Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mak Onye ‘Bara Uru Maka Ije Ozi’

Mak Onye ‘Bara Uru Maka Ije Ozi’

Mak Onye ‘Bara Uru Maka Ije Ozi’

Ọ BỤ eziokwu na e nwetụla nsogbu n’ọgbakọ dị n’Antiọk, ma, okwu Pọl na Banabas sere dị iche. Ha nọ na-akwadebe ịga ozi ala ọzọ, ma ‘ha abụọ sere ezigbo okwu’ mgbe ha kwutere okwu onye ga-eso ha aga. (Ọrụ 15:39) Ha abụọ kewara gawara onwe ha. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ nke atọ seere ha, aha ya bụ Mak.

Ònye bụ Mak? Olee ihe mere o ji seere ndịozi abụọ ahụ okwu? Olee ihe mere ha ekwekọrịtaghị ka o soro ha? Hà mechara gbanwee obi ha? Oleekwanụ ihe i nwere ike ịmụta n’akụkọ banyere Mak?

Ebe Mak Bi na Jeruselem

Mak, bụ́ onye ihe àmà na-egosi na o si n’ezinụlọ bara ọgaranya, nọ na Jeruselem too. Mgbe mbụ anyị nụrụ ihe banyere ya bụ n’akụkọ banyere otú ọgbakọ Ndị Kraịst si malite. N’ihe dị ka n’afọ 44 O.A., mgbe mmụọ ozi Jehova ji ọrụ ebube tọhapụ Pita n’ụlọ mkpọrọ, mgbe Herọd Agrịpa nke Mbụ tụrụ ya mkpọrọ, Pita gara “n’ụlọ Meri nne Jọn, onye a na-akpọkwa Mak, bụ́ ebe ọtụtụ mmadụ zukọtara na-ekpe ekpere.”—Ọrụ 12:1-12. *

O yiri ka ọgbakọ dị na Jeruselem ọ̀ na-anọ n’ụlọ nne Mak amụ ihe. Na “ọtụtụ mmadụ” zukọtara ebe ahụ gosiri na ụlọ ha buru ibu. Meri nwere odibo nwaanyị aha ya bụ Roda, onye bịara megheere Pita ụzọ mgbe ọ kụrụ aka “n’ọnụ ụzọ ámá.” Ihe ndị a niile na-egosi na Meri bụ aka ji akụ̀. A kpọkwara ụlọ ahụ ụlọ ya kama ịkpọ ya ụlọ di ya. Nke a na-egosi na o nwere ike ịbụ na di ya anwụọla, nakwa na Mak ka na-eto eto.—Ọrụ 12:13.

Ọ ga-abụ na Mak so ná ndị zukọtara na-ekpe ekpere. Ọ ghaghị ịbụ na ọ maara ndị na-eso ụzọ Jizọs nke ọma, marakwa ndị ọzọ hụrụ ihe ndị mere n’oge Jizọs nọ n’ụwa. O nwedịrị ike ya abụrụ Mak bụ nwa okorobịa ahụ yi naanị uwe linin, bụ́ onye nọ na-eso Jizọs mgbe e jidere Jizọs, bụ́kwa onye gbara ọsọ mgbe a chọrọ ijide yanwa.—Mak 14:51, 52.

Ihe Ùgwù Ndị O Nwere n’Ọgbakọ

O doro anya na otú Mak na Ndị Kraịst tozuru okè si na-akpa mere ka ọ na-akpa ezigbo àgwà. O nwere ọganihu n’ọgbakọ, ọtụtụ ụmụnna ndị nwere ihe ùgwù n’ọgbakọ nwekwara mmasị n’ebe ọ nọ. Ihe Mak masịrị Pọl na Banabas mgbe ha si n’Antiọk buga “ihe enyemaka” na Jeruselem iji nyere ndị nọ n’ụnwụ nri aka n’ihe dị ka n’afọ 46 O.A. Ha kpọkwa Mak lọghachi Antiọk.—Ọrụ 11:27-30; 12:25.

Ọ bụrụ na mmadụ agụọ akụkọ a elu elu, ọ ga-eche na e nweghị ihe ọzọ jikọrọ mmadụ atọ a ma e wezụga na ha bụ ụmụnna, nakwa na naanị ihe mere Pọl na Banabas ji kpọrọ Mak bụ na ọ ma ihe. Ma, otu n’ime akwụkwọ ozi ndị Pọl dere gosiri na Mak bụ onye ikwu Banabas. (Kọl. 4:10) Nke a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ndị ọzọ mere, bụ́ ndị metụtara Mak.

Mgbe ihe dị ka otu afọ gafere, mmụọ nsọ gwara Pọl na Banabas ka ha gaa ozi n’ala ọzọ. Ha si Antiọk gawa Saịprọs. Jọn Mak so ha gawa ka o wee “na-ejere ha ozi.” (Ọrụ 13:2-5) Eleghị anya, Mak ga na-emere ndịozi ahụ ihe ndị dị ha mkpa ka ha wee nwee ike ilekwasị anya n’ihe metụtara ofufe Jehova.

Pọl, Banabas, na Mak gazuru Saịprọs niile na-ekwusa ozi ọma. Mgbe ha mechara, ha gawara Eshia Maịnọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jọn Mak mere ihe wutere Pọl. Akụkọ ahụ kwuru na mgbe ha rutere Paga, “Jọn hapụrụ ha wee laghachi Jeruselem.” (Ọrụ 13:13) E kwughị ihe mere o ji mee nke a.

Mgbe afọ ole na ole gachara, Pọl, Banabas, na Mak lọghachiri Antiọk. Ndịozi abụọ ahụ nọ na-ekwurịta otú ha ga-esi aga ozi ala ọzọ nke abụọ ka ha wee nwee ike inyekwuru ndị ha ziri ozi ọma na nke mbụ aka. Banabas chọrọ ka Mak soro ha, ma Pọl achọghị iji ntị anụ nke ahụ, n’ihi na Mak hapụrụ ha na mbụ lawa. Nke a kpatara esemokwu ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite. Banabas kpọọrọ Mak gawa obodo ya bụ́ Saịprọs, ebe Pọl gawara Siria. (Ọrụ 15:36-41) O doro anya na otú Pọl si lee ihe ahụ Mak mere na mbụ anya dị iche n’otú Banabas si lee ya anya.

Ha Ekpezie

O doro anya na ihe ahụ merenụ wutere Mak. Ma, ọ nọgidere na-ejere Jehova ozi. Mgbe ihe dị ka afọ iri na otu ma ọ bụ afọ iri na abụọ gafere ka ya na Pọl nwechara nsogbu a, e kwuru okwu ọzọ banyere Mak. Ebee ka ọ nọ? Ọ nọ ebe ị na-agaghị atụ anya ịhụ ya. Ya na Pọl nọ.

Pọl zipụrụ ọtụtụ akwụkwọ ozi n’agbata afọ 60 na 61 O.A., mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom. Akwụkwọ ozi ndị ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ taa. Na nke o degaara ndị Kọlọsi, ọ sịrị: “Arịstakọs onye mkpọrọ ibe m na-ekele unu, Mak bụ́ nwa nwanne Banabas na-ekelekwa unu, (ọ bụ onye ahụ e nyere unu iwu ka unu nabata ma ọ bụrụ na ọ bịakwute unu mgbe ọ bụla,) . . . Ọ bụ naanị ndị a bụ ndị ọrụ ibe m maka alaeze Chineke, ndị a aghọwokwa ndị na-enyere m aka, na-eme ka m dị ike.”—Kọl. 4:10, 11.

Nke a bụ mgbanwe na-enweghị atụ. Mak ihe ya na-ewebu Pọl iwe ghọziri onye Pọl hụrụ n’anya nke ya na ya na-arụkọ ọrụ. Ọ dị ka Pọl gwara ndị Kọlọsi na Mak nwere ike ịbịa. Ọ bụrụ na Mak agaa, ọ ga-abụ onye nnọchiteanya Pọl.

Pọl ọ̀ katọburu Mak? Ndụmọdụ e nyere Mak ọ̀ baara ya uru? Ka ihe abụọ a hà mere? N’agbanyeghị nke merenụ, otú Pọl na Mak si kpezie gosiri na ha bụ dimkpa. Ha chefuru ihe gara aga ma maliteghachi ịrụkọ ọrụ. Nke a bụ ezigbo ihe nlereanya nke Ndị Kraịst sere okwu kwesịrị iṅomi.

Mak Onye Ije

Ka ị na-agụ banyere ebe ndị Mak gara, ị ga-ahụ na ọ bụ onye ije. O si Jeruselem gaa Antiọk, si Antiọk gaa Saịprọs na Paga. O sizi ebe ahụ gaa Rom. Pọl chọrọ isi ebe ahụ ziga ya Kọlọsi. E nwekwara ebe ndị ọzọ ọ gara.

Pita onyeozi dere akwụkwọ ozi ya nke mbụ n’ihe dị ka n’afọ 62 ruo 64 O.A. O dere, sị: “Nwaanyị ahụ nke nọ na Babịlọn . . . na-ekele unu. Mak nwa m na-ekelekwa unu.” (1 Pita 5:13) Nke a na-egosi na Mak gara Babịlọn ka o soro onye ozi ahụ na-aga ọmụmụ ihe n’ụlọ mama ya ọtụtụ afọ gara aga na-eje ozi.

Mgbe Pọl degaara Timoti akwụkwọ ka o si n’Efesọs bịakwute ya mgbe a tụrụ ya mkpọrọ nke abụọ na Rom n’ihe dị ka n’afọ 65 O.A., otu n’ime ihe ọ gwara Timoti bụ: “Kpọrọ Mak ka gị na ya bịa.” (2 Tim. 4:11) Nke a gosiri na Mak nọ n’Efesọs mgbe ahụ. O doro anya na o mere ihe Pọl kwuru ma soro Timoti gaa Rom. Ime njem adịghị mfe n’oge ahụ, ma, Mak ji obi ọcha ya gaa ebe ndị a chọrọ ka ọ gaa.

Ihe Ùgwù Ọzọ Pụrụ Iche

Ihe ùgwù ọzọ pụrụ iche Mak nwere bụ iso ná ndị Jehova nyere mmụọ nsọ ka o soro dee Oziọma banyere ndụ Jizọs. Ọ bụ ezie na e kwughị aha onye dere oziọma ahụ, akwụkwọ ndị e nwere n’oge ochie gosiri na ọ bụ Mak dere ya, gosikwa na o si n’aka Pita nweta ihe o dere. N’eziokwu, Pita ji anya ya hụ mgbe ihe niile Mak dere mere.

Ndị na-enyocha Oziọma Mak kwuru na ọ bụ ndị Jentaịl ka o bu n’obi dee ya; ọ kọwara ụfọdụ omenala ndị Juu akọwa. (Mak 7:3; 14:12; 15:42) Mak sụgharịrị okwu Arameik, ndị ndị na-abụghị ndị Juu na-agaghị aghọta. (Mak 3:17; 5:41; 7:11, 34; 15:22, 34) O dere ọtụtụ okwu na Latịn, o jikwa okwu Latịn kọwaa ndị nke Grik. Ihe a niile yiri ka ọ̀ na-akwado ihe ahụ e kwuwere kemgbe na Mak nọ na Rom dee Oziọma ya.

“Ọ Baara M Uru Maka Ije Ozi”

Ọ bụghị naanị ide Oziọma ya ka Mak rụrụ na Rom. Cheta na Pọl gwara Timoti, sị: “Kpọrọ Mak ka gị na ya bịa.” Maka gịnị? “N’ihi na ọ baara m uru maka ije ozi.”—2 Tim. 4:11.

Aha a a kpọtụrụ Mak ebe a, nke yiri ka ọ bụ nke ikpeazụ ya n’Akwụkwọ Nsọ, gosiri ọtụtụ ihe banyere ya. Ọ dịghị ebe e gosiri na Mak bụ onyeozi, onye ndú, ma ọ bụ onye amụma. Ọ bụ onye na-eje ozi, ya bụ, onye na-ejere ndị ọzọ ozi. O dokwara anya na Mak baara Pọl ezigbo uru n’oge Pọl na-eche ọnwụ ihu.

Anyị chịkọta ihe niile anyị ma banyere Mak, anyị ga-ahụ na o ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ ebe n’ụwa, anyị ga-ahụkwa na ọ bụ nwoke ji obi ụtọ jeere ndị ọzọ ozi. N’eziokwu, Mak nwere ọtụtụ ihe ùgwù n’ihi na ọ daghị mbà.

Dị ka Mak mere, anyị bụ́ ndị ohu Chineke taa jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ụfọdụ n’ime anyị nwedịrị ike ịga obodo ma ọ bụ mba ndị ọzọ dị ka Mak, gaa kwusaa ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị anyị niile nwere ike ịkwaga ebe ọzọ gaa kwusaa ozi ọma, ma, anyị niile nwere ike iṅomi Mak n’ụzọ ọzọ dị mkpa. Dị nnọọ ka o wepụtara onwe ya jeere ụmụnna ya ozi, anyị kwesịkwara ịgba mbọ nyere ụmụnna anyị aka ijere Chineke ozi. Ka anyị na-eme nke a, ka obi sie anyị ike na Jehova ga-anọgide na-agọzi anyị.—Ilu 3:27; 10:22; Gal. 6:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ndị dịrị ndụ n’oge Mak dị ndụ na-azakarị aha ọzọ dị iche na nke a gụrụ ha. Ọ na-abụkarị aha Hibru ma ọ bụ nke asụsụ ọzọ. Aha Juu Mak bụ Yohanan, ya bụ, Jọn. Aha nna ya n’asụsụ Latịn bụ Makọs, ma ọ bụ Mak.—Ọrụ 12:25.

[Map/Foto dị na peeji nke 8, 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ụfọdụ n’Ime Obodo Ndị Mak Gara

Rom

Efesọs

Kọlọsi

Paga

Antiọk (nke Siria)

Saịprọs

OKÉ OSIMIRI MEDITERENIAN

Jeruselem

Babịlọn