Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Jizọs Kụziri Banyere Chineke

Ihe Jizọs Kụziri Banyere Chineke

Ihe Jizọs Kụziri Banyere Chineke

“Naanị onye maara nnọọ Nna ahụ bụ Ọkpara ya. Ma Ọkpara ahụ chọrọ ịgwa ndị ọzọ banyere Nna ahụ, ka ha marakwa ya.”—LUK 10:22, CONTEMPORARY ENGLISH VERSION.

TUPU Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya aghọọ mmadụ, ya na Nna ya nọrọ nnọọ ọtụtụ afọ. (Ndị Kọlọsi 1:15) N’ihi ya, Ọkpara ahụ matara otú Nna ya si eche echiche, otú o si ele ihe anya, na otú o si eme ihe. Mgbe Ọkpara a mechara bịa n’ụwa bụrụ nwoke ahụ a na-akpọ Jizọs, ọ dị njikere ịkụzi eziokwu banyere Nna ya. Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe banyere Chineke site n’ige ntị n’ihe Ọkpara ya kwuru.

Aha Chineke Aha Chineke, bụ́ Jehova, bụ ihe kacha Jizọs mkpa. Ọkpara a Nna ya hụrụ n’anya chọrọ ka ndị ọzọ mata aha Nna ya ma na-akpọ ya ya. Aha Jizọs pụtara “Jehova bụ Nzọpụta.” N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọnụ siri ya ike ịgwa Jehova n’ekpere, sị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị.” (Jọn 17:26) O jughị anyị anya na Jizọs kpọrọ Chineke aha ya ma mee ka ndị ọzọ mara ya. A sị ka e kwuwe, olee otú ndị na-ege Jizọs ntị ga-esi ghọta eziokwu banyere Jehova ma ọ bụrụ na ha amadịghị aha Ya na ihe ọ pụtara? *

Ịhụnanya dị ukwuu nke Chineke Ọ dị mgbe Jizọs gwara Chineke n’ekpere, sị: “Nna, . . . ị hụrụ m n’anya tupu a tọọ ntọala ụwa.” (Jọn 17:24) Ebe ọ bụ na Chineke hụrụ Jizọs n’anya n’eluigwe, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ chọrọ igosi ndị mmadụ ịhụnanya ahụ n’ọtụtụ ụzọ ndị magburu onwe ha.

Jizọs gosiri na ịhụnanya Jehova nwere ike irutụrụ mmadụ niile. Jizọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Okwu Grik a sụgharịrị “ụwa” n’amaokwu ahụ apụtaghị “ala.” N’ebe a, ọ pụtara ụmụ mmadụ—n’ezie, mmadụ niile. Ịhụnanya Chineke nwere maka ụmụ mmadụ dị ukwuu nke na o nyere Ọkpara ya ọ kacha hụ n’anya iji gbapụta ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ná mmehie na ọnwụ ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Anyị enweghị ike ịghọtacha otú ịhụnanya ahụ dịruru ukwuu.—Ndị Rom 8:38, 39.

Jizọs kwughachiri otu eziokwu na-emesi anyị nnọọ obi ike: Jehova hụrụ nnọọ ndị na-efe ya ofufe n’anya n’otu n’otu. Jizọs kụziri na Jehova dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke hụrụ atụrụ ya nke ọ bụla n’anya ma mara ha n’otu n’otu. (Matiu 18:12-14) Jizọs kwuru na otu nza agaghị ada n’ala, Jehova aghara ịma. Jizọs kwukwara, sị: “A gụwo ntutu niile dị n’isi unu ọnụ.” (Matiu 10:29-31) Ọ bụrụ na Jehova nwere ikike ịhụ na otu nza nọ n’akwụ́ anọkwaghị, í cheghị na ọ na-ahụ onye nke ọ bụla na-efe ya ofufe ma na-eche banyere ya karị? Ọ bụrụ na Jehova ga-agụtali ntutu isi anyị niile ọnụ ma mara banyere ha, ò nweziri ihe metụtara ndụ anyị—ihe na-akpa anyị, ahụhụ ndị anyị na-ata, na nchegbu anyị—ọ na-enweghị ike ịma?

Nna nke Eluigwe Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jizọs bụ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. Ọ bụghị ihe ijuanya na Ọkpara ahụ Nna ya hụrụ n’anya na-akpọkarị Jehova “Nna.” N’ezie, n’okwu mbụ Jizọs kwuru e dere ede, bụ́ nke o kwuru n’ụlọ nsọ mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, ọ kpọrọ Jehova “Nna m.” (Luk 2:49) Okwu ahụ bụ́ “Nna” pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro otu narị na iri itoolu n’Oziọma ndị dị na Baịbụl. Jizọs kpọrọ Jehova “Nna unu,” “Nna anyị,” na “Nna m.” (Matiu 5:16; 6:9; 7:21) Ebe ọ bụ na Jizọs kpọrọ Jehova aha ndị ahụ ugboro ugboro, o gosiri na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-eme mmehie na Jehova nwere ike ịdị nnọọ ná mma, ha atụkwasịkwa Ya obi.

Ọ na-eme ebere ma dị njikere ịgbaghara mmehie Jizọs maara na ebere dị ukwuu nke Jehova dị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mkpa. N’ilu Jizọs tụrụ banyere nwa mmefu ahụ, o ji Jehova tụnyere nna nwere ọmịiko ma na-agbaghara mmehie, bụ́ onye gbasara aka ya iji nabataghachi nwa ya chegharịrị echegharị. (Luk 15:11-32) N’ihi ya, okwu Jizọs na-emesi anyị obi ike na Jehova na-achọ ihe na-egosi na onye mere mmehie echegharịala, ka O wee meere ya ebere. Ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ịgbaghara onye mmehie nke chegharịrịnụ. Jizọs kwuru, sị: “Ana m asị unu na otú ahụ ka a ga-enwe ọṅụ dị ukwuu n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ karịa n’ihi ndị ezi omume iri itoolu na itoolu, ndị nchegharị na-adịghị mkpa.” (Luk 15:7) Olee onye na-agaghị achọ ka ya na Chineke nke na-eme ebere otú ahụ dịrị ná mma?

Onye na-anụ ekpere Mgbe Jizọs nọ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, o ji anya ya hụ na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere” nakwa na ekpere ndị na-efe ya ofufe n’ikwesị ntụkwasị obi na-ekpegara Ya na-atọ ya ụtọ. (Abụ Ọma 65:2) N’ihi ya, mgbe Jizọs na-eje ozi ya, ọ kụziiri ndị gere ya ntị otú ha ga-esi na-ekpe ekpere na ihe ha ga-arịọ. Ọ dụrụ ọdụ, sị: “Ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.” Ọ gbara ndị gere ya ntị ume ka ha na-ekpe ekpere ka uche Chineke “meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” Anyị nwekwara ike ikpe ekpere maka nri ụbọchị, ka a gbaghara anyị mmehie anyị, nakwa ka anyị nwee ike imeri ọnwụnwa. (Matiu 6:5-13) Jizọs kụziri na Jehova na-eji obiọma aza ekpere ndị ohu Ya, na-aza ekpere ha ji okwukwe si n’ala ala obi ha kpee.—Matiu 7:7-11.

N’ezie, Jizọs gbalịrị ịkụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Jehova na ụdị Chineke ọ bụ. Ma, e nwere ihe ọzọ Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi kọọrọ ndị mmadụ banyere Jehova, ya bụ, ihe Jehova ga-eji gbanwee ọnọdụ ụwa iji mezuo nzube Ya banyere ụwa na ụmụ mmadụ bi na ya. O doro anya na nke ahụ bụ isiokwu nke ozi ọma Jizọs.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Mgbe e dere Baịbụl, aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ihe dị ka puku ugboro asaa n’ime ya. Ihe aha ahụ pụtara bụ “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụpụ 3:14) Chineke nwere ike ịbụ ihe ọ bụla o chere dị mkpa iji mezuo nzube ya. N’ihi ya, aha a na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke agatụghị eme ihe megidere ihe o kwuru nakwa na ihe ọ bụla o kwere ná nkwa ga-emezu.