Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Kraịst—Otú Ozi Ya Si Gbasa Gị

Jizọs Kraịst—Otú Ozi Ya Si Gbasa Gị

Jizọs Kraịst—Otú Ozi Ya Si Gbasa Gị

“Abịara m ka ha nwee ndụ, ka ha nweekwa ya n’uju.”—JỌN 10:10.

ISI ihe mere Jizọs Kraịst ji bịa n’ụwa bụ inye ihe, ọ bụghị ịnara ihe. O si n’ozi ya nye ụmụ mmadụ onyinye dị oké ọnụ ahịa—ozi nke mere ka a mata eziokwu banyere Chineke na uche Ya. Ndị nabatara ozi ahụ nwere ike ibi ndụ ka mma ugbu a, dị ka ọtụtụ nde ezi Ndị Kraịst nwere ike ịgba akaebe ya. * Ma, isi ihe Jizọs kwusara n’ozi ya bụ onyinye kacha ọnụ ahịa e nyere anyị, ya bụ, ndụ ya zuru okè o nyere n’ihi anyị. Ihe ga-ekpebi ma ànyị ga-adị ndụ ebighị ebi ma ọ bụ na anyị agaghị adị bụ ma ànyị nabatara ihe ahụ kacha mkpa n’ozi ya ka ọ̀ bụ na anyị anabataghị ya.

Ihe Chineke na Kraịst nyere Jizọs maara na ya ga-anwụ ọnwụ ahụhụ n’aka ndị iro ya. (Matiu 20:17-19) N’agbanyeghị nke ahụ, o kwuru okwu a ma ama dị na Jọn 3:16, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Jizọs kwukwara na ya bịara ‘inye mkpụrụ obi [ma ọ bụ ndụ] ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) Gịnị mere o ji kwuo na ya ga-enye ndụ ya kama ịbụ na a ga-anara ya ndụ ya?

Ịhụnanya na-enweghị atụ Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ mere ka o mee ndokwa ịnapụta ha ná mmehie ha ketara eketa na ihe ndị ọ kpataara ha, bụ́ ezughị okè na ọnwụ. Chineke mere nke a site n’izite Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà. Jizọs ji obi ya dum kwere, nye ndụ ya zuru okè n’ihi anyị. Ndokwa a, bụ́ nke a kpọrọ ihe mgbapụta, bụ onyinye kachanụ Chineke nyere ụmụ mmadụ. * Ọ bụ onyinye nwere ike ime ka mmadụ nweta ndụ ebighị ebi.

Ihe i kwesịrị ime Ì so ná ndị e nyere ihe mgbapụta ahụ? Ọ bụ gị ka ọ dịịrị ikpebi. Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na mmadụ matịrị aka inye gị ngwugwu a fụrụ nke ọma. N’ezie, ọ gaghị aghọ nke gị ruo mgbe ị matịrị aka nara ya onye ahụ. N’otu aka ahụ, Jehova na-enye gị ihe mgbapụta ahụ, ma onyinye a agaghị aghọ nke gị ruo mgbe ị matịrị aka nara ya. Olee otú ị ga-esi nara ya?

Jizọs kwuru na ọ bụ ndị “nwere okwukwe” na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi. Inwe okwukwe metụtara otú i si ebi ndụ. (Jems 2:26) Inwe okwukwe na Jizọs pụtara ime ka ndụ gị kwekọọ n’ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere. Iji mee nke ahụ, ị ga-amatarịrị Jizọs na Nna ya nke ọma. Jizọs kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Jizọs Kraịst kwusara ozi gbanwere ndụ ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa dum. Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere ozi ahụ na otú gị na ndị ị hụrụ n’anya nwere ike isi rite uru na ya, ọ bụghị naanị ugbu a, kama ruo mgbe ebighị ebi? Obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka.

Isiokwu ndị na-esonụ ga-eme ka ị matakwuo Jizọs Kraịst, bụ́ nwoke kwusara ozi nke nwere ike ịgbanwe ndụ gị ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụghị onye ọ bụla sịrị na ya bụ Onye Kraịst bụ ezigbo onye na-eso ụzọ Kraịst. Ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ndị na-ebi ndụ kwekọrọ n’eziokwu ọ kụziri banyere Chineke na uche Ya.—Matiu 7:21-23.

^ par. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Akwụkwọ Nsọ kụziri banyere ihe mgbapụta ahụ, gụọ isi 5, bụ́ “Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere,” n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.