Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Banyere Anyị Na-emetụ Chineke n’Obi n’Ezie Otú Anyị Si Mara

Ihe Banyere Anyị Na-emetụ Chineke n’Obi n’Ezie Otú Anyị Si Mara

Ihe Banyere Anyị Na-emetụ Chineke n’Obi n’Ezie Otú Anyị Si Mara

Ọ BỤRỤ na Chineke hụrụ anyị n’anya, gịnị mere ahụhụ ji ju ebe niile? Ajụjụ a dị mkpa enyela ndị mmadụ nsogbu n’obi ruo ọtụtụ puku afọ. Ma eleghị anya, i kweere na ọ bụrụ na ị hụrụ mmadụ n’anya, ị gaghị achọ ka onye ahụ taa ahụhụ, ya nọrọkwa ná nsogbu, ị ga-agbalị inyere ya aka. N’ihi nke ahụ, ọtụtụ ndị na-eche na ebe ọ bụ na ahụhụ juru n’ụwa, ihe banyere anyị anaghị nnọọ emetụ Chineke n’obi. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị buru ụzọ tụlee ihe ndị na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya n’ezie, na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi.

Ihe Ndị E Kere Eke Na-egosi Ịhụnanya Chineke

Jehova Chineke bụ “Onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha.” (Ọrụ 4:24) Ka anyị na-eche banyere ihe ndị Jehova kere, anyị ga-ekweta na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. Dị ka ihe atụ, chee banyere ihe ndị na-eme gị obi ụtọ. Ọ̀ na-amasị gị iri nri dị ụtọ? Jehova gaara eke naanị otu ụdị nri iji mee ka anyị dịgide ndụ. Kama nke ahụ, o kere ụdị nri dị iche iche ga na-atọ anyị ụtọ. N’otu aka ahụ, Jehova ji ọtụtụ osisi, okooko osisi, na ebe ndị mara mma chọọ ụwa mma iji mee ka ndụ na-atọ anyị ụtọ ma na-agụ anyị agụụ obibi.

Tụleekwa otú e si kee anyị. Ikike anyị nwere ịnụ ụtọ egwú, inwe mmasị n’ihe mara mma na ihe ịkpa anyị ọchị adịghị anyị mkpa iji dịgide ndụ, ha bụcha onyinye Chineke nyere anyị bụ́ ndị na-eme ka ndụ dị anyị ụtọ. Cheekwa banyere mmekọrịta gị na ndị ọzọ. Olee onye ọ na-anaghị atọ ụtọ ịnọnyere ezigbo ndị enyi ya ma ọ bụ ịmakụ onye ọ hụrụ nnọọ n’anya? N’ezie, inwe ike ịhụ ndị ọzọ n’anya bụ onyinye Chineke nke hụrụ anyị n’anya nyere anyị! Ebe ọ bụ na Chineke kere ụmụ mmadụ inwe ike ịhụ ndị ọzọ n’anya, ọ ghaghị ịbụ na ịhụnanya so n’àgwà ndị Chineke nwere.

Baịbụl Na-emesi Anyị Obi Ike na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya

Baịbụl gwara anyị na Chineke bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ọ bụghị naanị n’ihe ndị o kere eke ka a na-ahụ ịhụnanya ya, a na-ahụkwa ya n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Baịbụl nyere anyị ntụziaka ndị ga-eso mee ka anyị nwee ahụ́ ike, gbaa anyị ume ịghara imebiga ihe ọ bụla ókè, dọọkwa anyị aka ná ntị ka anyị zere ịṅụbiga mmanya ókè na iribiga nri ókè.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

Baịbụl nyekwara anyị ezigbo ndụmọdụ banyere otú anyị na ndị ọzọ ga-esi na-emekọ ihe, na-agba anyị ume ịhụ ibe anyị n’anya, ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù, na imeso ha omume obiọma. (Matiu 7:12) Ọ katọrọ àgwà na omume ndị na-eweta ahụhụ, dị ka anyaukwu, ịgba asịrị, anyaụfụ, ịkwa iko, na igbu ọchụ. Ọ bụrụ na mmadụ niile agbalịa itinye ezi ndụmọdụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ, ahụhụ ga-ebelata nnọọ n’ụwa niile.

Ma, ụzọ kachanụ Chineke si gosi ịhụnanya ya bụ inye Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, iji gbapụta ụmụ mmadụ. Jọn 3:16 kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Ya mere, Jehova emeelarị ndokwa ịkwụsị ọnwụ na ụdị ahụhụ niile kpamkpam.—1 Jọn 3:8.

N’ezie, e nwere ọtụtụ ihe ndị na-egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya. N’ihi ya, ọ naghị enye Chineke obi ụtọ ịhụ ebe anyị na-ata ahụhụ. Ọ ga-eme ihe iji kwụsị ahụhụ. Ọ dịghị mkpa ka anyị kọwa nkọ banyere ya—Baịbụl gwara anyị kpọmkwem otú Chineke ga-esi kwụsị ahụhụ.

[Foto dị na peeji nke 4]

Inwe ike ịhụ ndị ọzọ n’anya bụ onyinye Chineke nke hụrụ anyị n’anya nyere anyị