Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịlụ Agha Ò Kwekọrọ n’Ozizi Ndị Kraịst?

Ịlụ Agha Ò Kwekọrọ n’Ozizi Ndị Kraịst?

Ịlụ Agha Ò Kwekọrọ n’Ozizi Ndị Kraịst?

“Olee iwu kwuru na ịlụ agha bụ ihe ọjọọ ma ọ bụkwanụ mmehie? Ajụjụ a adịtụghị mfe ọzịza.”—OLIVER O’DONOVAN, PRỌFESỌ NKÀ MMỤTA AKPARAMÀGWÀ NDỊ KRAỊST

N’OTU ihe osise a kpọrọ Ịchụàjà, bụ́ nke e sere n’ihi ihe mere n’Agha Ụwa Mbụ, nke e kowere n’Ụlọ Ndebe Ihe Ochie nke Canada, e nwere ndị soja e gburu egbu, ndị soja si agha na-alọta ike gwụchara, na ndị ezinụlọ ha nọ n’ụlọ. N’elu ya, e sere Jizọs Kraịst, ebe a kpọgidere ya n’obe. Akpata oyi na-awụ ụfọdụ ndị kiriri ihe osise a na e sere Jizọs, bụ́ “Onyeisi Udo,” n’ebe e sere agha ụmụ mmadụ. (Aịzaya 9:6) Ndị ọzọ, bụ́ ndị obi dị ụtọ maka mbọ ndị obodo ha gbaara ha, chere na Chineke na Ọkpara ya chọrọ ka Ndị Kraịst na-alụ agha iji chebe mba ha.

Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị ndú okpukpe ekwuola okwuchukwu na-akwado ịlụ agha. N’afọ 417 Oge Anyị, ọkà mmụta okpukpe bụ́ Augustine dere, sị: “Echela na o nweghị onye agha, nke ji ngwá agha alụ agha, Chineke nwere ike ịnabata. . . . Ndị ọzọ ji ekpere na-ebusoro unu ndị iro a na-anaghị ahụ anya agha, ebe unu na-ebusoro ha ndị ọjọọ a na-ahụ anya agha.” Na narị afọ nke iri na atọ, Thomas Aquinas kwuru na “agha dị mma ma zie ezie ma ọ bụrụhaala na o chebere ndị ogbenye na mba dum ka ndị iro ghara iji aghụghọ nweta ha.”

Olee ihe i chere? Ọ bụrụ na e bu ihe yiri ihe ọma n’uche buo agha, ya bụ, iji chebe mba ma ọ bụ iji mee ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha, Chineke ọ̀ ga-agọzi agha ahụ? Olee “iwu” ga-enyere Ndị Kraịst aka ịmata uche Chineke n’okwu a?

Ihe Nlereanya Jizọs Kraịst

Ànyị nwere ike ịmata uche Chineke n’isiokwu tara akpụ dị ka agha a na-alụ n’oge a? Pọl onyeozi ghọtara nsogbu anyị, jụọ, sị: “‘Ònye maara uche Jehova, ka o wee kụziere ya ihe?’ Ma anyị nwere uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrịnt 2:16) Iji nyere anyị aka, Jehova Chineke zitere Jizọs n’ụwa ka anyị soro ihe nlereanya ya. Ihe Jizọs kwuru ma mee gosiri ihe bụ́ echiche na ụzọ Jehova. Ya mere, olee ihe Jizọs kwuru banyere ịlụ agha? Olee ebe ọ kwụ n’ihe banyere agha?

O yiri ka o nweghị ihe ga-akacha eme ka a lụọ agha karịa ịlụ ya iji chebe Jizọs Kraịst. Otu n’ime ndịozi ya chere otú ahụ. Mgbe a raara Jizọs nye, ìgwè mmadụ ji ngwá agha ejidekwa ya n’etiti abalị, enyi ya bụ́ Pita “mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà wee bepụ ya ntị.” Ihe ahụ Pita mere ò ziri ezi? Jizọs gwara Pita, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.”—Matiu 26:47-52.

Ihe a Jizọs zara ejughị anyị anya. Afọ abụọ tupu ihe a emee, o kwuru, sị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya ma kpọọ onye iro gị asị.’ Otú ọ dị, ana m asị unu: Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe, n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:43-45) Ezi uche ọ̀ dị n’iche na Onye Kraịst nwere ike ịhụ ndị iro ya n’anya ma na-ekpere ha ekpere ma n’otu mgbe ahụ, na-ebuso ha agha?

Akụkọ ihe mere eme na-egosi na Ndị Kraịst nwere ọtụtụ ndị iro. Dị ka ihe atụ, ndị Rom mara Jizọs Kraịst ikpe ma gbuo ya. N’oge na-adịghị anya ha mechara nke a, naanị mmadụ ikwu na ya bụ Onye Kraịst nwere ike ịkpatara ya ọnwụ. Jizọs tụrụ anya na ọnọdụ nwere ike ime ka Ndị Kraịst chewe echiche iji ngwá agha lụọ ọgụ na inupụrụ ndị Rom isi n’ihi mmegbu ha na-emegbu ha, dị ka ụfọdụ ndị Juu merela. N’ihi ya, o kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:16) Ndị Kraịst họọrọ ịnọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. O nweghị ụdị ikpe mkpegbu e kpere ha ma ọ bụ egwu e yiri ha ma ọ bụ e yiri mba ha bi na ya ga-eme ka o zie ezie ha ịlụ agha.

Ndị Na-akwado Alaeze Chineke

Ezi Ndị Kraịst mere ihe Jizọs chọrọ ma nọpụ iche. Chegodị echiche banyere ihe mere n’Aịkoniọm, bụ́ obodo oge ochie dị n’Eshia Maịnọ. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ndị mba ọzọ na ndị Juu, tinyere ndị na-achị ha, gbara ajọ mbọ imenye [Pọl na Banabas] ihere na ịtụ ha nkume, mgbe a gwara ha banyere ya, ha gbagara n’obodo ndị dị na Likeonia, bụ́ Listra na Dabe na ógbè ndị dị ha gburugburu. Ha gakwara n’ihu na-ezisa ozi ọma n’ebe ndị ahụ.” (Ọrụ 14:5-7) Buru n’obi na mgbe e megidere Ndị Kraịst mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ, ha ejighị ngwá agha chebe onwe ha, ha emegwaraghịkwa. Kama nke ahụ, ha nọgidere na-ezisa “ozi ọma.” Olee ozi ọma ha zisara?

Ndị Kraịst zisara otu ozi ahụ Jizọs zisara. O kwuru, sị: ‘Aghaghịkwa m izisa ozi ọma alaeze Chineke.’ (Luk 4:43) Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwadoro Alaeze Chineke. Ọ dịghị mgbe Kraịst ji ndị agha mba chebe Alaeze ahụ. O kwuru, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.”—Jọn 18:36.

“Ọ Bụrụ na Unu Enwee Ịhụnanya n’Etiti Onwe Unu”

Ịnọpụ iche n’oge agha bụ ihe e ji mara ndị na-efe ezi ofufe. Jizọs kwuru, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ọtụtụ nde mmadụ nwere obi ụtọ mgbe ha chọtara ndị na-egosi ụdị ịhụnanya a, ọbụna mgbe a kwara ha emo, tụọ ha mkpọrọ, ma ọ bụkwanụ gbuo ha n’ihi na ha jụrụ ije agha.

Mgbe ndị Nazi weghaara Yurop, ndị ọchịchị tụrụ ihe dị ka puku Ndịàmà Jehova iri mkpọrọ maka na ha nọpụrụ iche dị ka Ndị Kraịst, tinyere ihe dị ka puku Ndịàmà atọ e zigara n’ogige ịta ahụhụ. Ka nke ahụ na-eme, a tụrụ ihe karịrị puku Ndịàmà anọ na narị atọ mkpọrọ na United States maka ịjụ ịbanye ọrụ soja. Ma Ndịàmà bụ́ ndị Germany ma ndị nke America ekweghị iji ngwá agha lụso Ndị Kraịst ibe ha ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ agha. Oleekwanụ otú ha ga-esi ekwu na ha hụrụ onwe ha na mmadụ ibe ha n’anya ma ọ bụrụ na ha emee otú ahụ?

Ọtụtụ ndị chere na ịlụ agha bụ ụzọ dị mkpa mba si echebe onwe ya. Ma, chegodị echiche: Ọ bụ ezie na a kpagburu Ndị Kraịst narị afọ mbụ ajọ mkpagbu, ha ajụkwa ịlụso ndị na-akpagbu ha ọgụ, nke ahụ emeghị ka ha nwụchaa. Alaeze Ukwu Rom dị ike ekpochapụlighị Ndị Kraịst. Ezi Ndị Kraịst ka na-amụba ọbụna taa, ha nọgidekwara na-anọpụ iche. Kama ịlụso ndị iro ha ọgụ, ha nwere obi ike na Chineke ga-enyere ha aka. Okwu ya, bụ́ Baịbụl, kwuru, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’”—Ndị Rom 12:19.

[Igbe dị na peeji nke 30]

AGHA NDỊ CHINEKE GỌZIRI

Ọtụtụ narị afọ tupu e nwee Ndị Kraịst, e nyere Izrel oge ochie, bụ́ mba Chineke họọrọ ịbụ mba pụrụ iche, ikike n’oge ụfọdụ ka ha chịrị ndị agha gaa agha. Tupu ụmụ Izrel abanye Kenan, bụ́ ala Chineke kwere nkwa inye Ebreham, a gwara ha, sị: “Jehova bụ́ Chineke gị ga-enyefe [mba asaa] n’aka gị, ị ga-emerikwa ha. Hụ na i bibiri ha. Gị na ha agbala ndụ, emekwarala ha amara ọ bụla.” (Diuterọnọmi 7:1, 2) N’ihi ya, Ọchịagha Jọshụa nke Izrel meriri mba ndị ahụ bụ́ ndị iro ha “dị ka Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere n’iwu.”—Jọshụa 10:40.

Ndị Izrel hà ji obi ọjọọ merie mba ndị ọzọ ma jiri anyaukwu chịwa ha? Mbanụ. Ikpere arụsị, mwụfu ọbara, na mmekọahụ rụrụ arụ juru ná mba ndị ahụ. E suredịrị ụmụaka n’ọkụ dị ka àjà. (Ọnụ Ọgụgụ 33:52; Jeremaya 7:31) Ịdị nsọ Chineke, ikpe ziri ezi ya, na ịhụnanya o nwere maka ndị ya kpaliri ya iwepụ adịghị ọcha niile n’ala ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nyochara obi mmadụ niile, bụ́ ihe ọ na-adịghị ọchịagha nwere ike ime ya taa, ma hapụ ndị dị njikere ịgbanwe ụzọ ọjọọ ha ma fee ya.

[Foto dị na peeji nke 31]

Jizọs ọ̀ tụrụ anya ka ndị na-eso ụzọ ya lụọ agha iji chebe ya ma ọ bụ Ndị Kraịst ibe ha?

[Foto dị na peeji nke 31]

Ìgwè Ndịàmà Jehova, mgbe a tọhapụchara ha n’ogige ịta ahụhụ Buchenwald n’afọ 1945