Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bụrụ Ezigbo Onye Na-eso Ụzọ Kraịst

Bụrụ Ezigbo Onye Na-eso Ụzọ Kraịst

Bụrụ Ezigbo Onye Na-eso Ụzọ Kraịst

“Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru.”—MAT. 7:17.

1, 2. Olee ihe e ji ama ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst na ndị nke adịgboroja, karịchaa n’oge ọgwụgwụ a?

JIZỌS kwuru na ihe a ga-eji mara ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya na ndị sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya bụ ụdị mkpụrụ ha na-amị, ya bụ, ihe ha na-akụzi na àgwà ha na-akpa. (Mat. 7:15-17, 20) N’eziokwu, ndị mmadụ na-eme ihe ha mụtara, ya bụ, ihe banyere ha n’uche na n’obi. (Mat. 15:18, 19) Ndị a na-ezi ozizi ụgha na-amị “mkpụrụ na-abaghị uru,” ebe ndị a na-akụziri eziokwu na-amị “ezi mkpụrụ.”

2 Ụdị mkpụrụ abụọ a apụtala ìhè n’oge ọgwụgwụ a. (Gụọ Daniel 12:3, 10.) Ndị Kraịst ụgha amaghị nke bụ́ eziokwu banyere Chineke, ha na-emekarịkwa ka hà na-efe Chineke. Ma, ndị ma eziokwu na-efe Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24; 2 Tim. 3:1-5) Ha na-agbasi mbọ ike ịkpa àgwà ka Kraịst. Ma, oleekwanụ banyere anyị n’otu n’otu? Ka ị na-atụle ugbu a ihe ise e ji ama ezigbo Ndị Kraịst, jụọ onwe gị, sị: ‘Àgwà m na ihe m na-akụzi hà kwekọrọ n’ihe e dere n’Okwu Chineke? M̀ na-eme ka eziokwu ahụ maa mma n’anya ndị na-achọ ịmụta ya?’

Ha Na-eme Ihe Baịbụl Kwuru

3. Olee ihe ndị na-amasị Jehova, oleekwa otú ezigbo Ndị Kraịst si ele ha anya?

3 Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.” (Mat. 7:21) N’ezie, ihe na-amasị Jehova abụghị mmadụ ịsị na ya bụ Onye Kraịst kama ọ bụ onye ahụ ịkpa àgwà Onye Kraịst. Ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst na-egosi nke a n’ihe niile ha na-eme ná ndụ. Nke a gụnyere otú ha si ele ego, ọrụ e ji akpata ego, ihe e ji atụrụ ndụ, omenala na ememme anya. Ọ gụnyekwara otú ha si ewere alụmdi na nwunye nakwa otú ha si emeso ndị ọzọ ihe. Ma, Ndị Kraịst adịgboroja na-eme ihe ọ bụla ụwa na-eme, bụ́ ihe ndị na-ajọwanye njọ n’oge ikpeazụ a.—Ọma 92:7.

4, 5. Olee otú anyị ga-esi na-eme ihe Jehova kwuru nke e dere na Malakaị 3:18?

4 Ọ bụ nke a mere Malakaị onye amụma ji dee, sị: “Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume, n’etiti onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.” (Mal. 3:18) Ka ị na-echebara okwu ndị a echiche, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-eme ka ndị ụwa ka m̀ dị iche? M̀ na-achọkarị ime ka ndị mụ na ha na-arụ ọrụ, ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe m, ka m̀ na-eme ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ka ndị ọzọ mara ihe m kweere mgbe ọ dị mkpa ka m mee otú ahụ?’ (Gụọ 1 Pita 3:16.) Ọ bụ eziokwu na anyị achọghị ịbụ ndị oké ezi omume, ma, anyị kwesịrị ịdị iche ná ndị na-ahụghị Jehova n’anya, bụ́ ndị na-anaghịkwa efe ya.

5 Ọ bụrụ na ị chọpụta ebe i kwesịrị imezi ná ndụ gị, kpekuo Chineke ekpere banyere ya. Gbaakwa mbọ na-amụchi Baịbụl anya, na-ekpe ekpere mgbe niile, ma na-agachi ọmụmụ ihe anya ka i wee nwee ike ime nke ọma. Ka ị na-emekwu ihe ị mụtara n’Okwu Chineke, otú ahụ ka ị ga-enwekwu ike ịmị “ezi mkpụrụ,” nke gụnyere “mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha [Chineke] n’ihu ọha.”—Hib. 13:15.

Ha Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

6, 7. Olee ihe dị iche ná Ndị Kraịst adịgboroja na ezigbo Ndị Kraịst ma a bịa n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke?

6 Jizọs kwuru, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Olee ihe mere Alaeze Chineke ji bụrụ isi ihe Jizọs kwusara? Ọ bụ n’ihi na ọ maara na yanwa, bụ́ Eze nke Alaeze Chineke, nakwa ụmụnna ya e ji mmụọ nsọ mụta, bụ́ ndị a kpọlitere n’ọnwụ, ga-ekpochapụ mmehie, bụ́ ihe na-akpata nsogbu niile ụmụ mmadụ na-enwe, gbuokwa onye na-akpata ha, bụ́ Ekwensu. (Rom 5:12; Mkpu. 20:10) N’ihi ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekwusa banyere Alaeze Chineke ruo mgbe usoro ihe a ga-agwụ. (Mat. 24:14) Ndị na-ekwu naanị n’ọnụ na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst anaghị arụ ọrụ a, n’eziokwu, ha agaghị arụli ya. N’ihi gịnị? E nwere, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ihe atọ kpatara ya. Nke mbụ, ha agaghị ekwusa ihe ha na-aghọtaghị. Nke abụọ, ọtụtụ n’ime ha adịghị umeala n’obi, ha amaghịkwa ihe ha ga-eme ma ọ bụrụ na ndị agbata obi ha ha chọrọ ikwusara ozi ọma Alaeze Chineke akparịwa ha ma ọ bụkwanụ kpagbuwe ha. (Mat. 24:9; 1 Pita 2:23) Nke atọ, Ndị Kraịst adịgboroja enweghị mmụọ nsọ Chineke.—Jọn 14:16, 17.

7 Ma, ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst ghọtara ihe Alaeze Chineke bụ, ghọtakwa ihe ọ ga-emere ụmụ mmadụ. Ha na-ebute ihe banyere Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ha, mmụọ nsọ Jehova na-enyekwara ha aka ikwusa banyere ya n’ụwa niile. (Zek. 4:6) Ị̀ na-ejechi ozi ọma anya? Ị̀ na-agba mbọ imekwu nke ọma n’ozi ọma, ikekwe site n’itinyekwu oge na ya ma ọ bụkwanụ site n’ime ka otú i si ezi ya ka mma? Ụfọdụ na-eme ka otú ha si ezi ozi ọma ka mma site n’ịhụ na ha na-agụrụ ndị mmadụ Baịbụl mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. Pọl onyeozi, bụ́ onye e ji iji Akwụkwọ Nsọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma mara dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—Hib. 4:12; Ọrụ 17:2, 3.

8, 9. (a) Olee ahụmahụ ndị gosiri na ọ bara uru ịgụrụ ndị mmadụ Baịbụl mgbe anyị na-ezi ha ozi ọma? (b) Olee otú anyị nwere ike isi mara otú e si eji Okwu Chineke ezi ozi ọma nke ọma?

8 Mgbe otu nwanna nwoke nọ na-aga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọ gụụrụ otu nwoke onye Katọlik Daniel 2:44 ma kọwaara ya otú Alaeze Chineke ga-esi eme ka udo dị, meekwa ka obi ruo ndị mmadụ ala. Nwoke ahụ kwuru sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ na ị gụụrụ m ihe Baịbụl kwuru kama ịgwa m ihe dị gị n’isi.” Mgbe nwanna nwoke ọzọ gụụrụ otu nwaanyị na-aga chọọchị Ọtọdọks nke Gris Baịbụl, nwaanyị ahụ jụrụ ọtụtụ ajụjụ dị mma. Nwanna nwoke a na nwunye ya ji Baịbụl zaa ya ajụjụ ndị ọ jụrụ. Nwaanyị ahụ mechara kwuo, sị: “Ùnu ma ihe mere m ji kwere ka mụ na unu kparịta ụka? Ọ bụ n’ihi na unu ji Baịbụl bịa n’ụlọ m ma gụọrọ m ihe dị n’ime ya.”

9 N’ezie, akwụkwọ anyị bara uru, anyị kwesịkwara inye ha ndị mmadụ n’ozi ọma. Ma, Baịbụl bụ ngwá ọrụ anyị bụ́ isi. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ marabeghị gị ahụ́ ịgụrụ ndị mmadụ Baịbụl mgbe ị nọ n’ozi ọma, gbaa mbọ ka ọ mara gị ahụ́. I nwere ike ịhọrọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ole na ole ndị kọwara ihe Alaeze Chineke bụ na otú ọ ga-esi ewepụ nsogbu ndị agbata obi gị na-enwe ma gụọ ha mgbe ị na-ezi ha ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.

Ihere Emela Gị na A Kpọkwasịrị Gị Aha Chineke

10, 11. Olee otú Jizọs si dịrị iche n’ebe ndị sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya nọ ma a bịa n’ihe banyere aha Chineke?

10 “‘Unu bụ ndị àmà m,’ ka Jehova kwuru, ‘abụkwa m Chineke.’” (Aịza. 43:12) Onyeàmà Jehova kachanụ, bụ́ Jizọs Kraịst, weere ya ka ihe ùgwù na a kpọkwasịrị ya aha Chineke. Obi dịkwa ya ụtọ ime ka ndị ọzọ mara aha ahụ. (Gụọ Ọpụpụ 3:15; Jọn 17:6; Ndị Hibru 2:12.) N’eziokwu, a kpọrọ Jizọs “Onye Àmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi” n’ihi na o mere ka ndị mmadụ mara aha Nna ya.—Mkpu. 1:5; Mat. 6:9.

11 Ọtụtụ ndị, bụ́ ndị sị na ha na-anọchite anya Chineke na Ọkpara ya, anaghị eme nke a, ha na-akpaso aha Chineke àgwà ọjọọ, ha na-ewepụdị aha Chineke na Baịbụl ha. Ihe a gwara ndị bishọp ndị Katọlik n’oge na-adịbeghị anya gosiri na nke a bụ eziokwu. A gwara ha na “e kwesịghị ịna-akpọ tetragramatọn ahụ, ya bụ, YHWH nke bụ́ aha Chineke” mgbe a na-ekwu okwuchukwu. * Nke a bụ nnọọ echiche hiere ụzọ.

12. Olee otú e si jirikwuo aha Jehova mara ndị ohu ya n’afọ 1931?

12 Ezigbo Ndị Kraịst na-eme ka ndị ọzọ mara aha Chineke dị ka Kraịst na “oké ìgwè ndị àmà” dịrị ndụ tupu Jizọs abịa n’ụwa mere. (Hib. 12:1) N’ezie, n’afọ 1931, e ji aha ahụ bụ́ Jehova marakwuo ndị ohu Chineke mgbe ha malitere ịza Ndịàmà Jehova. (Gụọ Aịzaya 43:10-12.) N’ihi ya, ezigbo Ndị Kraịst ghọrọ “ndị a kpọkwasịrị aha [Chineke]” n’ụzọ pụrụ iche.—Ọrụ 15:14, 17.

13. Olee otú anyị ga-esi na-akpa àgwà kwekọrọ n’aha Chineke kpọkwasịrị anyị?

13 Olee otú anyị niile n’otu n’otu kwesịrị isi na-akpa àgwà ka ndị a kpọkwasịrị aha ahụ pụrụ iche? Otu ụzọ anyị ga-esi eme nke a bụ ịnọgide na-agbara Chineke àmà. Pọl dere, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta. Otú ọ dị, olee otú ha ga-esi kpọkuo onye ha na-enwebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ? Oleekwa otú ha ga-esi nwee okwukwe n’ebe onye ha na-anụbeghị banyere ya nọ? Oleekwa otú ha ga-esi anụ ma ọ́ dịghị onye ga-ekwusara ha? Oleekwa otú ha ga-esi kwusaa ma ọ bụrụ na e zigaghị ha?” (Rom 10:13-15) Anyị kwesịkwara iji akọ na-eme ka a mata ụgha okpukpe na-aghagide Onye kere anyị. Otu n’ime ụgha ndị a bụ na e nwere ọkụ mmụọ, bụ́ nke na-eme ka o yie ka Chineke nke hụrụ anyị n’anya ò nwere obi ọjọọ ka Ekwensu.—Jere. 7:31; 1 Jọn 4:8; tụlee Mak 9:17-27.

14. Olee ihe ụfọdụ ndị mere mgbe ha matara aha Chineke?

14 Obi ọ̀ dị gị ụtọ na a kpọkwasịrị gị aha Nna gị nke eluigwe? Ị̀ na-eme ka ndị ọzọ mata aha ahụ dị nsọ? Otu nwaanyị bi na Paris nke dị na Frans, nụrụ na Ndịàmà Jehova ma aha Chineke, n’ihi ya, ọ gwara otu Onyeàmà ọ hụrụ ka o gosi ya aha ahụ na Baịbụl dị n’ụlọ ya. Mgbe ọ gụrụ Abụ Ọma 83:18, ihe ọ gụtara metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu. Ọ malitere ịmụ Baịbụl, ugbu a kwa, ọ ghọọla nwanna nwaanyị nke ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejechi ozi anya ná mba ọzọ. Obi ụtọ otu nwaanyị onye Katọlik bi n’Ọstrelia nwere ụbọchị ọ hụrụ aha Chineke na Baịbụl ya mere ka o bee ákwá. Ọ rụọla ọrụ ịsụ ụzọ ruo ọtụtụ afọ ugbu a. N’oge na-adịbeghị anya, mgbe otu Onyeàmà nọ na Jameyika gosiri otu nwaanyị nọ ebe ahụ aha Chineke n’ime Baịbụl nwaanyị ahụ, anya mmiri gbara ya n’ihi ọṅụ. N’ihi ya, nwee obi ụtọ na a kpọkwasịrị gị aha Chineke, meekwa ka mmadụ niile mara aha ahụ pụrụ iche, dị ka Jizọs mere.

“Unu Ahụla Ụwa . . . n’Anya”

15, 16. Olee otú ezigbo Ndị Kraịst si ele ụwa anya, oleekwa ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

15 “Unu ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna anyị adịghị n’ime ya.” (1 Jọn 2:15) Ụwa na mmụọ nke ụwa na-emegide Jehova na mmụọ nsọ ya. N’ihi ya, ihe ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme abụghị naanị ịnọpụ iche n’ụwa, kamakwa, ha ahụghị ya n’anya n’ihi na ha ma na “ịbụ enyi ụwa bụ ịbụ onye iro Chineke,” dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems dere.—Jems 4:4.

16 Ọ dịghị mfe ime ihe Jems kwuru n’ụwa ebe e nwere ọtụtụ ihe ndị na-anwa mmadụ ọnwụnwa. (2 Tim. 4:10) N’ihi ya, Jizọs kpere ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe m na-arịọ gị abụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:15, 16) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agbalị ka m ghara ịbụ nke ụwa? Ndị ọzọ hà ma ihe m kweere banyere ememme na omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nakwa banyere ndị nke na-esighị n’aka ndị ọgọ mmụọ ma ha na-egosi mmụọ nke ụwa.’—2 Kọr. 6:17; 1 Pita 4:3, 4.

17. Gịnị nwere ike ime ka ndị nwere obi eziokwu bịakwute Jehova?

17 Nke bụ́ eziokwu bụ na ụwa ga-akpọ anyị asị n’ihi na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru, ma nke a nwere ike ime ka ndị nwere obi eziokwu chọkwuo ịmata banyere anyị. N’ezie, mgbe ha chọpụtara na okwukwe anyị gbadosiri ụkwụ ike n’Akwụkwọ Nsọ, nakwa na anyị na-ebi ndụ ka ndị na-agụ Baịbụl, ha nwere ike ikwu, sị: “Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—Zek. 8:23.

Na-ahụ Ndị Ọzọ n’Anya Otú Onye Kraịst Kwesịrị Ime

18. Gịnị ka ịhụ Jehova na onye agbata obi anyị n’anya gụnyere?

18 Jizọs sịrị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya,” o kwukwara, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Mat. 22:37, 39) Ịhụnanya ahụ, (ya bụ, a·gaʹpe n’asụsụ Grik) bụ ezigbo ịhụnanya nke mmadụ nwere n’ihi na ọ bụ ọrụ dịịrị ya bụrụkwa ihe kwesịrị ekwesị, ma, ọ na-esikarị n’ala ala obi. Ọ na-esi ike, na-emekwa ka mmadụ nwee obi ụtọ. (1 Pita 1:22) Onye nwere ya anaghị achọ ọdịmma onwe ya naanị. Ọ na-agwa ndị ọzọ okwu dị mma, na-emekwara ha ihe n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ya.—Gụọ1 Ndị Kọrịnt 13:4-7.

19, 20. Kọọ ahụmahụ ụfọdụ ndị na-egosi na ịhụnanya Ndị Kraịst na-akpa ike.

19 Ịhụnanya ezigbo Ndị Kraịst nwere n’ebe ndị si n’agbụrụ ọzọ, ebo ọzọ, na mba ọzọ nọ na-eme ka ha ghara ịkpọ ndị ahụ asị n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke na-eme ka ha hụ ndị ọzọ n’anya. (Gụọ Jọn 13:34, 35; Gal. 5:22) Ịhụnanya dị otú a na-emetụ ndị yiri atụrụ n’ahụ́. Dị ka ihe atụ, ụbọchị mbụ otu nwa okorobịa bụ́ onye Juu bịara ọmụmụ ihe, ọ tụrụ ya n’anya otú ụmụnna anyị ndị Juu na ndị Arab si na-efekọ Jehova ọnụ n’Izrel. Nke a mere ka ọ malite ịbịachi ọmụmụ ihe anya, kwekwa ka a mụwara ya Baịbụl. Ì ji obi gị dum hụ ụmụnna gị n’anya otú a? Ị̀ na-agbali ikele ndị ọhụrụ nke ọma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’agbanyeghị mba ha si, ụcha akpụkpọ ahụ́ ha, ma ọ bụ ọnọdụ ha ná ndụ?

20 Anyị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst na-agbalị ịhụ mmadụ niile n’anya. N’El Salvadọọ, otu onye nkwusa ka na-eto eto nọ na-amụrụ otu nwaanyị onye Katọlik dị afọ iri asatọ na asaa nke bu chọọchị n’isi ihe. Otu ụbọchị, nwaanyị ahụ dara ọrịa, e buga ya ụlọ ọgwụ. Mgbe ọ lọtara, Ndịàmà Jehova na-ebutere ya nri. Ha mere nke a ruo ihe dị ka otu ọnwa. O nweghị onye si na chọọchị nwaanyị ahụ bịa leta ya. Gịnị mechara mee? Ọ tụfuru ihe oyiyi niile o nwere, degara ndị chọọchị ya akwụkwọ na ya apụọla na chọọchị ha, maliteghachikwa ịmụ Baịbụl. N’eziokwu, ịhụnanya Ndị Kraịst nwere n’ebe ndị ọzọ nọ na-akpa ike! O nwere ike ịkpa ike karịa okwu ọnụ.

21. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị wee nweta ihe anyị na-atụ anya ya n’ọdịnihu?

21 N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-agwa ndị niile sị na ha na-ejere ya ozi ma ha anaghị eme otú ahụ, sị: “Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.” (Mat. 7:23) N’ihi ya, ka anyị nọgide na-amị mkpụrụ nke na-ewetara Nna anyị nke eluigwe na Ọkpara ya nsọpụrụ. Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma na-eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume.” (Mat. 7:24) N’ezie, ọ bụrụ na anyị abụrụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị na Chineke ga-adị ná mma, anyị ji n’aka na anyị ga-enweta ihe anyị na-atụ anya ya n’ọdịnihu, dị nnọọ ka e ji n’aka na o nweghị ihe ga-eme ụlọ e wuru n’elu oké nkume!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 N’ụfọdụ akwụkwọ ndị Katọlik, gụnyere Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik, a sụgharịrị tetragramatọn ahụ ka ọ bụrụ “Yahweh.”

Ì Chetara?

• Olee otú e si ama ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst na ndị nke adịgboroja?

• Kwuo “mkpụrụ” ụfọdụ e ji ama ezigbo Ndị Kraịst.

• Olee ihe i kpebiri ime iji wee na-amị mkpụrụ e ji ama onye bụ́ Onye Kraịst?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Ị̀ na-agụrụ ndị mmadụ Baịbụl mgbe niile ma ị nọrọ n’ozi ọma?

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị ọzọ hà ma otú i si ele ememme ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị anya?