Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a na-esonụ:

• Olee otú o si bụrụ na Chineke nwere ike ime gị ọgaranya?

N’oge ochie, Jehova mere ndị ụfọdụ, dị ka Ebreham na Sọlọmọn, ọgaranya. Ma, ugbu a, akụnụba nke kacha dịrị Ndị Kraịst mkpa, bụ́kwanụ nke Chineke ga-enyere ha aka inweta, bụ okwukwe, udo, afọ ojuju na obi ụtọ.—9/1, peeji nke 3-7.

• Gịnị ka anyị ga-amụta ná nnapụta ahụ Jizọs napụtara Pita mgbe mmiri chọrọ iri ya? (Mat. 14:28-31)

Ọ bụrụ na anyị achọpụta na o yiri ka nwanna anyị enwechaghị okwukwe, anyị kwesịrị ịmatị aka nyere ya aka ka ọ malite inwekwu okwukwe.—9/15, peeji nke 8.

• Gịnị ka ịnapụta anyị furu Jehova?

Jehova diri ahụhụ a tara Ọkpara ya, diekwa mkparị ndị mmadụ kparịrị ya. Jehova diri ogbugbu e gburu Ọkpara ya ka ọ̀ bụ omekome, bụ́ ihe njikere ahụ Ebreham jikeere iji nwa ya chụọ àjà sere onyinyo ya.—9/15, peeji nke 28-29.

• Gịnị mere Codex Vatikan ji bụrụ akụ́ dị oké ọnụ ahịa?

Ọ bụ ihe odide e dere n’asụsụ Grik n’ihe na-erughị narị afọ atọ mgbe e dechara Baịbụl. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dị na ya. Ọ bụ otu n’ime ihe na-enyere ndị ọkà mmụta aka ịchọpụta ihe dị na Baịbụl mbụ.—10/1, peeji nke 18-20.

• Olee ihe anyị na-amụta n’Ilu 24:27 banyere ‘iwulite ezinụlọ’?

Nwoke nke chọrọ ịlụ nwaanyị kwesịrị ijikere maka ọrụ dị na ya. Nke a gụnyere ịdị njikere maka ịkpata ihe ezinụlọ ya ga na-eri, tinyere ịkụziri ha Okwu Chineke.—10/15, peeji nke 12.

• Gịnị mere na ọ dịghị mma ịkpọ Ndịàmà Jehova okpukpe ndị Protestant?

N’ihe dị ka narị afọ ise gara aga, a malitere okpukpe ndị Protestant na Yurop ka e wee dozigharịa chọọchị Katọlik. Ndị Protestant bụ ndị chọrọ ka e dozigharịa ihe na Katọlik. Ndịàmà Jehova ekweghị na e nyefere poopu ike kachanụ. Ha kwere na Baịbụl kacha akwụkwọ niile. Ma, ha anaghị anabata ozizi dị iche iche na-adịghị na Baịbụl, bụ́ ndị okpukpe ndị Protestant na-akụziri ndị mmadụ, ha anaghịkwa anabata omume na-adịghị mma ndị Protestant na-eme.—11/1, peeji nke 19.

• Mmadụ ò kwesịrị ibu ụzọ mara ịsụ asụsụ Hibru na Grik tupu ya enwee ike ịghọta ihe dị na Baịbụl?

Mba. Na mmadụ ma asụsụ ndị ahụ apụtaghị na onye ahụ ga-aghọtarịrị ihe dị na Baịbụl. Onye ma asụsụ Hibru na Grik ka ga na-achọ okwu ụfọdụ n’akwụkwọ ọkọwa okwu nakwa n’akwụkwọ ndị ọzọ ka o wee ghọta ihe Baịbụl na-ekwu. Na Chineke nyere mmụọ nsọ ya iji chebe okwu Ohu ya kasị ukwuu naanị n’ụdị a sụgharịrị asụgharị, n’asụsụ mmadụ niile na-aghọta nke ọma n’oge ahụ, gosiri na ihe dị mkpa abụghị asụsụ anyị ji gụọ Baịbụl.—11/1, peeji nke 20-23.

• Olee otú Jehova na Jizọs si setịpụrụ anyị ihe nlereanya n’otú anyị kwesịrị isi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù?

N’agbanyeghị na Jehova bụ onye kacha ihe niile elu, ọ na-eji obiọma emeso ndị mmadụ ihe, na-akwanyekwara ha ùgwù. Mgbe ọ gwara ma Ebreham ma Mozis okwu, o ji okwu Hibru a na-asụgharịkarị ka ọ bụrụ “biko” gwa ha okwu. (Jen. 13:14; Ọpụ. 4:6) Chineke na-egekwa ndị mmadụ ntị. (Jen. 18:23-32) Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o mere ka nna ya, ọ na-adị njikere inyere ndị ọzọ aka, ọ na-enwekwa obi ụtọ ime nke a. Ọ na-akpọkwa ha aha.—11/15, peeji nke 25.

• Gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst anaghị eme ememme Afọ Ọhụrụ?

Ememme Afọ Ọhụrụ bụ otu n’ime ememme ndị a na-eme na mba ndị dị n’Eshia. Otu n’ime ihe a na-eme n’ememme a bụ ịchọpụta isi ọma nakwa ịkwanyere ndị mmụọ ùgwù. Ndị Kraịst na-asọpụrụ nne ha na nna ha, na-akwanyekwara ha ùgwù, ma, ha anaghị etinye aka n’ememme ọ bụla e ji akwanyere ndị nna nna ha nwụrụ anwụ ùgwù ma ọ bụkwanụ chọwa ka chi ndị ezinụlọ ha na-efe nyere ha aka.—12/1, peeji nke 20-23.