Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China—Ọ̀ Bụ Maka Ndị Kraịst?

Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China—Ọ̀ Bụ Maka Ndị Kraịst?

Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China—Ọ̀ Bụ Maka Ndị Kraịst?

KWA afọ na January ma ọ bụ February, ndị ọbịa na-aga n’Eshia na-aka ndị na-aga ebe ọ bụla ọzọ n’ụwa. Ọtụtụ narị nde ndị Eshia na-alakwuru ndị ezinụlọ ha iji mee Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China. *

Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China bụ ememme kacha mkpa a na-eme n’Eshia. Otu onye America na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “[O] yiri imekọta ememme Afọ Ọhụrụ na nke Abalị Anọ n’Ọnwa July na nke Ịtụ Mma Mma, na nke Krismas ọnụ.” Ememme ahụ na-amalite n’ọnwa ọhụrụ mbụ na kalenda ndị China ji ọnwa agụ, ma ọ bụ n’agbata January 21 na February 20 na kalenda anyị. Ọ na-ewe abalị ole na ole, mgbe ụfọdụkwa, ruo izu abụọ.

Isi ihe mere e ji eme ememme Afọ Ọhụrụ bụ ịmalite ihe ọhụrụ, ịchụ afọ ochie ma nabata nke ọhụrụ. Iji kwadebe maka ememme ahụ, ndị mmadụ na-ehicha ụlọ ha ma chọọ ha mma, zụọ ákwà ọhụrụ, sie nri ndị aha ha yiri “ihu ọma” ma ọ bụ “ọganihu,” kwụọkwa ụgwọ ha ji ma dozie okwu ha na ndị mmadụ nwere. N’ụbọchị Ememme Afọ Ọhụrụ ahụ, ha nwere ike inyerịta onyinye ma gọọrọ ibe ha ọfọ ọma, nke na-abụkarị ọfọ inwe akụnụba na ọganihu, nye ibe ha ngwugwu ndị na-acha ọbara ọbara a sị na ọ bụ ego ihu ọma, rie nri ndị pụrụ iche, gbaa nọkaụt, kirie egwú dragọn ma ọ bụ ọdụm nke na-atọ ụtọ, ma ọ bụ ikwu na ibe ejiri nnọọ oge ezumike ahụ nọrịa.

Omenala ndị ahụ nwere nnọọ ihe ndị ha pụtara. Akwụkwọ bụ́ Mooncakes and Hungry Ghosts: Festivals of China kwuru, sị: “Isi ihe na-adị ndị ikwu na ibe mkpa bụ inweta ihu ọma, ịkwanyere chi na mmụọ dị iche iche ùgwù na ịgọrọ ibe ha ọfọ ọma maka afọ ọhụrụ.” Ebe ọ bụ na ọtụtụ ihe ndị a na-eme n’ememme ahụ metụtara omenala na okpukpe, olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi lee ememme ahụ anya? Hà kwesịrị nnọọ iso ibe ha mewe omenala ahụ? Ọ̀ bụ maka Ndị Kraịst?

“Cheta Ebe O Si”

Otu ilu ndị China a ma ama kwuru, sị: “Mgbe ị na-aṅụ mmiri, cheta ebe o si.” Nke a na-egosi nnọọ ezigbo ùgwù ndị Eshia na-akwanyere ndị mụrụ ha na ndị nna nna ha. Ebe ọ bụ ndị mụrụ ha nyere ha ndụ, ha na-akwanyere ha nnọọ ùgwù, bụ́ otu n’ime ihe ndị dị mkpa mere e ji eme ememme Afọ Ọhụrụ.

Ihe na-akacha nnọọ amasị ọtụtụ ezinụlọ ndị Eshia n’ememme ahụ bụ ihe a na-eme n’Abalị Na-abọta Ụbọchị Afọ Ọhụrụ. N’abalị ahụ, ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ ndị Eshia na-ezukọ maka iri nri pụrụ iche. Ihe a bụ oge ndị ezinụlọ na-eji anọkọ ọnụ ọzọ bụ́ nke ndị Eshia na-eme ihe niile ha nwere ike ime iji hụ na ọ kwaghị ha. N’oriri ahụ, a na-edebere ma ndị ezinụlọ bịaranụ ma ndị nwụrụla anwụ, bụ́ ndị ha kweere na ha nọ n’ebe ahụ na mmụọ, oche. Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru na mgbe a na-eri ihe oriri a, “ndị ezinụlọ na-agwa nnọọ ndị nna nna ha nwụrụ anwụ okwu.” Akwụkwọ ọzọ e ji eme nnyocha kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ esila otú a mekọrịta ihe ọzọ, ndị nna nna ahụ nwụrụ anwụ ga-echebe ezinụlọ ha n’afọ ahụ dum.” Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi lee omenala a anya?

Ndị Kraịst ejighịkwa ịhụ ndị mụrụ ha n’anya na irubere ha isi egwuri egwu. Ha na-erubere iwu Chineke isi, nke bụ́: “Gee nna nke mụrụ gị ntị, eledakwala nne gị anya naanị n’ihi na o mewo agadi.” (Ilu 23:22) Ha na-erubekwara iwu a Baịbụl nyere isi: “‘Sọpụrụ nna gị na nne gị’; nke bụ́ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nwere nkwa: ‘Ka ihe wee gaziere gị, ka i wee dị ogologo ndụ n’elu ụwa.’” (Ndị Efesọs 6:2, 3) N’ezie, ezi Ndị Kraịst na-achọ ịhụ ndị mụrụ ha n’anya na ịsọpụrụ ha!

Baịbụl kwukwara okwu ọma banyere nnọkọ ezinụlọ ndị na-agba ume. (Job 1:4; Luk 15:22-24) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nyere iwu, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke . . . na-ajụ onye na-agba afa ase . . . ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase.” (Diuterọnọmi 18:10, 11) Gịnị mere e ji nye iwu a? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl kwuru kpọmkwem ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ọ sịrị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ha enweghị ike iso ndị dị ndụ mekọọ ihe; ha enweghịkwa ike inyere anyị aka ma ọ bụ imerụ anyị ahụ́. (Ekliziastis 9:5, 6, 10) Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, ji ọnwụ tụnyere ụra miri emi, ọ bụkwa naanị ná mbilite n’ọnwụ na-abịanụ ka ndị nwụrụ anwụ ga-eteta.—Jọn 5:28, 29; 11:11, 14.

Baịbụl gosikwara na ihe ahụ a sị na ọ bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ bụ nnọọ ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka hà bụ ndị nwụrụ anwụ. Olee ihe mere ha ji eme ya? Ọ bụ iji duhie ndị mmadụ ma chịwa ha! (2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10) Iwu Chineke na-echebe anyị nnọọ ka anyị ghara ịdaba n’ajọ nsogbu. Ya mere, n’ihi ịhụ Jehova n’anya na iji zere nsogbu, Ndị Kraịst na-eji amamihe ezere omenala ọ bụla metụtara ife ihe a sị na ọ bụ mmụọ nke ndị ezinụlọ nwụrụ anwụ ma ọ bụ ịchọ ka ha chebe ha.—Aịzaya 8:19, 20; 1 Ndị Kọrịnt 10:20-22.

N’aka nke ọzọ, Ndị Kraịst chọkwara ịsọpụrụ ‘Nna anyị, bụ́ onye ezinụlọ ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa sitere n’ebe ọ nọ nweta aha ya.’ (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ònye bụ Nna ahụ? Ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike anyị na Onye Na-enye Ndụ. (Ọrụ 17:26) Ya mere, mgbe anyị na-eche banyere Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China, anyị kwesịrị ịjụ, sị: Olee otú Jehova si ele omenala ndị ahụ anya? Hà dị ya mma?—1 Jọn 5:3.

Ịkwanyere Chi Ezinụlọ Dị Iche Iche Ùgwù

N’Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China, e nwere ọtụtụ omenala na-ewu ewu bụ́ ndị e ji asọpụrụ ma ọ bụ akwanyere ọtụtụ chi na chi ezinụlọ ùgwù, ndị dị ka chi ọnụ ụzọ, chi ala ma ọ bụ mmụọ nke na-echebe ndị mmadụ, chi akụnụba ma ọ bụ ihu ọma, na chi usekwu ma ọ bụ stovu. Ka anyị lebagodị anya n’omenala na-ewu ewu e ji asọpụrụ chi usekwu. * E kweere na abalị ole na ole tupu Afọ Ọhụrụ, chi a na-aga eluigwe ịga kọọrọ Eze Ukwu Jade, bụ́ chi kacha chi niile na China, banyere ezinụlọ ahụ. Ndị ezinụlọ na-esiri chi usekwu a nri pụrụ iche, nyekwa ya swiit na keki iji sị ya gaa nke ọma, ka o wee kọọ akụkọ ọma banyere ha. Iji mee ka ọ gaa ngwa ngwa, ndị ezinụlọ ahụ na-ewedata ihe osise ya, mgbe ụfọdụ jiri swiit tee ya n’egbugbere ọnụ ma kpọọ ya ọkụ n’èzí. N’Abalị Ga-abọta Ụbọchị Afọ Ọhụrụ, ha na-edowe ihe osise ọhụrụ nke chi ahụ n’elu ebe stovu ha dị iji sị ya lọghachi n’ụlọ ha maka afọ ọhụrụ.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ omenala ndị ahụ nwere ike iyi ka o nweghị ihe ha mere, Ndị Kraịst kwesịrị iso ihe Okwu Chineke kwuru banyere ofufe. Jizọs Kraịst kwuru banyere nke a, sị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.” (Matiu 4:10) O doro anya na Chineke chọrọ ka anyị fee naanị ya. N’ihi gịnị? Chebagodịrị ihe a echiche: Jehova bụ Nna anyị nke eluigwe. Olee otú obi ga-adị nna ọ bụla ụmụ ya leghaara anya ma gakwuwe nna ọzọ? Ọ́ gaghị ewute ya?

Jizọs matara na Nna ya nke eluigwe bụ “onye naanị ya bụ ezi Chineke,” Jehova n’onwe ya gwakwara ndị na-efe ya ofufe hoo haa ka ha ghara ‘inwe chi ọ bụla ọzọ’ ma e wezụga ya. (Jọn 17:3; Ọpụpụ 20:3) N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst na-achọ ime ihe dị Jehova mma, ọ bụghị imechu ya ihu ma ọ bụ mee ihe ga-ewute ya site n’ife chi ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrịnt 8:4-6.

Nkwenkwe Ụgha na Mgbaasị

E nwekwara nnọọ ihe jikọrọ Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China na ịgụ kpakpando. A na-agụ afọ ọhụrụ ọ bụla nke ndị China aha otu n’ime anụmanụ iri na abụọ dị n’ìgwè kpakpando nke zodịak ndị China, bụ́ dragọn, agụ, enwe, ewi, na ndị ọzọ. A na-ekwu na anụmanụ ahụ na-ekpebi àgwà nke ndị a ga-amụ n’afọ ahụ ma ọ bụ mee ka afọ ahụ dị mma maka ọrụ ụfọdụ. Isi ihe mere e ji eme ọtụtụ omenala ndị ọzọ a na-eme n’Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China, tinyere ịsọpụrụ chi akụnụba ma ọ bụ ihu ọma, bụ iji nweta “ihu ọma.” Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele omenala ndị a anya?

N’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, Jehova baara nnọọ “ndị na-efe eluigwe, ndị na-ele kpakpando, ndị na-eme ka a mara ihe ga-adakwasị [ha] mgbe ọnwa ọhụrụ pụtara” mba. Ọ katọkwara ofufe “chi Ihu Ọma” na “chi Akara Aka.” (Aịzaya 47:13; 65:11, 12) Kama ịtụkwasị ike ụfọdụ dị omimi ma ọ bụ ike a na-anaghị ahụ anya obi, bụ́ ndị a sịrị na ha si n’ógbè ndị mmụọ ma ọ bụ na kpakpando, a gwara ndị na-efe ezi ofufe, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” (Ilu 3:5, 6) N’ezie, nkwenkwe ụgha na-eke ndị mmadụ agbụ, ma eziokwu Baịbụl na-eme ka ha nwere onwe ha.—Jọn 8:32.

Gosi na Ị hụrụ Chineke n’Anya

Ịmara ebe omenala na nkwenkwe nke Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China si bụ otu ihe; ikpebi ịghara ime ya abụrụ ihe ọzọ. Ọ bụrụ na i bi n’ebe ọ bụ omenala ime Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China kwa afọ ma ọ bụ, ọ bụrụ na ezinụlọ gị na-eme ememme Afọ Ọhụrụ dị ka omenala ha, i nwere mkpebi tara akpụ ime.

N’ezie, ịkwụsi ike mgbe a na-enye gị nsogbu ime ihe ị na-achọghị ime chọrọ obi ike na ime mkpebi siri ike. Otu nwaanyị bụ́ Onye Kraịst bi n’Eshia kwuru, sị: “Ezigbo ụjọ tụrụ m n’ihi na ndị agbata obi m niile na-eme ememme Afọ Ọhụrụ, ma anaghị m eme.” Gịnị nyeere ya aka? Ọ sịrị: “Ọ bụ naanị ịhụ nnọọ Chineke n’anya mere ka m kwụsie ike.”—Matiu 10:32-38.

Ị̀ hụrụ Jehova n’anya otú ahụ? I kwesịrị nnọọ ịhụ ya n’anya. Ndụ gị esighị n’aka chi a na-enweghị ike ịghọta aghọta, kama o si n’aka Jehova Chineke, bụ́ onye Baịbụl kwuru banyere ya, sị: “Ọ bụ gị bụ isi iyi nke ndụ; ọ bụ ìhè si n’ebe ị nọ ka anyị pụrụ iji hụ ìhè.” (Abụ Ọma 36:9) Ọ bụ Jehova na-enye gị ihe ndị dị gị mkpa ma na-eme ka i nwee ike ibi ndụ obi ụtọ, ọ bụghị chi ihu ọma ma ọ bụ chi usekwu. (Ọrụ 14:17; 17:28) Ị̀ ga-ahụ ya n’anya otú ahụ ọ hụrụ gị? Jide n’aka na ọ bụrụ na i mee otú ahụ, Jehova ga-agọzi gị nnọọ.—Mak 10:29, 30.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A na-akpọkwa ya Ememme Afọ Ọhụrụ E Ji Ọnwa Agụ, Ememme Oge Opupu Ihe Ubi, Chun Jie (China), Tet (Vietnam), Solnal (Korea), ma ọ bụ Losar (Tibet).

^ par. 14 A na-eme omenala a kọwara n’isiokwu a n’ụzọ dị iche iche n’Eshia dum, ma, ọ bụ otu ihe ka ha niile na-anọchi anya ya. Ị chọọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ Teta! (Bekee) December 22, 1986, peeji nke 20 na 21, na Teta! (Bekee) January 8, 1970, peeji nke 9 ruo nke 11.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]

Imesi Ndị Ikwu na Ibe Obi Ike

Ọ bụrụ na mmadụ akwụsị ime Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China o nwere ike ịtụ nnọọ ndị ikwu na ibe ya n’anya. Ha nwere ike iwe iwe, nwee mwute, ma ọ bụdị chee na onye ahụ agbaala ha mgba okpuru. Ma, e nwere ọtụtụ ihe onye ahụ nwere ike ime iji mee ka ya na ezinụlọ ya ka dịrị ná mma. Chebagodịrị ihe ndị a Ndị Kraịst bi n’ebe dị iche iche n’Eshia kwuru echiche:

Jiang: “Ogologo oge tupu ụbọchị Afọ Ọhụrụ eruo, eletara m ndị ikwu m ma jiri akọ kọwaara ha ihe mere na agaghị m esokwa eme ememme ụfọdụ ndị na-ewu ewu. M ji nlezianya zere ileda ihe ndị ha kweere anya ma jiri nkwanye ùgwù were Baịbụl zaa ajụjụ ndị ha jụrụ m. Nke a mere ka mụ na ha kwurịta nnọọ ihe ụfọdụ si na Baịbụl.”

Li: “Tupu Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China, m ji akọ na nkwanye ùgwù gwa di m na ihe ga-eme ka m nwee ezi obi ụtọ bụ ime ihe akọ na uche m gwara m mee. M kwekwara ya nkwa na agaghị m emechu ya ihu ma anyị gaa ileta ndị ezinụlọ ya n’oge ezumike ahụ. O mere ihe tụrụ m n’anya n’ụbọchị ndị ezinụlọ ya na-efe ndị nna nna ha nwụrụ anwụ, ọ kpọ m gaa n’ebe ọzọ ka m gaa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst n’ebe ahụ.”

Xie: “M mere ka obi sie ndị ezinụlọ m ike na m hụrụ ha n’anya ma gwa ha na ihe ndị m kweere ga-eme ka m bụrụkwuo ezigbo mmadụ. M gbalịsiziri ike ịkpa àgwà Ndị Kraịst ndị dị ka ịdị nwayọọ, ịdị akọ, na ịhụnanya. Ha ji nwayọọ nwayọọ malite ịkwanyere okpukpe m ùgwù. Di m mechara mụọ Baịbụl ma ghọọ ezi Onye Kraịst.”

Min: “Eji m obiọma na nkwanye ùgwù gwa ndị mụrụ m okwu. Kama ịgọrọ ha ọfọ ‘ihu ọma,’ agwara m ha na m na-ekpegara Jehova, bụ́ Onye Okike anyị, ekpere maka ha mgbe niile, na-arịọ ya ka ọ gọzie ha ma nyere ha aka inweta udo na obi ụtọ.”

Fuong: “M gwara ndị mụrụ m na ọ dịghị m mkpa ichere Afọ Ọhụrụ tupu mụ agaa leta ndị ezinụlọ anyị. M na-eleta ha mgbe mgbe. Nke a mere ka obi tọọ ndị mụrụ m ezigbo ụtọ, ha akwụsị ịkatọ m. Nwanne m nwoke nke m tọrọ bịakwara nwee mmasị n’ịmụ eziokwu Baịbụl.”

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 20]

Panorama Stock/age Fotostock