Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Ọ̀ Ga-agwụ?

Ụwa Ọ̀ Ga-agwụ?

Ụwa Ọ̀ Ga-agwụ?

“OKWU banyere ọgwụgwụ ụwa anaghị agbụ ndị mmadụ agbụ, ma ó nweghị ihe ọzọ na fim.” Nke ahụ bụ ihe onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ, bụ́ Jọn Skọlzi, kwuru. Olee ihe mere fim na-egosi ọgwụgwụ ụwa ji amasị ndị mmadụ? Skọlzi kwuru, sị: “Ọ bụ n’ihi na ọ bụ ihe anyị na-atụ ụjọ ya.” Ì kwetara? Ọ̀ dị ezi ihe mere anyị ga-eji na-atụ ụjọ banyere otú ụwa—na ihe niile dị ndụ nọ n’ime ya—nwere ike isi gwụ na mgbe o nwere ike ịgwụ?

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị, anyị na-anụ mkpamkpa ọdachi ndị na-emere onwe ha na-akpa gburugburu ụwa. A na-egosi mkpamkpa ndị dị otú ahụ ugboro ugboro na tiivi na n’Ịntanet. Mgbe a na-egosi anyị otú e si na-ebibi ndị mmadụ na ebe dị iche iche, ọ na-eme ka ọ dịrị anyị mfe ile ọgwụgwụ ụwa anya dị ka ihe ga-eme eme kama ịbụ naanị ihe na-eme na fim.

Ndị ọkà mmụta sayensị na-eme ka ụjọ ji ndị mmadụ ka njọ site n’ịkọ otú ụwa nwere ike isi mebie. Ụfọdụ kwudịrị mgbe ụwa nwere ike imebi n’onwe ya. Na Mach 2008, akwụkwọ bụ́ Monthly Notices of the Royal Astronomical Society kọrọ na mmadụ abụọ na-enyocha mbara igwe kwuru na n’ihe karịtụrụ ijeri afọ asaa na ọkara n’ọdịnihu, anyanwụ ga-ekpuchi ụwa ma gbazee ya.

Ụwa ọ̀ ga-emebi n’onwe ya n’ezie otu ụbọchị?

Ò Nwere Ụbọchị Ụwa Anyị Ga-emebi n’Onwe Ya?

Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “Otu ọgbọ na-ala, ọgbọ ọzọ na-abịakwa, ma ụwa na-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi.” (Ekliziastis 1:4) Jehova Chineke “tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike,” keekwa ya ka ọ dịruo “mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5) Okwu ndị a e si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee hà dara gị ka akụkọ ifo? Olee ihe mere i kwesịrị iji kwere na ụwa anyị agaghị emebi emebi, n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ọ ga-emebi?

Chetụgodị banyere ngwá ahịa ndị a kpọsara n’ụlọ ahịa. E dere ụbọchị ụfọdụ n’ime ha ga-emebi n’ahụ́ ha. Ònye kwuru ụbọchị ndị ahụ e dere n’ahụ́ ha? Ọ̀ bụ onyeisi ụlọ ahịa ahụ ji amamihe ya kwuo ụbọchị o chere na ha ga-emebi? Mbanụ! Ọ bụ onye mepụtara ha kwuru ụbọchị ha ga-emebi. Anyị na-ekwere na ngwá ahịa ndị ahụ ga-emebi n’ụbọchị ahụ n’ihi na onye mepụtara ha maara ngwá ahịa ndị ahụ o mepụtara karịa onye ọ bụla ọzọ. Anyị kwesịrị nnọọ ịtụkwasị Onye kere ụwa anyị obi karị! Okwu ya kwuru hoo haa na “ọ tọsiwo ntọala ụwa ike” ka o wee dịruo mgbe ebighị ebi. Ọ gaghị emebi emebi—ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 119:90.

Ma, ụmụ mmadụ na-ejighị ihe kpọrọ ihe hà ga-enwe ike imebigide ụwa ruo mgbe ọ na-agakwaghị enwe mmekwata? Mbanụ! Jehova adịghị ka ụmụ mmadụ na-emepụta ihe, n’ihi na o “nwere ike ime ihe niile.” (Job 42:2) Ọ bụ ya mere o ji kwuo n’eleghị anya n’azụ, sị: “Okwu m nke si n’ọnụ m pụta . . . ga-emezukwa.” (Aịzaya 55:11) Anyị ji n’aka na “Onye kere anyị” agaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie ya imezu nzube ya maka ụwa. (Abụ Ọma 95:6) Olee ihe bụ́ nzube ahụ, oleekwa otú Chineke ga-esi emezu ya?

Alaeze Chineke Ga-emezu Nzube Chineke

Ọ bụghị naanị na Okwu Chineke mesiri anyị obi ike na ụwa agaghị emebi emebi, ọ gwakwara anyị na Chineke “kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.” (Aịzaya 45:18) Ọ bụ ezie na ndị mmadụ ebiela n’ụwa anyị ruo ọtụtụ puku afọ, nke ahụ apụtaghị na nzube Chineke emezuola.

Jehova bụ “Chineke bụ́ onye obi ụtọ” na onye “hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.” (1 Timoti 1:11; Abụ Ọma 37:28) Nzube ya bụ ka ụmụ mmadụ niile bie ndụ obi ụtọ, n’enweghị ikpe na-ezighị ezi. Iji mezuo nzube ya, Chineke buru amụma na ya ga-eguzobe otu Alaeze n’eluigwe nke ga-achị ụwa niile. (Daniel 2:44) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwuru banyere ọchịchị Alaeze Chineke ugboro ugboro. Ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha na-ekpe ekpere maka ya n’ihi na ọ maara ngọzi ndị ọchịchị nke Alaeze ahụ ga-ewetara ụwa. (Matiu 6:9, 10; 24:14) Olee ụfọdụ n’ime ngọzi ndị ahụ?

Udo na obi iru ala ga-adị ebe niile n’ihi na Chineke kwere nkwa ịkwụsị agha niile.—Abụ Ọma 46:9.

Nri ga-abụ atụrụ tawa.—Abụ Ọma 72:16.

Ọrịa agakwaghị abụ nsogbu n’ihi na “ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.

Iru uju agaghị adịkwa, n’ihi na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.

Chineke kwere nkwa na ndị ya ga-ewu ụlọ nke ha, biri n’ime ya n’obi iru ala, ‘ṅụrịakwa ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.’—Aịzaya 65:17-24.

O doro anya na ọ na-agụ gị agụụ ịnọ n’ụdị ọnọdụ ndị ahụ e kwuru okwu ha n’elu. Ọ na-agụsi Jehova agụụ ike, na-anụ ya ọkụ n’obi, imezu ihe niile o kwuru na ya ga-eme. (Aịzaya 9:6, 7) Ma, i nwere ike ịnọ na-eche, sị: ‘O ruola ọtụtụ puku afọ e dere nkwa ndị ahụ Chineke kwere na Baịbụl. Olee ihe mere na ha emezubeghị?’

Ndidi Chineke Ga-eme Ka A Zọpụta Anyị

Ka obi sie gị ike na “Jehova adịghị egbu oge n’imezu nkwa ya.” Baịbụl kwuru na Chineke ji ịhụnanya na-enwere anyị ndidi kemgbe. N’ihi ya, a gbara anyị ume ka anyị ‘na-agụ ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta.’ (2 Pita 3:9, 15) Ma, gịnị mere ndidi Chineke ji dị mkpa maka ịzọpụta anyị?

Nke mbụ bụ na Chineke maara na tupu ya enwee ike inye ụmụ mmadụ bụ́ ndị ezi omume ebe obibi dị mma obi ga-eru ha ala na ya, ọ ga-ebu ụzọ ‘bibie ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Ma, ebe ọ bụ na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, “ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla.” N’ihi ya, Nna anyị nke eluigwe ejirila ndidi na-agbalị ‘ịdọ ndị ajọ omume aka ná ntị ka ha hapụ ụzọ ọjọọ ha.’ Ọ bụ ya mere Jehova ji mee ka a na-ekwusa ozi Alaeze ya n’ụwa niile. * (Ezikiel 3:17, 18) A ga-azọpụta ndị niile na-ege ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke ma na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume ya, ha ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa paradaịs.

Bịakwute Chineke Ka A Zọpụta Gị

N’eziokwu, Baịbụl nwere “ozi ọma” izi anyị. (Matiu 24:14) Ọ na-eme ka anyị mara ihe e ji n’aka Chineke kwuru, nke bụ́ na o nweghị mgbe a ga-emebi ụwa! Amụma Baịbụl na-egosikwa na anyị nwere ike inwe okwukwe na “n’oge na-adịghị anya, [ndị] ajọ omume agakwaghị anọ.” N’oge na-adịghị anya, ọ bụ naanị ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya Chineke “ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” (Abụ Ọma 37:9-11, 29; Matiu 5:5; Mkpughe 21:3, 4) Tupu oge ahụ eruo, Chineke ga-anọgide na-eji ndidi agwa ndị mmadụ, sị: “Bịakwutenụ m ka a zọpụta unu, unu niile ndị nọ na nsọtụ ụwa.” (Aịzaya 45:22) Gịnị ka ị ga-eme?

Ọ́ gaghị adị mma ka i kpebisie ike ịbịakwute Chineke? Abụ Ọma 37:34 gbara anyị ume, sị: “Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya, ọ ga-ebulikwa gị elu inweta ụwa.” Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmụtakwu banyere ihe bụ́ nzube ebighị ebi Chineke maka ụwa na otú i nwere ike isi hụ mgbe nzube ahụ ga-emezu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 21 Ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova asaa nọ na narị ala abụọ na iri atọ na isii na-erube isi n’iwu Jizọs nyere na Matiu 28:19, 20, na-eji ihe dị ka otu ijeri awa na ọkara kwa afọ akụziri ndị mmadụ banyere ihe ndị magburu onwe ha Chineke zubere banyere ụwa a.

[Ebe E Si Nweta Foto peeji 22]

Foto NASA