Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Ọṅụ n’Ọrụ Chineke nke Anyị Na-arụsi Ike

Inwe Ọṅụ n’Ọrụ Chineke nke Anyị Na-arụsi Ike

Inwe Ọṅụ n’Ọrụ Chineke nke Anyị Na-arụsi Ike

JEHOVA chọrọ ka ị na-enwe ọṅụ. (Ọma 100:2) E nwere ike ya abụrụ na ị bụ ohu Jehova nke na-arụsi ọrụ ike. E nwekwara ike ya abụrụ na ị ka nwee ohere mgbe ị raara onwe gị nye Chineke, ma ugbu a, ọrụ i ji akpata ego nakwa ihe ndị i kwesịrị ịna-eme iji fee Chineke na-eme ka ị ghara ịna-enwe ohere. Obi gị nwekwara ike ịna-ama gị ikpe maka na ị naghị emecha ihe ndị ị chọrọ ịna-eme. Olee otú i nwere ike isi meruo ihe nke ọ bụla n’ókè kwesịrị ekwesị ma na-enwe “ọṅụ Jehova”?—Neh. 8:10.

Ị ga na-enwe ọtụtụ nsogbu n’ihi na oge a dị oké egwu. N’ihi ya, i kwesịrị ịhazi ndụ gị nke ọma. Ya mere, i kwesịrị ime ihe Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ dụọ anyị ọdụ ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.”—Efe. 5:15, 16.

Iji mee ezigbo ihe a a dụrụ anyị ọdụ, olee otú ị ga-esi setịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ ndị ị ga-eruli ma na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye nke ọma, na-elekọta ezinụlọ gị, na-aga ozi ọma, na-arụ ọrụ i ji akpata ego, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị mkpa?

Ì chetara ụdị ọṅụ i nwere mgbe ị raara onwe gị nye Chineke, e wee mee gị baptizim? I nwere ọṅụ ahụ n’ihi na ị matara Jehova na nzube ya. O nwere ike ịbụ na ị mụsiri ihe ike ọtụtụ ọnwa tupu ị mata ya wee malite inwe ọṅụ a. Ma, nke a alaghị n’iyi. Ihe ị mụtara gbanwere ndụ gị.

I kwesịrị ịna-amụ ihe ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọgide na-enwe ọṅụ. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike iwepụta oge ị ga-eji na-agụ Baịbụl ma na-amụ ya, leruo anya ma ò nwere otú ị ga-esi hazigharịa oge gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na gị na Jehova ga-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na ị na-eji nkeji ole na ole na-amụ ihe kwa ụbọchị ma na-atụgharị uche. Nke a ga-emekwa ka ị na-enwekwu ọṅụ.

Ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke nwere ike isi n’oge ha ji eme ihe ndị na-adịchaghị mkpa zụta oge ha ga-eji na-eme ihe ndị dị oké mkpa. Jụọ onwe gị, sị, ‘Oge hà otú ole ka m ji agụ magazin ndị ụwa ma ọ bụ akwụkwọ akụkọ, ma ọ bụkwanụ ekiri tiivi, egere egwú, ma ọ bụkwanụ atụrụ ndụ?’ Ihe ndị a nwere ike ime ka ị na-enwe ọṅụ ma ọ bụrụ na ị na-emeru ha n’ókè. (1 Tim. 4:8) Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị naghị enwe ohere ime ihe ndị dị oké mkpa, hazigharịa oge gị.

Adam, bụ́ di na nna mụrụ ụmụ atọ nakwa okenye ọgbakọ, kwuru ihe na-enyere ya aka. Ọ sịrị: “M na-agba mbọ ka m ghara ịna-etinye aka n’ihe ndị nwere ike ịna-ewekọrọ oge m. M na-ezere ntụrụndụ ọ bụla na-eri oge, m nweghịkwa ihe ndị ga-ewe m nnukwu oge ilekọta. Ọ bụghị na m na-ata ndụ m ahụhụ, kama ọ bụ na achọghị m ntụrụndụ nke nwere ike iwekọrọ oge m niile.”

Ịtụgharị uche n’ihe ọma sirila ná mkpebi i mere pụta nwere ike ime ka ị nọgide na-enwe ọṅụ ma nyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, Mariusz, bụ́ okenye ọgbakọ, onye mụrụ ụmụ atọ, sịrị: “Mgbe m malitere ịmụ Baịbụl, m bidoro inwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Site n’oge ruo n’oge, m ka na-enwe ihe isi ike ndị ọ bụ naanị Jehova ma banyere ha. M na-enwe ọṅụ na ọdịnihu ga-aka mma n’ihi na Jehova na-akwado m.”

Dị ka ihe mere Mariusz na-egosi, na mmadụ nwere olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu agaghị eme ka ọ ghara inwe nsogbu ọ bụla. Kama nke ahụ, o nwere ike ime ka i jiri ọṅụ na-edi ihe ọ bụla bịaara gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ụbọchị niile nke onye nọ n’ahụhụ jọrọ njọ; ma onye obi dị mma na-eri oriri mgbe niile.” (Ilu 15:15) Tụgharịakwa uche n’otú Chineke sirila gosi na ya hụrụ gị n’anya. Nke a nwere ike ime ka ị hụkwuo ya n’anya, meekwa ka ị na-enwekwu ọṅụ Jehova.—Mat. 22:37.

Ezinụlọ ga na-enwekwu ọṅụ ma ha bute Jehova na ofufe ya ụzọ. Ndị ezinụlọ agaghị na-enwekarị esemokwu ma ha na-akpa àgwà Ndị Kraịst, nke a ga-emekwa ka ha nwee ịhụnanya na udo. Nke a ga-eme ka ezinụlọ dịrị n’udo dịkwa n’otu.—Ọma 133:1.

Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ na-emekọ ihe ọ bụla metụtara ofufe ọnụ, ha ga na-enwe ezigbo ọṅụ. Mariusz, kwuru, sị: “Oge ezinụlọ m ji emekọ ihe ọnụ na-amasị m. Nwunye m na-akwado m nke ọma. Mgbe ọ bụla o kwere omume, mụ na ya na-eso aga ozi ọma ma ọ bụkwanụ gaa zachaa ámá egwuregwu anyị ga-anọ nwee mgbakọ. Ọ na-esokwa m aga ọgbakọ ọzọ ma m gaa ikwuru ha okwu ihu ọha. Nke a na-agba m ume.”

Akwụkwọ Nsọ gwara Ndị Kraịst ka ha na-enye ndị ezinụlọ ha ihe ndị na-akpa anụ ahụ́ ha. (1 Tim. 5:8) Ma, ọ bụrụ na ọrụ i ji akpata ego na-ewerecha oge gị na ike gị, o nwere ike ime ka ozi Chineke ghara ịna-enye gị ọṅụ. Kọọrọ Jehova banyere nsogbu a n’ekpere. (Ọma 55:22) Ndị ụfọdụ achọpụtala na ha aghaghị ịgbanwe ọrụ ha na-arụ ka ha wee nwee ike iburu ụzọ chọọ Alaeze Chineke. Onye Kraịst ekwesịghị ịgba nkịtị ka nnukwu ego ọ na-enweta n’ọrụ nke na-anaghị enye ya ohere mee ka o leghara ife Jehova anya, bụ́ ihe ka mkpa.—Ilu 22:3.

I nwere ike ide uru na ọghọm dị n’ọrụ ị na-arụ ugbu a ma ọ bụkwanụ nke i nwere ike ịrụ n’ọdịnihu n’akwụkwọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọrụ na-enye ezigbo ego adịghị njọ. Ma, ọrụ ị na-arụ ugbu a ọ̀ na-ekwe ka i nyere ezinụlọ gị aka ife Chineke? Tụlee ihe niile nke ọma, meekwa mkpebi ga-enyere gị aka ibute adịm ná mma gị na Jehova ụzọ.

Ọ bụrụ na ọrụ ị na-arụ ugbu a anaghị ekwe ka gị na Jehova nọgide na-adị ná mma, i kwesịrị ịgbanwe ya. Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eme mgbanwe dị ukwuu ka ha wee nwee ohere na-eme ihe Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme. Otu nwanna nwoke nọ na Poland kwuru, sị: “O nwere mgbe m gbara arụkwaghịm n’ọrụ m na-arụ n’ihi na ọrụ ahụ anaghị ekwe m nọrọ n’ụlọ. M naghị enwecha ohere eme ihe ọ bụla n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ lekọta ezinụlọ m.” Ugbu a, ọ na-arụzi ọrụ nke na-eme ka o nwee ohere, nke na-anaghịkwa ewekọrọ ike ya niile.

Ka Inyere Ndị Ọzọ Aka Na-enye Gị Ọṅụ

Jizọs sịrị na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) E nwere ọtụtụ ụzọ Ndị Kraịst nwere ike isi nye ndị ọzọ ihe. Mgbe ụfọdụ, ịchị ọchị si n’ala ala obi, ikwe onye ọzọ n’aka, ma ọ bụkwanụ ikele nwanna anyị nke ọma maka ọrụ ọ na-arụsi ike n’ọgbakọ, ezuola ime ka gị na onye ọzọ nwee ọṅụ.

Pọl onyeozi gbara ụmụnna ya ume, sị: “Na-agụgụnụ mkpụrụ obi dara mbà, na-akwadonụ ndị na-adịghị ike.” (1 Tesa. 5:14) Onye dara mbà n’obi nwere ike iche na ya agaghị emerili nsogbu bịaara ya. Ì nwere ike inyere onye dị otú ahụ aka? Ọ bụrụ na ị chọpụta na nwanna gị anaghịzi enwe ọṅụ n’ozi Jehova, gbalịa ka ị gbaa ya ume. Nke a ga-agbakwa gịnwa ume. O nwere ụfọdụ nsogbu mmadụ na-enweghị ike ịkwụsị. Ma, i nwere ike ime ihe na-egosi na i nwere ọmịiko n’ahụ́ ya, i nwekwara ike ịgba ya ume ka ọ tụkwasị Jehova obi na ọ ga-anọgide na-enyere ya aka. Jehova agaghị ahapụ ndị tụkwasịrị ya obi.—Ọma 27:10; Aịza. 59:1.

Ihe ọzọ i nwere ike ime nke ga-enyere nwanna nke yiri ka ọ nakwaghị enwe ọṅụ n’ozi Jehova aka bụ gị na ya iso gaa ozi ọma. Mgbe Jizọs zipụrụ iri mmadụ asaa, bụ́ ndị na-eso ụzọ ya, ka ha gaa ozi ọma, o zipụrụ ha “abụọ abụọ.” (Luk 10:1) O nwere ike ịbụ na ị ma na otú Jizọs si kee ha mere ka onye nke ọ bụla gbaa onye ya na ya so ume. Ì nwere ike ime ka onye gị na ya so na-aga ozi ọma nke na-anakwaghị enwe ọṅụ n’ozi Jehova maliteghachi inwe ọṅụ?

Onye ọ bụla nọ ndụ nwere ihe nwere ike ime ka ọ ghara inwe ọṅụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl gbara anyị ume, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị. Aga m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ!” (Fil. 4:4) Ndụ gị nwere isi ugbu a n’ihi na ị hụrụ Chineke n’anya, na-erubere ya isi, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-arụsi ọrụ o nyere gị ike. Nke a na-eme ka i nwee ọṅụ. Jehova na-enyekwara gị aka imeri nsogbu ọ bụla bịaara gị.—Rom 2:6, 7.

Anyị nwere okwukwe na ụwa ọhụrụ ahụ Jehova kwere anyị ná nkwa adịla nso. Nke a ga-eme ka anyị nwee ọtụtụ ngọzi na ọṅụ dị ukwuu. (Ọma 37:34) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe obi ike, n’echefughị otú Jehova si agọzi anyị ugbu a. Nke a ga-eme ka anyị jiri ‘ọṅụ na-ejere Jehova ozi.’—Ọma 100:2.

[Ihe osise dị na peeji nke 8]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

I nwere ike ịhazigharị oge gị ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọgide na-enwe ọṅụ

NTỤRỤNDỤ

ỤLỌ na ILEKỌTA EZINỤLỌ

ỌRỤ

ỌMỤMỤ IHE ỌGBAKỌ

ỌMỤMỤ IHE ONWE ONYE

OZI ỌMA

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ì nwere ike inyere ndị ọzọ aka ka ha maliteghachi inwe ọṅụ?