Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ụzọ Pọl onyeozi si n’oge mbụ ọ gara Rom?

Ọrụ 28:13-16 kwuru na ụgbọ mmiri Pọl banyere gaa Ịtali kwụsịrị na Putiolaị (ebe bụ́ Pọtswọli n’oge a), n’Ọnụ Mmiri Nepụls. O sizi ụzọ Vaya Apịa banye Rom, bụ́ okporo ụzọ awara awara bụ́ isi e nwere na Rom.

Onye e si n’aha ya nweta aha Vaya Apịa bụ Apịọs Klọdiọs Sikọs, bụ́ onye ọchịchị Rom nke malitere ịrụ ụzọ a n’afọ 312 Tupu Oge Anyị. Okporo ụzọ a, bụ́ nke dị n’agbata mita ise na isii n’obosara, bụ́kwa nke e ji nnukwu okwute wụọ ala ya, mechara dị narị kilomita ise na iri asatọ na atọ n’ogologo n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Rom. O jikọtara Rom na ọdụ ụgbọ mmiri Brọndiziọm (ebe bụ́ Brindizi ugbu a), bụ́ ebe e si abanye n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ndị njem na-akwụsịtụ n’ebe ụfọdụ e mere ịnọ ezurụtụ ike, bụ́ ndị na-adịkarị kwa kilomita iri abụọ na anọ ọ bụla, iji zụrụ ihe oriri, hie ụra, ma ọ bụ banye ịnyịnya ma ọ bụ ụgbọ ọzọ.

Ma, ọ dị nnọọ ka Pọl ò ji ụkwụ na-aga. Ebe ọ garuru na Vaya Apịa dị narị kilomita abụọ na iri na abụọ n’ogologo. Ụzọ a nwere ebe a na-akpọ Pọntin Mashis, bụ́ ebe bụ́ nnọọ apịtị apịtị nke mere otu onye Rom na-ede akwụkwọ ji kwuo na anwụnta na-atakarị n’ebe ahụ nakwa na ọ na-esi ajọ ísì. Ahịa Apịọs—nke dị ihe dị ka kilomita iri isii na ise site na Rom—na Ụlọ Atọ nke Ndị Ije, bụ́ ebe a na-anọ ezu ike nke dị ihe dị ka kilomita iri ise site na Rom, dị nnọọ n’ebe ugwu nke ebe ahụ bụ́ apịtị apịtị. Ndị Kraịst si Rom nọ n’ebe abụọ a ndị njem na-akwụsịtụ na-eche Pọl. Mgbe Pọl hụrụ ha, “o kelere Chineke ma nwee obi ike.”—Ọrụ 28:15.

Olee ụdị mbadamba ide ihe e kwuru okwu ya na Luk 1:63?

Oziọma Luk kwuru na ndị enyi Zekaraya jụrụ ya ihe a ga-akpọ nwa ọhụrụ a mụụrụ ya. Zekaraya “wee sị ka e nye ya mbadamba ihe, o wee dee, sị: ‘Jọn bụ aha ya.’” (Luk 1:63) Otu akwụkwọ nkà mmụta kwuru na okwu Grik a sụgharịrị “mbadamba ihe” n’ebe a pụtara “obere bọọdụ e ji ede ihe a na-ejikarị osisi arụ ma tee ya mgbá aṅụ.” A na-eji mgbá aṅụ na-akwọ mụrụmụrụ etechi ebe ndị batụrụ ime n’ibe osisi ndị a kụkọtara akụkọta. Onye na-ede ihe nweziri ike iji mkpịsị ígwè dee ihe n’elu ya. E nwere ike imecha hichapụ ihe ahụ e dere na ya ma teghachi ya mgbá aṅụ ka e nwee ike ideghachi ya ihe.

Akwụkwọ bụ́ Reading and Writing in the Time of Jesus kwuru, sị: “Ihe osise ndị e nwetara na Pọmpee, ihe a tụrụ atụ ndị e si n’ebe dị iche iche n’Alaeze Ukwu Rom nweta na ihe ndị e gwupụtara n’ebe dị iche iche malite n’Ijipt ruo ná Mgbidi Hedrian [Ebe Ugwu Briten] na-egosi nnọọ na e ji mbadamba ihe dee ihe n’ebe dị iche iche.” Ọ ga-abụ na ụdị ndị dị iche iche, ya bụ, ndị ahịa, ndị ọrụ gọọmenti, na ikekwe ụfọdụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ, nwere ụdị mbadamba ide ihe ahụ.

[Foto dị na peeji nke 11]

Vaya Apịa

[Foto dị na peeji nke 11]

Mbadamba ide ihe e tere mgbá aṅụ nke otu nwa akwụkwọ, narị afọ nke abụọ oge anyị

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara Ọ́bá Akwụkwọ Briten ikike