Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Na-achọ Ebe Anyị Na-emezi Emezi

Ọ Na-achọ Ebe Anyị Na-emezi Emezi

Bịaruo Chineke Nso

Ọ Na-achọ Ebe Anyị Na-emezi Emezi

1 NDỊ EZE 14:13

“JEHOVA na-enyocha obi niile, ọ na-amatakwa ihe niile mmadụ na-eche n’echiche.” (1 Ihe E Mere 28:9) E si n’ike mmụọ nsọ dee okwu ndị a iji mee ka obi anyị jupụta n’ekele maka otú Jehova nweruru mmasị n’ebe anyị nọ. Jehova na-achọ ezi ihe dị anyị n’obi n’agbanyeghị na anyị ezutụdịghị okè. Nke a pụtara nnọọ ìhè n’ihe o kwuru banyere Abaịja, nke dị ná 1 Ndị Eze 14:13.

Abaịja biri n’ezinụlọ ọjọọ. Nna ya, bụ́ Jeroboam, bụ onyeisi nke ọchịchị si n’ezi ofufe dapụ. * Jehova zubere ikpochapụ ụlọ Jeroboam, “dị nnọọ ka mmadụ si ekpopụ nsị.” (1 Ndị Eze 14:10) Ma, Chineke nyere iwu na ọ bụ naanị otu onye n’ezinụlọ Jeroboam, bụ́ Abaịja—onye nọ n’ezigbo ọrịa mgbe ahụ—ka a ga-eli nke ọma. * N’ihi gịnị? Chineke kọwara, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel ahụwo ihe dị mma n’ime ya n’ụlọ Jeroboam.” (1 Ndị Eze 14:1, 12, 13) Olee ihe okwu ndị a na-agwa anyị banyere Abaịja?

Baịbụl ekwughị na Abaịja bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi nke na-efe Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ihe dịtụ mma n’ime ya. Ọ bụ ‘Jehova hụrụ’ ihe a dị mma n’ime ya, ikekwe, ihe ahụ metụtara ofufe Ya. Ndị edemede bụ́ ndị rabaị na-ekwu na ọ ga-abụ na Abaịja na-aga efe ofufe n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem kwa afọ ma ọ bụ na o wepụrụ ndị nche nna ya dowere igbochi ndị Izrel ịga Jeruselem.

N’agbanyeghị ihe ihe a dị mma a hụrụ n’ime Abaịja bụ, ihe ahụ pụrụ iche. Nke mbụ bụ na o si ya n’obi. Ihe a dị mma dị “n’ime ya”—ya bụ, n’obi ya. Nke abụọ abụrụ na ọ pụrụ iche. Abaịja mere ihe a dị mma n’agbanyeghị na ọ nọ “n’ụlọ Jeroboam.” Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Ndị bi n’ebe ma ọ bụ n’ezinụlọ a na-akpa àgwà ọjọọ ma nọgide na-akpa ezi àgwà kwesịrị ka a jaa ha ezigbo mma.” Onye ọzọ kwuru na àgwà ọma Abaịja “pụtara ìhè . . . , otú ahụ kpakpando si akacha enye ìhè mgbe ihu igwe gbara ọchịchịrị, na otú ahụ osisi sida na-akacha ama mma mgbe osisi ndị gbara ya gburugburu na-enweghị akwụkwọ.”

Nke ka nke bụ na ihe e kwuru ná 1 Ndị Eze 14:13 na-akụziri anyị ihe magburu onwe ha banyere Jehova na ihe ọ na-achọ n’ime anyị. Cheta na Chineke ‘hụrụ’ ihe dị mma “n’ime” Abaịja. O doro anya na Jehova nọ na-achọ ihe n’obi Abaịja ruo mgbe Ọ hụrụ obere ihe dị mma. Otu ọkà mmụta kwuru na ọ bụrụ na e jiri Abaịja tụnyere ndị ezinụlọ ya, ọ dị ka otu nkume pel “dị n’ime ikpo nkume.” Jehova nwere mmasị n’ihe a dị mma ma gọzie ya, metụrụ otu onye a nọ n’ajọ ezinụlọ ebere.

Ọ́ naghị emesi anyị obi ike ịmara na Jehova na-achọ ihe ọma n’ime anyị ma jiri ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị na anyị ezughị okè? (Abụ Ọma 130:3) Ịmara nke a kwesịrị ịkpali anyị ịbịaru Jehova, bụ́ Chineke nke na-enyocha obi anyị iji chọta obere ihe ọma ọ bụla dị na ya, nso.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Jeroboam malitere ofufe chi nwa ehi n’alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu iji mee ka ndị ya ghara ịga Jeruselem ife Jehova n’ụlọ nsọ ya dị n’ebe ahụ.

^ par. 5 N’oge Baịbụl, elighị mmadụ nke ọma na-egosi na Chineke na-ewesa onye ahụ iwe.—Jeremaya 25:32, 33.