Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchị Jehova Kacha Mma!

Ọchịchị Jehova Kacha Mma!

Ọchịchị Jehova Kacha Mma!

“Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ.”—DAN. 4:17.

1, 2. Olee ihe ụfọdụ mere ọchịchị ụmụ mmadụ jirila kụọ afọ n’ala?

OBI abụọ adịghị ya na ọchịchị ụmụ mmadụ akụọla afọ n’ala. Ihe kacha mee ka ọchịchị ụmụ mmadụ kụọ afọ n’ala bụ na ha enweghị amamihe nke ga-eme ka ha nwee ike ịchị nke ọma. Taa, a kacha ahụ ọdịda nke ọchịchị ụmụ mmadụ dara n’ihi na ọtụtụ ndị ọchịchị egosila na ha bụ ‘ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu.’—2 Tim. 3:2-4.

2 Nne na nna mbụ anyị jụrụ ọchịchị Chineke ọtụtụ afọ gara aga. O nwere ike ịbụ na ihe mere ha ji mee nke a bụ n’ihi na ha chere na nke a ga-eme ka ha chịwa onwe ha. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ha mere ihe ahụ bụ ịhọrọ ọchịchị Setan. Ọchịchị ndị mmadụ chịrịla onwe ha puku afọ isii, bụ́ nke “onye na-achị ụwa a,” bụ́ Setan, nọ n’isi ya, bụ ya wetaara anyị nsogbu niile anyị na-enwe ugbu a. (Jọn 12:31) Mgbe otu akwụkwọ nọ na-ekwu banyere ọnọdụ ụmụ mmadụ taa, ọ sịrị na ọ baghị uru “ịchọ ka e nwee ụwa zuru okè.” O kwukwara, sị: “Ọ bụghị naanị na e nweghị ike inwe ya, kamakwa, ịchọ ka e nwee ya ga-eme ka e nwee ọdachi, ọchịchị aka ike, na agha na-enweghị atụ.” Nke a na-egosi na o doro nnọọ anya na ọchịchị ụmụ mmadụ akụọla afọ n’ala.

3. Olee ihe anyị ga-ekwu banyere otú Chineke gaara esi na-achị ụwa ma a sị na Adam na Iv emehieghị?

3 Ọ jọgburu nnọọ onwe ya na nne na nna mbụ anyị jụrụ ezigbo ọchịchị, ya bụ, ọchịchị Chineke. Ọ bụ ezie na anyị amaghị kpọmkwem otú Chineke gaara esi na-achị ụwa ma a sị na Adam na Iv enupụrụghị ya isi, ma, otu ihe doro anyị anya bụ na a sị na mmadụ niile nabatara ọchịchị Chineke, ịhụnanya ga-eju ebe niile, e nweghịkwa ndị ga na-ele mmadụ anya n’ihu. (Ọrụ 10:34; 1 Jọn 4:8) Ihe ọzọkwa doro anyị anya bụ na a gaaraghị enwe nsogbu dị iche iche ọchịchị mmadụ merela ka anyị nwee ma a sị na ụmụ mmadụ ajụghị ọchịchị Chineke n’ihi na Chineke nwere amamihe na-enweghị atụ. Ọchịchị Chineke gaara ewerela “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.” (Ọma 145:16) E kwuo ya na nkenke, ọ gaara abụ ọchịchị zuru okè. (Diut. 32:4) Ọ bụ nnọọ ihe jọgburu onwe ya na ụmụ mmadụ jụrụ ya.

4. Olee ebe ọchịchị Setan na-agaru kwụsị?

4 Ma, ọ dị mma icheta na n’agbanyeghị na Jehova hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha na ọ ka bụ ya kwesịrị ịchị ihe niile o kere eke. Otu eze dị ike nke chịrị Babịlọn mechara kweta na “Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ.” (Dan. 4:17) Mee elu mee ala, Alaeze Chineke ga-eme ka uche ya mee. (Mat. 6:10) Ma, ka ọ dịgodị, Jehova hapụtụrụ Setan ka ọ bụrụ “chi nke usoro ihe a” ka o wee gosi ya na ihe ahụ o kwuru n’Iden bụ ụgha chara acha. (2 Kọr. 4:4; 1 Jọn 5:19) N’agbanyeghị nke ahụ, Setan agaghị enwe ike ime ihe karịrị ihe ọ bụla Jehova nyere ya ohere ka o mee. (2 Ihe 20:6; tụlee Job 1:11, 12; 2:3-6.) Kemgbe ụwa, a na-enwe ndị na-ahọrọ irubere Chineke isi n’agbanyeghị na ha bi n’ụwa nke nnukwu Onye iro Chineke na-achị.

Otú Chineke Si Chịa Izrel

5. Olee nkwa ụmụ Izrel kwere Chineke?

5 Malite mgbe Ebel dị ndụ ruo mgbe mba Izrel malitere, ọtụtụ ndị bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi fere Jehova ma rube isi n’iwu ya. (Hib. 11:4-22) N’oge Mozis, Jehova na ụmụ Jekọb gbara ndụ, ụmụ Jekọb wee ghọọ mba Izrel. N’afọ 1513 T.O.A., ụmụ Izrel kwere Jehova nkwa, kwechitekwara ụmụ ha, wee kwuo na Jehova ga-abụ Eze ha. Ha sịrị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.”—Ọpụ. 19:8.

6, 7. Olee otú mba Izrel dị mgbe Chineke na-achị ya?

6 O nwere ihe mere Jehova ji họrọ ụmụ Izrel ka ha bụrụ ndị ya. (Gụọ Diuterọnọmi 7:7, 8.) O meghị ya naanị maka ọdịmma ha. O metụtara aha Chineke na alaeze ya, nke a kakwa mkpa. Ụmụ Izrel ga-achọpụta n’onwe ha na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke. (Aịza. 43:10; 44:6-8) Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa ha, sị: “Unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu, Jehova ahọrọwokwa unu ịbụ ndị ya, ihe onwunwe pụrụ iche, n’etiti ndị niile nọ n’elu ala.”—Diut. 14:2.

7 Chineke chịrị ụmụ Izrel otú e kwesịrị isi na-achị ndị na-ezughị okè. N’agbanyeghị nke ahụ, iwu ya zuru okè, o gosikwara ụdị àgwà onye nyere iwu ahụ nwere. Iwu Jehova si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel gosiri nke ọma na Chineke dị nsọ, na ọ hụrụ ikpe ziri ezi n’anya, dị njikere ịgbaghara ndị mere mmehie, nakwa na ọ na-edi ihe. Ka oge na-aga, ụmụ Izrel rubere isi n’iwu Jehova wee nwee udo na ngọzi ime mmụọ n’oge Jọshụa na ndị ọgbọ ya nọ ndụ. (Jọsh. 24:21, 22, 31) Otú ihe si gaa n’Izrel mgbe ahụ na-egosi na ọchịchị Jehova magburu onwe ya.

Ọchịchị Mmadụ Na-efu Ndị A Na-achị Ihe

8, 9. Olee arịrịọ na-ekwesịghị ekwesị nke ụmụ Izrel rịọrọ Jehova, oleekwa ihe si na ya pụta?

8 Ma, ụmụ Izrel jụrụ ọchịchị Chineke ugboro ugboro, Chineke kwụsịkwara ichebe ha. Ka oge na-aga, ụmụ Izrel gwara Samuel ka ọ gwa Jehova ka o nye ha eze ha ga na-ahụ anya. Jehova wee gwa Samuel ka o meere ha ihe ha rịọrọ ya. Ma, Jehova gwakwara ya, sị: “Ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ m ka ha jụrụ ịbụ eze ha.” (1 Sam. 8:7) N’agbanyeghị na Jehova nyere ụmụ Izrel eze ha na-ahụ anya, ọ gwara ha na ọ ga-efu ha ihe.—Gụọ 1 Samuel 8:9-18.

9 Ihe mere ha gosiri na ihe ahụ Jehova kwuru mechara mee. Ụmụ Izrel nwere ọtụtụ nsogbu mgbe ndị eze na-achị ha, karịchaa, mgbe ọ bụla eze na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-achị. Ihe a mere ụmụ Izrel ga-enyere anyị aka icheta na ọ bụghị ihe ijuanya na kemgbe ụwa na ndị ọchịchị na-amaghị Jehova enweghị ike ịrụpụta ihe dị mma ga-adịte aka. Ọ bụ eziokwu na ndị ọchịchị na-arịọ Chineke ka ọ gọzie mbọ ha na-agba iweta udo, ma mee ka ahụ́ ruo ndị mmadụ ala, ma, olee otú Chineke ga-esi gọzie ndị na-anaghị akwado ọchịchị ya?—Ọma 2:10-12.

Mba Ọhụrụ nke Chineke Na-achị

10. Gịnị mere Chineke ji jiri mba ọzọ dochie Izrel?

10 Mba Izrel kwụsịrị irubere Jehova isi. Ka oge na-aga, ha jụrụ Mesaya Chineke zitere, Jehova wee jụ ha wee mee ndokwa ijiri ndị ọzọ ga-abụ mba ọhụrụ dochie ha. Nke a mere ka e hiwe ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ n’afọ 33 O.A. Ọgbakọ ahụ ghọrọ mba ọhụrụ nke Jehova na-achị. Pọl kpọrọ ya “Izrel nke Chineke.”—Gal. 6:16.

11, 12. A bịa n’ilekọta ndị mmadụ, olee ebe dị iche iche Izrel oge ochie yiri “Izrel nke Chineke”?

11 E nwere ebe ụfọdụ Izrel oge ochie na “Izrel nke Chineke” si yie, nweekwa ebe ndị ha na-eyighị. Ọgbakọ Ndị Kraịst enweghị eze bụ́ mmadụ, dị ka Izrel oge ochie nwere, a naghịkwa achụ ụmụ anụmanụ n’àjà na ya iji gbaghara mmehie. Otu n’ime ebe mba Izrel oge ochie na ọgbakọ Ndị Kraịst yiri bụ na ha abụọ nwere ndị okenye. (Ọpụ. 19:3-8) Ndị okenye ọgbakọ anaghị achị atụrụ Chineke dị ka à ga-asị na ha bụ eze ha. Kama nke ahụ, ha na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ ma jiri obi ha niile na-ebute ụzọ n’ihe niile a na-eme n’ọgbakọ. Ha hụrụ onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ n’anya, na-akwanyekwara mmadụ niile ùgwù.—2 Kọr. 1:24; 1 Pita 5:2, 3.

12 Ọ bụrụ na “Izrel nke Chineke” na ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” echebara otú Chineke si mesoo ụmụ Izrel ihe echiche, ha ga-enwekwu mmasị n’ebe Jehova nọ, nweekwa obi ụtọ n’otú o si achị. (Jọn 10:16) Dị ka ihe atụ, ihe mere n’oge Izrel oge ochie gosiri na ndị chịrị ha mere ka ha mee ihe ziri ezi ma ọ bụkwanụ ihe na-ezighị ezi. Nke a na-echetara ndị na-edu ndú n’ọgbakọ Ndị Kraịst na ha kwesịrị ịna-esetịpụ ezi ihe nlereanya, n’agbanyeghị na ha abụghị ndị eze, dị ka ndị chịrị Izrel oge ochie.—Hib. 13:7.

Otú Jehova Si Achị n’Oge A

13. Gịnị bụ oké ihe nke mere n’afọ 1914?

13 Taa, Ndị Kraịst na-agwa ụwa niile na ọchịchị ụmụ mmadụ ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. N’afọ 1914, n’eluigwe, Jehova malitere ọchịchị nke dị n’aka Eze ọ họpụtara, bụ́ Jizọs Kraịst. N’oge ahụ, o nyere Jizọs ikike ka ọ gaa “na-emeri, ka o wee nwezuo mmeri ya.” (Mkpu. 6:2) Ọ gwara Eze ahụ o chiri ọhụrụ, sị: “Gaa na-enwe mmeri n’etiti ndị iro gị.” (Ọma 110:2) Ọ dị mwute ikwu na mba dị iche iche anọgidela na-enupụrụ ọchịchị Jehova isi. Ha na-eme ka à ga-asị na “Jehova adịghị.”—Ọma 14:1.

14, 15. (a) Olee otú Alaeze Chineke si achị anyị taa, oleekwa ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị n’ihi nke a? (b) N’oge anyị a, olee ihe na-egosi na ọchịchị Chineke enweghị atụ?

14 Mmadụ ole na ole n’ime ndị e tere mmanụ bụ́ “Izrel nke Chineke” ka nọ n’ụwa. Ha bụ “ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst” n’ihi na ha bụ ụmụnna ya. (2 Kọr. 5:20) A họpụtala ha ka ha bụrụ ohu kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke na-ahụ maka nri ime mmụọ a na-enye ndị e tere mmanụ nakwa ìgwè Ndị Kraịst ọnụ ọgụgụ ha na-arịwanye elu, ndị bụ́ ugbu a ọtụtụ nde mmadụ, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa a ruo mgbe ebighị ebi. (Mat. 24:45-47; Mkpu. 7:9-15) Ihe na-egosi na Jehova na-agọzi ndokwa a bụ otú ọgbakọ ya si na-eto n’oge anyị a.

15 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ ma ọrụ m kwesịrị ịrụ n’ọgbakọ? M̀ na-akwado ọchịchị Jehova otú kwesịrị? M̀ na-enwe obi ụtọ na m bụ onye Alaeze Jehova na-achị? M̀ kpebisiri ike iji ike m niile na-agwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke?’ Ndịàmà Jehova na-eji obi ha dum erube isi ná ntụziaka ọ bụla si n’aka Òtù Na-achị Isi, ha na-erubekwara ndị okenye ọgbakọ isi. Nke a na-egosi na anyị nabatara ọchịchị Chineke. (Gụọ Ndị Hibru 13:17.) Ọ bụrụ na anyị esi n’ala ala obi anyị na-erube isi, anyị na ibe anyị ga-adị n’otu n’ụwa niile, bụ́ ihe na-anaghị ekwe omume n’ụwa a. Ọ na-emekwa ka udo na ezi omume dịrị, na-ewetakwara Jehova otuto, bụ́ ihe na-egosi na ọchịchị ya enweghị atụ.

Ọchịchị Jehova Emeriela

16. Olee mkpebi onye ọ bụla kwesịrị ime n’oge a?

16 N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ihe ga-egosi na ebubo ahụ Setan boro ya n’Iden bụ ụgha. Ya mere, ugbu a bụ oge ndị mmadụ kwesịrị ikpebi ebe ha ga-eso. Onye ọ bụla aghaghị ikpebi ma ọ̀ ga-akwado ọchịchị Jehova ka ọ̀ bụ ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù inyere ndị dị obi umeala aka ka ha mee mkpebi dị mma. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eji Amagedọn mee ka ọchịchị ya nọchie ọchịchị Setan, bụ́ nke dị n’aka ụmụ mmadụ. (Dan. 2:44; Mkpu. 16:16) Ọchịchị ụmụ mmadụ ga-akwụsị, Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa niile. A ga-esi otú a gosi na ọ bụ ọchịchị Jehova kacha mma.—Gụọ Mkpughe 21:3-5.

17. Olee ihe ndị ga-enyere ndị dị obi umeala aka ikpebi onye ha ga-akwado ọchịchị ya?

17 Ndị ịkwado ọchịchị Jehova ka na-eme obi abụọ kwesịrị ikpeku ya ekpere ka o nyere ha aka ịtụle ihe ọma dị iche iche ọchịchị ya ga-ewetara ụmụ mmadụ. Ọchịchị ụmụ mmadụ enweghị ike ịkwụsị mpụ dị iche iche jọgburu onwe ha. Ọchịchị Chineke ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa. (Ọma 37:1, 2, 9) Ọchịchị ụmụ mmadụ na-akpasu agha site n’oge ruo n’oge, ma, ọchịchị Chineke ga-eme “ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.” (Ọma 46:9) Ọchịchị Chineke ga-emedị ka udo dịrị n’etiti ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ! (Aịza. 11:6-9) Ịda ogbenye na agụụ bụ ihe e ji mara ọchịchị ụmụ mmadụ, ma, ọchịchị Chineke ga-eme ka ha ghara ịdịkwa. (Aịza. 65:21) Ọ bụrụgodị na onye nọ n’ọchịchị bụ ezigbo mmadụ, o nweghị ka ọ ga-esi wepụ ọrịa na ọnwụ, ma, n’ọchịchị Chineke, obi ga-adị ndị agadi na ndị na-arịa ọrịa ụtọ n’ihi na ha ga-alaghachi otú ha dị n’oge ha nwere ike okoro na agbọghọ. (Job 33:25; Aịza. 35:5, 6) N’ezie, ụwa ga-aghọ paradaịs, bụ́ ebe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Luk 23:43; Ọrụ 24:15.

18. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị kwere na ọchịchị Chineke kacha mma?

18 N’ezie, ọchịchị Chineke ga-emezi ihe niile mebiri emebi kemgbe Setan mere ka Adam na Iv nupụrụ Onye kere ha isi. Chegodị ka ọ ga-adị, Setan anọrọla na-emebi ihe kemgbe ihe dị ka puku afọ isii, ma, Chineke ga-esi n’aka Kraịst jiri otu puku afọ mezie ihe ndị ahụ niile! Nke a bụ nnukwu ihe ọzọ na-egosi na ọchịchị Chineke enweghị atụ. Chineke bụ Eze anyị n’ihi na anyị bụ Ndịàmà ya. Ya mere, ka anyị na-egosi kwa ụbọchị, ee, kwa awa, na anyị na-efe Jehova, na anyị bụ ndị Alaeze ya na-achị, nakwa na obi dị anyị ụtọ na anyị bụ Ndịàmà ya. Ka anyị werekwa ohere ọ bụla dapụtaranụ gwa onye ọ bụla chọrọ ige anyị ntị na ọchịchị Jehova kacha mma.

Gịnị Ka Anyị Mụtara Banyere Ọchịchị Chineke Site n’Ịgụ . . .

Diuterọnọmi 7:7, 8?

1 Samuel 8:9-18?

Ndị Hibru 13:17?

Mkpughe 21:3-5?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 29]

Jehova na-achị achị mgbe niile

[Foto dị na peeji nke 31]

Anyị na ibe anyị ga-adị n’otu n’ụwa niile ma anyị jiri obi dum na-erubere ọchịchị Jehova isi