Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Kwusara “Ozi Ọma” n’Agwaetiti Ndị Dị n’Ime Ime Ebe Ugwu Ọstrelia

E Kwusara “Ozi Ọma” n’Agwaetiti Ndị Dị n’Ime Ime Ebe Ugwu Ọstrelia

E Kwusara “Ozi Ọma” n’Agwaetiti Ndị Dị n’Ime Ime Ebe Ugwu Ọstrelia

JIZỌS kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14) Ndịàmà Jehova na-erube isi n’iwu ahụ Jizọs nyere ma na-agbalị izi ndị mmadụ ozi Baịbụl, n’agbanyeghị ebe ha bi. (Matiu 28:19, 20) A naghị akwụ ha ụgwọ n’ọrụ a, n’agbanyeghị ihe isi ike ndị na-adị na ya na ego ọ na-efu ha mgbe ụfọdụ.

Dị ka ihe atụ, Netan na Kali hazigharịrị ndụ ha ka ha nwee ike ikwusara ndị bi n’Agwaetiti Toris Stret dịpụrụ adịpụ ozi ọma. N’afọ 2003, otu onye nnọchianya nke alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Ọstrelia gwara ha ka ha kwaga n’Agwaetiti Tọzdee iji nyere ọgbakọ dị n’ebe ahụ aka. Agwaetiti ahụ bụ naanị otu n’ime ọtụtụ agwaetiti nwere ọtụtụ ahịhịa ndụ mara mma dị n’Oké Osimiri Pasifik, n’agbata Ọstrelia na Niu Gini.

N’afọ 2007, ezinụlọ ahụ zụrụ ụgbọ mmiri ochie e ji osisi rụọ, nke a kpọrọ Teisan-Y, bụ́ nke e jibu achọ nkume pel n’oké osimiri. Ha ji ego ha rụzigharịa ụgbọ ahụ ma malite iji ya aga ekwusara ndị bi n’agwaetiti iri n’ime agwaetiti ndị kacha anya ozi ọma, biri ebiri n’Agwaetiti Tọzdee. Ka anyị kọọ ihe ndị mere n’ụfọdụ njem ndị ha mere.

Jenụwarị 2008: Taa, m ji obere ụgbọ mmiri gbaa iri kilomita asatọ, uje na ụla, gaa Bamaga iburu Ndịàmà isii bụ́ ndị obodo ahụ. Anyị nọzi na Teisan-Y, na-aga n’agwaetiti Waraba na Pọruma. A gbajuru tankị ụgbọ mmiri a agbaju—puku lita mmanụ ise na narị ise, nke a zụrụ otu lita ya ihe dị ka narị naịra atọ. Ụgbọ a anatụghị agbasi ike, ọ na-agba naanị ihe dị ka kilomita iri kwa awa. Ma, ihu ígwé magburu onwe ya—oké osimiri dara jụụ.

Mgbe anyị ruru, anyị kwụsịrị n’ikpere mmiri, jiri obere ụgbọ mmiri buru ụfọdụ n’ime ndị anyị na ha so bụ́ ndị nwere ndị ikwu na Waraba ma gakwuru onyeisi agwaetiti ahụ iji nata ya ike ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ. Onyeisi ahụ bụ pastọ na chọọchị dị n’ebe ahụ, ma, o kwere ka anyị zie ndị bi ebe ahụ ozi ọma. Anyị mekwara otu ihe ahụ na Pọruma, e kwekwara ka anyị zie ozi ọma n’ebe ahụ. Ndị obodo ahụ dị nnọọ obiọma ma nwee mmasị ịgụ akwụkwọ anyị. Anyị malitere ịmụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl.

EpreI 2008: Anyị gawara Dwọn, Saịbaị, na Bọịgu—agwaetiti atọ ndị kacha anya—bụ́ ndị dị nso na Papiuwa Niu Gini (PNG). Ihu igwe jọrọ oké njọ, anyị echezie ihu n’Agwaetiti Mabiọg. Mabiọg dị naanị kilomita iri asaa site n’ọdụ ụgbọ mmiri nke ebe anyị bi ebi, ma, iji zere ọtụtụ okwute na ikpo ájá ndị dị n’okpuru mmiri, anyị ga-agba ihe ruru otu narị kilomita na iri anọ.

Oké ebili mmiri dọkapụrụ obere ụgbọ mmiri anyị kegidere na Teisan-Y. N’agbanyeghị oké ebili mmiri ahụ, anyị nyagharịrị ụgbọ mmiri anyị ịga chọta obere ụgbọ mmiri ahụ. Njem ụgbọ mmiri ahụ emeela ka ahụ́ kpaghasịa ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ụgbọ a.

Na Mabiọg, anyị natara ike ikwusa ozi ọma n’agwaetiti a, ndị obodo ahụ nabatara anyị nke ọma nke na n’oge na-adịghị anya, anyị chefuru nsogbu anyị nwere. Obi tọrọ nnọọ otu nwaanyị ụtọ ịnụ ozi anyị nke na ọ natakwuru anyị akwụkwọ ndị ọ ga-edowe n’ọ́bá akwụkwọ obodo ahụ, bụ́ ebe ọ na-arụ ọrụ.

Site na Mee Ruo Ọktoba 2008: N’ihi ihu ígwé, anyị erulighị n’agwaetiti ndị ahụ. Anyị ji ohere ahụ kwusaara ndị bi anyị nso ozi ọma, rụọ ọrụ, ma rụzie ụgbọ mmiri anyị.

Ebe ọ bụ na ihe a ga-arụzi n’ụgbọ mmiri ahụ buru ibu, anyị gara n’ọdụ ụgbọ mmiri Wepa ma jiri nnukwu ụgbọala bupụta ụgbọ mmiri anyị n’elu ala. Ọ dị mfe n’ọnụ, ma ọrụ dị na ya adịghị mfe! Ndịàmà si n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ wepụtara oge ha rụtụrụ anyị ọrụ ndị dị ka idozi paịpụ mmiri, ite ágbá, na ọrụ ịkwa nkà. Ndị ọzọ buteere anyị nri. Ndị ọzọ wetakwaara anyị ihe ụfọdụ anyị ga-eji mee njem ọzọ ikwusa ozi ọma. Ọbịa ha lere anyị na aka ha nyeere anyị baara anyị ezigbo uru.

Disemba 2008: Anyị chekwara ihu ọzọ ịga Dwọn, Saịbaị, na Bọịgu. Anyị ji ígwè e ji amata ihe ndị dị n’ihu zere oké ifufe a na-enwe n’ebe ahụ, jirikwa ígwè e ji amata ụzọ zere okwute na ikpo ájá ndị dị n’ụzọ. Ọ na-ewe awa iri na abụọ iji ụgbọ mmiri ruo Dwọn, ma, ọ bụ agwaetiti kacha mma anyị hụtụrụla. Urukpuru kpuchiri ugwu ndị dị elu bụ́ okwute okwute e nwere ebe ahụ. Ndị bi na Dwọn gere anyị ezigbo ntị, anyị mekwara ndokwa ka anyị na ha jiri fon na-ekwurịta banyere Baịbụl mgbe anyị lara.

Otu nwaanyị bi n’ebe ahụ aha ya bụ Leti nwere otú o si nweta magazin anyị ma dejupụta akwụkwọ ka e zitekwuoro ya akwụkwọ. Alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia zigaara ya akwụkwọ ndị ahụ ma detara ọgbakọ anyị akwụkwọ ozi ka anyị kpọtụrụ ya ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe anyị omume. Anyị mechara chọta Leti, obi tọkwara anyị ụtọ igbotụ mkpa ime mmụọ ya.

N’agwaetiti Saịbaị, onyeisi obodo ahụ ekweghị anyị kwusaara ndị bi n’ebe ahụ ozi ọma. Ma, o kwere ka ndị anyị na ha so bụ́ ndị nwere ndị ikwu n’agwaetiti ahụ gaa leta ha ma zie ha ozi ọma. Gọọmenti nyere m ọrụ ite ụlọ ndị dị na Saịbaị ágbá, o nyekwaara anyị aka ịkwụ ụgwọ ihe ụfọdụ anyị mefuru.

Otu nwanna anyị nwaanyị aha ya bụ Tasi si n’otu obodo dị na PNG, nke dị naanị kilomita anọ site na Saịbaị. N’ihi nkwekọrịta gọọmenti Ọstrelia na PNG nwere, ndị bi na PNG nwere ike ịga Saịbaị zụọ ahịa. Tasi hụrụ ọtụtụ ndị obodo ya, ma o nweghị akwụkwọ ga-ezu ha niile. Ihe a bụ nke mbụ Tasi na-ahụ ndị obodo ya kemgbe ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova. Anyị gaghachiri n’ụgbọ mmiri ahụ ma butere ya katọn akwụkwọ, nke e dere ihe ka ọtụtụ n’ime ha n’asụsụ PNG, bụ́ Tọk Pisin Pijin. Tasi ji Baịbụl zie ìgwè mmadụ karịrị iri atọ si PNG ozi ọma, ndị nwere mmasị wekwaara akwụkwọ niile dị na katọn ahụ. Ọ bụ naanị ụgbọ mmiri ka e ji aga obodo ha, o nwekwara ike ịbụ na Ndịàmà Jehova agatụbeghị na ya.

Ọ dịghị mfe ịgaru n’agwaetiti ikpeazụ bụ́ Bọịgu. Ebe anyị nọ dị kilomita anọ site n’ikpere mmiri, mmiri ahụ dịkwa naanị mita abụọ na ọkara n’omimi. Ala ụgbọ mmiri anyị ruru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mita abụọ n’ime mmiri. Mụ na otu n’ime ndị so anyị ji obere ụgbọ mmiri anyị gbagharịa n’ebe ahụ iji chọta ụzọ anyị ga-esi banye n’agwaetiti ahụ. Mmiri nọ na-ezosi ike, ọ makasịkwara anyị ahụ́! O were anyị awa abụọ ịchọta ụzọ.

Mgbe anyị ruru, o juru ndị bi n’agwaetiti ahụ anya, ha agwa anyị na chaatị ahụ anyị ji ezighị ezi nakwa na ndị nche oké osimiri na ndị agha mmiri anadịghị abata ebe ahụ. Onyeisi agwaetiti ahụ ekweghị anyị kwusaa ozi ọma n’ebe ahụ, ma o kwere ka ndị anyị na ha so nwere ndị ikwu n’agwaetiti ahụ gaa leta ha ma zie ha ozi ọma. Anyị mere ihe onyeisi ahụ kwuru ma gaa naanị na nke ndị ezinụlọ anyị. Otu nwoke nke nwetara akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? * gụrụ ya ozugbo ma malite ide ajụjụ ndị ọ ga-ajụ n’azụ Baịbụl ya. E mechara kpọtụrụ nwoke a ọzọ mgbe ọ bịara n’Agwaetiti Tọzdee.

Jenụwarị 2009: Anyị gaghachiri n’agwaetiti Moa na Mabiọg ka anyị na ndị nwere mmasị n’ozi Baịbụl kwurịta okwu ọzọ. Ndị bi n’agwaetiti abụọ ahụ nabatara anyị nke ọma. Ọtụtụ ndị bi n’obodo nta bụ́ Sent Pọl nke dị n’Agwaetiti Moa gwara anyị ka anyị ghara ịnọ ogologo oge otú ahụ anyị nọrọ tupu anyị abịa ọzọ. Onyeisi obodo ahụ kwuru na anyị nwere ike ịbịa zie ozi ọma n’obodo ha mgbe ọ bụla anyị chọrọ.

E nwere agwaetiti iri na asaa ndị mmadụ bi na ha na Toris Stret. Anyị amaghị ma ànyị ga-ezili mmadụ niile bi na ha ozi ọma. Ma, anyị niile nọ n’ọgbakọ a dị n’agwaetiti ndị dị n’ime ime ebe ugwu Ọstrelia nwere obi ụtọ ime ihe anyị nwere ike ime iji wetara Onye Okike Ukwu anyị, bụ́ Jehova, otuto.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Map dị na peeji 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ỌSTRELIA

Wepa

Bamaga

AGWAETITI TORIS STRET

PAPIUWA NIU GINI

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ihe osise NASA/Visible Earth

[Map dị na peeji 24, 25]

Bamaga

Agwaetiti Tọzdee

Agwaetiti Moa

Agwaetiti Waraba

Agwaetiti Pọruma

Agwaetiti Mabiọg

Agwaetiti Saịbaị

Agwaetiti Dwọn

Agwaetiti Bọịgu

PAPIUWA NIU GINI

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ihe osise NASA/Visible Earth

[Foto dị na peeji nke 24]

Mgbe anyị rutere n’Agwaetiti Tọzdee

[Foto dị na peeji nke 24]

Mgbe anyị ji ụkwụ na-aga na nke ndị mmadụ n’Agwaetiti Saịbaị

[Foto dị na peeji nke 25]

Ebe a na-ekwusa ozi ọma n’asụsụ Tọk Pisin