Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Echiche Ụgha nke 6: Chineke Chọrọ Ka E Jiri Ihe Oyiyi na Ihe Osise Na-efe Ya Ofufe

Echiche Ụgha nke 6: Chineke Chọrọ Ka E Jiri Ihe Oyiyi na Ihe Osise Na-efe Ya Ofufe

Echiche Ụgha nke 6: Chineke Chọrọ Ka E Jiri Ihe Oyiyi na Ihe Osise Na-efe Ya Ofufe

Olee ebe echiche ụgha a si? “Ndị Kraịst oge mbụ ejighị ihe oyiyi fee ofufe . . . Ihe mere e ji webata ihe oyiyi na chọọchị na narị afọ nke anọ na nke ise bụ na e kwuru na ndị na-amaghị nke a na-akọ ga-aka esi na ha amụta banyere Iso Ụzọ Kraịst karịa ka ha ga-amụta n’okwuchukwu na n’akwụkwọ okpukpe.”—Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature, nke McClintock na Strong dere, Nke 4, peeji nke 503 na 504.

Gịnị ka Baịbụl kwuru? “Ị gaghị emere onwe gị ihe ọbụla n’ụdị oyiyi nke ihe dị n’eluigwe, na n’okpuru eluigwe maọbụ n’ụwa, maọbụ n’ime osimiri, maọbụ n’ime ala. Akpọla isiala nye ha maọbụ fee ha ofufe.” (Ọpụpụ 20:4, 5, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Jọn onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ ozi, sị: “Ụmụntakịrị, kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.”—1 Jọn 5:21.

Ihe oyiyi hà bụ nnọọ ihe e ji agakwuru ma na-akwanyere ihe ndị ha na-anọchi anya ha ùgwù, dị ka chọọchị dị iche iche na-ekwu? Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion kwuru, sị: “Na mbụ, o nwere ike ịbụ na isi ihe e ji ihe oyiyi mee bụ ịkụzi ihe na ịchọ ụlọ chọọchị mma; ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ bụ ihe ndị a sịrị na e ji ha mee. Ma n’oge na-adịghị anya, o doro onye ọ bụla anya na a maliteziri iji ha efe ofufe. Ndị nke a kacha eji efe ofufe bụ ihe osise ndị e ji mara Chọọchị Ọtọdọks nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ.” Ma, Aịzaya onye amụma jụrụ ajụjụ kwesịrị ekwesị, sị: “Ònye ka unu nwere ike iji Chineke tụnyere? Olee ihe oyiyi unu nwere ike ime, sị na o yiri ya?”—Aịzaya 40:18, The New Jerusalem Bible.

Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Aịzaya 44:13-19; Ọrụ 10:25, 26; 17:29; 2 Ndị Kọrịnt 5:7

NKE BỤ́ EZIOKWU:

Chineke achọghị ka e jiri ihe oyiyi na ihe osise na-efe ya ofufe

JỤ ECHICHE ỤGHA, JIDESIE EZIOKWU IKE

Olee ihe anyị nwere ike ikwubi banyere echiche ụgha ndị a anyị tụlere ná nkenke, bụ́ ndị a ka na-akụzi n’ọtụtụ chọọchị? “Akụkọ ifo” [Grik, myʹthos] ndị ahụ “mmadụ kọrọ site n’amamihe ya” enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere eziokwu Baịbụl dị mfe nghọta ma na-akasi obi.—2 Pita 1:16, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

N’ihi ya, jiri obi gị dum were Okwu Chineke, bụ́ isi iyi nke eziokwu, tụnyere ihe a kụziirila gị. (Jọn 17:17) I mee nke a, nkwa a ga-emezu n’isi gị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:32.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 9]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.