Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova Hà So n’Okpukpe Ndị Protestant?

Ndịàmà Jehova Hà So n’Okpukpe Ndị Protestant?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ndịàmà Jehova Hà So n’Okpukpe Ndị Protestant?

Ndịàmà Jehova anaghị ewere onwe ha na ha so n’okpukpe Protestant. N’ihi gịnị?

Okpukpe Protestant malitere na Yurop na narị afọ nke 16 mgbe a na-agba mbọ idozigharị Chọọchị Roman Katọlik. Ọ bụ ná Nzukọ nke Speyer e nwere n’afọ 1529 bụ mgbe mbụ a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Martin Luther ndị “Protestant.” Kemgbe ahụ, ọ ghọziri ihe a na-akpọ ndị niile na-eso ụkpụrụ Ndozigharị ahụ Martin Luther malitere. N’ihi ya, akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Merriam-Webster’s Collegiate Dictionary, Nke 11, kọwara na onye Protestant bụ “onye nọ na nke ọ bụla n’ime ọtụtụ chọọchị ndị na-ekwetaghị na e nyefere Poopu ikike kachanụ n’ụwa na onye na-akwado ụkpụrụ Ndozigharị ahụ bụ́ na naanị okwukwe ga-eme ka a zọpụta mmadụ, na onye ọ bụla bụ́ onye kwere ekwe bụ onye ụkọchukwu, nakwa na Baịbụl bụ o kwuchaa o bie n’ihe metụtara eziokwu sitere n’aka Chineke.”

Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova ekweghị na e nyere poopu ikike kachanụ n’ụwa, jirikwa obi ha dum kwere na Baịbụl bụ o kwuchaa o bie, e nwere ọtụtụ ụzọ pụtara ìhè ha si dị iche n’okpukpe Protestant. N’ezie, akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion kwuru na Ndịàmà Jehova “dị nnọọ iche n’okpukpe ndị ọzọ.” Ka anyị tụlee ụzọ atọ ha si dị iche.

Nke mbụ bụ na ọ bụ ezie na okpukpe Protestant ekweghị n’ihe dị iche iche ndị Katọlik na-akụzi, ndị malitere Ndozigharị ahụ ahapụghị ozizi ụfọdụ nke ndị Katọlik, dị ka Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, nakwa na mkpụrụ obi mmadụ anaghị anwụ anwụ. Ma, Ndịàmà Jehova kweere na ọ bụghị naanị na ozizi ndị ahụ na-emegide Baịbụl, kamakwa, na ha na-eme ka ndị mmadụ na-aghọtahie ụdị onye Chineke bụ.—Gụọ peeji nke 4 ruo nke 7 na magazin a.

Nke abụọ bụ na ihe okpukpe Ndịàmà Jehova na-eme abụghị ịgba ozizi okpukpe ọzọ ụkwụ, kama ha na-akụzi eziokwu dị na Baịbụl. Ha ji ndụmọdụ a Baịbụl nyere kpọrọ ihe: “O kwesịghị ka odibo nke Onyenweanyị bụrụ onye okwu na ụka, kama ọ ga-abụ onye nwere ndidi, ezi onyenkuzi, na onye ji nwayọọ emeso ndị mmadụ omume. Ọ ga-abụkwa onye ji nwayọọ na-agbaziri ndịiro ya.” (2 Timoti 2:24, 25, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Ndịàmà Jehova na-egosi ndị mmadụ ihe dị iche n’ihe Baịbụl kwuru na ihe ọtụtụ okpukpe na-akụzi. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ha bu n’obi eme ya abụghị idozigharị okpukpe ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ebumnobi ha bụ inyere ndị nwere ezi obi aka ịmata Chineke na Okwu ya, bụ́ Baịbụl, nke ọma. (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Mgbe ndị nọ n’okpukpe ndị ọzọ rụwara nnọọ Ndịàmà Jehova ụka, Ndịàmà na-ezere arụmụka na-enweghị isi.—2 Timoti 2:23.

Ihe nke atọ mere Ndịàmà Jehova ji dị iche n’okpukpe Protestant bụ na okpukpe Protestant ekewaala ghọọ ọtụtụ narị chọọchị, ma Ndịàmà Jehova ka dị n’otu n’ụwa niile dị ka ụmụnna. A bịa n’ozizi Baịbụl, Ndịàmà Jehova nọ na narị mba abụọ na iri atọ na-eso ndụmọdụ Pọl onyeozi nke bụ́ ka ha “na-ekwu otu ihe.” E nweghị nkewa n’etiti ha. Kama nke ahụ, ha ‘dị nnọọ n’otu n’otu obi na n’otu echiche.’ (1 Ndị Kọrịnt 1:10) Ha na-agbasi mbọ ike n’etiti onwe ha ‘ịnọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.’—Ndị Efesọs 4:3.