Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ribeka Dị Njikere Ime Ihe Dị Jehova Mma

Ribeka Dị Njikere Ime Ihe Dị Jehova Mma

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ribeka Dị Njikere Ime Ihe Dị Jehova Mma

RIBEKA bụ aha ndị mmadụ na-azakarị n’ọtụtụ ebe taa. Ọ̀ dị onye ị maara na-aza ya?— * Ribeka bụ onye dị mkpa a kọrọ akụkọ ya n’akwụkwọ a kacha mara amara n’ụwa, bụ́ Baịbụl. Olee ihe ị maara banyere ya?— Anyị kwesịrị ịchọ ịmụta banyere Ribeka n’ihi na ihe nlereanya ya nwere ike inyere anyị aka ijere ezi Chineke, bụ́ Jehova, ozi.

Ribeka bụ nwaanyị nke abụọ a kpọrọ aha na Baịbụl bụ́ onye fere Jehova ezi ofufe. Ị̀ maara onye nwaanyị nke mbụ bụ?— Ọ bụ Sera, nwunye Ebreham. Mgbe Sera mere agadi, ọ mụrụ otu mkpụrụ nwa, bụ́ Aịzik. Ugbu a, ka anyị tụlee otú Ribeka si dị njikere ime ihe dị Jehova mma na otú ya na Aịzik si hụ.

Ihe karịrị iri afọ isii agafeela kemgbe Chineke gwara Ebreham na Sera ka ha hapụ Heran kwaga n’ala Kenan. Mgbe Ebreham na Sera mere agadi, Chineke kwere ha nkwa na ha ga-amụta nwa nwoke a ga-akpọ Aịzik. Dị ka i nwere ike iche n’echiche, nne na nna Aịzik hụrụ ya nnọọ n’anya. Mgbe Sera nwụrụ n’oge ọ dị otu narị afọ na iri abụọ na asaa, nwa ya nwoke, bụ́ Aịzik, aghọọla dimkpa, ọnwụ nne ya wutesikwara ya ike. Ebreham achọghị ka Aịzik lụọ nwaanyị Kenan, n’ihi na ndị Kenan anaghị efe Jehova. N’ihi ya, o zigara ohu ya, ikekwe, Elịiza, ka ọ gaa lụtara Aịzik nwaanyị n’etiti ndị ikwu Ebreham na Heran, bụ́ ebe dị ihe karịrị narị kilomita asatọ site na Kenan!—Jenesis 12:4, 5; 15:2; 17:17, 19; 23:1.

Ka oge na-aga, Elịiza na ndị ohu Ebreham ndị ọzọ rutere Heran, tinyere kamel iri ha bú ngwongwo na onyinye ha ga-enye onye ha ga-alụta. Ha kwụsịrị n’akụkụ otu olulu mmiri, n’ihi na Elịiza maara na ndị mmadụ na-abịa n’ehihie isere mmiri maka anụmanụ na ezinụlọ ha. Elịiza kpeziri ekpere ka onye ọ ga-alụtara Aịzik bụrụ onye ọ ga-abụ ya rịọ ya mmiri, ya asị ya: “Ṅụọ, m ga-enyekwa kamel gị mmiri.”

Nke a bụ nnọọ ihe merenụ! Nwa agbọghọ “mara mma nke ukwuu,” bụ́ Ribeka, rutere n’olulu mmiri ahụ. Mgbe Elịiza rịọrọ ya mmiri, ọ sịrị: “M ga-esetakwara kamel gị mmiri.” Ka ọ nọ na-agbaga “ugboro ugboro n’olulu mmiri ahụ iseta mmiri,” Elịiza nọ na-ele ya anya n’ijuanya. Chegodị echiche! Iji nyejuo kamel iri akpịrị kpọrọ nkụ mmiri afọ, ọ dị mkpa ka Ribeka kutere ha otu puku lita mmiri!

Elịiza nyere Ribeka onyinye ndị mara mma, ọ matakwara na ọ bụ nwa Betuel, bụ́ onye ikwu Ebreham. Ribeka kpọrọ Elịiza na ndị ha na ya so ka ha bata n’ụlọ ezinụlọ ha ‘rahụ.’ Ribeka jizi ọsọ buru ha ụzọ gaa gwa ndị ezinụlọ ya banyere ndị ọbịa Ebreham si Kenan zite ịbịa hụ ha.

Mgbe nwanne Ribeka nke nwoke, bụ́ Leban, hụrụ onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa e nyere nwanne ya nwaanyị, matakwa onye Elịiza bụ, ọ sịrị ha batawa ụlọ. Ma Elịiza kwuru, sị: “Agaghị m eri ihe ruo mgbe m kwuru ihe mere m ji bịa.” Ọ kọwaziri ihe mere Ebreham ji zite ya. Obi tọrọ Betuel, na nwunye ya, na Leban ụtọ ịnụ ya, ha kwetakwara ka a lụrụ Ribeka.

Mgbe Elịiza na ndị ha na ya so richara nri, ha hibọrọ chi n’ebe ahụ. N’ụtụtụ, Elịiza kwuru, sị: “Hapụnụ m ka m lakwuru nna m ukwu.” Ma, nne Ribeka na nwanne ya nwoke chọrọ ka ha nọkwuo “ụbọchị iri ma ọ dịkarịa ala.” Mgbe a jụrụ Ribeka ma ọ̀ ga-achọ ịgawa ozugbo, ọ zara, sị, “Achọrọ m iso ya laa.” Ozugbo ahụ, o sooro Elịiza lawa. Mgbe ha laruru, ọ ghọrọ nwunye Aịzik.—Jenesis 24:1-58, 67.

Ì chere na ọ dịịrị Ribeka mfe ịhapụ ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya ma gawa ebe dị anya, ebe ọ ma na o nwere ike ịbụ na ọ gaghị ahụ ha anya ọzọ?— Ee e, ọ dịghịrị ya mfe. Ma, a gọziri Ribeka n’ihi njikere ọ dị ime ihe dị Jehova mma. Ọ ghọrọ onye e si na ya mụta Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Jizọs Kraịst. A ga-agọzikwa anyị ma ọ bụrụ na anyị dị njikere ime ihe dị Jehova mma otú ahụ Ribeka dị.—Ndị Rom 9:7-10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

AJỤJỤ:

▪ Ònye bụ Ribeka, oleekwa ebe Elịiza hụrụ ya?

▪ Olee ihe mere Ebreham achọghị ka Aịzik lụọ nwaanyị Kenan?

▪ Olee otú Ribeka si gosi na ọ ga-abụ ezi nwunye?

▪ Olee ihe anyị nwere ike ime iji dị ka Ribeka?