Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

E wezụga mmanya, olee ụdị ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu e nwere n’oge Baịbụl?

A kpọkọtara “mmanya na ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu” aha ugboro ugboro na Baịbụl. (Diuterọnọmi 14:26; Luk 1:15) E kwesịghị ịghọta okwu bụ́ “ihe ọṅụṅụ” dị ka mmanya e siri esi, ebe ọ bụ na a malitere isi mmanya ọtụtụ narị afọ mgbe oge Baịbụl gafechara. Ọ bụghị naanị mkpụrụ osisi, dị ka mkpụrụ vaịn, mkpụrụ nkwụ det, fig, apụl, na pọmigranet, ka e ji mee ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu, kama e jikwa mmanụ aṅụ mee ya.

N’ezie, okwu bụ́ “ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu” nwekwara ike ịpụta biya. Okwu Hibru a sụgharịrị “ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu” yiri okwu ndị Akad nke nwere ike ịpụta ụdị biya e ji ọka bali eme n’ebe niile na Mesopotemia. Ihe ọṅụṅụ ahụ enwechaghị ihe na-egbu egbu, ma, o nwere ike igbu mmadụ egbu ma ọ bụrụ na onye ahụ aṅụbiga ya ókè. (Ilu 20:1) A chọtala ihe a tụrụ atụ ndị na-egosi ebe ndị a na-eme mmanya na ihe osise nke ndị na-eme mmanya n’ili ndị dị n’Ijipt oge ochie. Na Babịlọn, ma ndị eze ma ndị ogbenye na-aṅụ biya kwa ụbọchị n’ụlọ ha. Ndị Filistia ṅụkwara ụdị ihe ọṅụṅụ ahụ. N’ebe niile na Palestaịn, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie achọtala ebele mmanya ndị nwere ihe e ji aza mmanya. Ebele ndị ahụ na-aza mmanya, mee ka onye na-aṅụ ya ghara ịṅụkọta mkpo ọka bali ndị banyere na ya mgbe a na-eme ya.

N’oge Pọl onyeozi, olee ihe mere o ji dị oké ize ndụ iji ụgbọ mmiri eme njem n’oge ụfọdụ n’afọ?

N’ihi ajọ ifufe, otu ụgbọ mmiri Pọl onyeozi banyere nọrọ ogologo oge na mmiri ka ọ na-achọ ịgawa ebe ọdịda anyanwụ n’ụsọ oké osimiri dị n’Eshia Maịnọ. Baịbụl kwuru na o nwere mgbe o ruru, ya adị “ize ndụ ime njem na mmiri . . . n’ihi na ọbụna ibu ọnụ nke ụbọchị mkpuchi mmehie agafewo.” Pọl gwara ndị njem ibe ya na ọ bụrụ na ha anwaa anwaa gaa n’ihu na njem ahụ, “ọ bụghị naanị ibu na ụgbọ mmiri ga-ala n’iyi, kamakwa mkpụrụ obi [ha].”—Ọrụ 27:4-10.

Ibu ọnụ nke Ụbọchị Mkpuchi Mmehie na-abụ n’ọgwụgwụ Septemba ma ọ bụ ná mmalite Ọktoba. Ndị Rom na-eme njem n’oké osimiri maara na a naghị enwekarị nsogbu na njem oké osimiri malite n’abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee ruo n’abalị iri na anọ nke ọnwa Septemba. N’agbata abalị iri na anọ nke ọnwa Septemba na abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba, ihe ọ bụla nwere ike ime onye na-eme njem n’oké osimiri, malitekwa n’abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba ruo n’abalị iri nke ọnwa Mach, ọ dịkarịghị ndị na-eme njem n’oké osimiri. Dị ka ihe mechara mee Pọl gosiri, otu ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na ihu ìgwè na-agbanwe ngwa ngwa n’oge ahụ. (Ọrụ 27:13-44) Ọ bụrụ na mmadụ eburu ụgbọ mmiri banye na mmiri n’oge ahụ, oké ifufe nwere ike inye ya nsogbu, ọ ga-esikwara ya ike karị ịkwọ ụgbọ ya. Ígwé ojii na-ekpuchi anyanwụ n’ehihie, kpuchiekwa kpakpando n’abalị. Alụlụụ na mmiri ozuzo na-eme ka o sie ike ịhụ ụzọ nke ọma, meekwa ka a ghara ịhụ ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata ọdachi n’ime mmiri.

[Foto dị na peeji nke 23]

Karama biya ndị Ijipt ji osisi tụọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Erich Lessing/Art Resource, NY

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụgbọ mmiri ndị Rom ji ebu ibu, ihe dị ka afọ 100-200 oge anyị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.