Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ònye bụ “onyeisi ndị nche ụlọ nsọ,” oleekwa ihe bụ́ ọrụ ya?

Otu n’ime ndị ndú okpukpe ndị Juu bụ́ ndị jidere ndịozi bụ́ Pita na Jọn mgbe ha na-ekwusa ozi ọma bụ “onyeisi ndị nche ụlọ nsọ.” (Ọrụ 4:1-3) Baịbụl ekwughị ihe bụ́ ọrụ onyeisi ndị nche ụlọ nsọ, ma ihe ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru mere ka anyị ghọtatụ ọrụ ya.

O yiri ka mgbe Jizọs nọ n’ụwa, onye na-arụ ọrụ a ọ̀ bụ onye nchụàjà nke na-esote nnukwu onye nchụàjà. Onyeisi ndị nche ụlọ nsọ na-ahụ na udo dị n’ụlọ nsọ Jeruselem nakwa n’ogige ya. Ọ bụ ya na-ahụ maka ofufe a na-efe n’ụlọ nsọ ahụ, na-ahụkwa maka ndị e nwere ike ịkpọ ndị uwe ojii ụlọ nsọ. Ndị isi nọ n’okpuru ya na-elekọta ndị nche ndị na-emepe ọnụ ụzọ ụlọ nsọ n’ụtụtụ ma na-emechi ha n’abalị, na-ahụkwa na o nweghị onye banyere n’ebe a na-achọghị ka ndị mmadụ banye ma na-eche akụ̀ ndị dị n’ụlọ nsọ nche.

A haziri ndị nchụàjà na ndị Livaị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ ìgwè iri abụọ na anọ, ìgwè nke ọ bụla na-ejekwa ozi otu izu n’otu mgbe, ugboro abụọ n’afọ. Ọ dị ka ìgwè nke ọ bụla ò nwere onyeisi nke ya.—1 Ihe E Mere 24:1-18.

Ndị isi ndị nche ụlọ nsọ bụ ndị a ma ama. A kpọrọ ha aha mgbe a na-ekwu banyere ndị isi nchụàjà, bụ́ ndị gbara izu ka e gbuo Jizọs, ọ bụkwa ha dunyere ndị nọ n’okpuru ha ka ha gaa jide Jizọs.—Luk 22:4, 52.

Matiu 3:4 kwuru na Jọn Onye Na-eme Baptizim riri “igurube na mmanụ aṅụ ọhịa.” Igurube ọ̀ bụ nri ndị mmadụ na-erikarị n’oge ahụ?

Ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ma ọ̀ bụkwa igurube ka Jọn riri, na-ekwu na ihe Matiu na-ekwu na o riri bụ mkpụrụ nke osisi a na-akpọ locust tree, mkpụrụ osisi na-amị n’ọhịa, ma ọ bụkwanụ ọbụna ụdị azụ̀ dị iche iche. Ma, okwu Grik Matiu dere n’amaokwu ahụ bụ aha otu ụdị igurube nke a na-akpọ Acrididae taa. Ụdị igurube a kacha mara amara n’Izrel bụ ụdị na-anọ n’ọzara, bụ́ nke a maara na-agbakọ aka eripịa ihe ọkụkụ.—Joel 1:4, 7; Nehọm 3:15.

Ndị Asiria na ndị Itiopia oge ochie weere igurube dị ka ezigbo ihe oriri, ndị Arab Bedouin na ndị Juu Yemen ka na-erikwa ya taa. N’Izrel, e weere igurube dị ka nri ndị ogbenye. Mgbe e wepụchara isi ya, ụkwụ ya, na afọ ya, a na-eri etiti ya ná ndụ ma ọ bụ a hụọ ya n’ọkụ, ma ọ bụkwanụ rie ya mgbe a mịkpọchara ya n’anwụ. Mgbe ụfọdụ, a na-etinye igurube nnu ma ọ bụkwanụ tinye ya ná mmanya gbara ụka ma ọ bụ mmanụ aṅụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Henri Daniel-Rops kwuru na ọ na-atọtụ ka oporo.

Ebe ọ bụ na Jọn kwusara ozi ọma n’ala ịkpa, ọ ga-abụ na ọ dịịrị ya mfe inweta igurube. (Mak 1:4) Igurube na mmanụ aṅụ bụ nri na-enye ezigbo ihe n’ahụ́ n’ihi na igurube nwere ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke protein ahụ́ mmadụ chọrọ.

[Foto dị na peeji nke 28]

Ebe ndị ozi bụ́ ndị Asiria bu igurube na pọmigranet

[Ebe E Si Nweta Foto]

E nwetara ya n’akwụkwọ bụ́ Discoveries Among the Ruins of Nineveh and Babylon (1853)