Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Zigara Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ “n’Ebe Kasị Anya n’Ụwa”

E Zigara Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ “n’Ebe Kasị Anya n’Ụwa”

Ememme Ngụsị Akwụkwọ Nke Klas Nke 127 Nke Gilied

E Zigara Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ “n’Ebe Kasị Anya n’Ụwa”

JIZỌS nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha bụrụ ndị àmà ya ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Ọrụ 1:8) Ndịàmà Jehova ji iwu ahụ kpọrọ ihe.

N’ezie, kemgbe ihe karịrị iri afọ isii na ise, ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ a zụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied enyela aka n’ibute ụzọ n’ọrụ nkwusa a n’ihe karịrị narị mba abụọ. Na Satọdee, Septemba 12, 2009, ndị ozi iri ise na isii ọzọ maara nke a na-akọ n’ikwusa ozi ọma gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ nke dị na Patasịn, Niu Yọk dị n’Amerịka, bụ́ ebe a zụrụ ha ọnwa ise.

Ọrụ Ịtụgharị Uche Na-arụ

Stivin Let, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ́kwa onyeisi oche nke ememme ngụsị akwụkwọ ahụ, gwara klas ahụ okwu n’isiokwu bụ́ “Jiri Ikike Ịtụgharị Uche Gị Mee Ihe nke Ọma.” O bu ụzọ dọọ ụmụ akwụkwọ ahụ aka ná ntị banyere ihe anọ ha na-ekwesịghị ịtụgharị n’uche. Atọ ndị mbụ bụ: (1) Echela na ihe onwunwe nwere ike ichebe gị mgbe niile; (2) zere ịtụgharị omume rụrụ arụ n’uche; (3) zerekwa ichegbubiga onwe gị ókè, na-eche na echi nwere ike ịjọgbu onwe ya. (Ilu 18:11; Matiu 5:28; 6:34) Mgbe ọkà okwu ahụ na-ekwu banyere ihe nke atọ ahụ, o kwuru na mmadụ ichegbubiga onwe ya ókè na-eme ka o were nchegbu nke ụnyaahụ tụkwasị na nke taa, werekwa nke echi tụkwasị na ha. Nwanna Let kwuru, sị: “Nke ahụ bụ mmadụ ibo onwe ya ibu arọ.” Olee ihe bụ́ nke anọ? Ọ dọrọ klas ahụ aka ná ntị ka ha ghara iche na ndụ ha mgbe ha na-aghọbeghị ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ akala mma. Ime otú ahụ ga-eme ka ha ghara inwe ọṅụ ha nwere ike inweta n’ebe ọhụrụ e kenyere ha ọrụ.

Nwanna Let gbaziri klas ahụ ume ka ha jiri ikike ịtụgharị uche ha na-eme ihe anọ bara uru. O kwuru, sị: (1) Na-elepụ anya n’ihu iji hụ ihe ndị nwere ike ịkpatara gị nsogbu ime mmụọ ma ọ bụ nke anụ ahụ́, zerekwa ha; (2) jiri anya nke uche gị na-ahụ ihe ndị ị na-agụ na Baịbụl, werekwa ya na ị nọ mgbe ha na-eme; (3) were ya na onye ọ bụla ị gwara okwu n’ebe ọhụrụ e kenyere gị ọrụ nwere ike ịghọ onye na-efe Jehova; (4) mụtakwa inwe ọmịiko n’ahụ́ ndị mmadụ site n’itinye onwe gị n’ọnọdụ ndị ị na-ekwusara ozi ọma.—Ilu 22:3.

Uru Ịzụ Ndị Ọzọ Bara

Devid Splen, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Nyefee Ya n’Aka Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi,” nke dabeere na 2 Timoti 2:2. Mgbe Pọl onyeozi nyere Timoti ntụziaka ka ọ zụọ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ihe Pọl bu n’obi abụghị naanị ka Timoti kụziere ndị ahụ eziokwu ndị a maara nke ọma, kamakwa, ka ọ gbaa ha ume ka ha zụọ ndị ọzọ. Ọkà okwu ahụ gwara klas ahụ na e nwere mkpa dị ukwuu inwekwu ndị ikom ga na-edu ndú n’ọrụ Ndị Kraịst. Olee mgbe a ga-azụ ha, oleekwa otú a ga-esi zụọ ha? Nwanna Splen gbara klas ahụ ume ka ha bido ịzụ ndị ikom a malite nnọọ mgbe mbụ ha malitere ịmụrụ ha Baịbụl.

Olee nnọọ otú ndị a na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ nwere ike isi zụọ ndị ha na-akụziri Baịbụl ịbụrụ ndị ọzọ ezi ihe nlereanya? Ọkà okwu ahụ kwuru ụzọ dị iche iche ha nwere ike isi mee otú ahụ. Ọ dị mkpa ka ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ zụọ ha ịkwadebe nke ọma maka ọmụmụ Baịbụl ha. Ka ndị ahụ ha na-amụrụ Baịbụl malitere ịbịa ọmụmụ ihe ọgbakọ, ọ dị mkpa ka ha mụta otú ha ga-esi na-akwadebe ihe ndị dabeere na Baịbụl a na-amụ n’ọmụmụ ihe ndị ahụ. Ọkà okwu ahụ kọwara, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike ịmụ Baịbụl n’onwe ya, o nweghị otú ọ ga-esi kụziliere ndị ọzọ ihe.” Nwanna Splen kwukwara na ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ nwere ike inyere ndị ọhụrụ aka iji oge eme ihe, iji ego ha akwado ọrụ ikwusa ozi ọma, na irubere ndị na-edu ndú ugbu a isi. O kwuru na ụzọ kacha mma isi kụzie ihe ndị a bụ ịbụ ezigbo ihe nlereanya.

Ihe Ùgwù nke Ịbụ Ndịàmà

Gaị Pies, onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu dabeere n’okwu Jizọs nke e dere n’Ọrụ 1:8 bụ́, “Unu Ga-abụkwa Ndị Àmà M.” O chetaara klas ahụ na na narị afọ mbụ Oge Anyị, mba Izrel tụfuru ihe ùgwù nke ịbụ ndị àmà Jehova. E weere ihe ùgwù ahụ nye mba nke na-amị mkpụrụ Alaeze. (Matiu 21:43) Mba ahụ bụ ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ọkà okwu ahụ kwuru ihe Pita onyeozi kwuru, bụ́ onye kwuru na “mba dị nsọ” bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ ‘ga-ekwusa ịdị mma Jehova n’ebe niile.’ (1 Pita 2:6-9) Ya mere, ihe Jizọs na-ekwu abụghị na Ndị Kraịst ga-abụ naanị ndị àmà ya ma gharazie ịbụ ndị àmà Jehova. A sị ka e kwuwe, a kpọrọ Jizọs “Onye Àmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi.” (Mkpughe 1:5; 3:14) Ọ bụ ya bụ onye mbụ bụ́ Onyeàmà Jehova, bụrụkwa ihe nlereanya anyị na-eso.—1 Pita 2:21.

Ọkà okwu ahụ gwara klas ahụ na ihe Jizọs kwuru n’Ọrụ 1:8 na-emezu taa karịa otú o mezutụrụla. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na otu amụma dị mkpa, bụ́ nke e dere ná Mkpughe 11:15, emezuola! E hiwela Alaeze Mesaya nke Chineke. N’ezie, a na-arụ ọrụ ịgba àmà ahụ ugbu a “n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Nwanna Pies mere ka o doo anya na ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ na-agba àmà banyere Jehova na Alaeze ya, ọ bụghị banyere onwe ha ma ọ bụ ndụ ha biri na mbụ, omenala ha, na mba ha. Ọ gbara klas ahụ ume ka ha kụziere ‘ndị niile ha nwere ike ịkụziri ihe ihe n’ime oge fọrọ afọ.’

Ihe Ndị Ọzọ Gbara Ọkpụrụkpụ n’Ememme Ahụ

Aleks Rinmula, bụ́ onye na-enyere Kọmitii Mbipụta aka, kwuru okwu n’isiokwu bụ́, “Jehova Ga-enye Gị Obi Ike.” O kwuru na ọ bụrụ na ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ adabere n’ike Jehova, Ọ ga-enyere ha aka ịmata ebe ndị ha dị ike, nabata adịghị ike ha, lụso ihe ndị na-atụ ha ụjọ ọgụ ma nye Chineke ihe kacha mma ha ga-enyeli ya.

Ndị nkụzi abụọ na-arụ ná Ngalaba Ụlọ Akwụkwọ Ọchịchị Chineke, bụ́ Sam Rọbasin na Wiliam Samuelsịn, gwakwara ụmụ akwụkwọ ahụ okwu. Nwanna Rọbasin kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “M Nọnyeere Gị,” nke dabeere n’Aịzaya 41:10. O kwuru na ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ ga-enwe ọtụtụ ihe ga-enye ha ọṅụ. Ha ga-enwekwa nsogbu. Ha ga-edili ya ma ọ bụrụ na ha eṅomie Eze Devid, bụ́ onye kpọkuru Nna ya hụrụ ya n’anya n’ekpere. (Abụ Ọma 34:4, 6, 17, 19) Okwu Nwanna Samuelsịn mere ka ha mata mkpa ọ dị ha ịnọgide na-azụ ikike iche echiche ha. Ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ bụ́ ndị na-eme nke a na-enwe ike izere ime ihe na-adịghị mma mgbe a gwara ha okwu ọjọọ, na-ezerekwa iwe iwe ọsọ ọsọ.—Ilu 2:10, 11.

Jim Mants, bụ́ onye na-enyere Ngalaba Ide Ihe aka, gbara otu onye so na Kọmitii Alaka Mba Jọjịa, na onye nke so na nke mba Họnduras, nakwa onye so na Kọmitii Na-elekọta Mba Tajikistan ajụjụ ọnụ. Ụmụnna a ferela Jehova ọtụtụ afọ nyere ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ ndụmọdụ banyere otú ha nwere ike isi meta ndị nwere ike imegide ozi ọma anyị enyi site n’iji “ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:21) Mak Numa, bụ́ onye ọzọ na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ ahụ, gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ajụjụ ọnụ kporo ọkụ banyere ihe ndị tọrọ ha ụtọ n’ozi ọma ha gara n’oge a na-azụ ha na Gilied. Isiokwu ajụjụ ọnụ a nke na-akpali iche echiche bụ, “Olee Otú M Nwere Ike Isi Nye Aka?”

Onyeisi oche pịachiri ihe omume ahụ site n’ikwu ihe e dere n’abụ ọhụrụ bụ́ “Hụ Onwe Gị Mgbe Ihe Niile Dị Ọhụrụ.” Mgbe puku mmadụ isii na narị ise na itoolu bịara ememme ahụ na-ala, ha kpebisikwuru ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịgba àmà banyere Jehova na Ọkpara ya ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’

[Chaatị/Map dị na peeji nke 31]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

8 mba ole ha si

56 ole ụmụ akwụkwọ dị

28 mmadụ ole bụ́ di na nwunye

33.6 nkezi afọ ndụ ha

18.3 nkezi afọ ole ha nọrọla kemgbe e mere ha baptizim

13.6 nkezi afọ ole ha kwusarala ozi ọma oge niile

[Map]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

E kenyere ndị klas ahụ ọrụ ná mba 22 e dere n’okpuru ebe a

EBE NDỊ E KENYERE NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA N’ALA ỌZỌ ỌRỤ

JAMEIKA

HEITI

NIKARAGỤA

KỌSTA RIKA

PANAMA

KURASO

GAYANA

PERUU

BOLIVIA

PARAGỤAỊ

CHILI

MỌLDOVA

SABIA

ALBENIA

KOT DIVUA

KỌNGO, DEM. RIP.

YUGANDA

BURUNDI

TANZANIA

MOZAMBIK

NEPỌL

KAMBODIA

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Klas nke 127 n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied

E nyere ahịrị ndị dị na foto a nọmba malite n’ihu laa azụ, aha ha malitekwara n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Mashal, T.; Prudent, L.; Mashbọn, A.; Rozenstrọm, S.; Tista, A.; Takeyema, M.; Sisk, M.

(2) Grums, K.; Miura, S.; Kamacho, M.; Rosas, S.; Bọk, M.; Mesa, I.; Yọng, G.; Gerati, S.

(3) Boniya, K.; Nọla, D.; Paralis, R.; Họti, S.; Takada, E.; Tọnad, M.; Sopel, K.

(4) Miura, Y.; Paralis, K.; Prudent, K.; Kolbọn, S.; Wilis, L.; Veranen, A.; Sisk, B.; Takada, R.

(5) Grums, J.; Veranen, M.; Gerati, B.; Stakhaụs, R.; Wilsin, E.; Bonel, E.; Kamacho, D.; Mesa, R.; Bonel, M.

(6) Takeyema, S.; Tista, G.; Kolbọn, T.; Mashbọn, K.; Wilis, W.; Tọnad, L.; Bọk, J.; Stakhaụs, J.

(7) Wilsin, J.; Yọng, J.; Mashal, E.; Rosas, M.; Nọla, J.; Họti, N.; Rozenstrọm, A.; Sopel, J.; Boniya, Ọ.