Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ikom, Ùnu Na-edo Onwe Unu n’Okpuru Kraịst?

Ndị Ikom, Ùnu Na-edo Onwe Unu n’Okpuru Kraịst?

Ndị Ikom, Ùnu Na-edo Onwe Unu n’Okpuru Kraịst?

“Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla.”—1 KOR. 11:3.

1. Gịnị na-egosi na Jehova abụghị Chineke aghara?

MKPUGHE isi anọ amaokwu iri na otu kwuru, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” Jehova Chineke bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa n’ihi na ọ bụ ya kere ihe niile, ọ kakwa ihe niile o kere. Otú Jehova si hazie ndị mmụọ ozi ya na-egosi na ọ ‘bụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.’—1 Kọr. 14:33; Aịza. 6:1-3; Hib. 12:22, 23.

2, 3. (a) Ònye bụ onye mbụ Jehova kere? (b) Olee ihe bụ́ ọkwá Ọkpara ahụ n’ebe Nna ya nọ?

2 Naanị Chineke nọrọ ọtụtụ afọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ tupu ya ekee ihe ọ bụla ọzọ. Ihe mbụ o kere bụ mmụọ nke a na-akpọ “Okwu ahụ” n’ihi na ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru ya. Chineke si n’aka Okwu ahụ kee ihe ọzọ niile. Okwu ahụ mechara bịa n’ụwa ghọọ mmadụ zuru okè, onye a kpọrọ Jizọs Kraịst.—Gụọ Jọn 1:1-3, 14.

3 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ọkwá Chineke na nke Ọkpara ya? Mmụọ nsọ kpaliri Pọl onyeozi ịgwa anyị, sị: “Ma achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Kọr. 11:3) Kraịst nọ n’okpuru Nna ya. E kwesịrị inwe onye nọ n’isi n’etiti ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi, nweekwa ndị ga-anọ n’okpuru, ka udo wee dị, ihe ana-agakwa n’usoro. Ọbụna onye “e si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile” kwesịrị ido onwe ya n’okpuru Chineke.—Kọl. 1:16.

4, 5. Olee otú Jizọs si lee ido onwe ya n’okpuru Jehova anya?

4 Olee otú Jizọs si lee ido onwe ya n’okpuru Jehova na ịbịa n’ụwa anya? Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Kraịst Jizọs . . . dịrị n’ụdị Chineke, ma o cheghị echiche ịnara ọkwá n’ike, ya bụ, ka ọ hara ka Chineke. Ee e, kama o mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi mmadụ. Mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ụdị mmadụ, o wedara onwe ya ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.”—Fil. 2:5-8.

5 Jizọs mere uche Nna ya mgbe niile. Ọ sịrị: “Apụghị m ime otu mkpụrụ ihe n’uche nke aka m; . . . ihe m na-ekpe n’ikpe zikwara ezi, n’ihi na ihe m na-achọ ime abụghị uche nke m, kama ọ bụ uche onye zitere m.” (Jọn 5:30) O kwukwara, sị: “M na-eme ihe dị [Nna m] mma mgbe niile.” (Jọn 8:29) Ka oge ọnwụ Jizọs na-eru nso, ọ gwara Nna ya n’ekpere, sị: “Emewo m ka ị dị ebube n’ụwa, ebe ọ bụ na arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ.” (Jọn 17:4) O doro anya na o sighịrị Jizọs ike ido onwe ya n’okpuru Chineke.

Ọkpara Chineke Ritere Uru n’Ihi na O Doro Onwe Ya n’Okpuru Nna Ya

6. Olee àgwà ọma ndị Jizọs nwere?

6 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na ya nwere ọtụtụ àgwà mara mma. Otu n’ime ha bụ na ọ hụrụ Nna ya n’anya nke ukwuu. Ọ sịrị: “M hụrụ Nna m n’anya.” (Jọn 14:31) O gosikwara na ya hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu. (Gụọ Matiu 22:35-40.) Jizọs nwere obiọma, ọ dịghị aka ike, ọ dịghịkwa mpako. O kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Mat. 11:28-30) Àgwà ọma Jizọs na ozi ọma na-akasi obi o ziri ndị mmadụ, mere ka obi ruo ndị niile yiri atụrụ ala, ma ndị ukwu ma ndị nta, karịchaa, ndị nke a na-emegbu emegbu.

7, 8. Olee ihe Iwu Mozis kwuru na nwaanyị ahụ na-arịa ọrịa oruru ọbara ekwesịghị ime, ma, olee otú Jizọs si meso ya omume?

7 Tụlee otú Jizọs si mesoo ndị inyom ihe. Kemgbe ụwa, ọtụtụ ụmụ nwoke na-emeso ụmụ nwaanyị mmeso ọjọọ. Otú a ka ndị ndú okpukpe mere n’Izrel oge ochie. Ma, Jizọs kwanyeere ụmụ nwaanyị ùgwù. Otú o si mesoo otu nwaanyị nke rịara ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ ihe gosiri na nke a bụ eziokwu. “Ọ tawo ahụhụ nke ukwu” n’aka ọtụtụ ndị ọgwọ ọrịa, o mefuokwala ego buru ibu ebe ọ na-achọ ka a gwọọ ya. N’agbanyeghị ihe a niile, ọnọdụ ya “kara njọ.” Dị ka Iwu Mozis kwuru, ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ya aka ga-aghọkwa onye na-adịghị ọcha.—Lev. 15:19, 25.

8 Mgbe nwaanyị ahụ nụrụ na Jizọs na-agwọ ndị ọrịa, o sooro ìgwè mmadụ gbara Jizọs gburugburu ma kwuo, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.” Ọ gbakekwara ozugbo o metụrụ Jizọs aka. Jizọs ma na nwaanyị ahụ ekwesịghị ibitụ uwe ya aka. N’agbanyeghị nke a, ọ baghịrị ya mba. Kama ịbara ya mba, o meteere ya ebere. Ọ ma otú ọ dị ya kemgbe afọ niile ahụ ọrịa ahụ na-arịa ya, ghọtakwa na ọ na-agụsi ya agụụ ike ka a gwọọ ya. Jizọs ji obi ọmịiko gwa ya, sị: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, gbakee n’ọrịa ọjọọ nke na-arịa gị.”—Mak 5:25-34.

9. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndị na-eso ụzọ ya gbalịrị igbochi ụmụaka chọrọ ịbịakwute ya?

9 Ahụ́ na-erudị ụmụaka ala ma ha na Jizọs nọrọ. E nwere mgbe ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kpọtaara ya ụmụaka mba, ikekwe n’ihi na ha chere na ọ gaghị achọ ka ụmụaka nye ya nsogbu. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka Jizọs si lee ya anya. Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Mgbe Jizọs hụrụ nke a, o were iwe wee sị [ndị na-eso ụzọ ya]: ‘Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m; unu anwala igbochi ha, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ.’ . . . O kukwaara ụmụaka ahụ wee malite ịgọzi ha, na-ebikwasị ha aka n’isi.” Ihe Jizọs ji nabata ụmụaka abụghị n’ihi na ọ maghị otú ọ ga-esi chụpụ ha; kama, o ji obi ya dum nabata ha.—Mak 10:13-16.

10. Olee otú Jizọs si mụta àgwà ndị ọ kpara?

10 Olee otú Jizọs si mụta àgwà ndị ọ kpara mgbe ọ bịara n’ụwa? Tupu ya abịa n’ụwa, ya na Nna ya nke eluigwe nọrọ ọtụtụ afọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ọ mụtakwara àgwà ya. (Gụọ Ilu 8:22, 23, 30.) Mgbe ọ nọ n’eluigwe, ọ hụrụ otú Jehova si jiri ịhụnanya na-achị ihe ndị o kere, ọ mụtakwara nke a. A sị na Jizọs edoghị onwe ya n’okpuru Nna ya, ọ̀ gaara amụta ihe ndị a? Ọ tọrọ ya ụtọ ido onwe ya n’okpuru Nna ya, obi dịkwa Jehova ụtọ inwe Ọkpara dị otú a. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ kpara nnọọ àgwà ọma ndị Nna ya nke eluigwe na-akpa. N’ezie, ọ bụ nnọọ ihe ùgwù ido onwe anyị n’okpuru Kraịst, bụ́ onye Chineke họpụtara ka ọ bụrụ Onye Ọchịchị nke Alaeze eluigwe.

Ṅomie Àgwà Kraịst

11. (a) Ònye ka anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-eṅomi? (b) Olee ihe mere o ji bụrụ ndị nwoke nọ n’ọgbakọ kacha kwesị ịgbalị iṅomi Jizọs?

11 Ndị niile nọ n’ọgbakọ, karịchaa ndị nwoke, kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha na-eme ka Kraịst. Dị ka anyị kwuru ná mmalite, Baịbụl sịrị: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla.” Dị nnọọ ka Kraịst ṅomiri onye bụ́ Isi ya, bụ́ ezi Chineke anyị, ndị nwoke bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịgba mbọ na-eṅomi onyeisi ha, bụ́ Kraịst. Pọl onyeozi mere otú a mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst. Ọ gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Kọr. 11:1) Pita onyeozi kwukwara, sị: “A kpọrọ unu ka unu soro ụzọ a, n’ihi na ọbụna Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) E nwere ihe ọzọ mere ndụmọdụ a e nyere ka anyị na-eṅomi Kraịst ji kacha gbasa ndị nwoke. Ọ bụ hanwa ka a na-eme ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Dị nnọọ ka iṅomi Jehova nyere Jizọs ọṅụ, iṅomi Kraịst kwesịrị inye ndị nwoke bụ́ Ndị Kraịst ọṅụ.

12, 13. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-emeso atụrụ e nyere ha ka ha na-elekọta?

12 Iwu ji ndị okenye ọgbakọ ịdị ka Kraịst. Pita nyere ndị okenye ndụmọdụ, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha; ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya, kama n’ịnụ ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa ime ndị bụ́ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ̀ bụ unu nwe ha, kama ghọọrọnụ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.” (1 Pita 5:1-3) Ndị okenye ọgbakọ ekwesịghị ịdị aka ike ma ọ bụ bụrụ eze onye agwala m. Iji gosi na ha na-eṅomi Kraịst, ha kwesịrị ịgbasi mbọ ike hụ atụrụ e nyere ha ka ha na-elekọta n’anya, dịrị umeala n’obi, ma jiri obiọma na-emeso ha ihe.

13 Ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ezughị okè, ha ekwesịghịkwa ichefu nke a. (Rom 3:23) N’ihi ya, ha kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-amụ banyere Jizọs ma na-ahụ ndị ọzọ n’anya ka Jizọs. Ha kwesịrị ịmụta otú Chineke na Kraịst si emeso ndị ọzọ ihe ma na-eṅomi ha. Pita dụrụ anyị ọdụ, sị: “Unu niile, werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’otú unu si emeso ibe unu, n’ihi na Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.”—1 Pita 5:5.

14. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-asọpụrụ ndị ọzọ?

14 Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịna-akpa àgwà dị mma mgbe ha na-emeso atụrụ Chineke ihe. Ndị Rom 12:10 kwuru, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịna-asọpụrụ ndị ọzọ. Dị ka Ndị Kraịst niile kwesịrị ime, ha ekwesịghị “ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka [ha].” (Fil. 2:3) Ndị na-edu ndú n’ọgbakọ kwesịrị iwere ya na ndị ọzọ ka ha. Ọ bụrụ na ha emee otú a, ha na-eme ihe Pọl dụrụ n’ọdụ, mgbe ọ sịrị: “Ma anyị ndị siri ike kwesịrị iburu adịghị ike nke ndị na-esighị ike, ọ bụghịkwa ịdị na-eme ihe na-amasị anyị onwe anyị. Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya n’ihe dị mma maka iwuli ya elu. N’ihi na ọbụna Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya.”—Rom 15:1-3.

‘Na-enyenụ Ndị Bụ́ Nwunye Nsọpụrụ’

15. Olee otú ndị bụ́ di kwesịrị isi na-emeso ndị nwunye ha?

15 Ugbu a, ka anyị tụlee ndụmọdụ Pita nyere ndị lụrụ nwaanyị. O dere, sị: “Unu ndị bụ́ di, ka unu na ndị nwunye unu na-ebi otú ahụ dị ka ihe ọmụma si dị, na-enyenụ nwaanyị nsọpụrụ dị ka arịa na-esighị ike.” (1 Pita 3:7) Ịsọpụrụ mmadụ pụtara iji onye ahụ akpọrọ ihe. Ya bụ, i kwesịrị ichebara aro onye ahụ tụrụ, mkpa ya, na ihe ndị na-amasị ya echiche, ma mee ihe onye ahụ chọrọ, ma ọ bụrụ na e nweghị ihe nke ahụ ga-emebi. Otú a ka ndị bụ́ di kwesịrị isi na-emeso ndị nwunye ha.

16. Olee ihe Okwu Chineke gwara ndị bụ́ di banyere ịsọpụrụ ndị nwunye ha?

16 Mgbe Pita na-agwa ndị bụ́ di ka ha sọpụrụ ndị nwunye ha, o kwukwara, sị: “Ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Nke a na-egosi na Jehova ejighị otú nwoke si emeso nwunye ya egwuri egwu. Ọ bụrụ na ọ sọpụrụghị ya, nke a nwere ike ime ka Chineke ghara ịza ekpere ya. Ihe ọzọkwa bụ na ndị bụ́ nwunye na-akpaso di ha àgwà ọma ma ọ bụrụ na di ha na-asọpụrụ ha.

17. Olee otú ịhụnanya onye bụ́ di hụrụ nwunye ya kwesịrị ịha?

17 A bịa n’ihe banyere mmadụ ịhụ nwunye ya n’anya, Okwu Chineke dụrụ anyị ọdụ, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. . . . N’ihi na ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya, dị ka Kraịst na-emekwara ọgbakọ ya . . . Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya.” (Efe. 5:28, 29, 33) Olee otú ịhụnanya ndị bụ́ di hụrụ nwunye ha kwesịrị ịha? Pọl dere, sị: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Efe. 5:25) N’eziokwu, onye bụ́ di kwesịrị ịdị njikere ịnwụ n’ihi nwunye ya, dị nnọọ ka Kraịst meere ndị ọzọ. Ọ bụrụ na di bụ́ Onye Kraịst na-emeso nwunye ya ihe n’ụzọ dị nro, hụ ya n’anya, ma jiri obiọma na-emeso ya ihe, ọ ga-adịrị nwunye ya mfe ido onwe ya n’okpuru ya.

18. Olee ihe nwere ike inyere ndị bụ́ di aka ịrụ ọrụ dịịrị ha n’ezinụlọ?

18 Inye ndị bụ́ nwunye nsọpụrụ ọ̀ bụ ọrụ dị ike nke ndị bụ́ di na-agaghị arụli? Ee e, Jehova enweghị ike ịgwa ha ka ha mee ihe ha na-agaghị emeli. E wezụga nke a, Jehova na-enye ndị na-efe ya ike kacha ike niile n’eluigwe nakwa n’ụwa, ya bụ, mmụọ nsọ. Jizọs sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:13) Mgbe ndị bụ́ di na-ekpe ekpere naanị ha, ha nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye ha mmụọ nsọ ya ka o wee nyere ha aka ịma otú ha ga-esi na-emeso ndị ọzọ, gụnyere ndị nwunye ha.—Gụọ Ọrụ 5:32.

19. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

19 N’eziokwu, ụmụ nwoke nwere ọrụ dị ukwuu ha ga-arụ ka ha wee nwee ike ido onwe ha n’okpuru Kraịst ma na-eṅomi ya. Oleekwanụ banyere ụmụ nwaanyị, karịchaa, ndị bụ́ nwunye? Isiokwu na-eso nke a ga-egosi otú ha ga-esi na-eme ihe Jehova chọrọ ha n’aka.

Ì Chetara?

• Olee àgwà Jizọs ndị anyị kwesịrị iṅomi?

• Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-emeso atụrụ Chineke?

• Olee otú onye bụ́ di kwesịrị isi na-emeso nwunye ya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Na-asọpụrụ ndị ọzọ dị ka Jizọs mere