Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ile Mmanya Na-aba n’Anya anya Otú Kwesịrị Ekwesị

Ile Mmanya Na-aba n’Anya anya Otú Kwesịrị Ekwesị

Ile Mmanya Na-aba n’Anya anya Otú Kwesịrị Ekwesị

TONI, bụ́ onye e kwuru banyere ya n’isiokwu nke mbụ, gaara ebi ezigbo ndụ ma a sị nnọọ na o kwetara na ya nwere nsogbu mmanya. Ma, ebe ọ bụ na o yiri ka ò nwere ike ịṅụ ọtụtụ iko mmanya n’enweghị ihe pụtara ìhè ọ na-eme ya, o chere na ya maara ihe ya na-eme. Olee ihe mere na ihe o chere banyere onwe ya ezighị ezi?

Oké mmanya ọ na-aṅụ mere ka ọ ghara ịma na ya nwere nsogbu. Ma Toni ò maara ma ọ bụ na ọ maghị, ụbụrụ ya, bụ́ nke na-enyere ahụ́ ya na uche ya aka ịrụ ọrụ, anaghị arụ ọrụ nke ọma mgbe ọ bụla ọ ṅụbigara mmanya ókè. Ka ọ na-aṅụkwu mmanya, otú ahụ ka ọ na-esikwuru ụbụrụ ya ike ịghọta na ya nwere nsogbu.

Ihe ọzọ mere o ji siere Toni ike ịmata na ya nwere nsogbu bụ na ọ chọsiri ike izochi nsogbu ịṅụ mmanya ya. Alen, bụ́ onye a kpọrọ aha n’isiokwu ndị bú nke a ụzọ, ekwetaghị ná mmalite na ya nwere nsogbu ịṅụ mmanya. O kwetara, sị: “Anaghị m ekwe ka ndị mmadụ mara na m na-aṅụ oké mmanya, m na-achọkwa ihe ndị m ga-eji akụgide aka aṅubiga mmanya ókè, na-emekwa ka à ga-asị na oké mmanya m na-aṅụ adịghị ihe o mere. Ọ bụ naanị otu ihe na-adị m n’uche, ya bụ, ịhụ na anọgidere m na-aṅụbiga mmanya ókè.” N’agbanyeghị na ndị ọzọ na-ahụ na mmanya na-atụrụ Toni na Alen ụka, onye nke ọ bụla n’ime ha nọgidere na-agwa onwe ya na ya enweghị nsogbu. Ọ dị mkpa ka mmadụ abụọ ahụ mee ihe iji kwụsị ịṅụbiga mmanya ókè. Ma, olee ihe ha ga-eme?

Mee Ihe!

Ọtụtụ ndị kwụsịrịla ịṅụbiga mmanya ókè mere ihe a Jizọs kwuru: “Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo. N’ihi na ọ baara gị uru ka otu akụkụ ahụ́ gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị dum na Gehena.”—Matiu 5:29.

N’ezie, ihe Jizọs na-ekwu abụghị ka mmadụ bepụ akụkụ ahụ́ ya. Kama nke ahụ, o nyere anyị ihe atụ nke na-egosi na anyị kwesịrị nnọọ ịdị njikere iwepụ ná ndụ anyị ihe ọ bụla ga-emebi mmekọrịta anyị na Chineke. N’eziokwu, ihe ahụ anyị ga-eme nwere ike isiri anyị ezigbo ike. Ma ọ ga-eme ka anyị zere ụdị echiche ma ọ bụ ọnọdụ ndị nwere ike ime ka anyị ṅụbiga mmanya ókè. N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị ọzọ ekwuola na ị ṅụbigawala mmanya ókè, mee ihe iji belata ya. * Ọ bụrụ na o doo anya na ị gaghị ebelatali iko mmanya ole ị na-aṅụ, dị njikere ịkwụsị ịṅụ ya kpamkpam. N’agbanyeghị otú nke ahụ nwere ike isi siere gị ike, ọ dị mma karịa ibibi ndụ gị.

Ya bụrụgodị na ị bụghị onye aṅụrụma, ị̀ na-aṅụkarị oké mmanya? Ya bụrụ otú ahụ, olee ihe ndị bara uru i nwere ike ime bụ́ ndị ga-enyere gị aka ile mmanya na-aba n’anya anya otú kwesịrị ekwesị?

Ebe Ndị I Nwere Ike Isi Nweta Enyemaka

1. Nwee okwukwe na isi n’ala ala obi gị na-ekpe ekpere mgbe niile ga-enyere gị aka. Baịbụl nyere ndị niile chọrọ ime ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ ndụmọdụ a: “N’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Olee ihe ị ga-arịọ Chineke n’ekpere iji nweta ụdị udo a n’obi gị?

Kweta n’ezie na i nwere nsogbu ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè, nke bụ́kwanụ nsogbu i kwesịrị ịrụrụ ọrụ. Ịgwa Chineke ihe ị chọrọ ime banyere ya ga-eme ka ọ gọzie mgbalị ị na-eme inwere onwe gị na ya na izere nsogbu ndị ka njọ. “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.” (Ilu 28:13) Jizọs kwukwara na anyị nwere ike ikpe ekpere, sị: “Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 6:13) Ma, olee otú i nwere ike isi na-eme ihe ndị kwekọrọ n’ekpere ndị dị otú ahụ, oleekwa ebe i nwere ike isi nweta azịza nke ekpere ndị ị na-ekpesi ike?

2. Nweta ike site n’Okwu Chineke. “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, . . . o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ihe mmadụ bu n’obi.” (Ndị Hibru 4:12) Ịgụ na ịtụgharị uche n’amaokwu Baịbụl dị iche iche kwa ụbọchị enyerela ọtụtụ ndị na-aṅụbu oké mmanya aka. Otu ọbụ abụ na-atụ egwu Chineke dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-adịghị eje ije na ndụmọdụ ndị ajọ omume. . . . Kama iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị. . . . Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”—Abụ Ọma 1:1-3.

Alen, bụ́ onye Baịbụl ya na Ndịàmà Jehova mụrụ mere ka o nweta ume ịkwụsị ịṅụbiga mmanya ókè, kwuru, sị: “O doro m anya na e wezụga Baịbụl na ụkpụrụ Baịbụl ndị nyeere m aka ịkwụsị ịṅụ mmanya, m gaarala anwụ.”

3. Mụta ijide onwe gị. Baịbụl kọọrọ anyị na a sachara ndị bụ́bu ndị aṅụrụma n’ọgbakọ Ndị Kraịst “site ná mmụọ nke Chineke anyị.” (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) Olee otú nke ahụ si mee? Otu ụzọ o si mee bụ na ha mụtara inwe njide onwe onye, bụ́ àgwà mmụọ nsọ Chineke na-enyere mmadụ aka ịzụlite, nke ahụ nyekwaara ha aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya na ime oriri oké mkpọtụ. “Unu adịkwala na-aṅụbiga mmanya ókè, nke ndụ ịla n’iyi dị na ya, kama na-ejupụtanụ na mmụọ nsọ.” (Ndị Efesọs 5:18; Ndị Galeshia 5:21-23) Jizọs Kraịst kwere nkwa na “Nna unu nke nọ n’eluigwe [ga-enye] ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.” Ya mere, “na-arịọnụ, a ga-enye unu.”—Luk 11:9, 13.

Ndị chọrọ ife Jehova otú ọ ga-anabata nwere ike ịmụta inwe njide onwe onye site n’ịgụ na ịmụ Baịbụl na site n’isi n’obi ha na-ekpe ekpere mgbe niile. Kama ịda mbà n’obi, kwere nkwa a dị n’Okwu Chineke: “Onye na-agha mkpụrụ maka anụ ahụ́ ya ga-aghọrọ ire ure site n’anụ ahụ́ ya. Ya mere, ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.”—Ndị Galeshia 6:8, 9.

4. Họrọ ezigbo ndị enyi. “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) Gwa ndị enyi gị na i kpebisiela ike na ị gaghị aṅụbigakwa mmanya ókè. Ma, Okwu Chineke eburula ụzọ dọọ gị aka ná ntị na ọ bụrụ na ị kwụsị ‘ịṅụ oké mmanya, iri oriri oké mkpọtụ, na ịma aka n’ịṅụ mmanya, ọ ga-eju ụfọdụ ndị bụ́bu ndị enyi gị anya, ha ewee na-ekwujọ gị.’ (1 Pita 4:3, 4) Dị njikere ịkwụsị ịkpakwuru ndị enyi na-eme ka o siere gị ike ịkwụsị ịṅụbiga mmanya ókè.

5. Kpebie nnọọ iko ole ị ga na-aṅụ. “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Ọ bụrụ na i kwe ka ụkpụrụ nke Okwu Chineke nyere gị aka ikpebi iko ole ị ga na-aṅụ kama ikwe ka “usoro ihe nke a” kpebiere gị ya, ị ga-ebi ndụ ga-eme Chineke obi ụtọ. Ma, olee otú i nwere ike isi kpebie ole i kwesịrị ịṅụdebe?

Iko mmanya ole mere ka ị ghara ime mkpebi ziri ezi ma mee ka ikike iche echiche gị ghara ịdị nkọ agafeela ókè. N’ihi ya, ọ bụrụ na i kpebie ịṅụ mmanya, ọ dịghị mma ịhọrọ ịṅụru ya otú ọ ga-afọ obere ka o gbuwe gị egbuwe. Ekwela ka ịgbara eziokwu ọsọ mee ka ị ghara ileba anya nke ọma n’otú i si aṅụ mmanya. Kpebie nnọọ ole ị ga na-aṅụ iji zere ịba ná nsogbu, bụ́ nke na-agaghị enye gị ohere ịṅụbiga ya ókè.

6. Mụta ịjụ ịṅụtụkwu. “Naanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e.” (Matiu 5:37) Mụta iji obiọma jụ ịṅụtụkwu mmanya mgbe onye ị gara na nke ya nke na-aghọtaghị ọnọdụ gị nọ na-asị gị ṅụtụkwuo. “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.”—Ndị Kọlọsi 4:6.

7. Chọta ndị ga-enyere gị aka. Chọta ezigbo ndị enyi ga-akwado gị ná mkpebi i mere na ị gaghị aṅụbiga mmanya ókè, bụ́kwa ndị ga-enyere gị aka n’ụzọ ime mmụọ. “Abụọ dị mma karịa otu, n’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha. N’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya.” (Ekliziastis 4:9, 10; Jems 5:14, 16) Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Ịṅụbiga Mmanya Ókè na Aṅụrụma na Yunaịted Stets dụkwara ọdụ, sị: “Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri gị ike ịkwụsịlata ịṅụ mmanya. Gwa ndị ikwu na ibe gị ka ha nyere gị aka ịkwụsịlata ya.”

8. Nọgide ná mkpebi gị. “Bụrụnụ ndị na-eme okwu Chineke, unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ, ndị ji echiche ụgha na-aghọgbu onwe ha. Ma onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ n’ime ya eme, n’ihi na ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama ọ bụ onye na-arụ ọrụ ahụ.”—Jems 1:22, 25.

Otú Ị Ga-esi Nwere Onwe Gị Ma Ọ Bụrụ na Ịṅụbiga Mmanya Ókè Eriela Gị Ahụ́

Ọ bụghị mmadụ niile na-aṅụ oké mmanya na-aghọ ndị aṅụrụma. Ma, ụfọdụ ndị na-amalite ịṅụ oké mmanya—ma ọ bụ na-aṅụ nnọọ mmanya ugboro ugboro—nke na mmanya na-aba n’anya na-eri ha ahụ́. Ebe ọ bụ na mmanya iri mmadụ ahụ́ pụtakwara na ahụ́ na uche onye ahụ na-achọ mmanya mgbe niile, ihe dị onye dị otú ahụ mkpa abụghị naanị ikpebisi ike ịkwụsị aṅụrụma na enyemaka ime mmụọ. Alen chetara, sị: “Mgbe m na-agbalị ịkwụsị ịṅụ mmanya na-aba n’anya, ahụ́ mgbu ọ kpataara m abụghị obere ihe. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na e wezụga enyemaka ime mmụọ m na-enweta, ọ dịkwa m mkpa ka e lebara m anya n’ụlọ ọgwụ.”

Ọ dị ọtụtụ ndị na-aṅụ oké mmanya mkpa ka e lebara ha anya n’ụlọ ọgwụ ka ha nwee ike imeri n’ọgụ ime mmụọ ha na-alụ ịkwụsị ịṅụbiga mmanya ókè. * Ọ dị mkpa ka e nye ụfọdụ ndị àkwà n’ụlọ ọgwụ iji nyere ha aka idi oké ahụ́ mgbakasị ha na-enwe mgbe ha na-akwụsị ịṅụ mmanya ma ọ bụ ka e nye ha ọgwụ ga-eme ka mmanya ghara ịgụ ha agụụ gabiga ókè na iji nyere ha aka ịkwụsịcha ịṅụ mmanya. Ọkpara Chineke na-arụ ọrụ ebube kwuru, sị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị na-arịa ọrịa.”—Mak 2:17.

Uru Ige Chineke Ntị Bara

Ndụmọdụ ndị bara uru Baịbụl nyere sitere n’aka ezi Chineke, bụ́ onye chọrọ nnọọ ka ihe dịrị anyị ná mma—ọ bụghị naanị ugbu a kamakwa ruo mgbe ebighị ebi. Afọ iri abụọ na anọ Alen kwụsịchara ịṅụ mmanya na-aba n’anya, o chetara ihe merenụ ma kwuo, sị: “O mere m nnọọ obi ụtọ ịmata na m nwere ike ịgbanwe, ịmata na Jehova chọrọ inyere m aka ịgbanwe àgwà ọjọọ m, na ọ . . . ” Alen kwụsịtụrụ iji hichaa anya mmiri na-agba ya n’ihi ihe ndị o chetara. Ọ gaziri n’ihu, sị: “Eem, . . . ịmata na Jehova ghọtara ọnọdụ m, na-echekwa banyere m ma na-enyere m aka na-eme m ezigbo obi ụtọ.”

N’ihi ya, ọ bụrụ na mmanya na-aba n’anya eriela gị ahụ́, adịla ngwa ikwubi na ọ dịghị ihe ị ga-emeli banyere ya ma ọ bụ chee na ọnọdụ gị enweghị mmekwata. Ọ dịla mgbe ọ dị Alen na ọtụtụ ndị ọzọ otú ahụ ọ dị gị ugbu a, ma ha mechara kwụsịlata iko mmanya ole ha na-aṅụ ma ọ bụ kwụsịchaa ịṅụ mmanya. Ha anaghị akwa ụta ọ bụla; ị gaghịkwa akwa.

Ma ị̀ họọrọ ịṅụ mmanya otú kwesịrị ekwesị ma ị̀ họọrọ ịkwụsịcha ya, gee ntị n’arịrịọ a Chineke ji ịhụnanya rịọ gị: “A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri, ezi omume gị ga-adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.”—Aịzaya 48:18.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Gụọ igbe bụ́  “Mmanya Ọ̀ Tụwarala M Ụka?” nke dị na peeji nke 8.

^ par. 24 E nwere ọtụtụ ogige ịgwọ ọrịa, ụlọ ọgwụ, na ihe omume ndị ọzọ nwere ike inyere mmadụ aka ịkwụsị ịṅụbiga mmanya ókè. Ụlọ Nche anaghị akwado ụdị ọgwụgwọ ọ bụla. Onye nke ọ bụla kwesịrị iji nlezianya tụlee ụzọ ndị a chọrọ isi agwọ ya, kpebiziere onwe ya ihe ọ ga-eme nke na-agaghị emegide ụkpụrụ Baịbụl.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

 Mmanya Ọ̀ Tụwarala M Ụka?

I nwere ike ịjụ onwe gị, sị:

• Àna m aṅụ mmanya na-aba n’anya karịa otú m na-aṅụbu?

• Àna m aṅụ mmanya ugboro ugboro karịa otú m na-aṅụbu?

• Àṅụwakwuola m mmanya ndị siri ike karịa ndị m na-aṅụbu?

• Àna m aṅụ mmanya mgbe m nọ ná nchegbu ma ọ bụ mgbe m nwere nsogbu?

• Ọ̀ dịla enyi m ma ọ bụ onye ezinụlọ m nke gwara m na m ṅụbigawala mmanya ókè?

• Mmanya ọ̀ kpatarala m nsogbu n’ụlọ, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ mgbe m mere njem?

• Ọ̀ na-esiri m ike ịnọ otu izu n’aṅụghị mmanya?

• Ahụ́ ọ̀ na-agbakasị m mgbe ndị ọzọ jụrụ ịṅụ mmanya?

• Àna m ezoro ndị ọzọ iko mmanya ole m na-aṅụ?

Ọ bụrụ na ị zara ee n’otu n’ime ajụjụ ndị a ma ọ bụ karị, o nwere ike ịdị mkpa ka i mee ihe iji belata iko mmanya ole ị na-aṅụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Ime Ezi Mkpebi Banyere Mmanya Na-aba n’Anya

Tupu gị aṅụọ mmanya na-aba n’anya, tụlee ihe ndị a:

M̀ kwesịrị ịṅụ mmanya na-aba n’anya, ka m̀ kwesịrị ịhapụ ịṅụ?

Aro: Onye na-enweghị ike ịkpara onwe ya ókè iko mmanya ole ọ ga-aṅụ kwesịrị ịhapụ ịṅụ aṅụ.

Iko ole ka m kwesịrị ịṅụ?

Aro: Kpebie iko ole isi gị ga-ebuli tupu mmanya emegharịa gị anya.

Olee mgbe m ga-aṅụ mmanya?

Aro: Aṅụla ya tupu gị akwọwa ụgbọala ma ọ bụ mgbe ị na-eme ihe ndị chọrọ ka i jiri anya doro edo mee ha; aṅụla ya tupu gị emee ihe metụtara okpukpe; aṅụla ya mgbe ị dị ime; aṅụla ya mgbe ị na-aṅụ ọgwụ ụfọdụ.

Ebee ka m ga-aṅụ mmanya?

Aro: N’ebe na-agaghị akpatara gị nsogbu; ọ bụghị na nzuzo ka ndị mmadụ ghara ịma na ị na-aṅụ mmanya; aṅụla ya n’ihu ndị ịṅụ ya ga-ewe iwe.

Olee ndị mụ na ha ga-anọ aṅụ mmanya?

Aro: Mgbe gị na ezi ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị nọ; aṅụla ya mgbe gị na ndị nwere nsogbu ịṅụ mmanya nọ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Otú Okwu Chineke Si Nyere Onye Bụ́bu Onye Aṅụrụma Aka

Supot, bụ́ onye bi na Taịland, na-aṅụ oké mmanya. Na mbụ, ọ na-aṅụ mmanya naanị ná mgbede. O ji nwayọọ nwayọọ malite ịṅụ ya n’ụtụtụ ma mechaa na-aṅụkwa ya n’ehihie. Mgbe mgbe, ọ na-aṅụ mmanya naanị ka mmanya gbuwe ya. Ma ka oge na-aga, ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Mgbe Supot mụtara na Jehova Chineke kpọrọ aṅụrụma asị, ọ kwụsịrị ịṅụ mmanya. Ma, ka oge ụfọdụ gasịrị, ọ maliteghachiri ịṅụbiga mmanya ókè. Nke ahụ wutere nnọọ ndị ezinụlọ ya.

Ma, Supot ka hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ife ya nke ọma. Ndị enyi Supot nọgidere na-enyere ya aka ma na-agba ndị ezinụlọ ya ume ka ha na-ewepụtakwu oge iji nọnyere ya nakwa ka ha ghara ịda mbà n’inyere ya aka. N’oge ahụ, okwu ahụ doro anya dị ná 1 Ndị Kọrịnt 6:10 nke bụ́ na ‘ndị aṅụrụma agaghị eketa alaeze Chineke’ nyeere Supot aka ịghọta otú ihe ọ na-eme jọruru ná njọ. Ọ ghọtara na ọ dị ya mkpa ịgbalị ike ya niile ịkwụsị ịṅụbiga mmanya ókè.

Na nke ugbu a, Supot kpebisiri ike ịkwụsị ịṅụ mmanya na-aba n’anya kpamkpam. N’ikpeazụ, site n’ike nke mmụọ nsọ Chineke, nduzi nke Okwu Chineke, na enyemaka nke ndị ezinụlọ ya na ọgbakọ ya, Supot nwetara ikike ime mmụọ ma kwụsị inwe agụụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Obi tọrọ nnọọ ezinụlọ ya ụtọ mgbe e mere ya baptizim iji gosi na o nyefeela Chineke onwe ya. Supot na Chineke dị n’ezigbo mma ugbu a bụ́ ihe na-agụ ya nnọọ agụụ kemgbe, ọ na-ewepụtakwa oge iji nyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ.