Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Dere Banyere Jizọs

Ndị Dere Banyere Jizọs

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ndị Dere Banyere Jizọs

Ọ̀ NA-ATỌ gị ụtọ gị na mmadụ ịgụ banyere Jizọs?— * Ọ na-eju ụfọdụ ndị anya mgbe ha matara na o nweghị ihe Jizọs dere na Baịbụl. N’agbanyeghị nke ahụ, mmadụ asatọ so dee Baịbụl kọọrọ anyị ọtụtụ ihe banyere ya. Ha niile dịrị ndụ n’oge Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, ha kọkwaara anyị ihe ndị ọ kụziri. Ì nwere ike ikwu aha mmadụ asatọ ahụ?—Matiu, Mak, Luk, na Jọn so na ha. Mmadụ anọ ndị nke ọzọ bụ Pita, Jems, Jud, na Pọl. Olee ihe ị maara banyere ndị a so dee Baịbụl?—

Ka anyị buru ụzọ kwuo banyere mmadụ atọ so dee Baịbụl bụ́ ndị sokwa ná ndịozi iri na abụọ Jizọs. Ị̀ maara aha ha?—Pita, Jọn, na Matiu. Pita degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi abụọ. Ọ gwara ha ihe ndị ọ maara Jizọs mere ma kwuo. Sapeta 2 Pita 1:16-18 na Baịbụl gị ma gụọ ihe Pita kọrọ n’ebe ahụ banyere mgbe ọ nụrụ ka Jehova Chineke si n’eluigwe na-agwa Jizọs okwu.—Matiu 17:5.

Jọn onyeozi dere akwụkwọ Baịbụl ise. Ọ nọ n’akụkụ Jizọs ná nri ikpeazụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na Nna ha ukwu rikọrọ ọnụ. Jọn na Jizọs nọkwa mgbe Jizọs nwụrụ. (Jọn 13:23-26; 19:26) Jọn dere otu n’ime akwụkwọ Baịbụl anọ kọrọ banyere ndụ Jizọs, bụ́ ndị a na-akpọ Oziọma. O dekwara Mkpughe Jizọs gosiri ya nakwa akwụkwọ ozi atọ dị na Baịbụl a kpọrọ aha ya. (Mkpughe 1:1) Onye nke atọ so dee Baịbụl, bụ́ onye ghọrọ onyeozi Jizọs, bụ Matiu. Ọ bụbu onye ọnaụtụ.

Mmadụ abụọ ọzọ so dee Baịbụl matara Jizọs n’ụzọ pụrụ iche. Ha bụ ụmụnne ya nta ndị nne ji ha na ya, ndị Josef na Meri mụkwara. (Matiu 13:55) Ná mmalite, ha abụghị ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha chedịrị na isi emebiela ya n’ihi ịnụ ọkụ n’obi o ji na-ekwusa ozi ọma. (Mak 3:21) Olee ndị bụ́ ụmụnne ya ahụ?—Jems bụ otu n’ime ha. Ọ bụ ya dere akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jems. Onye nke ọzọ bụ Judas, onye a na-akpọkwa Jud. Ọ bụ ya dere akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jud.—Jud 1.

Mmadụ abụọ ọzọ dere banyere ndụ Jizọs bụ Mak na Luk. Nne Mak, bụ́ Meri, nwere nnukwu ụlọ na Jeruselem, bụ́ ebe Ndị Kraịst oge mbụ na-ezukọ, tinyere Pita onyeozi. (Ọrụ 12:11, 12) Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, n’abalị ahụ Jizọs so ndịozi ya mee Ememme Ngabiga ikpeazụ ya, ọ ga-abụ na Mak so ha mgbe ha banyere n’ogige Getsemeni. Mgbe e jidere Jizọs, ndị agha jidere Mak, ma ọ hapụrụ uwe ya gbalaga.—Mak 14:51, 52.

Luk bụ dọkịta gụrụ akwụkwọ nke ọma, ọ ga-abụkwa na ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs mgbe Jizọs nwụcharala. O ji nlezianya mụọ banyere ndụ Jizọs ma dee akụkọ ziri ezi, dokwara anya banyere ya. Luk mechara soro Pọl onyeozi na-aga ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ, ọ bụkwa ya dere akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ọrụ Ndịozi.—Luk 1:1-3; Ọrụ 1:1.

Pọl bụ onye nke asatọ so dee Baịbụl nke dere banyere Jizọs. Ọ bụ ọkàiwu a ma ama bụ́ Gameliel kụziiri ya ihe. Ebe ọ bụ ndị Farisii zụlitere Pọl, bụ́ onye a na-akpọ Sọl n’oge ahụ, ma kụziere ya ihe, Pọl kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs asị ma soro gbuo ha. (Ọrụ 7:58–8:3; 22:1-5; 26:4, 5) Ị̀ maara otú Pọl si mata eziokwu banyere Jizọs?—

Pọl nọ n’ụzọ ịga Damaskọs ijide ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe ìhè si n’eluigwe chachie ya anya na mberede. Ọ nụrụ otu olu nke jụrụ ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” Ọ bụ Jizọs nwe olu ahụ! Ọ gwara Pọl ka ọ banye na Damaskọs. Jizọs gwaziri onye na-eso ụzọ ya bụ́ Ananayas ka ọ gaa gwa Pọl okwu, Pọl ghọkwara onye na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 9:1-18) Pọl dere akwụkwọ iri na anọ na Baịbụl, malite ná Ndị Rom ruo ná Ndị Hibru.

Ị̀ malitela ịgụ akwụkwọ Baịbụl ndị kwuru banyere Jizọs ka mmadụ ọ̀ gụwarala gị ha?—Otu n’ime ihe ndị kacha mma ị ga-eme ná ndụ gị bụ ịmalite ugbu a ị ka na-eto eto mụwa ihe Baịbụl kwuru banyere Jizọs.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

AJỤJỤ:

▪ Olee ndịozi Jizọs so dee Baịbụl?

▪ Olee mmadụ abụọ so dee Baịbụl bụ́ ụmụnne Jizọs?

▪ Olee ihe mere ọ ga-eji bụrụ na Mak maara Jizọs, ma olee ihe mere ọ ga-eji bụrụ na Luk amaghị Jizọs?

▪ Olee otú Pọl si ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs?

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Jud

Mak

Pita

Matiu

Pọl

Jems

Luk

Jọn