Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Alaeze Gị Ga-eguzosi Ike”

“Alaeze Gị Ga-eguzosi Ike”

Bịaruo Chineke Nso

“Alaeze Gị Ga-eguzosi Ike”

2 SAMUEL 7:1-16

KEMGBE ụwa, a chụpụla ọtụtụ ndị ọchịchị bụ́ mmadụ n’ọchịchị. Ụfọdụ dara ná ntụliaka, ebe a chụpụrụ ndị ọzọ n’ike. Olee maka Jizọs Kraịst, bụ́ Eze Alaeze eluigwe nke Chineke? Ọ̀ dị ihe nwere ike igbochi ya ịchị dị ka Eze Chineke họpụtara? Anyị nwere ike inweta azịza ya n’okwu Jehova gwara Eze Devid nke Izrel oge ochie, bụ́ nke e dere na 2 Samuel isi 7.

N’amaokwu ndị malitere ya, anyị mụtara na ihere nọ na-eme Devid na igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị n’ụlọikwuu na-amaghị mma, ebe yanwa bụ́ eze nkịtị bi n’obí mara mma. * Devid kwuru na ya chọrọ iwuru Jehova ụlọ ma ọ bụ ụlọ nsọ kwesịrị ekwesị. (Amaokwu 2) Ma, ọ bụghị Devid ga-ewu ụlọ ahụ. Jehova si n’ọnụ Netan onye amụma gwa Devid na ọ bụ nwa ya ga-ewu ụlọ nsọ ahụ.—Amaokwu 4, 5, 12, 13.

Otú ahụ Devid ji si n’ala ala obi ya chọọ iwuru Jehova ụlọ masịrị nnọọ Jehova. N’ihi ihe ndị e buru n’amụma na otú Devid si hụ Chineke n’anya, Chineke kwuru n’ọgbụgba ndụ Ya na Devid gbara na Ya ga-eme ka otu onye si n’ezinụlọ Devid bụrụ onye ọchịchị ruo mgbe ebighị ebi. Netan gwara Devid nkwa Chineke kwere ya, sị: “Ụlọ gị na alaeze gị ga-eguzosi ike n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi; a ga-emekwa ka ocheeze gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Amaokwu 16) Ònye ka ọgbụgba ndụ a kwuru ga-anọgide n’ocheeze ahụ, bụ́ Onye ga-achị ruo mgbe ebighị ebi?—Abụ Ọma 89:20, 29, 34-36.

Jizọs onye Nazaret bụ nwa Devid. Mgbe mmụọ ozi na-ama ọkwa ọmụmụ Jizọs, o kwuru, sị: “Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.” (Luk 1:32, 33) N’ihi ya, ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na Devid gbara mezuru n’isi Jizọs Kraịst. Ya mere, ọ bụghị mmadụ họpụtara ya ịchị, kama ọ bụ nkwa Chineke kwere nyere ya ikike ịchị ruo mgbe ebighị ebi. Ka anyị cheta na Chineke na-emezu nkwa ya mgbe niile.—Aịzaya 55:10, 11.

E nwere ihe abụọ bara uru anyị ga-amụta na 2 Samuel isi 7. Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị inwe obi ike na ọ dịghị ihe ma ọ bụ mmadụ nwere ike igbochi Jizọs Kraịst ịchị. N’ihi ya, anyị ji n’aka na ọ ga-emezu ihe o kwuru ọchịchị ya ga-eme, nke bụ́ imezu uche Chineke n’ụwa dị ka ọ dị n’eluigwe.—Matiu 6:9, 10.

Ihe nke abụọ bụ na akụkọ a na-akụziri anyị ihe na-enye obi ụtọ banyere Jehova. Cheta na Jehova hụrụ ihe Devid bu n’obi, ya amasịkwa ya. Ịmara na ịhụnanya anyị nwere n’ofufe Jehova na-amasị Ya na-eme ka obi sie anyị ike. Mgbe ụfọdụ, ọnọdụ ndị karịrị anyị, dị ka ọrịa ma ọ bụ nká, nwere ike igbochi anyị ime ihe niile na-agụ obi anyị agụụ ime n’ozi Chineke. Ya bụrụ otú ahụ, ka eziokwu bụ́ na Jehova na-ahụdị ihe dị n’obi onye hụrụ ofufe ya n’anya, kasie anyị obi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Igbe ọgbụgba ndụ ahụ bụ igbe dị nsọ Jehova nyere ntụziaka ka a rụọ otú ọ chọrọ. Ọ nọchiri anya ọnụnọ Jehova n’Izrel oge ochie.—Ọpụpụ 25:22.