Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Banyere Ezi Ofufe

Banyere Ezi Ofufe

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Banyere Ezi Ofufe

Chineke ọ̀ na-anabata ofufe niile?

▪ Jizọs meteere ndị okpukpe ụgha duhiere ebere. Ọ dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị zere “ndị amụma ụgha ndị [na-abịa] n’oyiyi atụrụ, ma n’ime ha, ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji.” (Matiu 7:15) Ị̀ chọpụtala na ụfọdụ ndị na-eji okpukpe eme arụ?

Jizọs kwuru n’ekpere o kpegaara Chineke, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ya mere, Chineke anaghị anabata ofufe nke na-emegide eziokwu nke Baịbụl. N’ihi ya, Jizọs gwara ụfọdụ ndị okpukpe ihu abụọ na ihe a Chineke kwuru metụtara ha, nke bụ́: “Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.”—Matiu 15:9.

È nwere ezi okpukpe?

▪ Mgbe Jizọs hụrụ otu nwaanyị na Sameria bụ́ onye okpukpe ụgha duhiere, Jizọs gwara ya, sị: “Unu na-efe ihe unu na-amaghị . . . Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.” (Jọn 4:22, 23) O doro anya na e nwere ike ịchọta ezi ofufe.

Jizọs kwuru, sị: “Adịghịkwa m eme ihe ọ bụla n’uche nke aka m; kama m na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m.” N’ihi ya, Jizọs maara na okpukpe ọ kụziiri ndị mmadụ ka ha na-ekpe bụ naanị ezi okpukpe e nwere. (Jọn 8:28) Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ebe ọ bụ na ndị na-ekpe ezi okpukpe nwere otu ụzọ ha si abịakwute Nna ahụ, ha aghaghịkwa ịnọ n’otu ezi okpukpe.

Olee otú i nwere ike isi mata ndị na-efe ezi ofufe?

▪ Onye Kraịst bụ onye na-eso Jizọs Kraịst. Ka anyị tụlee ụzọ anọ iṅomi ihe nlereanya Jizọs ga-esi nnọọ mee ka a mata ndị na-eso ụzọ ya.

1. Jizọs Kraịst gwara Jehova n’ekpere, sị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị.” (Jọn 17:26) Ezi Ndị Kraịst ka na-eme otu ihe ahụ.

2. Jizọs kwusara banyere Alaeze Jehova ma zipụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa n’ụlọ n’ụlọ na-eme otu ihe ahụ. O kwuru, sị: “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu banyere, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya.” O mechara gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị nke mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Matiu 10:7, 11; 28:19) I nwere ike ịmata ezi Ndị Kraịst taa n’ihi na ha ka na-arụ otu ọrụ ahụ.

3. Jizọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ihi ya, o kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:14) Ihe e kwesịrị iji mara ndị na-efe ezi ofufe bụ etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

4. Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya n’achọghị ọdịmma nke onwe ya. O kwuru, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ezi Ndị Kraịst hụrụ ibe ha n’anya ma na-ezere ịlụ agha.

Olee otú ezi ofufe nwere ike isi baara gị uru?

▪ Iji fee ezi ofufe, ọ dị mkpa ka i buru ụzọ mata Jehova nke ọma. Ịmata Chineke ga-eme ka i nwee ike ibi ụdị ndụ kacha mma ma mee ka i si n’ala ala obi gị hụ Chineke n’anya. Jehova kwere ndị hụrụ ya n’anya nkwa na ha ga-adị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, Jizọs kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke.”—Jọn 17:3.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere isiokwu a, lee isi nke 15 nke akwụkwọ a, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 16]

“Lezienụ anya maka ndị amụma ụgha ndị na-abịakwute unu n’oyiyi atụrụ, ma n’ime ha, ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji.”—Matiu 7:15