Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nyere Ụmụ Gị Aka Imeri Ọtụtụ Ọnwụnwa Ha Na-enwe

Nyere Ụmụ Gị Aka Imeri Ọtụtụ Ọnwụnwa Ha Na-enwe

Nyere Ụmụ Gị Aka Imeri Ọtụtụ Ọnwụnwa Ha Na-enwe

A NA-AMANYEKARỊ ndị na-eto eto itinye aka n’ihe ọjọọ. Ndị na-eme omume ọjọọ gbara ha gburugburu, ha na-alụsokwa “ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa” ọgụ. (2 Tim. 2:22; 1 Jọn 5:19) Ndị na-enweghị mmasị n’ihe ha kweere na-akwa ha emo na-amajakwa ha n’ihi na ha na-agba mbọ ‘icheta Onye Okike Ukwu ha.’ (Ekli. 12:1) Otu nwanna nwoke aha ya bụ Vinsent chetara ihe mere mgbe ọ dị obere. Ọ sịrị: “E nwere onye na-amajakarị m, na-achọ m okwu, na-achọkwa ịlụso m ọgụ n’ihi na m bụ Onyeàmà. Ọtụtụ mgbe, ọ na-aka njọ nke na m naghị achọzi ịga akwụkwọ.” *

E wezụga nsogbu ndị a ndị ọgbọ ụmụ anyị na-enye ha, ọ na-agụkwa ha onwe ha agụụ mgbe ụfọdụ ịdị ka ndị ọgbọ ha. Otu nwanna nwaanyị nke dị afọ iri na isii aha ya bụ Katlin kwuru, sị: “Ọ na-enye nsogbu n’obi ma ọ bụrụ na a na-ele gị anya ka onye dị iche.” Nwanna nwoke aha ya bụ Alan kwuru, sị; “Ụmụ akwụkwọ ibe m na-agwakarị m ka m soro ha gaa kporie ndụ ná ngwụsị izu, ọ na-agụkwa m agụụ ịga.” Ihe ọzọkwa bụ na ọ na-amasịkarị ndị na-eto eto ka ha soro ibe ha na-egwu egwuregwu a na-egwu n’ụlọ akwụkwọ, bụ́ nke nwere ike ime ka ha na ndị ọjọọ na-akpakọrịta. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Tanya kwuru, sị: “Igwu egwuregwu na-amasị m nke ukwuu. Ndị na-akụziri anyị egwuregwu n’ụlọ akwụkwọ na-achọkarị ka m soro n’òtù egwuregwu. Ọ na-esiri m ike ịjụ.”

Olee otú i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka imeri ọtụtụ ọnwụnwa ha na-enwe? Jehova gwara ndị nne na nna ka ha na-azụ ụmụ ha. (Ilu 22:6; Efe. 6:4) Ndị nne na nna ndị na-atụ egwu Chineke na-agbasi mbọ ike ịkụziri ụmụ ha ka ha na-erubere Jehova isi. (Ilu 6:20-23) Nke a ga-enyere ụmụ ha aka ka ha ghara itinye aka n’ihe ọjọọ, ọ bụrụgodị na ndị mụrụ ha anọghị ya.

Ọ na-esiri ndị nne na nna ike ịkpata ihe ha na ụmụ ha ga-eri, ịzụ ụmụ ha, nakwa ịrụ ọrụ ọgbakọ. Ụfọdụ bụ ndị nne ma ọ bụ ndị nna naanị ha na-azụ ụmụ, ma ọ bụkwanụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-akpagbu. N’agbanyeghị ihe ndị a, Jehova chọrọ ka ndị nne na nna wepụta oge nyere ụmụ ha aka. N’ihi ya, olee otú ị ga-esi enyere ụmụ gị aka ka ha ghara itinye aka n’ihe ọjọọ ndị ọgbọ ha na-eme, ka ha ghara ịdaba n’ọnwụnwa, ka ha gharakwa ikwe ka mmaja a na-amaja ha kwa ụbọchị kụda ha mmụọ?

Nyere Ha Aka Mee Ka Ha na Jehova Dịrị ná Mma

Nke mbụ bụ na ndị na-eto eto ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịma na e nwere onye a na-akpọ Jehova. E kwesịrị inyere ha aka ka ha ‘hụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.’ (Hib. 11:27) Vinsent, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite, chetara otú ndị mụrụ ya si nyere ya aka mee ka ya na Jehova dịrị ná mma. Ọ sịrị: “Ha kụziiri m na ekpere dị mkpa. M na-echeta na m na-ekpeku Jehova ekpere kwa abalị tupu mụ alakpuo ụra. Mụ na Jehova dị ná mma.” Unu na ụmụ unu ùnu na-ekpekọ ekpere ọnụ? Gbalịa gee ntị n’ihe ha na-agwa Jehova n’ekpere. Ọ̀ bụ otu ihe ka ha na-ekwukarị ma ha na-ekpe ekpere? Ka ekpere ha ọ̀ na-egosi na ha hụrụ Jehova n’anya? Ọ bụrụ na ị na-aṅa ntị n’ekpere ha, ị ga-enwe ike ịghọta otú ha na Jehova dịruru ná mma.

Ihe ọzọ dị mkpa nke ga-eme ka ndị na-eto eto na Jehova dịkwuo ná mma bụ ma ọ bụrụ na ha na-agụ Okwu Chineke n’onwe ha. Katlin, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite, sịrị: “Baịbụl m malitere ná nwata gụwa nyeere m aka. O mere ka obi sie m ike na ọ bụrụgodị na ndị mmadụ na-emegide m, Jehova nọnyeere m.” Ụmụ gị hà na-agụchi Baịbụl anya?—Ọma 1:1-3; 77:12.

N’eziokwu, otú ụmụaka si anabata ọzụzụ nne na nna ha dịgasị iche. Ọganihu ha na-enwekwa na-adabere n’afọ ndụ ha. N’agbanyeghị nke a, ọ ga-esiri ndị na-eto eto ike ịmara ụdị onye Jehova bụ ma ọ bụrụ na e nyereghị ha aka. Ndị nne na nna kwesịrị ịkụnye okwu Chineke n’ime ụmụ ha ka ụmụ ha wee na-anụ ka Jehova na-agwa ha okwu n’ebe ọ bụla ha nọ. (Diut. 6:6-9) Ụmụ gị kwesịrị ikweta na Jehova hụrụ hanwa n’anya.

Otú Unu Ga-esi Na-enwe Mkparịta Ụka Bara Uru

Mkparịta ụka bụ ihe ọzọ dị oké mkpa unu ga-eji na-enyere ụmụ unu aka. N’ezie, mkparịta ụka nke dị mma karịrị ịgwa ụmụ gị ihe ha ga na-eme. I kwesịkwara ịjụ ha ajụjụ ma nwee ndidi ka i wee nụ ihe ha ga-aza gị, ọ bụrụgodị na ihe ha ga-aza abụghị ihe ị chọrọ ịnụ. An, bụ́ nne mụrụ ụmụntakịrị nwoke abụọ, kwuru, sị: “M na-ajụgide ha ajụjụ ruo mgbe obi m gwara m na mụ aghọtala ihe ha na-eche na ihe ha na ha na-alụ.” Ọ̀ na-adị ụmụ gị ka ị̀ na-ege ha ntị? Tanya, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mbụ, sịrị: “Ndị mụrụ m na-ege m nnọọ ntị, ha na-echetakwa ihe mụ na ha kparịtara. Ha maara aha ụmụ klas anyị. Ha na-ajụ ase ha, na-ajụkwa banyere ihe ndị ọzọ anyị kwurịtara n’oge gara aga.” Ige ntị na icheta ihe unu kparịtara n’oge gara aga na-eme ka mkparịta ụka unu na-aga nke ọma.

Ọtụtụ ezinụlọ achọpụtala na oge nri bụ oge dị mma iji nwee mkparịta ụka bara uru. Vinsent kwuru, sị: “Ezinụlọ anyị na-erikọkarị nri ọnụ. Ndị mụrụ anyị na-achọkarị ka anyị niile na-anọkọ ọnụ n’oge nri mgbe ọ bụla o kwere omume. Ha anaghị ekwe ka anyị na-ele televishọn, na-ege redio, ma ọ bụ na-agụ akwụkwọ n’oge anyị ji eri nri. Ebe ọ bụ na ihe ndị anyị na-akparịtakarị n’oge a abụghị ihe ndị dị oké mkpa, ọ na-eme ka m nwee ike ikwu nsogbu ndị m na-enwe n’ụlọ akwụkwọ.” O kwukwara, sị: “Ịgwa ndị mụrụ m okwu n’oge anyị na-eri nri amarala m ahụ́, nke a na-emekwa ka ọ ghara isiri m ike ịgwa ha okwu mgbe e nwere ihe na-enye m ezigbo nsogbu n’obi.”

Jụọ onwe gị ugboro ole ezinụlọ unu na-erikọ nri ọnụ n’izu. Ọ bụrụ na ị gbalịa ka unu na-erikọ ihe ọnụ, ì chere na ọ ga-eme ka gị na ụmụ gị na-akparịtakwu ụka nke ọma?

Ihe Mere Ezinụlọ Ji Kwesị Inwe Oge Ha Ga Na-amụ Ihe

Ọ bụrụ na ezinụlọ na-enwe Ofufe Ezinụlọ kwa izu, ha ga-enwe ohere ịna-akparịta ụka nke ọma, nke a ga-enyekwara ụmụaka aka ịma ihe ha ga-eme ma ha nwee nsogbu. Alan, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mbụ, sịrị: “Ndị mụrụ anyị na-eji oge anyị ji enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ achọpụta ihe na-enye anyị nsogbu n’obi. Anyị na ha na-amụ ihe ndị metụtara nsogbu anyị na-enwe.” Mama Alan kwuru, sị: “Anyị na-eji oge ọmụmụ ihe anyị amụgharị ihe ụfọdụ. Oge ndị a na-eme ka ụmụ anyị nwee ike ịgbara ndị ọzọ àmà ma gwa ha otú ihe ha kweere si bụrụ eziokwu. Nke a na-eme ka obi sie ha ike ịma ihe ha ga-eme banyere nsogbu ọ bụla bịaara ha.”

N’eziokwu, ụmụaka kwesịrị ime ihe karịrị ịjụ ime ihe ọjọọ ndị ọgbọ ha gwara ha mee. Ha kwesịrị ịgwa ndị ọgbọ ha ihe mere ha agaghị eme ihe ha sịrị ha mee. Ha kwesịkwara ịma ihe ha ga-eme mgbe a kparịwara ha n’ihi ihe ha kweere. Ọ bụrụ na ha agaghị ekwuli ihe mere ha ji kwere ihe ha kweere, ọ ga-esiri ha ike ịkwụsi ike n’akụkụ Jehova. Obi ga-aka ha ime nke a ma ọ bụrụ na unu na ha na-amụgharị ihe ha ga-eme.

 N’igbe dị na peeji nke 18, e dere ihe ụfọdụ unu nwere ike iji mee ihe ngosi mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ. Meenụ ya otú ọ ga-adị ka ihe na-eme eme site n’ịgbagha ihe ụmụ unu kwuru. Mgbe unu na-eme nke a, tụleenụ ụfọdụ ihe akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl na-akụzi. O doro anya na nke a ga-enyere ụmụ unu aka ịma ihe ha ga-eme ma ha nwee nsogbu n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ.

Udo Ọ̀ Dị n’Ụlọ Gị?

Ọ̀ na-agụ ụmụ gị agụụ ịlọta ụlọ ozugbo ha gbasara akwụkwọ? Ọ bụrụ na udo dị n’ụlọ gị, nke a ga-enyere ụmụ gị aka ịma ihe ha ga-eme banyere nsogbu na-abịara ha kwa ụbọchị. Otu nwanna nwaanyị nke na-eje ozi na Betel ugbu a kwuru, sị: “Mgbe m dị obere, otu n’ime ihe ndị nyeere m aka bụ udo dị n’ụlọ anyị. N’agbanyeghị ụdị nsogbu m na-enwe n’ụlọ akwụkwọ, amaara m na m lọta, ihe niile ga-adị mma.” Olee otú ụlọ gị dị? Ọ̀ bụ ebe e nwere ndị ‘na-ewe iwe ọkụ, ndị ndọrọ ndọrọ na ndị nkewa’ ka ọ̀ bụ ebe ‘ịhụnanya, ọṅụ na udo’ dị? (Gal. 5:19-23) Ọ bụrụ na udo adịchaghị n’ụlọ gị, ị̀ na-agbasi mbọ ike ka ị chọpụta ihe i nwere ike ime ka ahụ́ na-eru ụmụ gị ala n’ụlọ?

Ụzọ ọzọ ị ga-esi enyere ụmụ gị aka ịma ihe ha ga-eme ma ọnwụnwa bịara ha bụ ime ka ha na ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ na-akpa. Dị ka ihe atụ, ì nwere ike ịkpọ ndị ji ọgbakọ kpọrọ ihe ka ha soro ezinụlọ unu mgbe unu na-aga ịtụrụ ndụ? Ka ì nwere ike ịkpọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị ọzọ na-eje ozi oge niile ka ha bịa soro unu rie nri n’ụlọ unu? Ò nwere ndị ozi ala ọzọ ma ọ bụ ndị Betel ị ma, bụ́ ndị ha na ụmụ gị nwere ike ịdị ná mma, ọ bụrụgodị na ihe ha ga na-eme bụ naanị iderịta akwụkwọ ozi ma ọ bụ iimel, ma ọ bụkwanụ ịkpọrịta na fon mgbe ụfọdụ? Ihe ndị a nwere ike inyere ụmụ gị aka ịna-akpa àgwà dị mma, meekwa ka ha nwee ihe mgbaru ọsọ n’ọgbakọ. Cheedị otú Pọl onyeozi si bụụrụ nwa okorobịa bụ́ Timoti ezigbo ihe nlereanya. (2 Tim. 1:13; 3:10) Otú Pọl na Timoti si bụrụ enyi mere ka uche Timoti dịrị n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke.—1 Kọr. 4:17.

Na-aja Ụmụ Gị Mma

Jehova na-enwe obi ụtọ ma ọ na-ahụ ka ndị na-eto eto na-eme uche ya n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị ha na-enweta n’ụwa Setan. (Ọma 147:11; Ilu 27:11) O doro anya na gịnwa ga-enwe ọṅụ ka ị na-ahụ ka ụmụ anyị na-eme nke ọma. (Ilu 10:1) Mee ka ụmụ gị mara ihe ị na-eche banyere ha, gosikwa na ị hụrụ ha n’anya site n’iji obi ọcha na-aja ha nnọọ mma. Jehova setịpụụrụ ndị nne na nna ezigbo ihe nlereanya na nke a. Mgbe e mechara Jizọs baptizim, Jehova kwuru, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.” (Mak 1:11) O doro anya na ihe a Nna Jizọs gwara Ọkpara ya mere ka o die ọtụtụ ọnwụnwa ndị bịaara ya ka oge na-aga. Dị ka Jehova mere, mee ka ụmụ gị mara na ị hụrụ ha n’anya, na-ajakwa ha mma maka ihe ndị ha mere.

Ọ bụ eziokwu na o nweghị otú anyị ga-esi eme ka ọnwụnwa ghara ịbịara ụmụ anyị, e nweghịkwa otú a ga-esi kwụsị ịchọ ha okwu ma ọ bụ ịkwa ha emo, ma, i nwere ike inyere ha aka nke ukwuu. Olee otú ị ga-esi eme nke a? Nyere ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Mee ka ọ dịrị unu mfe inwe mkparịta ụka bara uru. Mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ, na-amụnụ ihe ga-abara ezinụlọ unu uru, hụkwanụ na udo dị n’ezinụlọ unu. Ọ bụrụ na unu emee otú a, ụmụ unu ga-enwe ike ịma ihe ha ga-eme banyere ọtụtụ nsogbu ha na-enwe.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

 Ọ BỤRỤ NA UNU NA-AMỤ IHE, Ọ GA-ENYERE UNU AKA

E dere nsogbu ụfọdụ ndị na-eto eto na-enwe n’ebe a. Maranụ ma ùnu ga-eji ihe ndị a mee ihe ngosi mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ.

▸ Onye na-akụzi egwuregwu n’ụlọ akwụkwọ gwara nwa gị nwaanyị ka o soro n’òtù egwuregwu e nwere n’ụlọ akwụkwọ ha.

▸ E nyere nwa gị sịga mgbe o si ụlọ akwụkwọ na-alọta.

▸ E nwere ụmụaka ndị gwara nwa gị nwoke na ha ga-akụ ya ihe ma ha hụ ya ka ọ na-ekwusa ozi ọma.

▸ Ka nwa gị nwaanyị na-eje ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ya ahụ nwa akwụkwọ ibe ya.

▸ A jụrụ nwa gị n’ihu ndị klas ha ihe mere ọ naghị ekele ọkọlọtọ.

▸ E nwere nwatakịrị nwoke nke na-akwakarị nwa gị nwoke emo n’ihi na ọ bụ Onyeàmà.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ụmụ gị, hà wepụtara oge ha ga-eji na-agụ Baịbụl n’onwe ha?

[Foto dị na peeji nke 19]

Ị̀ na-akpọ ndị ji ọgbakọ kpọrọ ihe ka ha soro unu na-aga atụrụ ndụ?