Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mesaya Ahụ Bụ Onye Chineke Ga-esi n’Aka Ya Zọpụta Anyị

Mesaya Ahụ Bụ Onye Chineke Ga-esi n’Aka Ya Zọpụta Anyị

Mesaya Ahụ Bụ Onye Chineke Ga-esi n’Aka Ya Zọpụta Anyị

“Dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.”—1 KỌR. 15:22.

1, 2. (a) Olee ihe Andru na Filip mere mgbe ha hụrụ Jizọs? (b) Gịnị mere anyị ji kwuo na anyị nwere ọtụtụ ihe na-egosi na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ karịa ka Ndị Kraịst oge ochie nwere?

ANDRU gwara Pita nwanne ya sị, “anyị ahụwo Mesaya ahụ.” Obi siri ya ike na Jizọs onye Nazaret bụ Onye Chineke Tere Mmanụ. Filip kwetara na Jizọs bụ Mesaya ahụ, ọ chọtakwara enyi ya bụ́ Nataniel wee gwa ya, sị: “Anyị ahụwo onye ahụ Mozis dere banyere ya n’Iwu ahụ, onye Ndị Amụma dekwara banyere ya, ya bụ, Jizọs, nwa Josef, onye Nazaret.”—Jọn 1:40, 41, 45.

2 Ì kwere na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, ‘onye Jehova mere Onye Nnọchiteanya Ukwu nke nzọpụta’? (Hib. 2:10) Taa, anyị nwere ọtụtụ ihe na-egosi na Jizọs bụ Mesaya karịa ka ndị na-eso ụzọ ya nwere n’oge ochie. Ihe Okwu Chineke kọrọ banyere Jizọs, bụ́ ndị mere malite mgbe a mụrụ ya ruo mgbe ọ nwụrụ, na-egosi nnọọ na ọ bụ Kraịst. (Gụọ Jọn 20:30, 31.) Baịbụl na-egosikwa na Jizọs ga-anọgide na-esi n’eluigwe na-arụ ọrụ o ji bụrụ Mesaya. (Jọn 6:40; gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:22.) Ihe ị mụtara na Baịbụl nwekwara ike ime ka i kwuo taa na ị ‘hụwo Mesaya ahụ.’ Ma, ka anyị buru ụzọ tụlee ihe mere ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ochie ji kwuo na ha ahụla Mesaya ahụ, ya abụrụ eziokwu.

E Jiri Nwayọọ Nwayọọ Mee Ka A Mata “Ihe Nzuzo Dị Nsọ” Banyere Mesaya Ahụ

3, 4. (a) Olee ihe nyeere ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ochie aka ‘ịhụ Mesaya ahụ’? (b) Olee ihe mere i ji kwere na ọ bụ naanị n’ahụ́ Jizọs ka amụma ndị metụtara Mesaya ahụ mezuru?

3 Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ochie si mata na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ? Jehova ji nwayọọ nwayọọ si n’aka ndị amụma mee ka a mata ihe ndị a ga-eji ama Mesaya ahụ. Otu ọkà mmụta Baịbụl ji otú a Jehova si mee ka a mata Mesaya tụnyere iwekọta ihe a tụrụ atụ nke dị n’ibé n’ibé. Ka e were ya na e nwere ọtụtụ ndị webatara ibé ihe ahụ otu otu n’otu ime ụlọ, n’enweghị onye n’ime ha hụrụ ibe ya. Ọ bụrụ na ibé ihe ahụ ghọrọ ihe a kpụrụ akpụ nke zuru ezu mgbe e dokọtara ya, o gosiri na e nwere onye kpachaara anya see otú ha ga-adịgasị ma wegara ha ndị ahụ. Dị ka ọ dị n’ibé nke ọ bụla n’ihe ahụ a kpụrụ akpụ, amụma ọ bụla e buru banyere Mesaya ahụ ga-enyere anyị aka ịmata onye bụ́ Mesaya ahụ.

4 N’ihi ya, ọ̀ ga-ekwe omume na amụma niile e buru banyere Mesaya ahụ mezuru n’ahụ́ otu onye ná ndaba? Otu onye na-eme nchọpụta kwuru na “o nweghị ka amụma niile e buru banyere Mesaya ga-esi mezuo n’ahụ́ Jizọs ná ndaba. Kemgbe ụwa, ọ bụ naanị Jizọs bụ Mesaya ahụ.”

5, 6. (a) Olee otú a ga-esi emezu ikpe a mara Setan? (b) Olee otú Chineke si jiri nwayọọ nwayọọ mee ka a mata usoro ọmụmụ “mkpụrụ” ahụ ga-esi na ya?

5 Ihe amụma ndị metụtara Mesaya ahụ pụtara bụ “ihe nzuzo dị nsọ,” bụ́ nke gụnyere ọtụtụ ihe ndị gbasara eluigwe na ụwa. (Kọl. 1:26, 27; Jen. 3:15) Otu n’ime ihe nzuzo ahụ bụ ikpe Chineke mara Setan bụ́ Ekwensu, onye bụ́ “agwọ mbụ ahụ,” bụ́ onye mere ụmụ mmadụ ji na-eme mmehie, na-anwụkwa anwụ. (Mkpu. 12:9) Olee otú a ga-esi emezu ikpe a Chineke mara Setan? Jehova buru amụma na “mkpụrụ” nke otu “nwaanyị” ga-amụta ga-egwepịa Setan isi. “Mkpụrụ” ahụ e buru n’amụma ga-egwepịa isi agwọ ahụ wee mee ka nnupụisi, ọrịa, na ọnwụ kwụsị. Ma, Chineke ga-ekwe ka Setan buru ụzọ merụọ “mkpụrụ” nwaanyị ahụ ahụ́ n’ikiri ụkwụ.

6 Jehova ji nwayọọ nwayọọ mee ka a mara onye ga-abụ “mkpụrụ” ahụ o kwere ná nkwa. Ọ ṅụụrụ Ebreham iyi, sị: “Site ná mkpụrụ gị ka mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jen. 22:18) Mozis buru amụma na Onye a ga-abụ “onye amụma” nke ka Mozis. (Diut. 18:18, 19) Chineke kwere Devid nkwa na Mesaya ahụ ga-esi n’eriri ya nakwa na ọ ga-anọkwasị n’ocheeze Devid ruo mgbe ebighị ebi. Ndị amụma kwadokwara nke a.—2 Sam. 7:12, 16; Jere. 23:5, 6.

Ihe Ndị Mere Ka Jizọs Bụrụ Mesaya Ahụ

7. Olee otú o si bụrụ na ọ bụ “nwaanyị” Chineke mụrụ Jizọs?

7 Chineke si n’etiti ndị mmụọ ozi ya, bụ́ nzukọ ya dị n’eluigwe nke dị ka nwunye ya, zite Ọkpara ya, bụ́ onye mbụ o kere, ka ọ bịa bụrụ “mkpụrụ” ahụ o kwere ná nkwa. Nke a pụtara na Ọkpara nke Chineke mụrụ naanị ya ‘ga-eme onwe ya ihe efu,’ ya bụ, ọ ga-ahapụ ndụ ọ na-adị n’eluigwe, ka e wee mụọ ya n’ụwa ebe a ka ọ bụrụ mmadụ zuru okè. (Fil. 2:5-7; Jọn 1:14) Mkpuchi mmụọ nsọ ‘kpuchiri’ Meri mere ka onye ọ mụrụ bụrụ onye a ‘ga-akpọ onye nsọ, Ọkpara Chineke.’—Luk 1:35.

8. Olee otú Jizọs si mezuo amụma banyere Mesaya ahụ mgbe ọ bịara ka e mee ya baptizim?

8 Amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ kwuru ebe a ga-amụ Jizọs nakwa mgbe a ga-amụ ya. A mụrụ Jizọs na Betlehem dị ka e buru n’amụma. (Maị. 5:2) Ndị Juu tụsiwere anya Mesaya ahụ ike na narị afọ mbụ nke oge anyị. N’ihi otú ndị mmadụ si na-atụsi anya Mesaya ahụ ike, ha jụrụ ajụjụ banyere Jọn Onye Na-eme Baptizim, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst?” Ma Jọn zara, sị: “Onye ka m ike na-abịa.” (Luk 3:15, 16) Mgbe Jizọs dị afọ iri atọ wee bịakwute Jọn ná ngwụcha afọ 29 O.A. ka o mee ya baptizim, ọ bịara kpọmkwem mgbe Mesaya ahụ kwesịrị ịpụta. (Dan. 9:25) Ọ maliteziri ozi ya pụrụ iche, sị: “Oge ahụ a kara aka eruwo, alaeze Chineke eruwokwa nso.”—Mak 1:14, 15.

9. Ọ bụ ezie na e nwere ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aghọtachaghị, olee ihe doro ha anya?

9 Ma, e nwere ihe ndị ụmụ mmadụ tụrụ anya ha, bụ́ ndị na-ezighị ezi. Ọ bụ eziokwu na Jizọs bụ Eze ndị mmadụ kpọrọ ya, ma, ha aghọtaghị n’oge ahụ na ọ ga-esi n’eluigwe na-achị n’ọdịnihu. (Jọn 12:12-16; 16:12, 13; Ọrụ 2:32-36) Ma, mgbe Jizọs jụrụ sị, “Ònye ka unu na-asị na m bụ?” n’egbughị oge, Pita zara, sị: “Ị bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.” (Mat. 16:13-16) Pita zakwara ihe yiri nke a mgbe ọtụtụ ndị hapụrụ Jizọs n’ihi otu ihe ọ kụziiri ha.—Gụọ Jọn 6:68, 69.

Ige Mesaya ahụ Ntị

10. Gịnị mere Jehova ji kwusie okwu ike banyere mkpa ọ dị ige Ọkpara ya ntị?

10 Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya bụ mmụọ dị ike mgbe ọ nọ n’eluigwe. Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ ghọrọ “onye nnọchiteanya nke Nna [ya].” (Jọn 16:27, 28) Ọ sịrị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) Iji gosi na Jizọs bụ Mesaya ahụ, Jehova kwuru mgbe Jizọs nwoghara, sị: “Geenụ ya ntị.” (Luk 9:35) Anyị kwesịrị ige Onye a Chineke Họọrọ ntị, ma ọ bụ rubere ya isi. Iji mee nke a, anyị aghaghị inwe okwukwe ma na-arụ ezi ọrụ. Ihe abụọ a dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe na-amasị Chineke, chọọkwa inweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16, 35, 36.

11, 12. (a) Olee ihe mere ndị Juu narị afọ mbụ ekweghị na Jizọs bụ Mesaya ahụ? (b) Ole ndị nwere okwukwe na Jizọs?

11 Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ihe gosiri na Jizọs bụ Mesaya ahụ, ọtụtụ ndị dị ndụ na narị afọ mbụ ekweghị na ọ bụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi ihe ndị ha chere na onye ga-abụ Mesaya ahụ ga-eme, tinyere na ọ ga-abụ onye ọchịchị nke ga-anapụta ha n’aka ndị Rom. (Gụọ Jọn 12:34.) N’ihi ya, ha anabataghị Mesaya nke mezuru amụma niile kwuru na a ga-eleda Mesaya ahụ anya, na ndị mmadụ ga-ezere ya, na ọ ga-abụ onye nwere ihe mgbu na onye maara ọrịa. Ha mechakwara gbuo ya. (Aịza. 53:3, 5) O wutekwara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na ọ napụtaghị ha n’aka ndị Rom. Ma, ha nọgidere na-eso ya, ka oge na-agakwa, ha ghọtara nke bụ́ eziokwu.—Luk 24:21.

12 Ihe ọzọ mere na ndị mmadụ ekweghị na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa bụ n’ihi ihe ụfọdụ ọ kụziri, bụ́ nke siiri ọtụtụ ndị ike ịnabata. Onye chọrọ ịbanye n’Alaeze Chineke ga-ebu ụzọ ‘jụ onwe ya,’ ‘rie’ ahụ́ Jizọs, ‘ṅụọ’ ọbara ya, ‘a mụọ ya ọzọ,’ ya agharakwa ịbụ “nke ụwa.” (Mak 8:34; Jọn 3:3; 6:53; 17:14, 16) Ndị mpako, ndị ọgaranya, na ndị ihu abụọ lere ihe ndị a anya dị ka ihe siri oké ike omume. Ma, ụfọdụ ndị Juu, bụ́ ndị dị umeala n’obi, kweere na Jizọs bụ Mesaya ahụ, dị ka ụfọdụ ndị Sameria kwetara. Ha sịrị: “Nwoke a bụ n’ezie onye nzọpụta nke ụwa.”—Jọn 4:25, 26, 41, 42; 7:31.

13. Olee otú e si chipịa Jizọs n’ikiri ụkwụ?

13 Jizọs buru amụma na ndị isi nchụàjà ga-ama ya ikpe ọnwụ, ndị Jentaịl akpọgbuo ya, ya esikwa n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ. (Mat. 20:17-19) Ndị Sanhedrin kpọrọ ya onye nkwulu mgbe ọ gwara ha na ya bụ “Kraịst, Ọkpara Chineke.” (Mat. 26:63-66) Paịlet ‘ahụghị ihe ọ bụla kwesịrị ọnwụ’ nke Jizọs mere, ma ‘o nyefere ya ka ndị Juu mee ya ihe ha chọrọ’ n’ihi na ha malitere ibo yanwa bụ́ Paịlet ebubo na ọ na-emegide ọchịchị Rom. (Luk 23:13-15, 25) Ha si otú a ‘gọnahụ’ “Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ” ma gbaa izu igbu ya n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe na-egosi na ọ bụ Chineke zitere ya. (Ọrụ 3:13-15) ‘E bipụrụ’ Mesaya ahụ dị ka e buru n’amụma mgbe a kpọgidere ya n’osisi n’Ụbọchị Ememme Ngabiga nke afọ 33 O.A. (Dan. 9:26, 27; Ọrụ 2:22, 23) Otú a ka e si chipịa Mesaya ahụ “n’ikiri ụkwụ” dị ka e buru n’amụma na Jenesis 3:15.

Ihe Mere Mesaya ahụ Ji Nwụọ

14, 15. (a) Olee ihe abụọ mere Jehova ji kwe ka Jizọs nwụọ? (b) Gịnị ka Jizọs mere mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ?

14 E nwere ihe abụọ dị mkpa mere Jehova ji kwere ka Jizọs nwụọ. Nke mbụ bụ na ọ bụrụ na Jizọs ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ọ ga-edozi ihe dị ezigbo mkpa ‘n’ihe nzuzo ahụ dị nsọ.’ Jizọs gosiri n’ụzọ na-enweghị atụ na mmadụ zuru okè nwere ike ịnọgide ‘na-asọpụrụ Chineke’ ma gosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị n’agbanyeghị ule ndị siri ike Setan wetaara onye ahụ. (1 Tim. 3:16) Nke abụọ bụ na, dị ka Jizọs kwuru, ‘nwa nke mmadụ bịara ka o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Mat. 20:28) ‘Ihe mgbapụta a nke kwekọrọ ekwekọ’ ka e ji kwụọ ụgwọ mmehie nke ụmụ Adam ketara ma mee ka ndị niile kwere na Jizọs bụ onye Chineke si n’aka ya na-azọpụta anyị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.—1 Tim. 2:5, 6.

15 Mgbe Kraịst nọchara ụbọchị atọ n’ili, a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ pụtakwara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro ruo ụbọchị iri anọ. Nke a bụ iji gosi ha na ya dị ndụ nakwa ka o wee nyekwuo ha ntụziaka. (Ọrụ 1:3-5) Ọ rịgoziri eluigwe ka o wee chee n’ihu Jehova uru nke àjà dị oké ọnụ ahịa ọ chụrụ ma chere ka oge ọnụnọ ya dị ka Eze Bụ́ Mesaya ruo. Ka ọ dịgodị, o nwere ọtụtụ ihe ọ ga-eme.

Ịrụzu Ọrụ O Ji Bụrụ Mesaya

16, 17. Kwuo ọrụ ndị Jizọs nọworo na-arụ kemgbe ọ rịgoro eluigwe.

16 Kemgbe ọtụtụ narị afọ Jizọs bilitere n’ọnwụ, ọ nọwo na-ahụ maka ọrụ a na-arụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ nke ọ na-achị. (Kọl. 1:13) Mgbe oge ruru, ọ ga-amalite ịkpa ike o ji bụrụ Eze nke Alaeze Chineke. Amụma ndị dị na Baịbụl na ihe ndị na-eme n’ụwa gosiri na ọnụnọ ya dị ka Eze malitere n’afọ 1914, bụ́kwa mgbe “ọgwụgwụ usoro ihe a” bidoro. (Mat. 24:3; Mkpu. 11:15) Mgbe obere oge gafere, ya na ndị mmụọ ozi ya chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe.—Mkpu. 12:7-10.

17 Ọrụ ikwusa ozi ọma nke Jizọs malitere n’afọ 29 O.A. agwụwala. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ekpe ndị niile dị ndụ ikpe. Ọ ga-agwazi ndị yiri atụrụ, bụ́ ndị kwere na ọ bụ ya ka Jehova si n’aka ya na-azọpụta ụmụ mmadụ, ka ha ‘keta alaeze ahụ a kwadebeere ha malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.’ (Mat. 25:31-34, 41) Mgbe Jizọs ga-akpọrọ ụsụụ ndị agha ya nọ n’eluigwe bịa ibibi ndị ajọ omume niile, ọ ga-ebibi ndị na-achọghị ka ọ bụrụ Eze ha. Ọ ga-ekezi Setan agbụ ma tụba ya na ndị mmụọ ọjọọ ya “n’ime abis.”—Mkpu. 19:11-14; 20:1-3.

18, 19. Olee ọrụ ndị Jizọs rụrụ iji gosi na ya bụ Mesaya, gịnịkwa ka ọ ga-emere ụmụ mmadụ ndị na-erube isi?

18 Mgbe ọ ga-amalite Ọchịchị Puku Afọ ya, ọ ga-arụzu ọrụ o ji bụrụ “Onye Ndụmọdụ Dị Ebube, Chineke nke bụ́ Dike, Nna Mgbe Ebighị Ebi, Onyeisi Udo.” (Aịza. 9:6, 7) Ọchịchị ya ga-eme ka ụmụ mmadụ zuo okè, gụnyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ. (Jọn 5:26-29) Mesaya ga-eduga ụmụ mmadụ ndị na-erube isi “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ,” bụ́ nke ga-eme ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma. (Gụọ Mkpughe 7:16, 17.) Mgbe ule ikpeazụ ahụ gachara, a ga-atụba ndị nnupụisi niile, tinyere Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, “n’ime ọdọ ọkụ,” nke ga-abụ igwepịa isi “agwọ” ahụ ya anwụọ.—Mkpu. 20:10.

19 Jizọs na-arụzu ọrụ ya n’ụzọ magburu onwe ya ma zuo ezuo. Ụmụ mmadụ a gbapụtara ná mmehie ga-anọ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, mgbe ọ ga-aghọ paradaịs, ha agaghị na-arịa ọrịa, ha ga na-enwekwa obi ụtọ. A ga-ewepụ nkọcha niile a na-akọcha aha nsọ Jehova, ọ ga-edokwa onye ọ bụla anya na ọ bụ ya kwesịrị ịchị eluigwe na ala. N’ezie, ihe ọma na-enweghị atụ na-echere ndị na-erubere Chineke na Onye O Tere Mmanụ isi.

Ị̀ Hụla Mesaya Ahụ?

20, 21. Olee ihe ndị mere ị ga-eji gwa ndị ọzọ banyere Mesaya ahụ?

20 Kemgbe afọ 1914, anyị nọ n’oge ọnụnọ Kraịst. Ọ bụ ezie na a naghị ahụ ya anya ebe ọ nọ na-achị n’Alaeze Chineke, amụma ndị na-emezu gosiri na ọ malitela ịchị. (Mkpu. 6:2-8) Ma, dị ka ndị Juu mere na narị afọ nke mbụ, ọtụtụ ndị taa ekweghị n’ihe ndị na-egosi na ọnụnọ Mesaya ahụ amalitela. Hanwa chọkwara mesaya bụ́ onye ọchịchị nke ga na-achị ha. Ma, ị matalanụ na Kraịst bụ Eze na-achị n’Alaeze Chineke ugbu a. Nke a ó meghị gị obi ụtọ mgbe ị matara ya? Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ mere, o doro anya na nke a mere ka i kwuo, sị: “Anyị ahụwo Mesaya ahụ.”

21 Mgbe ị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma taa, ị̀ na-agwa ha otú Jizọs si bụrụ Mesaya? Ọ bụrụ na ị na-eme otú a, ị na-egosikwu na obi dị gị ụtọ maka ihe o meere gị, ihe ọ na-eme ugbu a, nakwa ihe ọ ka ga-eme. Ọ ga-abụ na ị gwala ndị ikwu gị na ndị enyi gị banyere Mesaya ahụ dị ka Andru na Filip mere. Ọ bụrụ na i mebeghị otú a, leenụ ma ị̀ ga-eji ịnụ ọkụ n’obi gwa ha na Jizọs Kraịst bụ n’ezie Mesaya ahụ Chineke kwere ná nkwa, ya bụ, onye Chineke ga-esi n’aka ya zọpụta anyị.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ si hụ Mesaya?

• Olee ihe abụọ dị mkpa mere Jizọs ji nwụọ?

• Olee ihe ndị Jizọs ka ga-eme, bụ́ ndị ga-egosi na ọ bụ Mesaya?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Na narị afọ mbụ, olee ihe mere ndị mmadụ ji mata na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa?

[Foto dị na peeji nke 23]

Mgbe ị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, ị̀ na-agwa ha otú Jizọs si bụrụ Mesaya ahụ?