Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe “Obi Tiwara Etiwa, nke Nọ ná Mwute” Na-arịọ Mgbaghara

Mgbe “Obi Tiwara Etiwa, nke Nọ ná Mwute” Na-arịọ Mgbaghara

Bịaruo Chineke Nso

Mgbe “Obi Tiwara Etiwa, nke Nọ ná Mwute” Na-arịọ Mgbaghara

2 SAMUEL 12:1-14

ANYỊ niile na-eme mmehie ọtụtụ ụgboro. N’agbanyeghị otú o nwere ike isi na-ewute anyị, anyị nwere ike ịnọ na-eche, sị: ‘Chineke ọ̀ na-anụ ekpere nchegharị ndị m ji obi m dum na-ekpe? Ọ̀ ga-agbaghara m?’ Baịbụl na-akụzi eziokwu a na-akasi obi: Ọ bụ ezie na Jehova anatụghị akwado mmehie, ọ dị njikere ịgbaghara onye mmehie chegharịrị echegharị. Ihe mere Eze Devid nke Izrel oge ochie mere ka nke a doo anya, dị ka e dere na 2 Samuel isi 12.

Chegodị echiche otú ihe ahụ si mee. Devid mere mmehie dị oké njọ. Ya na Bat-shiba kwara iko, ma mgbe mbọ niile ọ gbara ikpuchi mmehie ahụ kụrụ afọ n’ala, o mere ndokwa ka e gbuo di ya. Devid kpuchiziri mmehie ya, mee ka à ga-asị na aka ya dị ọcha ruo ọtụtụ ọnwa. Ma, Jehova nọ na-ele ihe na-emenụ. Ọ hụrụ mmehie Devid. Ma, ọ hụkwara obi Devid, chọpụta na ọ ka nwere ike ichegharị. (Ilu 17:3) Gịnị ka Jehova ga-eme?

Jehova dunyere Netan onye amụma ka ọ gakwuru Devid. (Amaokwu nke 1) Mmụọ nsọ duziri Netan, ya ejiri akọ gakwuru eze, ebe ọ maara na ọ ghaghị ịkpachara anya n’ihe ọ ga-ekwu. Olee otú ọ ga-esi mee ka Devid kwụsị ịghọ onwe ya aghụghọ ma mee ka ọ ghọta otú mmehie ya jọruru njọ?

Netan mere ka Devid ghara ịzọwa onwe ya site n’ịkọrọ ya akụkọ ga-eru ya n’obi n’ihi na ọ maara na Devid bụbu onye ọzụzụ atụrụ. Ọ bụ banyere ndị ikom abụọ, otu bụ ọgaranya, otu abụrụ ogbenye. Ọgaranya ahụ nwere “ọtụtụ atụrụ na ehi,” ma ogbenye ahụ nwere “naanị otu nne atụrụ.” Ọgaranya ahụ nwere onye ọbịa ma chọọ isiri ya nri. Kama iwere otu n’ime atụrụ ya, o weere otu atụrụ ahụ ogbenye ahụ nwere. Ebe o doro anya na Devid chere na akụkọ ahụ mere eme, o were iwe ọkụ ma kwuo n’ike, sị: “Nwoke nke mere ihe a kwesịrị ịnwụ!” N’ihi gịnị? Devid kwuru, sị: “N’ihi na o nweghị ọmịiko.” *Amaokwu 2-6.

Ihe atụ ahụ Netan mere emezuola ihe o bu n’obi mee ya. E nwere ike ikwu na Devid ji aka ya maa onwe ya ikpe. Netan gwaziri ya hoo haa, sị: “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ!” (Amaokwu 7) Ebe ọ bụ na Netan na-ekwu ihe Chineke gwara ya kwuo, o doro anya na Jehova weere ya na ọ bụ yanwa ka Devid mejọrọ. Iwu Chineke ndị ahụ Devid mebiri gosiri na ọ kwanyereghị Onye Na-enye Iwu ùgwù. Chineke kwuru, sị: “I ledara m anya.” (Amaokwu 10) Mba a na-adụ adụ ruru Devid n’obi, ya ekwupụta mmehie ya, sị: “Emehiewo m Jehova.” Netan mesiri Devid obi ike na Jehova agbagharala ya, ma Devid ga-ata ahụhụ mmehie ya.—Amaokwu 13, 14.

Mgbe a gbachara mmehie Devid n’anwụ, o dere ihe dịzi n’Abụ Ọma nke 51. N’ebe ahụ, Devid kwuru ihe niile dị ya n’obi, gosi otú nchegharị ya ruru. Mmehie ahụ Devid mere bụ ileda Jehova anya. Ma, ozugbo eze a chegharịrị echegharị ghọtara na Chineke agbagharala ya mmehie ya, ọnụ siri ya ike ịgwa Jehova, sị: “Chineke, ị gaghị eleghara obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute, anya.” (Abụ Ọma 51:17) O siri ike ịhụ okwu ga-eme ka obi ruo onye mmehie chegharịrị echegharị nke na-achọ ebere Jehova ala karịa okwu ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Mmadụ igburu onye ọbịa ya nwa atụrụ na-egosi na ọ bụ onye na-ele ọbịa. Ma, izu nwa atụrụ bụ ihe ọjọọ, onye ọ bụla mere ya ga-eji nwa atụrụ anọ kwụọ ụgwọ ya. (Ọpụpụ 22:1) N’anya Devid, nwa atụrụ ahụ ọgaranya ahụ weere gosiri na obi fere ya azụ. O si otú ahụ napụ ogbenye ahụ atụrụ ezinụlọ ya nwere ike isi na ya na-enweta mmiri ara atụrụ na ajị anụ na nke ga-amụtadịrị ha ìgwè atụrụ.