Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọ Nzukọ ndị Juu—Ebe Jizọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Kwusara Ozi Ọma

Ụlọ Nzukọ ndị Juu—Ebe Jizọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Kwusara Ozi Ọma

Ụlọ Nzukọ ndị Juu—Ebe Jizọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Kwusara Ozi Ọma

“O wee gazuo Galili dum, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ.”—MATIU 4:23.

E KWURU ugboro ugboro n’Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn, na Jizọs gara n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ma, Jizọs ọ̀ nọ na Nazaret, bụ́ obodo ọ nọ too, ma ọ bụ na Kapaniọm, bụ́ obodo o ji mere ebe obibi, ma ọ bụkwanụ n’otu n’ime obodo ukwu na obodo nta ndị ọ gara n’afọ atọ na ọkara ahụ o jere ozi ya, ọ na-agakarị n’ụlọ nzukọ ikwusa na ịkụzi banyere Alaeze Chineke. N’ezie, Jizọs kwuru banyere ozi o jere, sị: “M kụziri ihe mgbe niile n’ụlọ nzukọ nakwa n’ụlọ nsọ, bụ́ ebe ndị Juu niile na-ezukọta.”—Jọn 18:20.

N’otu aka ahụ, ndịozi Jizọs na Ndị Kraịst oge gboo ndị ọzọ na-akụzikarị ihe n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ma, olee otú ndị Juu si malite ife ofufe n’ụlọ nzukọ? Oleekwa otú ụlọ ndị ahụ ha na-anọ efe ofufe na-adị n’oge Jizọs? Ka anyị lebakwuo ya anya.

Ebe Dị Ndị Juu Mkpa Ndị ikom niile bụ́ ndị Juu na-aga Jeruselem ugboro atọ n’afọ maka ememme ndị a na-eme n’ụlọ nsọ dị n’ebe ahụ. Ma, ha na-aga efe ofufe kwa ụbọchị n’ụlọ nzukọ dị n’ebe ha bi, ma hà bi na Palestaịn ma ọ bụ n’otu n’ime ọtụtụ ógbè ndị Juu e nwere ná mba ndị ọzọ.

Olee mgbe a malitere ife ofufe n’ụlọ nzukọ ndị Juu? Ụfọdụ kweere na ọ ga-abụ n’oge ahụ a dọọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn (607-537 T.O.A. [Tupu Oge Anyị]), bụ́ mgbe ụlọ nsọ Jehova ghọrọ mkpọmkpọ ebe. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ n’oge na-adịghị anya ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, bụ́ mgbe Ezra onye nchụàjà gbara ndị ala ya ume ka ha mụtakwuo Iwu Chineke ma ghọtakwuo ya.—Ezra 7:10; 8:1-8; 10:3.

Okwu e si na ya nweta okwu bụ́ “ụlọ nzukọ” pụtara “mgbakọ” ma ọ bụ “ọgbakọ.” Ọ bụ mgbakọ ma ọ bụ ọgbakọ ka a kpọrọ ya na Septuagint, bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru a sụgharịrị n’asụsụ Grik. Ma ka oge na-aga, okwu ahụ ghọziri aha a na-akpọ ụlọ ebe ndị mmadụ na-ezukọ maka ofufe. Ka ọ na-erule na narị afọ mbụ O.A. (Oge Anyị), ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na obodo nta niile Jizọs gara nwere ụlọ nzukọ nke ya; obodo ukwu nwere ọtụtụ ụlọ nzukọ; Jeruselem nwekwara ọtụtụ. Olee otú ụlọ ndị ahụ dị?

Ụlọ Ofufe A Na-achọghị Oké Mma Mgbe ndị Juu na-achọ iwu ụlọ nzukọ, ha na-achọtakarị ebe dị elu ma wuo ya ka ọnụ ụzọ ya (1) chee ihu na Jeruselem. Ma, ọ bụghị iwu na a ga-ewurịrị ya otú ahụ, n’ihi na ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-ekwe omume.

A naghị achọ ụlọ nzukọ ndị ahụ oké mma, ọ bụkwa arịa ole na ole ka a na-etinye n’ime ya. Ma, ihe kacha mkpa na-adị na ya bụ igbe (2) ma ọ bụ ebe a na-edebe ihe kacha oké ọnụ ahịa obodo nke ọ bụla nwere, bụ́ akwụkwọ mpịakọta nke Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ha na-enwe nzukọ, a na-ebupụta igbe ahụ ma bughachi ya n’ime ụlọ ebe a na-enweghị ihe ga-eme ya ma ha gbasaa (3).

N’akụkụ igbe ahụ, a na-enwe oche ihu ndị na-eche ndị bịara nzukọ ihu (4) bụ́ ebe ndị isi oche ụlọ nzukọ na ndị oké ozu na-anọ. (Matiu 23:5, 6) N’ebe etiti ụlọ nzukọ ahụ, a na-enwe ebe ikpo okwu a kpụliri akpụli, bụ́ ebe a na-edebe tebụl ọkà okwu na oche o ji anọ ọdụ (5). A na-edebe bench ebe ndị bịaranụ ga-anọ ọdụ n’akụkụ atọ nke ụlọ nzukọ ahụ ma chee ha ihu n’ebe ikpo okwu (6).

Ọ na-abụkarị ọgbakọ nke na-ezukọ n’ụlọ nzukọ na-elekọta ya. A na-eji onyinye mmadụ niile na-esi n’obi ha enye, ma nke ndị ọgaranya ma nke ndị ogbenye, arụzi ụlọ ahụ. Ma, olee otú nzukọ ndị a na-enwe na ya na-adị?

Ofufe n’Ụlọ Nzukọ Ndị Juu Ihe ndị so n’ofufe a na-efe n’ụlọ nzukọ ndị Juu bụ inye otuto, ikpe ekpere, ịgụ Akwụkwọ Nsọ nakwa izi ihe na ikwusa ozi ọma. Ihe ọgbakọ ahụ na-eji amalite bụ ịgụpụta Shema, bụ́ nkwupụta okwukwe ndị Juu. Aha ya sitere n’okwu mbụ dị n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ ha na-agụghachi, nke bụ́: “Nụrụ [Shema], Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.”—Diuterọnọmi 6:4.

Ihe ọzọ a na-eme bụ ịgụ na ịkọwa Tora, bụ́ akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl, bụ́ ndị Mozis dere. (Ọrụ 15:21) A na-agụkwa ihe ọgụgụ ọzọ, bụ́ nke na-esi n’akwụkwọ ndị amụma (haftara), kọwaa ya ma kwuo ihe a mụtara na ya. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ndị ọkà okwu si esi bịa na-eme nke a, dị ka Jizọs mere n’otu oge, bụ́ nke e dere na Luk 4:16-21.

N’ezie, akwụkwọ mpịakọta ahụ e nyere Jizọs ná nzukọ ahụ enweghị isiakwụkwọ na amaokwu otú Baịbụl ndị anyị nwere n’oge a nwere. N’ihi ya, anyị nwere ike iji anya nke uche anyị hụ ka Jizọs ji aka ekpe ya na-afụghe akwụkwọ mpịakọta ahụ ma jiri aka nri ya na-afụchi ya ruo mgbe ọ chọtara ebe ọ chọrọ ịgụ. Mgbe a gụchara ya, a na-afụchi akwụkwọ mpịakọta ahụ ruo n’isi.

Mgbe mgbe, a na-agụ ihe ọgụgụ ndị ahụ n’asụsụ Hibru mbụ ma sụgharịa ha n’Arameik. N’ọgbakọ ndị na-asụ Grik, a na-eji Septuagint agụ ha.

Ebe Na-adị Ndị Juu Ezigbo Mkpa Ụlọ nzukọ na-adị ndị Juu ezigbo mkpa nke na ha na-eji ya na ụlọ ndị a gbakwunyere na ya ma ọ bụ ndị ha na ya nọ n’otu ogige eme ọtụtụ ihe kwa ụbọchị. Mgbe ụfọdụ, a na-anọ ebe ahụ ekpe ikpe, na-enwekwa nzukọ obodo, ọbụna na-enwe mgbakọ ma nọrọ n’ọnụ ụlọ iri nri ndị a gbakwunyere na ya na-enye ndị bịara mgbakọ nri. Mgbe ụfọdụ, a na-enye ndị njem ụlọ n’ọnụ ụlọ ndị dị n’ogige ụlọ nzukọ ndị ahụ.

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụlọ nzukọ nke obodo ọ bụla na-enwe ụlọ akwụkwọ, ya na ya na-adịkarịkwa n’otu ụlọ. Anyị nwere ike iji anya nke uche anyị hụ ebe obere ụmụ akwụkwọ juru otu ụlọ ma na-amụ ịgụ mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo onye nkụzi ha dere n’obere bọọdụ e ji mgbá aṅụ machie. Ụlọ akwụkwọ ndị ahụ so n’ihe ndị kacha mee ka ndị Juu oge ochie mara otú e si agụ ihe, ndị nkịtị amaradị otú e si agụ Akwụkwọ Nsọ.

Ma, isi ihe mere e ji nwee ụlọ nzukọ ndị ahụ bụ ịnọ na ha efe ofufe mgbe niile. Ọ bụ ya mere na ọ bụghị ihe ijuanya na nzukọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ yiri nnọọ nzukọ ndị Juu na-enwe n’ụlọ nzukọ ha. Isi ihe mekwara Ndị Kraịst ji enwe nzukọ ha bụ iji ekpere, abụ otuto, na ịgụ na ịtụle Okwu Chineke fee Jehova ofufe. Ọ bụghị naanị n’ebe ndị a ka ha yiri. Ma n’ụlọ nzukọ ndị Juu ma n’ebe Ndị Kraịst na-anọ efe ofufe, a na-eji onyinye si ndị mmadụ n’obi egbo mkpa ndị e nwere; na nke ọ bụla n’ime ha, e nweghị ndị ụkọchukwu bụ́ ndị a na-ahapụrụ ịgụ na ịtụle Okwu Chineke; na nke ọ bụla n’ime ha, ọ bụ ndị okenye a họpụtara ahọpụta na-ahazi ma na-eduzi nzukọ ndị ahụ.

Ndịàmà Jehova na-agbalị iso ihe nlereanya Jizọs na nke ndị na-eso ụzọ ya na narị afọ mbụ. N’ihi ya, ihe ụfọdụ a na-eme ná nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na ihe a na-eme n’ụlọ nzukọ ndị Juu oge ochie yiri. Nke ka nke bụ na Ndịàmà na-ezukọta ọnụ n’ihi otu ihe ahụ mere ndị hụrụ eziokwu n’anya kemgbe ụwa ji ezukọ, ya bụ, iji ‘bịaruo Chineke nso.’—Jems 4:8.

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

E ji ụkpụrụ Ụlọ Nzukọ Obodo Gamla nke e nwere na narị afọ mbụ wugharịa ụlọ nzukọ a

[Foto dị na peeji nke 18]

Ụlọ akwụkwọ ndị dị n’ụlọ nzukọ ndị Juu na-akụziri ụmụaka ndị nwoke ndị nọ n’agbata afọ isii na afọ iri na atọ ihe