Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụgha na Eziokwu Eziokwu Banyere Jizọs

Ụgha na Eziokwu Eziokwu Banyere Jizọs

Ụgha na Eziokwu Eziokwu Banyere Jizọs

GỊNỊ KA I CHERE? IHE NDỊ E KWURU N’OKPURU EBE A HÀ BỤ EZIOKWU KA HÀ BỤ ỤGHA?

A mụrụ Jizọs na Disemba 25.

Ndị amamihe atọ letara Jizọs mgbe a mụrụ ya.

Jizọs bụ otu mkpụrụ nwa.

Jizọs bụ Chineke bịara n’anụ ahụ́.

Jizọs abụghị naanị ezigbo mmadụ.

ỌTỤTỤ ndị ga-asị na ihe niile ahụ e kwuru n’elu bụ eziokwu. Ndị ọzọ nwere ike ikwu na o siri ike, nakwa na e mekatadịghị mata ma hà bụ eziokwu. Ikekwe, ha chere na ọ bụrụhaala na mmadụ kweere na Jizọs, ịmata ma hà bụ eziokwu ma hà bụ ụgha adịchaghị mkpa.

Ma, Baịbụl kwuru ihe dị iche. Ọ na-agba anyị ume ka anyị nwee “ezi ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” (2 Pita 1:8) Otú anyị ga-esi nweta ihe ọmụma ahụ bụ ịgụ Oziọma ndị dị na Baịbụl. Ha kọrọ eziokwu banyere Jizọs, na-eme ka anyị mata ọdịiche dị n’eziokwu na ụgha. Ya mere, ka anyị tụlee ihe Oziọma ndị dị na Baịbụl kwuru banyere ihe ndị ahụ ndị mmadụ kweere e kwuru n’elu.

IHE NDỊ MMADỤ KWEERE: A mụrụ Jizọs na Disemba 25.

NKE Ọ BỤ: ỤGHA.

Ọ dịghị ebe Baịbụl kwuru ọnwa ma ọ bụ ụbọchị a mụrụ Jizọs. Oleezi ebe e si nweta Disemba 25? Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica kwuru na ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst “chọrọ ka ụbọchị ahụ daba n’ụbọchị ndị ọgọ mmụọ Rom ji eme . . . ememme etiti oge oyi, bụ́ mgbe chi na-anaghị eji ngwa ngwa, anyanwụ amaliteghachikwa ịgbagokwu elu.” Otu akwụkwọ ahụ e ji eme nnyocha kwuru na ọtụtụ ememme a na-eme n’oge Krismas sitere “n’ememme ọrụ ubi na nke anyanwụ ndị ọgọ mmụọ na-eme n’etiti oge oyi.”

Jizọs ọ̀ ga-achọ ka a na-eme ememme ncheta ọmụmụ ya na Disemba 25? Chegodị echiche: Ọ dịghị onye maara ụbọchị a mụrụ Jizọs. Ọ dịghị ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru ka anyị na-eme ememme ncheta ọmụmụ ya, ọ dịkwanụghị ihe gosiri na Ndị Kraịst oge gboo mere otú ahụ. Ma, Baịbụl kwuru nnọọ ụbọchị Jizọs nwụrụ, Jizọs nyekwara ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-echeta ụbọchị ahụ. * (Luk 22:19) O doro anya na Jizọs chọrọ ka anyị lekwasị anya n’uru àjà o ji ndụ ya chụọ bara, ọ bụghị n’ọmụmụ ya.—Matiu 20:28.

IHE NDỊ MMADỤ KWEERE: Ndị amamihe atọ (ma ọ bụ ndị eze atọ n’akụkọ ifo ụfọdụ) letara Jizọs mgbe a mụrụ ya.

NKE Ọ BỤ: ỤGHA.

Ikekwe, ị hụla ihe osise ọmụmụ Jizọs, bụ́ ndị na-egosi ebe nwa ọhụrụ bụ́ Jizọs dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri, ndị amamihe atọ ji onyinye agbaa ya gburugburu. Ma, ihe osise a bụ ụgha, ọ bụghị eziokwu.

Ọ bụ eziokwu na e nwere ndị ozi si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ bịa leta Jizọs mgbe ọ dị obere. Ma, ndị ọbịa ahụ bụ nnọọ ndị na-agụ kpakpando. (Matiu 2:1) Hà hụrụ Jizọs ka e nyiwere ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri? Mba; ha letara ya n’ụlọ. O doro anya na ha rutere ebe ahụ ọnwa ole na ole a mụchara Jizọs.—Matiu 2:9-11.

Ole ka ndị ọbịa ahụ dị? Hà dị abụọ, atọ, ka ọ̀ bụ iri atọ? Baịbụl ekwughị ole ha dị. Ikekwe, ihe mere e ji asị na ha dị atọ bụ n’ihi ụdị onyinye atọ ha ji bịa. * (Matiu 2:11) Ụfọdụ kwudịrị na onye nke ọ bụla n’ime ndị ahụ a kpọrọ ndị amamihe nọchiri anya otu agbụrụ nke ụmụ mmadụ. Ma, Akwụkwọ Nsọ ekwughị ihe dị otú ahụ. Kama nke ahụ, otu akwụkwọ nke kọwara Oziọma Baịbụl kwuru na “ọ bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme ụbụrụ na-aghọ nkọ nke dịrị ndụ na narị afọ nke asatọ” chepụtara ozizi ụgha a.

IHE NDỊ MMADỤ KWEERE: Jizọs bụ otu mkpụrụ nwa.

NKE Ọ BỤ: ỤGHA.

Oziọma ndị dị na Baịbụl mere ka o doo anya na Jizọs nwere ụmụnne. Oziọma Luk kpọrọ Jizọs “nwa mbụ” Meri, nke na-egosi na Meri mechara mụọ ụmụ ndị ọzọ. * (Luk 2:7) Oziọma Mak kọrọ na ụfọdụ ndị bi n’obodo Nazaret ji Jizọs tụnyere ụmụnne ya, n’eleghị ya anya ka onye pụrụ iche. Ha jụrụ, sị: “Onye a ọ́ bụghị . . . nwanne Jems na Josef na Judas na Saịmọn? Ọ̀ bụkwa na anyị na ụmụnne ya ndị inyom anọghị n’ebe a?”—Mak 6:3; Matiu 12:46; Jọn 7:5.

N’agbanyeghị ihe Oziọma ndị dị na Baịbụl kwuru, ọtụtụ ndị ọkà mmụta okpukpe ka na-ekwusi ike na Jizọs bụ otu mkpụrụ nwa. Ụfọdụ kwuru na ndị ahụ a kpọrọ ụmụnne Jizọs ndị ikom na ndị inyom bụ ụmụ nwanne nne ma ọ bụ nna ya. * Ndị ọzọ kwuru na ụmụnne ya ndị ahụ bụ ụmụ Meri kuchiri ekuchi. Ma, chegodị echiche: A sị na Jizọs bụ otu mkpụrụ nwa Meri mụrụ, ndị Nazaret ahụ hà gaara ekwu ihe ahụ ha kwuru? Kama nke ahụ, ọ ga-abụ na ụfọdụ n’ime ha ji anya ha hụ mgbe Meri dị ime ha. Ha ji anya ha hụ na Jizọs bụ otu n’ime ọtụtụ ụmụ Meri mụrụ.

IHE NDỊ MMADỤ KWEERE: Jizọs bụ Chineke bịara n’anụ ahụ́.

NKE Ọ BỤ: ỤGHA.

Ọ dịla anya a kụziwere na Chineke bịara bie ndụ n’ụwa dị ka nwoke bụ́ Jizọs, nke bụ́ isi ihe a na-ezi n’ozizi Atọ n’Ime Otu—ma, ozizi a adịghị n’oge Jizọs jere ozi n’ụwa. Kama nke ahụ, akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Ma okwu ahụ bụ́ Atọ n’Ime Otu ma ozizi ahụ kpọmkwem adịghị nke pụtara n’Agba Ọhụrụ . . . Ozizi ahụ malitere nke nta nke nta kemgbe ọtụtụ narị afọ gara aga, kpatakwa ọtụtụ esemokwu.”

Okpukpe na-akparị Jizọs akparị mgbe ọ na-akụzi na Jizọs bụ Chineke bịara n’anụ ahụ́. * N’ihi gịnị? Tụlee ihe atụ a. Ụfọdụ ndị ọrụ rịọrọ onyeisi ọrụ ha ihe, ma ya asị na ikike ya erughị imere ha ihe ahụ. Ọ bụrụ na ihe ahụ onyeisi ọrụ ahụ kwuru bụ eziokwu, ọ pụtara na ọ kpara àgwà onye maara ihe n’ihi na o gosiri na ọ maara ebe ikike ya ruru. Ọ bụrụ na ihe ahụ o kwuru abụghị eziokwu, ọ bụrụ na ọ ga-emeli ya ma jụ ime ya, ọ pụtara na ọ ghọrọ ha aghụghọ.

Olee ihe Jizọs mere mgbe ndịozi ya abụọ chọrọ inweta ọkwá dị elu? Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụghị m na-eme ka a nọdụ n’aka nri m na n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.” (Matiu 20:23) Ọ bụrụ na Jizọs bụ Chineke n’ezie, ihe ahụ o kwuru ọ́ bụghị ụgha? Kama nke ahụ, Jizọs gosiri ihe nlereanya magburu onwe ya n’ịdị umeala n’obi site n’ido onwe ya n’okpuru Onye ka ya ukwuu, gosikwa na ya na Chineke ahaghị.

IHE NDỊ MMADỤ KWEERE: Jizọs abụghị naanị ezigbo mmadụ.

NKE Ọ BỤ: EZIOKWU.

Jizọs kwuru hoo ha na ya abụghị naanị ezigbo mmadụ. O kwuru, sị: “Abụ m Ọkpara Chineke.” (Jọn 10:36) N’ezie, onye ọ bụla nwere ike ikwu na ya bụ Ọkpara Chineke. Ma, ọ bụrụ na ihe ahụ Jizọs kwuru bụ ụgha, olee ụdị onye nke ahụ ga-egosi na ọ bụ? O doro anya na ọ ga-egosi na ọ bụghị ezigbo mmadụ, kama na ọ bụ nnọọ onye aghụghọ!

Akaebe kachanụ nke gosiri na Jizọs bụ Ọkpara Chineke bụ nke Chineke n’onwe ya gbara. O kwuru ugboro abụọ banyere Jizọs, sị: “Onye a bụ Ọkpara m.” (Matiu 3:17; 17:5) Chegodị echiche: Ọ bụ naanị ugboro ole na ole ka Akwụkwọ Nsọ kwuru na a nụrụ olu Chineke n’ụwa, ma, ugboro abụọ n’ime ha, o kwuru hoo haa na Jizọs bụ Ọkpara ya! Nke a bụ nnọọ akaebe kachanụ nke gosiri na Jizọs bụ onye ahụ o kwuru na ya bụ.

Ò nwere eziokwu ị na-amabughị banyere Jizọs ị mụtara n’isiokwu a? Ya bụrụ otú ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka ị mụkwuo Oziọma ndị e si n’ike mmụọ nsọ dee? Ụdị ọmụmụ ihe ahụ ga-atọ gị ụtọ ma baara gị uru. A sị ka e kwuwe, Jizọs n’onwe ya kwuru na ịmụ eziokwu banyere ya na Nna ya dị mkpa iji “nweta ndụ ebighị ebi.”—Jọn 17:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Jizọs nwụrụ n’Ụbọchị Ememme Ngabiga, ma ọ bụ Naịsan 14, na kalenda ndị Juu.—Matiu 26:2.

^ par. 18 Matiu kọrọ na ndị ahụ si mba ọzọ ‘meghere igbe akụ̀ ha’ nye Jizọs onyinye, ya bụ, ọlaedo na frankinsens na mea. Ọ ga-abụ nnọọ na e nyere ha onyinye ndị ahụ dị oké ọnụ n’oge kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na n’oge na-adịghị anya, a manyere ezinụlọ Jizọs, nke o doro anya na ọ dara ogbenye, ịgba ọsọ ndụ.—Matiu 2:11-15.

^ par. 21 Ọ bụ ezie na a tụrụ ime Jizọs n’ụzọ ọrụ ebube, ọ bụ Josef, di Meri, tụwara Meri ime ụmụ ya ndị ọzọ.—Matiu 1:25.

^ par. 22 Ozizi a Jerom ziri n’ihe dị ka afọ 383 O.A. (Oge Anyị) na-ewu ewu n’etiti ndị kweere na Meri amaghị nwoke ná ndụ ya niile. Jerom mechara nyowe ozizi a o ziri enyowe, ma, ọ dịgidere n’obi ọtụtụ ndị nakwa n’ozizi Chọọchị Katọlik.

^ par. 26 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ozizi Atọ n’Ime Otu, gụọ broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

Eziokwu Ndị Ọzọ Ndị Nwere Ike Iju Gị Anya

Olee ụdị onye Jizọs bụ? Ọ̀ bụ nnọọ onye na-ata ndụ ya ahụhụ, onye na-enweghị ọmịiko na onye onwe ya juru afọ, nke na ya na ndị nkịtị na-anaghị emekọtali ihe? Ụfọdụ nwere ike ịza ee. O nwere ike ịbụ ihe mere o ji eju ha anya ịmata na Jizọs . . .

• jere nnọkọ oriri na ọṅụṅụ na-eme obi ụtọ.—Jọn 2:1-11.

• jara ndị mmadụ mma.—Mak 14:6-9.

• na ụmụaka nọrọ.—Mak 10:13, 14.

• bere ákwá n’ihu ọha.—Jọn 11:35.

• nwere ọmịiko.—Mak 1:40, 41.