Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mee Ka Ekpere Gị Ka Mma Site n’Ịmụ Baịbụl

Mee Ka Ekpere Gị Ka Mma Site n’Ịmụ Baịbụl

Mee Ka Ekpere Gị Ka Mma Site n’Ịmụ Baịbụl

“Ewoo, Jehova, biko, ka ntị gị nụrụ ekpere ohu gị.”—NEH. 1:11.

1, 2. Olee ihe mere ịtụle ekpere ụfọdụ e dere na Baịbụl ga-eji baa uru?

IKPE ekpere na ịmụ Baịbụl bụ ihe ndị dị oké mkpa e ji mara ndị na-efe Chineke. (1 Tesa. 5:17; 2 Tim. 3:16, 17) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ ekpere, ma, e nwere ekpere ndị e dere na Baịbụl, ọtụtụ n’ime ha dịkwa n’akwụkwọ Abụ Ọma.

2 Ka ị na-agụ Baịbụl ma na-amụ ya, i nwere ike ịhụ ekpere ndị kwekọrọ n’ọnọdụ gị. N’ezie, ọ bụrụ na ị na-ekpe ekpere otú e si kpee ekpere ụfọdụ e dere n’Akwụkwọ Nsọ, ha ga-eme ka ekpere gị ka mma. Olee ihe i nwere ike ịmụta n’aka ndị a zara ekpere ha nakwa n’ihe ha kpere n’ekpere?

Chọọ Nduzi Chineke ma Gbasoo Ya

3, 4. Olee ozi Ebreham dunyere ohu ya, gịnịkwa ka anyị ga-amụta n’otú Jehova si mee ka ihe gaziere ya?

3 Ọ bụrụ na anyị na-amụ Baịbụl, anyị ga-amụta na anyị kwesịrị ịna-ekpeku Chineke ekpere ka ọ na-eduzi anyị. Tụlee ihe mere mgbe nna ochie bụ́ Ebreham zigara ohu ya nke kacha okenye, o nwere ike ịbụ Elịiza, ka ọ gaa Mesopotemia lụtara Aịzik nwaanyị nke na-atụ egwu Chineke. Ka ụmụ nwaanyị na-abịa isere mmiri, ohu ahụ kpere ekpere, sị: “Jehova . . . . Ihe ga-emekwa bụ na nwa agbọghọ nke m ga-asị, ‘Biko, butuo ite mmiri gị ka m ṅụrụtụ mmiri,’ onye ga-asịkwa m, ‘Ṅụọ, m ga-enyekwa kamel gị mmiri,’ ọ bụ onye a ka ị ga-enye ohu gị, bụ́ Aịzik; ka m jiri nke a mara na i gosiwo nna m ukwu ịhụnanya na-adịgide adịgide.”—Jen. 24:12-14.

4 A zara ekpere ohu Ebreham mgbe Ribeka nyere kamel ya mmiri. Ribeka mechara soro ya lawa Kenan wee ghọọ nwunye Aịzik hụrụ n’anya. Ọ bụ eziokwu na ị gaghị atụ anya ka Chineke nye gị ihe àmà pụrụ iche nke na-egosi na ọ nụrụ ekpere gị, ma, ọ ga na-eduzi gị ma ọ bụrụ na ị na-ekpeku ya ekpere ma kwe ka mmụọ nsọ ya na-edu gị.—Gal. 5:18.

Ekpere Na-eme Ka Anyị Kwụsị Ichegbu Onwe Anyị

5, 6. Olee ihe pụtara ìhè n’ekpere ahụ Jekọb kpere mgbe ọ na-aga izute Ịsọ?

5 Ekpere nwere ike ime ka anyị kwụsị ichegbu onwe anyị. Jekọb kpere ekpere mgbe ụjọ ji ya na ejima ya bụ́ Ịsọ ga-alụso ya ọgụ. Ọ sịrị: “Jehova, . . . erughị m eru inweta obiọma niile na ikwesị ntụkwasị obi niile i gosiworo ohu gị . . . Ana m arịọ gị, napụta m n’aka nwanne m nwoke, n’aka Isọ, n’ihi na ana m atụ ya egwu na ọ pụrụ ịbịa wakpo m, ma nne ma ụmụ. Gị onwe gị asịwokwa, ‘N’ezie, m ga-emeso gị ihe n’ụzọ dị mma, m ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka ájá dị n’oké osimiri, bụ́ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’”—Jen. 32:9-12.

6 N’agbanyeghị na e nwere ihe Jekọb mere mgbe o kpechara ekpere ahụ, Chineke zara ekpere ya n’ihi na ya na Ịsọ kpeziri. (Jen. 33:1-4) Gụọ arịrịọ ahụ nke ọma, ị ga-ahụ na ihe Jekọb mere abụghị naanị ịrịọ Chineke ka o nyere ya aka. O gosiri na ya nwere okwukwe ná Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, keleekwa Chineke maka obiọma o gosiri ya. È nwere ihe ndị na-eme ka i “nwee egwu n’ime”? (2 Kọr. 7:5) Ọ bụrụ na e nwere, ekpere Jekọb nwere ike ichetara gị na ekpere nwere ike ime ka ị kwụsị ichegbu onwe gị. Ma, ọ bụghị naanị arịrịọ ka anyị kwesịrị ịna-ekpe n’ekpere kamakwa, ekpere anyị kwesịrị igosi na anyị nwere okwukwe.

Na-ekpe Ekpere Ka E Nye Gị Amamihe

7. Olee ihe Mozis ji kpee ekpere ka Jehova mee ka ya mara ụzọ ya?

7 Ọchịchọ i nwere ime ihe na-amasị Jehova kwesịrị ime ka i kpee ekpere ka o nye gị amamihe. Mozis kpere ekpere ka Chineke mee ka ọ mara ụzọ ya. Ọ rịọrọ, sị: “Lee, ị na-asị m, ‘Duru ndị a [si n’Ijipt] gbagoo’ . . . Ugbu a, biko, ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, mee ka m mara ụzọ gị, ka m wee mara gị, ka ihe m wee masị gị.” (Ọpụ. 33:12, 13) Chineke zara Mozis ekpere ya site n’ime ka ọ marakwuo ụzọ ya, nke bụ́ ihe dị ya mkpa ka o wee nwee ike idu ndị Jehova.

8. Olee otú i nwere ike isi rite uru n’ịtụgharị uche n’ihe e dere ná 1 Ndị Eze 3:7-14?

8 Devid kpekwara ekpere, sị: “Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị.” (Ọma 25:4) Nwa Devid bụ́ Sọlọmọn rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe nke ga-eme ka ya nwee ike ịchị Izrel nke ọma. Jehova nụrụ ekpere Sọlọmọn wee nye ya ihe ọ rịọrọ, nyekwa ya akụnụba na ebube. (Gụọ 1 Ndị Eze 3:7-14.) Ọ bụrụ na e nye gị ọrụ yiri ka ọ̀ karịrị gị n’ọgbakọ, kpekuo Chineke ekpere ka o nye gị amamihe, dịkwa umeala n’obi. Ọ bụrụ na i mee otú a, Chineke ga-eme ka ị mara otú ị ga-esi arụ ya, ọ ga-enyekwara gị aka ka i jiri amamihe na ịhụnanya rụọ ya otú kwesịrị ekwesị.

Si n’Ala Ala Obi Gị Kpee Ekpere

9, 10. Olee ihe dị mkpa ị chọpụtara n’otú Sọlọmọn si kwuo banyere obi ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-ekpe ekpere ahụ o ji rara ụlọ nsọ nye Chineke?

9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-aza ekpere anyị, anyị aghaghị isi n’ala ala obi na-ekpe ya. Sọlọmọn kpere ekpere si n’ala ala obi, bụ́ nke e dere ná Ndị Eze nke Mbụ isi asatọ, n’ihu ndị gbakọtara na Jeruselem mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ nye Jehova n’afọ 1026 T.O.A. Sọlọmọn toro Chineke mgbe a dọsara igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’Ebe Kasị Nsọ, ígwé ojii Jehova ejupụtakwa n’ụlọ nsọ ahụ.

10 Leruo ekpere ahụ Sọlọmọn kpere anya ma hụ otú o si kwuo banyere obi ọtụtụ ugboro. Sọlọmọn kwuru na ọ bụ naanị Jehova ma ihe dị mmadụ n’obi. (1 Eze 8:38, 39) Ekpere ahụ gosikwara na olileanya dịịrị onye mmehie nke ‘ji obi ya dum lọghachikwute Chineke.’ Ọ bụrụ na ndị iro adọrọ ndị Chineke n’agha, ọ ga-anụ ekpere ha ma ọ bụrụ na obi ha dum dị n’ebe ọ nọ. (1 Eze 8:48, 58, 61) N’ihi nke a, i kwesịrị isi n’ala ala obi gị na-ekpe ekpere.

Otú Abụ Ọma Nwere Ike Isi Mee Ka Ekpere Gị Ka Mma

11, 12. Olee ihe ị mụtara n’ekpere otu onye Livaị kpere mgbe ọ na-enweghị ike ịga n’ụlọ nsọ Chineke?

11 Ịmụ akwụkwọ Abụ Ọma nwere ike ime ka ị mara otú ị ga-esi na-ekpe ekpere, o nwekwara ike inyere gị aka ichere ka Chineke za ekpere gị. Cheedị banyere ndidi otu onye Livaị a dọọrọ n’agha nwere. Ọ bụ ezie na o nweghị ike ịga n’ụlọ nsọ Jehova n’oge ahụ, ọ bụrụ abụ, sị: “Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà, gịnịkwa mere i ji na-agba ghara ghara n’ime m? Chere Chineke, n’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu nakwa dị ka Chineke m.”—Ọma 42:5, 11; 43:5.

12 Olee ihe i nwere ike ịmụta n’aka onye Livaị ahụ? Ọ bụrụ na a tụọ gị mkpọrọ n’ihi na ị na-efe Jehova, nke a emeekwa ka ị ghara iso ụmụnna gị nọrọ n’ebe ha nọ na-efe Jehova, jiri ndidi chere ka Chineke gbatara gị ọsọ enyemaka. (Ọma 37:5) Ka ị ‘na-echere Chineke’ ka o mee ka i soroghachi ndị ya na-efe ya, na-atụgharị uche n’ihe ndị nyere gị ọṅụ n’ozi Chineke n’oge gara aga, na-ekpekwa ekpere ka Jehova nyere gị aka ịtachi obi.

Jiri Okwukwe Na-ekpe Ekpere

13. Dị ka Jems 1:5-8 gosiri, olee ihe mere i ji kwesị iji okwukwe na-ekpe ekpere?

13 N’agbanyeghị ihe bụ́ nsogbu gị, jiri okwukwe na-ekpe ekpere mgbe niile. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara gị, mee ihe Jems onye na-eso ụzọ Jizọs dụrụ anyị ọdụ ka anyị mee. Kpekuo Jehova ekpere, enwekwala obi abụọ ma ò nwere ike inye gị amamihe ị ga-eji die ọnwụnwa bịaara gị. (Gụọ Jems 1:5-8.) Chineke ma banyere ihe ọ bụla na-enye gị nsogbu n’obi, o nwekwara ike iji mmụọ nsọ ya duzie gị ma kasie gị obi. Jiri okwukwe gwa ya otú obi dị gị, “n’enweghị obi abụọ ma ọlị,” kwe ka mmụọ nsọ ya na-eduzi gị, narakwa ndụmọdụ sitere n’Okwu ya.

14, 15. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na Hana mere ihe gosiri na o nwere okwukwe?

14 Hana, bụ́ otu n’ime ụmụ nwaanyị abụọ Elkana onye Livaị lụrụ, kpere ekpere ma mee ihe gosiri na o nwere okwukwe. Hana amụghị nwa, nwunye di ya bụ́ Penina, onye mụrụ ọtụtụ ụmụ, na-akwakwa ya emo. Mgbe Hana ruru n’ụlọikwuu Chineke, o kwere ya nkwa na ọ bụrụ na ya amụta nwa nwoke, ya ga-enye ya Jehova. Ebe egbugbere ọnụ ya nọ na-emegharị mgbe ọ na-ekpe ekpere, Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ilaị, chere na mmanya na-egbu ya. Mgbe ọ chọpụtara na mmanya anaghị egbu ya, ọ sịrị: “Ka Chineke Izrel meekwara gị ihe ị rịọrọ ya.” N’agbanyeghị na Hana amaghị kpọmkwem ihe ga-emecha mee, obi siri ya ike na Chineke ga-aza ekpere ya. N’ihi ya, “ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.” O nweghịzi mwute.—1 Sam. 1:9-18.

15 Mgbe Hana kwụsịrị Samuel ara, ọ kpọgaara ya Jehova ka o jewere ya ozi dị nsọ n’ụlọikwuu ahụ. (1 Sam. 1:19-28) Ọ bụrụ na i chebara ekpere o kpere mgbe ahụ echiche, ọ ga-eme ka ekpere gị ka mma, nyekwara gị aka ịhụ na i nwere ike ịkwụsị inwe mwute mgbe ihe na-esiri gị ike ma ọ bụrụ na gị ekpee ekpere ma nwee okwukwe na Jehova ga-aza ekpere gị.—1 Sam. 2:1-10.

16, 17. Gịnị mere mgbe Nehemaya kpere ekpere ma mee ihe gosiri na o nwere okwukwe?

16 Nwoke ezi omume bụ́ Nehemaya, onye dịrị ndụ na narị afọ nke ise T.O.A., kpere ekpere ma mee ihe gosiri na o nwere okwukwe. Ọ rịọrọ, sị: “Ewoo, Jehova, biko, ka ntị gị nụrụ ekpere ohu gị na ekpere ndị ohu gị, bụ́ ndị ịtụ egwu aha gị na-atọ ụtọ; biko, mee ka ohu gị nwee ihe ịga nke ọma taa, meekwa ka ọ bụrụ onye nwoke a ga-emere ebere.” Ònye bụ “nwoke a”? Ọ bụ Eze Atazaksis nke na-achị Peshia, onye Nehemaya na-eburu ihe ọṅụṅụ.—Neh. 1:11.

17 Nehemaya ji okwukwe kpee ekpere ruo ọtụtụ ụbọchị mgbe ọ nụrụ na ndị Juu si na Babịlọn laa “nọ n’ọnọdụ dị oké njọ, a na-akọchakwa ha; a kwatuwokwa mgbidi Jeruselem.” (Neh. 1:3, 4) Chineke zara ekpere Nehemaya otú ọ na-atụghị anya ya mgbe Eze Atazaksis kwere ka ọ gaa Jeruselem wughachi mgbidi ya. (Neh. 2:1-8) E wughachiri mgbidi ahụ n’oge na-adịghị anya. Ihe mere Chineke ji zaa ekpere Nehemaya bụ n’ihi na o kpere ekpere maka ofufe Jehova, o jikwa okwukwe kpee ya. Ọ̀ bụ otú a ka i si ekpe ekpere?

Cheta Ito Chineke na Ikele Ya

18, 19. Olee ihe mere ndị ohu Jehova ji kwesị ito Jehova na ikele ya?

18 Mgbe ị na-ekpe ekpere, cheta ka i too Jehova ma kelee ya. E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji mee otú a. Dị ka ihe atụ, ọ gụsiri Devid agụụ ike ito Jehova n’ihi na Jehova bụ eze. (Gụọ Abụ Ọma 145:10-13.) Ekpere gị ọ̀ na-egosi na i ji ihe ùgwù i nwere ikwusa ozi ọma Alaeze Jehova kpọrọ ihe? Ihe ọbụ abụ ahụ kwuru nwekwara ike inyere gị aka isi n’ala ala obi gị kpekuo Chineke ekpere wee kelee ya maka ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche anyị na-aga.—Ọma 27:4; 122:1.

19 Obi ụtọ i nwere maka na gị na Chineke dị ná mma nwere ike ime ka i si n’ala ala obi gị kpee ekpere yiri nke a: “Jehova, m ga-eto gị n’etiti ndị dị iche iche; m ga-abụku gị abụ olu ụtọ n’etiti mba dị iche iche. N’ihi na obiọma gị dị ukwuu ruo n’eluigwe, eziokwu gị dịkwa ukwuu ruo na mbara igwe. Chineke, ka e bulie gị ka ị dị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị elu karịa ụwa dum.” (Ọma 57:9-11) Okwu a na-agba ume n’ezie. Í kweghị na okwu a nke na-emetụ n’obi, bụ́ nke si n’akwụkwọ Abụ Ọma, nwere ike inyere gị aka ime ka ekpere gị ka mma?

Jiri Nkwanye Ùgwù Miri Emi Na-ekpeku Chineke Ekpere

20. Olee otú Meri si gosi na ya na-asọpụrụ Chineke?

20 Anyị kwesịrị igosi n’ekpere anyị na anyị na-akwanyere Chineke ùgwù. Ihe Meri kwuru mgbe ọ matara na ya ga-abụ nne Mesaya yiri nke ahụ Hana kwuru mgbe ọ kpọgara Samuel n’ụlọikwuu. Ihe Meri kwuru gosiri nnọọ na ọ na-asọpụrụ Chineke. Ọ sịrị: “Mkpụrụ obi m na-eto Jehova, mmụọ m apụghịkwa ịkwụsị inwe oké ọṅụ n’ebe Chineke bụ́ Onye Nzọpụta m nọ.” (Luk 1:46, 47) Ekpere gị ọ̀ ga-aka mma ma i siri otú a na-ekpe ya? Ka a sịkwa ihe mere e ji họrọ Meri, onye na-atụ egwu Chineke, ka ọ bụrụ nne Jizọs bụ́ Mesaya!

21. Olee otú ekpere Jizọs si gosi na ọ na-akwanyere Chineke ùgwù nakwa na o nwere okwukwe?

21 Jizọs jikwa okwukwe na nkwanye ùgwù kpee ekpere. Dị ka ihe atụ, tupu Jizọs akpọlite Lazarọs n’ọnwụ, “[o] leliri anya n’eluigwe wee sị: ‘Nna, ana m ekele gị na ị nụwo olu m. N’eziokwu, amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile.’” (Jọn 11:41, 42) Ekpere gị ọ̀ na-egosi na ị na-asọpụrụ Chineke nakwa na i nwere okwukwe? Ọ bụrụ na i leruo ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị anya, ị ga-ahụ na ihe ndị bụ́ isi o kwuru bụ ka e doo aha Jehova nsọ, ka Alaeze ya bịa, nakwa ka uche ya mee. (Mat. 6:9, 10) Chebara ekpere nke gị echiche. Ọ̀ na-egosi na i nwere mmasị ka Alaeze Jehova bịa, ka e mee uche ya, nakwa ka e doo aha ya nsọ? O kwesịrị.

22. Olee ihe mere obi ga-eji sie gị ike na Jehova ga-eme ka i jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma?

22 N’ihi mkpagbu ma ọ bụ ọnwụnwa ndị ọzọ na-abịara anyị, anyị nwere ike ikpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka ka anyị jiri obi ike na-efe ya. Mgbe ndị Sanhedrin nyere Pita na Jọn iwu ka ha kwụsị ‘izi ihe ọ bụla n’aha Jizọs,’ ha ji obi ike jụ. (Ọrụ 4:18-20) Mgbe a hapụrụ ha, ha gwara ụmụnna ha ihe merenụ. Mgbe ha gwachara ha, ndị niile nọ ya mgbe ahụ rịọrọ Chineke ka o nyere ha aka ka ha jiri obi ike na-ekwusa okwu ya. Ọ ghaghị ịbụ na obi dị ha ezigbo ụtọ mgbe a zara ekpere ahụ “ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ, na-ekwukwa okwu Chineke n’atụghị egwu.” (Gụọ Ọrụ 4:24-31.) Nke a mere ka ìgwè mmadụ ghọọ ndị na-efe Jehova. Ekpere nwekwara ike ime ka i jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma.

Na-eme Ka Ekpere Gị Ka Mma

23, 24. (a) Kwuo ihe atụ ndị ọzọ na-egosi otú ịmụ Baịbụl nwere ike isi mee ka ekpere gị ka mma. (b) Olee ihe ị ga-eme iji mee ka ekpere gị ka mma?

23 E nwere ọtụtụ ihe atụ ndị ọzọ na-egosi na ekpere gị nwere ike ịka mma ma ọ bụrụ na ị na-agụ Baịbụl ma na-amụ ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-ekpe ekpere, i nwere ike ikwu na “ọ bụ Jehova nwe nzọpụta” dị ka Jona kwuru. (Jona 2:1-10) Ọ bụrụ na mmehie i mere na-enye gị nsogbu n’obi, ị gakwurukwala ndị okenye ka ha nyere gị aka, ekpere Devid nwere ike inyere gị aka ịma otú ị ga-esi agwa Jehova na i chegharịala mgbe ị na-ekpeku ya ekpere. (Ọma 51:1-12) Mgbe ụfọdụ ị na-ekpe ekpere, i nwere ike ito Jehova dị ka Jeremaya mere. (Jer. 32:16-19) Ọ bụrụ na ị na-achọ onye ị ga-alụ, ichebara ekpere ahụ dị n’Ezra isi itoolu echiche, nakwa isi n’ala ala obi gị rịọ Jehova arịọrọ, nwere ike ime ka i kpebisie ike irubere Chineke isi ‘ịlụ naanị n’ime Onyenwe anyị.’—1 Kọr. 7:39; Ezra 9:6, 10-15.

24 Na-agụ Baịbụl, na-amụ ya, na-emekwa nchọnchọ n’ime ya. Chọọ n’ime ya ma ị̀ ga-ahụ ihe ndị ị ga na-etinye n’ekpere gị. I nwere ike ịrịọ Chineke ụdị arịrịọ ndị ị gụtara n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ị na-ekpe ekpere nakwa mgbe ị na-ekele Chineke ma na-eto ya. O doro anya na ọ bụrụ na i mee ka ekpere gị ka mma site n’ịmụ Baịbụl, gị na Jehova Chineke ga-adịkwu ná mma.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ihe mere anyị ji kwesị ịrịọ Chineke ka ọ na-eduzi anyị, oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ime ihe ọ gwara anyị?

• Olee ihe kwesịrị ime ka anyị kpee ekpere ka Chineke nye anyị amamihe?

• Olee otú akwụkwọ Abụ Ọma nwere ike isi mee ka ekpere anyị ka mma?

• Olee ihe mere anyị ji kwesị iji okwukwe na nkwanye ùgwù na-ekpe ekpere?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 8]

Ohu Ebreham kpere ekpere ka Chineke duzie ya. Ị̀ na-eme otú ahụ?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ekpere gị nwere ike ịka mma ma ọ bụrụ na ị na-enwe Ofufe Ezinụlọ