Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

GỊNỊ mere onye rasta ji kpụọ isi dada ya ma kwụsị ịkpọ ndị ọcha asị? Oleekwa ihe nyeere otu nwa okorobịa na-eme ihe ike nke na-agbatara ndị na-ere ọgwụ ọjọọ ụgwọ aka ịgbanwe ndụ ya? Ka anyị tụlee ihe ndị a kwuru.

‘M kwụsịdịrị ịkpọ ndị ọcha asị.’—HAFENI NGHAMA

ADỊ M AFỌ: 34

ABỤ M ONYE: ZAMBIA

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE RASTA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Amụrụ m n’otu ogige ndị gbara ọsọ ndụ na Zambia. Nne m gbapụrụ na Namibia n’oge obodo ahụ nọ n’agha ma sonyere Òtù Ndị Ndịda Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka (SWAPO). Òtù a nọ na-alụso ọchịchị Saụt Afrịka na-achị Namibia n’oge ahụ agha.

Ebiri m n’ọtụtụ ogige ndị gbara ọsọ ndụ tupu m gbaa afọ iri na ise. A na-enye ndị na-eto eto nọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke SWAPO ọzụzụ ịkwado mbọ nnwere onwe òtù ahụ na-agba. E ji ndọrọ ndọrọ ọchịchị megharịa anyị anya, kụziekwara anyị ịkpọ ndị ọcha asị.

Mgbe m dị afọ iri na otu, achọrọ m ime kọnfameshọn dị ka Onye Kraịst n’otu chọọchị dị n’ogige ahụ, bụ́ nke ndị Roman Katọlik, ndị Luta, ndị Anglikan, na chọọchị ndị ọzọ na-ekpekọta ọnụ. Pastọ m kọọrọ ya sịrị m emela ya. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, aghọrọ m onye na-ekweghị na Chineke. Ma, mgbe m gbara afọ iri na ise, mmasị m nwere n’egwú rege na ọchịchọ m ịkwụsị mmegbu a na-emegbu ndị isi ojii Afrịka mere ka m sonye n’òtù ndị Rasta. Enwere m isi dada, na-aṅụ igbo, kwụsị iri anụ, ma na-agbasi mgba ike ka ndị isi ojii nwere onwe ha. N’agbanyeghị nke ahụ, akwụsịghị m ime omume rụrụ arụ na ile fim a na-eme ihe ike na ya. M ka na-ekwukwa okwu rụrụ arụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’afọ 1995, mgbe m dị ihe dị ka afọ iri abụọ, amalitere m ichesi echiche ike banyere otú m kwesịrị isi bie ndụ. Anọ m na-amụ akwụkwọ ndị Rasta niile m hụrụ. Ụfọdụ n’ime ha kwuru banyere ihe ndị dị na Baịbụl, ma eleghị m ihe ndị ha kọwara anya ka ihe nwere isi. N’ihi ya, ekpebiri m ịgụ Baịbụl n’onwe m.

Ka e mesịrị, otu enyi m bụ́ onye Rasta nyere m otu akwụkwọ e ji amụ Baịbụl nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Eji m aka m na-amụ akwụkwọ ahụ na Baịbụl. Ka e mesịrị, ahụrụ m Ndịàmà Jehova, ha amụwakwara m Baịbụl.

Agbalịsiri m ike kwụsị ịṅụ igbo na ịṅụ oké mmanya. (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Agbanwere m ọdịdị m, kpụọ isi dada m, kwụsị ile fim ndị na-egosi ndị gba ọtọ na ime ihe ike, kwụsịkwa ikwu okwu rụrụ arụ. (Ndị Efesọs 5:3, 4) Emechadịrị m kwụsị ịkpọ ndị ọcha asị. (Ọrụ 10:34, 35) Iji mee mgbanwe ndị a, akwụsịrị m ịkpọ egwú ndị na-akwado ịkpa ókè agbụrụ, kwụsịkwa ịkpakwuru ndị enyi m mbụ, bụ́ ndị na-agbalị ime ka m laghachi n’ụdị ndụ m hapụrụ ahapụ.

Mgbe m mechara mgbanwe ndị ahụ, achọtara m Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova ma gwa ha na achọrọ m isonye n’okpukpe ha. A malitere ịmụrụ m Baịbụl. Mgbe m kpebiri ka e mee m baptizim dị ka Onyeàmà Jehova, obi adịghị ndị ezinụlọ m mma. Nne m gwara m ka m họrọ okpukpe “Ndị Kraịst” ọ bụla ọzọ ma e wezụga nke Ndịàmà Jehova. Otu n’ime ụmụnne nne m, bụ́ onye ukwu n’ọchịchị, na-akatọ m mgbe niile n’ihi na m kpebiri iso Ndịàmà.

Ma, ịmụta otú Jizọs si mesoo ndị mmadụ na iso ndụmọdụ ya nyeere m aka idi mmegide na ịkwa emo. Mgbe m ji ihe Ndịàmà na-akụzi tụnyere ihe Baịbụl kwuru, o doro m anya na mụ achọtala ezi okpukpe. Dị ka ihe atụ, ha na-erubere iwu Baịbụl nyere ikwusara ndị ọzọ ozi ọma isi. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 15:14) Ha anaghịkwa etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.—Abụ Ọma 146:3, 4; Jọn 15:17, 18.

URU NDỊ M RITERELA: Ịmụta iso ụkpụrụ Baịbụl enyerela m aka ibi ndụ ka mma. Dị ka ihe atụ, ịkwụsị ịṅụ igbo emeela ka m kwụsị imefu ọtụtụ narị dọla kwa ọnwa. Anaghịzi m amụ anya arọ nrọ, uche akpakọkwuola m ọnụ, ahụ́ agbasikwuokwala m ike.

Eji m ndụ m na-eme ihe bara uru ugbu a bụ́ ihe nọ na-agụ m agụụ kemgbe m bụ nwata. Nke kacha mkpa bụ na echere m na abịaruola m Chineke nso.—Jems 4:8.

“M mụtala ịchịkwa iwe m.”—MATỊNO PEDRETI

ADỊ M AFỌ: 43

ABỤ M ONYE: ỌSTRELIA

NDỤ M BIRI: ONYE NA-ERE ỌGWỤ ỌJỌỌ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Ndị ezinụlọ anyị kwagharịrị ugboro ugboro mgbe m na-eto eto. Ebiri m n’obere obodo, ná nnukwu obodo, biekwa n’ogige chọọchị ndị nwe ala Ọstrelia dị n’ógbè dịpụrụ adịpụ. Obi na-atọ m ụtọ mgbe ọ bụla m chetara ihe ndị mụ na ụmụ nwanne nne m mere n’oge ahụ—igbu azụ̀, ịchụ nta, na ịtụ ihe ndị e ji osisi atụ.

Nna m na-akụ ọkpọ, ọ malitekwara ịkụziri m ịkụ ọkpọ mgbe m dị nnọọ obere. Ime ihe ike bịara mara m ahụ́. Mgbe m dị afọ iri na ụma, m na-anọ ọtụtụ oge n’ụlọ mmanya na-aṅụ mmanya. Mụ na ndị enyi m na-achọ ndị anyị na ha ga-alụ ọgụ. Anyị na-eji mma na okpiri alụso ìgwè mmadụ dị iri abụọ ma ọ bụ karịa ọgụ.

Ana m akpata ego site n’ire ọgwụ ọjọọ na ihe ndị na-arụ ọrụ n’ọdụ ụgbọ mmiri zutere. M na-agbatakwara ndị ahịa ọgwụ ọjọọ ụgwọ, jirikwa égbè na-emenyere ha ndị mmadụ ụjọ. M nọ na-agbalịsi ike ịghọ onye a na-ego ọrụ igbu ndị mmadụ. Okwu na-achị m mgbe niile bụ, Gbuo, ma ọ́ bụghị ya, e gbuo gị.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Anụla m banyere Ndịàmà Jehova mgbe m na-eto eto. Mgbe m gafetụrụ afọ iri abụọ, echetara m mgbe m jụrụ nne m ma ọ̀ maara ebe mmadụ nwere ike ịhụ ha. Ụbọchị abụọ ka nke ahụ gasịrị, Onyeàmà a na-akpọ Diksịn bịara n’ụlọ m. Mgbe mụ na ya kwuchara okwu ruo oge ụfọdụ, ọ kpọrọ m òkù ịbịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Agara m ọmụmụ ihe ahụ, agaakwala m ya ihe karịrị iri afọ abụọ ugbu a. Ndịàmà ji Baịbụl zaa m ajụjụ ọ bụla m nwere.

Obi tọrọ m ụtọ ịmụta na Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya, ma ndị na-anaghị asọpụrụ ya. (2 Pita 3:9) Achọpụtara m na ọ bụ Nna hụrụ m n’anya nke ga-elekọta m, ya bụrụgodị na mmadụ niile agbahapụ m. Obi rukwara m ala ịmụta na ọ ga-agbaghara m mmehie m ma ọ bụrụ na mụ agbanwee ndụ m. Ndị Efesọs 4:22-24 nyeere m ezigbo aka. Ebe ahụ gbara m ume “iyipụ mmadụ ochie” na “iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị.”

O were m oge ịgbanwe ndụ m. M na-anọ n’emetụghị ọgwụ ọjọọ aka n’ime izu, ma ná ngwụsị izu, mgbe mụ na “ndị enyi m” nọ, m na-aṅụ ya. Achọpụtara m na ọ bụrụ na m chọrọ ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ, m ga-akwapụ n’ebe ndị enyi m bi, n’ihi ya, ekpebiri m ịkwaga steeti ọzọ. Ụfọdụ n’ime ndị enyi m sịrị na ha ga-eso m, ekweere m. N’ụzọ, ha malitere ịṅụ igbo ma nye m ka m ṅụọ. Agwara m ha na m chọrọ ịhapụ àgwà ndị ahụ, mụ na ha gbasakwara mgbe anyị ruru n’ókè steeti ahụ na steeti ọzọ. M mechara chọpụta na obere oge ka nke ahụ gachara, ndị enyi m ahụ ji égbè gaa ohi n’ụlọ akụ̀.

URU NDỊ M RITERELA: Ozugbo mụ na ndị enyi m ahụ kwụsịrị ịkpa, achọpụtara m na ọ dịkwuuru m mfe ịgbanwe ndụ m. N’afọ 1989, aghọrọ m Onyeàmà e mere baptizim. Mgbe e mechara m baptizim, nwanne m nwaanyị, nne m, na nna m sonyechaara m n’ife Jehova.

Alụọla m nwaanyị ruo afọ iri na asaa, mụtakwa ọmarịcha ụmụ atọ. M mụtala ijide onwe m, ọbụna mgbe a kpasuru m iwe. Amụtakwala m ịhụ ndị si n’ebo, agbụrụ, na asụsụ niile n’anya. (Mkpughe 7:9) Echere m na okwu Jizọs emezuola n’ahụ́ m. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:31, 32.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Iji mee mgbanwe ndị a, akwụsịrị m ịkpọ egwú ndị na-akwado ịkpa ókè agbụrụ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]

Mụ na ndị enyi m na-achọ ndị anyị na ha ga-alụ ọgụ. Anyị na-eji mma na okpiri alụso ìgwè mmadụ dị iri abụọ ma ọ bụ karịa ọgụ