Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Kwesịrị Isi Soo Kraịst

Otú E Kwesịrị Isi Soo Kraịst

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Otú E Kwesịrị Isi Soo Kraịst

Mgbe ndị mmadụ malitere inwe okwukwe na Jizọs, ọ na-agwakarị ha, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” (Matiu 9:9; 19:21) Olee ihe dị n’ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ya bụ, ịbụ Onye Kraịst? Ka anyị tụlee azịza nke ajụjụ atọ dị ezigbo mkpa.

Olee otú i kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ?

▪ Onye na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị iso ntụziaka e nyere maka otú a ga na-esi emeso ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” Oleekwanụ ma ọ bụrụ na mmadụ mejọrọ gị? Jizọs kwuru, sị: “Mee ka gị na onye gbara gị akwụkwọ dozie okwu ọsọ ọsọ.” Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.”—Matiu 5:25; 6:15; 7:12.

Jizọs nyere ndị di na nwunye ndụmọdụ a: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’ Ma ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” Ezi Onye Kraịst na-ekwe ka ozizi Jizọs metụta ma uche ma obi ya.—Matiu 5:27, 28.

Ezi Ndị Kraịst na-ahapụ ihe ụfọdụ na-amasị ha iji nyere ndị ọzọ aka. Jizọs wepụtara onwe ya inyere ndị ọzọ aka. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-eme otu njem na-agwụ ike ịga kwusaa ozi ọma, ha enwedịghị ohere iri nri. N’ihi ya, Jizọs kpọ ha banye ụgbọ mmiri gaa n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị ka ha zuru ike. Ma, ndị mmadụ nụrụ ebe ha na-aga ma buru ha ụzọ gbaruo ebe ahụ. Akụkọ ahụ dị na Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ha pụtara, ọ hụrụ oké ìgwè mmadụ, ma o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:30-34) I nwere ike iṅomi Jizọs site n’ime ihe Chineke chọrọ gị n’aka, n’agbanyeghị na o nwere ike isiri gị ike.

Olee ihe mere i kwesịrị iji na-ekwusa ozi ọma?

▪ Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’” (Matiu 10:7) Ozi ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ezi dị ezigbo mkpa. Jizọs kpere ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke.”—Jọn 17:3.

Jizọs buru amụma banyere ọrụ nke ọtụtụ nde ndị na-eso ụzọ ya ga-arụ. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” (Matiu 24:14) Ọ bụrụ na ị mụtala banyere Alaeze Chineke ma kwere n’ihe Baịbụl na-ekwu, o doro anya na ọ ga-amasị gị ịkọrọ ndị ọzọ ihe ị mụtara. Ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-amalite ime nke a site n’ịkọrọ ndị ikwu ha banyere Alaeze Chineke.—Jọn 1:40, 41.

Olee ihe mere e kwesịrị iji mee gị baptizim?

▪ Mgbe e mere Jizọs baptizim n’osimiri Jọdan, o doro anya na o kpere ekpere, sị: “Abịawo m ime uche gị, Chineke.” (Ndị Hibru 10:7) Ọ bụrụ na ị chọrọ ime uche Chineke, i kwesịkwara ikwe ka e mee gị baptizim. Jizọs nyere iwu, sị: “Mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim.”—Matiu 28:19.

Olee ọrụ na uru dị ná mmadụ ịbụ onye e mere baptizim? Ndị na-eso ụzọ Jizọs e mere baptizim na-eji mkpụrụ obi ha dum ejere Chineke ozi. Jizọs kwuru ihe e dere n’Iwu Chineke, nke bụ́: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) O kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya.” (Matiu 16:24) Baptizim na-egosi na mmadụ ekpebiela ịjụ onwe ya ma nyefee Chineke onwe ya. Ndị ha na Chineke nwere mmekọrịta a pụrụ iche nwere ike ịrịọ Chineke ka o nye ha akọ na uche dị ọcha.—1 Pita 3:21.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isi 18 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.