe odide Baịbụl oge ochie abụọ ndị ọzọ ndị ọkà mmụta na-akwanyere ùgwù. Ma, a machaghị ebe e si nweta Codex Vatikan.

Akụ̀ Di Oké Ọnụ Ahịa E Zoro Ezo

Olee ebe e si nweta Codex Vatikan? Ebe mbụ a hụrụ aha akwụkwọ a bụ n’akwụkwọ ebe e dere aha akwụkwọ ndị e nwere n’Ọ́bá Akwụkwọ Vatikan na narị afọ nke iri na ise. Ndị ọkà mmụta ekwuola na o nwere ike ịbụ n’Ijipt, Sesaria, ma ọ bụ ọbụna na Rom ka e dere ya. Ma, mgbe Prọfesọ J. Neville Birdsall nke Mahadum Birmingham, England, tụlechara ihe ndị a ha kwuru, o kwubiri, sị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ejighị n’aka mgbe e dere Codex Vaticanus ma ọ bụ ebe a nọ dee ya, n’agbanyeghịkwa mgbalị niile ndị ọkà mmụta merela, ọ dịghị onye ji n’aka na ọ dị adị tupu narị afọ nke iri na ise.” N’agbanyeghị nke a, e kwuola na Codex Vatikan bụ otu n’ime ihe odide Baịbụl oge ochie ndị kacha mkpa e nwere. N’ihi gịnị?

N’ime ọtụtụ narị afọ, ụfọdụ ndị na-edepụtaghachi Baịbụl dehiere ihe ụfọdụ na ya. Ya mere, nsogbu ndị nsụgharị ndị chọrọ ịsụgharị Baịbụl otú ahụ e si dee ya n’oge ochie na-enwe bụ ịchọta ihe odide Baịbụl ndị a na-edehieghị ihe na ha. Chezienụ echiche otú o si gụsie ndị ọkà mmụta agụụ ike ịhụ ihe odide Codex Vatikan, bụ́ ihe odide Grik e dere na narị afọ nke anọ Oge Anyị, ihe na-erughị narị afọ atọ e dechara Baịbụl. Codex a nwere Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst zuru ezu ma e wezụga ebe ole na ole furu efu ka oge na-aga.

Ruo ogologo oge, ndị isi Vatikan achọghị ka ndị ọkà mmụta Baịbụl gụọ codex ahụ. Otu ọkà mmụta a ma ama nke na-enyocha ihe odide Baịbụl, bụ́ Sir Frederic Kenyon, kọrọ, sị: “N’afọ 1843, mgbe [ọkà mmụta Baịbụl bụ́ Konstantin von] Tischendorf cherela ọtụtụ ọnwa, e kwere ka ọ gụọ ya awa isii. . . . N’afọ 1845, e kwere nnọọ ka onye England bụ́ Tregelles, bụ́ ọkà mmụta a ma ama, gụọ ya, ma, e kweghị ka o si na ya dere otu mkpụrụ okwu.” Tischendorf rịọrọ ka ọ hụ codex a ọzọ, ma mgbe o si na ya dee ihe ruru peeji iri abụọ, e gbochiri ya ịhụ ya. Kenyon kọrọ na n’agbanyeghị nke ahụ, “arịrịọ [Tischendorf] rịọkwuru mere ka e nyekwuo ya ụbọchị isii ọzọ iji gụọ ya, bụ́ nke mere ka ụbọchị niile o ji gụọ ya bụrụ ụbọchị iri na anọ, awa atọ kwa ụbọchị; ebe ọ bụkwa na Tischendorf ji obere oge e nyere ya mee ihe nke ọma, n’afọ 1867, o bipụtara ihe odide ahụ nke kacha zuo ezuo e bipụtatụrụla.” Ndị isi Vatikan mechara bipụtara ndị mmadụ codex ahụ nke ka mma.

‘E Ji Nlezianya Depụtaghachi Ya’

Olee ihe a chọpụtara banyere ihe odide Codex Vatikan? Akwụkwọ bụ́ The Oxford Illustrated History of the Bible kwuru na “a sụpere okwu ndị dị na ya n’otu ụzọ n’ebe niile ha pụtara, e dehieghịkwa ihe na ya, bụ́ nke gosiri na e ji nlezianya dee ihe ndị dị na ya.” Otu akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “N’ihi ya, e nwere ike ikwubi na ndị depụtaghachiri ihe odide ahụ bụ aka ochie.”

Otú e si dee Codex Vatikan masịrị nnọọ ndị ọkà mmụta abụọ a ma ama, bụ́ B. F. Westcott na F.J.A. Hort. Ọ ka bụ na Baịbụl ha bụ́ New Testament in the Original Greek, nke ha bipụtara n’afọ 1881, nke dabeere n’ihe odide Vatikan na nke Sinaitic, ka ọtụtụ ndị na-asụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst taa na-elere anya, ọ bụkwa na ya ka e si sụgharịa Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na The Emphasised Bible nke J.  B. Rotherham sụgharịrị.

Ma, ụfọdụ ndị nkatọ chere na Westcott na Hort ekwesịghị ịtụkwasị Codex Vatikan obi otú ahụ. Ihe e dere na codex ahụ ọ̀ bụ kpọmkwem ihe dị na Baịbụl oge ochie? Mbipụta e bipụtara ihe odide papaịrọs Bodmer n’agbata afọ 1956 na 1961 masịrị nnọọ ndị ọkà mmụta n’ihi na papaịrọs ahụ nwere akụkụ ụfọdụ nke Luk na Jọn, bụ́ ndị e depụtaghachiri ná mmalite narị afọ nke atọ Oge Anyị. Hà ga-akwado ihe e mechara dee na Codex Vatikan?

Philip B. Payne na Paul Canart dere n’akwụkwọ ha bụ́ Novum Testamentum, sị: “Ihe odide Vaticanus na ihe odide papaịrọs Bodmer ndị e nwere taa yiri nnọọ. N’ihi otú a ha si yie, anyị nwere nnọọ ike ikwu na odeakwụkwọ nke depụtaghachiri ihe odide Vaticanus si n’ihe odide yiri nke papaịrọs Bodmer depụtaghachi ya. Ihe nke a pụtara bụ na ọ ga-abụrịrị na odeakwụkwọ ahụ si n’ihe odide merela ezigbo ochie depụtaghachi ya, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na o si na nke e si n’ihe odide merela ezigbo ochie depụta depụtaghachi nke ya.” Prọfesọ Birdsall kwuru, sị: “Ihe odide abụọ ahụ yiri nnọọ ibe ha. . . . [Codex ahụ] bụ akwụkwọ e ji nlezianya depụtaghachi: ndị depụtaghachiri ya bụ aka ochie n’idepụtaghachi ihe otú ọ dị.”

Ọ Baara Ndị Nsụgharị Uru

Ọ bụkwanụghị mgbe niile ka ihe odide kacha ochie na-akacha eyi ihe odide mbụ nke Baịbụl. Ma, iji Codex Vatikan tụnyere ihe odide ndị ọzọ enyerela ndị ọkà mmụta aka ịmata ihe e dere n’ihe odide mbụ nke Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ ndị kọrọ akụkọ ihe mere eme, malite na Jenesis ruo n’Ihe E Mere nke Mbụ, adịghị n’Ihe Odide Sinaitic a ka nwere taa, bụ́ nke e dekwara na narị afọ nke anọ Oge Anyị. Ma, ebe ọ bụ na ha dị na Codex Vatikan, o gosiri na ha so n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl.

Akwụkwọ bụ́ The Oxford Illustrated History of the Bible kwuru na ndị ọkà mmụta enweghị nkwekọrịta, karịsịa “banyere amaokwu ndị kwuru maka Kraịst na Atọ n’Ime Otu dị nsọ.” Olee otú Codex Vatikan sirila mee ka a ghọta amaokwu ndị ahụ?

Ka anyị leba anya n’otu ihe atụ. Jizọs kwuru na Jọn 3:13, sị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgowooro n’eluigwe ma e wezụga onye ahụ nke si n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ.” Ụfọdụ ndị nsụgharị tinyere ya okwu ndị bụ́ “nke [ma ọ bụ, onye] nọ n’eluigwe.” Okwu ndị ahụ ha tinyere na-egosi na Jizọs nọ n’eluigwe nọrọkwa n’ụwa n’otu mgbe ahụ, bụ́ echiche na-akwado Atọ n’Ime Otu. Okwu ndị ahụ ha tinyere dị n’ihe odide ole na ole e dere na narị afọ nke ise na nke iri Oge Anyị. Ma, ebe ọ bụ na okwu ndị ahụ adịghị n’ihe odide oge ochie nke Vatikan na nke Sinaitic, ọtụtụ ndị nsụgharị n’oge a ewepụla ha ná nsụgharị ha. Nke a mere ka a ghọta onye Kraịst bụ nke ọma, meekwa ka amaokwu ahụ kwekọọ n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ. Kama ịnọ n’ebe abụọ n’otu mgbe, Jizọs si n’eluigwe bịa, n’oge na-adịghị anya, ọ ga-alaghachikwa n’eluigwe, ‘rịgokwuru’ Nna ya.—Jọn 20:17.

Codex Vatikan nyekwaara anyị aka ịghọtakwu amaokwu Baịbụl ndị kwuru banyere nzube Chineke maka ụwa. Lee otu ihe atụ. Dị ka Bible Nsọ nke Union Version si kwuo, Pita onyeozi buru amụma na ‘ụwa na ọrụ nile a rụrụ n’ime ya ga-erechapụkwa.’ (2 Pita 3:10) Nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ dekwara ihe yiri nke a, ebe ha sikwa nweta ya bụ n’ihe odide Codex Alexandrine nke e dere na narị afọ nke ise na ihe odide ndị e dere mgbe e dechara ya. N’ihi ya, ọtụtụ ndị ji ezi obi na-agụ Baịbụl ekwerela na Chineke ga-ebibi ụwa.

Ma, ihe dị ka otu narị afọ tupu e dee Codex Alexandrine, Codex Vatikan (na nke e dere ya na ya otu mgbe bụ́ Ihe Odide Sinaitic) si otú a sụgharịa amụma Pita ahụ, “a ga-ekpughekwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya.” Nke a na amaokwu Baịbụl ndị ọzọ hà kwekọrọ? Eenụ! Ụwa nkịtị ‘agaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 104:5) Oleezi otú a ga-esi ‘ekpughe ụwa’? Amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ na-egosi na e nwere ike iji “ụwa” kwuo okwu n’ụzọ ihe atụ. “Ụwa” nwere ike ịsụ asụsụ, bụọkwa abụ. (Jenesis 11:1; Abụ Ọma 96:1) N’ihi ya, “ụwa” nwere ike ịpụta ụmụ mmadụ. Ọ́ bụghị ihe na-akasi obi ịmara na Chineke agaghị ebibi mbara ụwa anyị, kama na ọ ga-ekpughe ma wepụ ajọ omume na ndị na-eme ya?

Ọ “Ga-adịgide Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

Ọ dị mwute na e kwechaghị nnọọ ka ndị mmadụ gụọ Codex Vatikan ruo ọtụtụ narị afọ, bụ́kwa nke mere ka ndị na-agụ Baịbụl na-aghọtahie ihe amaokwu Baịbụl ụfọdụ pụtara. Ma, kemgbe e bipụtara Codex Vatikan, ya na nsụgharị Baịbụl ndị ọhụrụ e nwere ike ịtụkwasị obi enyerela ndị na-achọ eziokwu aka ịmata ihe Baịbụl na-akụzi n’ezie.

Ndị depụtaghachiri ọtụtụ ihe odide oge ochie na-etinyekarị okwu ndị a n’ihe odide ha: “Aka dere [ihe a] na-erekasị n’ili, ma ihe o dere ga-anọ site n’afọ ruo n’afọ.” Taa, obi dị anyị ụtọ maka mbọ dị ukwuu ndị ahụ anyị na-amaghị aha ha gbara iji depụtaghachi ihe odide ndị ahụ. Ma, onye anyị na-ekele karịchaa maka ichebe Baịbụl bụ Onye chepụtara ya, bụ́ onye si n’ike mmụọ nsọ mee ka onye amụma ya dee n’oge dị anya gara aga, sị: “Ahịhịa ndụ akpọnwụwo, okooko ya achanwụwo; ma okwu Chineke anyị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịzaya 40:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha ọzọ a na-akpọ Codex Vatikan bụ Vatican Manuscript 1209 ma ọ bụ Codex Vaticanus, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta na-ejikwa mkpụrụ okwu bụ́ “B” edochi anya ya. Codex bụ ụdị akwụkwọ mbụ e nwere. Gụọ isiokwu bụ́, “Site n’Akwụkwọ Mpịakọta Gaa na Codex—Otú Bible Si Dịrị n’Ụdị Akwụkwọ,” n’Ụlọ Nche June 1, 2007.

[Igbe dị na peeji nke 20]

Ikwu Mgbe E Dere Ihe Odide Oge Ochie

Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị depụtaghachiri Baịbụl dere oge ha dechara ihe odide ha, ihe ka ọtụtụ n’ihe odide Grik ebughị oge e dechara ha. Oleezi otú ndị ọkà mmụta si amata mgbe e dere ihe odide Baịbụl? Otú ahụ asụsụ na ihe osise nke otu ọgbọ na-adị iche na nke ọgbọ ọzọ, otú ahụkwa ka aka akwụkwọ na-adị iche site n’otu ọgbọ gaa n’ọgbọ ọzọ. Dị ka ihe atụ, e ji otu ụdị aka akwụkwọ ndị Gris nke mkpụrụ akwụkwọ ya na-agba okpotokpo ma dị n’ahịrị n’ahịrị dee ihe site na narị afọ nke anọ ruo ọtụtụ narị afọ sochiri ya. Ndị ọkà mmụta anya ruru ala nweziri ike ịmatakwu nnọọ kpọmkwem mgbe e dere ihe odide oge ochie ndị e ji ụdị aka akwụkwọ ahụ dee site n’iji ndị nke e dere oge e dere ha tụnyere ndị yiri ha a na-edeghị oge e dere ha.

Ma, ọ bụghị mgbe niile ka nke a na-enyere ha aka. Prọfesọ Bruce Metzger, nke Ụlọ Akwụkwọ Seminarị dị na Princeton, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na aka akwụkwọ mmadụ anaghị agbanwecha n’oge ndụ ya, o zighị ezi ilekwasị ihe na-erughị afọ iri ise anya kwuo mgbe e dere akwụkwọ.” Ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta kwekọrịtara na e dere Codex Vatikan na narị afọ nke anọ Oge Anyị mgbe ha jisiri nlezianya tụlee ihe ndị a.